Ụwa Ka Mma—Dị Nso!
“ỌCHỊCHỌ maka paradaịs e nweburu bụ otu n’ime ọchịchọ ndị siri ike maka ihe dịbunụ, bụ́ ndị na-adịgide n’uche ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ pụrụ ịbụ nke kasị sie ike, kasịkwa na-adịgide adịgide n’ime ha. A na-ahụ ihe àmà nke otu ụdị agụụ ahụ maka paradaịs n’ọnọdụ ọ bụla nke ndụ okpukpe,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu.
O yiri ka ndị nile nwere otu ụdị mmasị ahụ ịdị ndụ n’ụwa ka mma, dị ka a ga-asị na ha na-akwa arịrị maka ọnọdụ ọma mbụ nke na-adịkwaghị. Nke a na-atụ aro maka ịdị adị nke paradaịs mbụ, ma ọ̀ bụ n’ole ebe? Onye na-agwọ ọrịa mmetụta uche pụrụ ịsị na oké mmasị nke a na-ekpughe mmasị nke inwetaghachi ịnọ ná nchebe furu efu nke afọ nne. Ma, nkọwa nke a adịghị eme ka ndị mmụta na-amụ ihe banyere okpukpe kwenye.
“Ọchịchọ Maka Paradaịs E Nweburu”—N’ihi Gịnị?
Ịdị adị nke ọchịchọ dị otú ahụ maka ihe dịbu, dị ka ụfọdụ na-atụ aro, ọ̀ bụ nanị iji mee ka ihe isi ike nile na ịdị mkpụmkpụ nke ịdị adị mmadụ kwe nnakwere karị? Ka è nwere nkọwa ọzọ?
Gịnị mere ụwa ka mma ji agụ ihe a kpọrọ mmadụ agụụ? Bible na-enye nkọwa doro anya dị ka ọ dị nnọọ mfe nghọta: Ihe a kpọrọ mmadụ sitere n’ụwa ka mma! Paradaịs mbụ dịrị adị n’ezie. Okwu Chineke na-akọwa ya dị ka “ubi a gbara ogige” dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, nke e ji “osisi nile ọ bụla si n’ala puo, bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri,” gọzie. Chineke nyefere ya n’aka di na nwunye mbụ ahụ ilekọta. (Jenesis 2:7-15) Ọ bụ ọnọdụ magburu onwe ya nke ụmụ mmadụ pụrụ inweworị ezi obi ụtọ na ya.
Gịnị mere ọnọdụ ndị ahụ nke Paradaịs anọghị ogologo oge? N’ihi nnupụisi, ná mbụ nke otu mmụọ e kere eke na e mesịa nke di na nwunye ahụ bụ́ mmadụ. (Jenesis 2:16, 17; 3:1-6, 17-19) Otú a, mmadụ tụfuru ọ bụghị nanị Paradaịs kamakwa izu okè, ahụ ike, na ndụ agwụ agwụ. Ọnọdụ ndị a malitere inwe emeghị ma ọlị ka ndụ ihe a kpọrọ mmadụ ka mma. N’ụzọ megidere nke a, nke a anọgidewo na-eretọ ruo ọ̀tụ̀tụ̀ kasị njọ, bụ́ nke anyị na-ahụ taa.—Eklisiastis 3:18-20; Ndị Rom 5:12; 2 Timoti 3:1-5, 13.
Ọchịchọ A Na-achọ Paradaịs—Akụkọ Banyere Otu Ihe E Bu n’Uche
Dị ka a pụrụ iche, “ọchịchọ maka paradaịs e nweburu” nwere akụkọ dị ogologo. Ndị Sumer chetaghachiri mgbe e nwere nkwekọrịta n’eluigwe na ụwa nile: “Egwu adịghị, ụjọ adịghị, mmadụ enweghị ihe na-ama ya aka. . . . Eluigwe na ụwa nile, ndị mmadụ dị n’otu, chi Enlil n’otu asụsụ ka ha na-enye otuto,” ka otu abụ uri ndị Mesọpọtemia oge ochie na-echetaghachi. Ụfọdụ, dị ka ndị Ijipt oge ochie, nwere olileanya iru ụwa ka mma mgbe ha nwụsịrị. Ha kwere na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ na-eru ebe a na-akpọ ubi Aaru. Ma na mbụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, olileanya a dịịrị nanị ndị oké ozu; ogbenye apụghị ịtụ anya inweta ụwa ka mma.
N’akụkụ dị iche nke okpukpe, ndị Hindu atụwo anya maka ọbịbịa nke ọgbọ ụwa ka mma (yuga) ruo ọtụtụ narị afọ. Dị ka ozizi ndị Hindu si dị, yuga anọ na-agbaghachi gburugburu n’onwe ha, anyị na-ebikwa ugbu a na nke kasị njọ. N’ụzọ dị mwute, Kali Yuga (ọgbọ ọchịchịrị) nke a, ya na ahụhụ na mmebi iwu ya nile, ga-anọgide, dị ka ụfọdụ si kwuo, ruo ihe ruru 432,000 afọ. Otú ọ bụla o si dị, ndị Hindu ji okpukpe kpọrọ ihe na-echere ọgbọ ọma ahụ, Krita Yuga.
N’aka nke ọzọ, ndị Gris na ndị Rom rọrọ nrọ iru Agwaetiti Ihe Ndabara Ọma nke dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, n’Oké Osimiri Atlantic. Ọtụtụ ndị edemede, dị ka Hesiod, Virgil, na Ovid, kwuru banyere ọgbọ ọma mbụ dị ebube, na-enwe olileanya na n’otu ụbọchị a ga-eweghachi ya. Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke narị afọ mbụ T.O.A., onye Latin na-agụ abụ uri bụ́ Virgil buru amụma ịdị nso nke ọbịbịa aetas aurea (ọgbọ ọma) dị ọhụrụ na-adịgidekwa adịgide. Na narị afọ ndị sochirinụ, “ihe na-adịghị ala karịa ndị ọchịchị iri na isii nke Rom mere nzọrọ na ọchịchị ha eguzobeghachiwo Ọgbọ Ọma ahụ,” ka akwụkwọ The Encyclopedia of Religion sịrị. Ma dị ka anyị maara nke ọma taa, nke ahụ bụ nanị ịgba égbè ọnụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ọtụtụ ndị Celt chọsiri ike ihe ha chere bụ ala na-egbukepụ egbukepụ n’otu agwaetiti (ma ọ bụ n’otu ìgwè agwaetiti) n’ofe osimiri, bụ́ ebe ha kwetara na ndị mmadụ biri ndụ n’obi ụtọ zuru okè. Dị ka otu akụkọ ifo mgbe ochie na-ekwu, King Arthur, ọ bụ ezie na o merụrụ ahụ nke ukwuu, nọgidere na-adị ndụ mgbe ọ chọtara agwaetiti ahụ dị ebube a kpọrọ Avalon.
N’oge ochie na Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ọtụtụ ndị chere na ubi nkịtị a gbara ogige nke obi ụtọ, ubi Iden, ka dị adị n’otu ebe, “n’elu otu ugwu a na-apụghị ịrịgoru na ya ma ọ bụ n’ofe oké osimiri a na-apụghị ịgabiga ruo na ya,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jean Delumeau kọwara. Ọ bụ ezie na onye Ịtali na-agụ abụ uri bụ́ Dante kwetara na paradaịs nke eluigwe, o chere na paradaịs elu ụwa ka dị adị n’elu ugwu Pọgatrị ya, ná ncherịta ihu obodo Jerusalem. Ụfọdụ ndị kwetara na a pụrụ ịchọta ya n’Esia, na Mesọpọtemia, ma ọ bụ n’ugwu Himalaya. Akụkọ ndị mgbe ochie Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya banyere paradaịs Iden hitụrụ nne. Ọtụtụ ndị kwetara na ná nso nso paradaịs ahụ, e nwere otu alaeze dị ebube nke Prester John onye na-eme nsọ nsọ chịrị isi na ya. N’ihi ịdị nso nke paradaịs elu ala ahụ, e chere na ndụ n’ime alaeze Prester John bụ nke dị ogologo, dịkwa ụtọ, isi iyi na-adịgide adịgide nke ịnọ n’uju na ịba ọgaranya. Ndị ọzọ, n’iburu n’uche akụkọ mgbe ochie dị iche iche nke ndị Gris mgbe ochie, ka nọkwa na-eche na a pụrụ ịhụ agwaetiti nile nke paradaịs n’akụkụ Atlantic. Map ndị biri Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya gosiri ịbụ eziokwu nke nkwenkwe dị otú ahụ n’ịdị adị nke ubi Iden, ọbụna na-atụ aka n’ebe e chere na ọ dị.
N’ime narị afọ nke 15 na 16, ndị njem ụgbọ mmiri gabigara Atlantic n’ezie na-achọ ụwa nke dị ọhụrụ dịkwa ochie. Ha chere na n’ofe nke ọzọ nke oké osimiri ahụ, ha gaje ịhụ ọ bụghị nanị ndị India kamakwa ubi Iden. Dị ka ihe atụ, Christopher Columbus chọrọ ya n’etiti ugwu nile nke ala ebe oyi na-atụ na ala okpomọkụ nile nke Ebe Ndịda na Etiti Kọntinenti America. Obi siri ndị Europe na-eme nchọpụta ala bụ́ ndị rutere Brazil ike na paradaịs ahụ furu efu aghaghị ịdị n’ebe ahụ n’ihi ọnọdụ ihu igwe dị jụụ na ụba ihe oriri na ihe ọkụkụ dị iche iche. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya ma ọlị, a manyere ha ịghọta ihe bụ ezie bụ́ nke dị mwute.
Ebe Ihe Nile Zuru Okè—Hà Bụ Ebe Ndị Magburu Onwe Ha ná Mma?
Kama ịgbalịsi ike ịchọta ụwa magburu onwe ya ná mma n’otu nsọtụ nke ụwa, ndị ọzọ anwawo ime atụmatụ ya. Otú a, na 1516, onye England na-akwado ọdịmma ụmụ mmadụ bụ́ Thomas More kọwara agwaetiti nke Ebe Ihe Nile Zuru Okè, ihe dị ebube, dị udo, na ebe a pụrụ ịnagide ndụ, ebe dị nnọọ iche pụọ n’ụwa nke rụrụ arụ ọ maara. Ndị ọzọ agbalịwokwa ime atụmatụ maka ụwa ndị ka mma, ụwa ndị ka obi ụtọ: n’ime narị afọ nke isii T.O.A., Plato na Mba ya; na 1602, onye Ịtali bụ́ onye mọnk bụ́ Tommaso Campanella na Obodo Ukwu Anyanwụ ya nke a haziri n’ụzọ dị ukwuu; nanị afọ ole na ole n’ihu, onye England bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Francis Bacon n’ịkọ banyere “ebe obibi nke obi ụtọ na ọganihu” nke Atlantis Ọhụrụ ya. Mgbe ọtụtụ narị afọ na-aga, ndị na-eche echiche nke ụdị nile (ma ndị kwere ekwe ma ndị na-ekweghị) akọwawo ọtụtụ Ebe Ihe Nile Zuru Okè. Otú ọ dị, ole na ole ka e ji kpọrọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ dị nke e ji kpọrọ ihe.
E nwewo ụfọdụ ndị gbalịworo iwu Ebe Ihe Nile Zuru Okè nke ha. Dị ka ihe atụ, na 1824 otu onye England bara ọgaranya, Robert Owen, kpebiri ịkwaga n’Indiana, U.S.A., iji nweta mmezu nke echiche Ebe Ihe Nile Zuru Okè ndị o nwere n’obodo nta ọ kpọrọ New Harmony. N’ịbụ onye obi siri ike na n’okpuru ezi ọnọdụ nile, ụmụ mmadụ ga-emeziwanye ihe, o jiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile o nwere mee ihe n’ịgbalị iguzobe ihe ọ hụrụ dị ka ụwa ọhụrụ nke omume ọma. Ma ihe ndị si na ya pụta gosiri na ọnọdụ ọhụrụ nke ibi ndụ ezughị iji mepụta ụmụ mmadụ ndị ọhụrụ.
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile na-akwado na ọ dịịrị mmadụ ịhazi ụwa ikwekọ n’ihe ọmụma ya na echiche nke ya nke ihe bụ eziokwu iji weta paradaịs ahụ a rọworo nrọ ya n’elu ụwa. Ma, n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ, mgbalị nile iji nweta ihe mgbaru ọsọ ndị dị otú ahụ arụpụtawo agha na mgbanwe ọchịchị dị iche iche, dị ka Mgbanwe Ọchịchị France na 1789 na Mgbanwe Ọchịchị Bolshevik na 1917. Kama iweta ọnọdụ paradaịs, mgbalị ndị a edugawo ọtụtụ mgbe n’ịrị elu nke ihe mgbu na nhụjuanya.
Oké ọchịchọ, atụmatụ, Ebe Ihe Nile Zuru Okè, na mgbalị ndị a na-eme iji nweta ha—ọ bụ akụkọ nke ọtụtụ olileanya kụrụ afọ n’ala. N’oge dị ugbu a, ụfọdụ na-ekwu banyere “nrọ na-emezughị” na “ọgwụgwụ nke ebe ihe nile zuru okè,” na-akpọ anyị òkù ịmụta “ibi ndụ n’enweghị ebe ihe nile zuru okè ndị ahụ.” È nwere olileanya ọ bụla dịnụ ịhụ ụwa ka mma, ka à kawo ya aka ịnọgide na-abụ nanị nrọ?
Ndị Kraịst na Ụwa Ka Mma
Ụwa ọhụrụ abụghị nrọ ma ọlị—ọ bụ olileanya e ji n’aka! Jisọs Kraịst, Onye Guzobere Iso Ụzọ Kraịst, maara na ụwa a dị ugbu a abụghị ụwa nke kasị mma n’ụwa nile a pụrụ inwe. Ọ kụziri na ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala nakwa na uche Chineke ga-ewere ọnọdụ n’ebe ahụ. (Matiu 5:5; 6:9, 10) Ma ya ma ndị na-eso ụzọ ya maara na ọ bụ onye iro Chineke bụ́ Setan Ekwensu na-achị ụwa nke a, nakwa na nke a bụ isi ihe kpatara ọtụtụ ahụhụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Jọn 12:31; 2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:12) Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi tụrụ anya ụbọchị mgbe Chineke ga-eme ka ụwa nwere onwe ya pụọ n’ọtụtụ agha, ihe mgbu, na ọrịa kpam kpam iji jiri ndị hụrụ udo na ikpe ziri ezi n’anya mejupụta ya. N’otu ụzọ ahụ, ndị Kraịst narị afọ mbụ ji obi ike chere ka e jiri usoro ihe ọhụrụ, “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” dochie ụwa nke a dị ugbu a.—2 Pita 3:13; Abụ Ọma 37:11; 46:8, 9; Aịsaịa 25:8; 33:24; 45:18; Mkpughe 21:1.
Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’elu osisi ịta ahụhụ, o kweghachiri nkwa maka ụwa ka mma nye otu onye mmebi iwu gosipụtara ọ̀tụ̀tụ̀ okwukwe n’ebe Ọ nọ. “[Jisọs] gwara ya, sị: ‘N’ezie, asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.’” (Luk 23:40-43, NW) Gịnị ka onye mmebi iwu ahụ ghọtara na okwu ndị ahụ pụtara? Jisọs ọ̀ tụrụ aro na onye mmebi iwu ahụ ‘ga-anọnyere ya’ n’eluigwe n’ụbọchị ahụ kpọmkwem, dị ka nsụgharị Bible ụfọdụ nke ndị Katọlik na Protestant ga-eyi ka ha na-egosi? Ee e, nke ahụ abụghị ihe Jisọs bu n’uche, ebe ọ bụ na mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, Jisọs gwara Meri Magdalini na Ya ‘a ka arịgokwurughị Nna ya.’ (Jọn 20:11-18) Ọ bụ ezie na Jisọs ziri ha ihe ruo afọ atọ na ọkara, tupu Pentikọst 33 O.A. ọbụna ndị ozi ya echetụghị echiche paradaịs eluigwe. (Ọrụ 1:6-11) Onye mmebi iwu ahụ ghọtara ihe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị Juu dị ndụ mgbe ahụ ga-aghọtaworị: Jisọs na-ekwe nkwa maka ụwa ka mma nke ga-abịa n’elu ụwa paradaịs. Otu onye Germany bụ́ ọkà mmụta kwetara, sị: “Nkụzi nke inye mmadụ ahụhụ mgbe a nwụsịrị apụtaghị ma ọlị n’Agba Ochie.”
Na a ga-enwe paradaịs n’elu ụwa anyị bụ ihe Pọl onyeozi nwapụtara n’akwụkwọ ozi ya o degaara ndị Hibru. Mgbe ọ na-agba ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha ghara ‘ilefuru oké nzọpụta ahụ e buru ụzọ kwuo site n’ọnụ Jisọs Kraịst anya,’ Pọl mesiri ya ike na Jehova Chineke nyere Jisọs ịbụ isi n’elu “ụwa dum mmadụ bi [Greek, oi·kou·meʹne] nke gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 2:3, 5) N’ime Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu ahụ bụ́ oi·kou·meʹne na-atụ aka mgbe nile n’elu ala anyị nke mmadụ bijupụtara, ọ bụghị n’ụwa eluigwe. (Tụlee Matiu 24:14; Luk 2:1; 21:26; Ọrụ 17:31.) Ya mere Alaeze Chineke nke Kraịst Jisọs na-achị ga-achịkwa elu ụwa dum mmadụ bi. Nke ahụ n’ezie ga-abụ ebe magburu onwe ya ibi na ya!
Ọ bụ ezie na Alaeze ahụ n’onwe ya dị n’eluigwe, ọ ghaghị ime ihe n’ebe ihe omume nile nke ụwa dị. Gịnị ga-esi n’ime ya pụta? Ahụ adịghị ike nile, arụrụala nile, ịda ogbenye, na ọnwụ ga-aghọ akụkọ mgbe dị anya gara aga. Ọbụna nkụda mmụọ na enweghị afọ ojuju ga-apụ n’anya. (Mkpughe 21:3-5) Bible na-asị na ‘Chineke ga-asaghe aka ya werekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’ (Abụ Ọma 145:16) Nsogbu ndị dị ka enweghị ọrụ na mmetọ ga-enwe ngwọta dị irè na nke na-adịgide adịgide. (Aịsaịa 65:21-23; Mkpughe 11:18) Ma karịsịa ihe nile, n’ihi ngọzi Chineke, a ga-enwe mmeri nke eziokwu, ikpe ziri ezi, na udo—àgwà ndị o yiri ka ọ fọrọ nke nta ka ha pụsịa n’anya!—Abụ Ọma 85:7-13; Ndị Galetia 5:22, 23.
Ihe a dum ọ̀ bụ nrọ, Ebe Ihe Nile Zuru Okè? Ee e, oge a kasị dị egwu nke anyị na-ebi n’ime ya na-egosipụta na anyị nọ na “mgbe ikpeazụ” nke ụwa nke a, n’ihi ya kwa na ụwa ọhụrụ ahụ dị nso. (2 Timoti 3:1-5) Ị̀ ga-enwe mmasị ibi n’ebe ahụ? Mụta otú ọ ga-esi kwe omume site n’isoro Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ụwa ka mma dị nso, bụ́ nke ka mma nke ukwuu karịa nke ọ bụla anyị rọworo ná nrọ. Ọ bụghị Ebe Ihe Nile Zuru Okè—ọ dị adị n’ezie!
[Foto dị na peeji nke 7]
Ụwa ka mma—ihe ga-adị adị n’isi nso