Gosi Mmasị Ịhụnanya n’Ebe “Ụmụ Mgbei” Nọ
1 Jehova bụ “nna nke ụmụ mgbei.” (Ọma 68:5) Nchegbu ọ na-enwe maka ọdịmma ha pụtara ìhè n’iwu a o nyere mba Izrel oge ochie: “Nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ, ma ọ bụ nwa mgbei, unu ewedala ya n’ala. Ọ bụrụ na i weda ya n’ala ma ọlị, o wee tikuo m n’ụzọ ọ bụla n’ezie, aghaghị m ịnụ ntiku ya.” (Ọpụ. 22:22, 23) Iwu Chineke gụnyekwara ndokwa iji nyere ndị dị otú ahụ aka inweta ihe ndị dị ha mkpa n’ụzọ anụ ahụ́. (Deut. 24:19-21) Ná ndokwa nke Ndị Kraịst, a dụrụ ndị na-efe ezi ofufe ọdụ “ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha.” (Jems 1:27) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie mmasị ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị na-etolite n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ezinụlọ ndị kewara ekewa n’ụzọ okpukpe nọ?
2 Ọzụzụ Ime Mmụọ: Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ, ma ọ bụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị bụ onye na-ekweghị ekwe, iduziri ụmụ gị ọmụmụ Bible ebe obibi mgbe nile pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ọmụmụ Bible nke dị irè, nke a na-enwechikwa anya dị mkpa ma ọ bụrụ na ha ga-etolite ma bụrụ ndị dimkpa nwere ezi uche, ndị tozuru okè. (Ilu 22:6) Iso ha na-ekwurịta banyere ihe ime mmụọ kwa ụbọchị dịkwa mkpa. (Deut. 6:6-9) Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ inwe nkụda mmụọ, ma ike agwụla gị. Chigharịkwuru Jehova maka ike na nduzi ka ị “na-azụlite [ụmụ gị] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Efe. 6:4.
3 Ọ bụrụ na ị chọrọ enyemaka n’ilekọta ibu ọrụ ndị Akwụkwọ Nsọ nyere gị, mee ka ndị okenye mara mkpa gị. Ha pụrụ ịtụ aro ndị dị irè ma ọ bụ nyere gị aka inwe ezi usoro ihe omume ime mmụọ maka ezinụlọ gị.
4 Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka: Na narị afọ mbụ, Timoti ghọrọ ohu Jehova na-anụ ọkụ n’obi n’agbanyeghị na o tolitere n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe. Mgbalị nne ya na nne ya ochie ji ịdị uchu mee n’ịkụziri ya ihe odide ndị dị nsọ n’oge ọ bụ onye ntorobịa keere òkè dị mkpa na nke a. (Ọrụ 16:1, 2; 2 Tim. 1:5; 3:15) Otú ọ dị, o ritekwara uru site n’iso Ndị Kraịst ndị ọzọ kpakọrịta, gụnyere Pọl onyeozi, bụ́ onye kpọrọ Timoti “nwa m m hụrụ n’anya nke na-ekwesị ntụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị.”—1 Kọr. 4:17.
5 N’otu aka ahụ taa, lee otú o si aba uru mgbe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ na-egosi mmasị ịhụnanya n’ebe ụmụ mgbei nọ n’ọgbakọ nọ! Ị̀ maara aha ha nile? Ị̀ na-eso ha ekwurịta okwu ná nzukọ Ndị Kraịst na n’oge ndị ọzọ? Gwa ha ka ha sonyere gị n’ozi ubi. Ikekwe, ị pụrụ ime ka ha na nne ma ọ bụ nna ha nke nanị ya n’azụ ha ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ha nke kwere ekwe sonye n’ọmụmụ ihe ezinụlọ gị ma ọ bụ ná ndokwa maka inwe ntụrụndụ na-ewuli elu. Mgbe ndị a na-eto eto weere gị dị ka enyi ha, o yikarịrị ka ha ga-eṅomi ihe nlereanya gị ma nakwere agbamume gị.—Fil. 2:4.
6 Jehova nwere mmasị dị ukwuu n’ebe ụmụ mgbei nọ, ọ na-agọzikwa mgbalị anyị ji ịhụnanya na-eme inyere ha aka ime ka eziokwu ahụ bụrụ nke ha. Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị tolitere n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ n’ezinụlọ ndị e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe nwetara ụdị agbamume ahụ, ha na-ejekwa ozi ugbu a n’ikwesị ntụkwasị obi dị ka ndị ọsụ ụzọ, ndị ohu na-eje ozi, ndị okenye, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ Betel. Ka anyị nile na-achọ ụzọ isi ‘gbasapụ’ mmetụta ịhụnanya anyị n’ebe ụmụ mgbei nọ, n’iṅomi Nna anyị nke eluigwe.—2 Kọr. 6:11-13.