Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/1 p. 3
  • Ụwa Ka Mma—Ọ̀ Bụ Nanị Nrọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa Ka Mma—Ọ̀ Bụ Nanị Nrọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụwa Ka Mma—Dị Nso!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Nrọ Hà Pụrụ Ịkọ Ọdịnihu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Nrọ Hà Bụ Ozi Ndị Sitere n’Aka Chineke?
    Teta!—2001
  • Ndụ Ka Mma—N’isi Nso!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/1 p. 3

Ụwa Ka Mma​—⁠Ọ̀ Bụ Nanị Nrọ?

ỌBỤRỤ na ị bụwo onye na-eso ụzọ okpukpe Mazda dị ka onye amụma Iran ahụ bụ́ Zoroaster kwusara ya, ị ga-echerewo ụbọchị ahụ mgbe ụwa ga-alaghachi n’ịma mma mbụ ya. Ọ bụrụ na i biri na Gris oge ochie, ma eleghị anya ị ga-arọworị nrọ iru ebe ahụ mara mma nke Agwaetiti Ihe Ndabara Ọma ma ọ bụ ịhụ nlọghachite nke Ọgbọ Ọma ahụ nke onye abụ uri bụ́ Hesiod kọwara na narị afọ nke asatọ T.O.A. Onye Guaraní nke India n’Ebe Ndịda Kọntinenti America ka pụrụ ịdị na-achọ Ala Ihe Ọjọọ Na-adịghị Ya. N’ihi ịdị ndụ n’oge anyị, ma eleghị anya ị na-enwe olileanya na ụwa ga-akawanye mma n’ihi otu echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ dị ka ihe sitere n’ihe ọmụma banyere gburugburu ebe obibi nke oge a.

Ọgbọ Ọma, Agwaetiti Ihe Ndabara Ọma, Ala Ihe Ọjọọ Na-adịghị Ya​—⁠ndị a so n’ọtụtụ aha a na-eji akọwa otu ọchịchọ ahụ, olileanya maka ụwa ka mma.

Ụwa nke a, ụwa anyị, bụ n’ezie ebe na-ekwesịghị obibi. Ịrị elu na-aga n’ihu nke ajọ mpụ, agha ime ihe ike a na-enwetụbeghị ụdị ya nke nwanne igbu nwanne ya, mgbukpọ nke agbụrụ, enweghị mmetụta banyere nhụjuanya nke ndị ọzọ, ịda ogbenye na agụụ, enweghị ọrụ na enweghị nkwekọrịta n’ihe, nsogbu gburugburu ebe obibi, ọrịa ndị na-enweghị ngwọta ndị na-emekpa ọtụtụ nde mmadụ ahụ​—⁠ndepụta nke ahụhụ ndị e nwere taa yiri ka o nweghị ọgwụgwụ. N’iche echiche banyere agha ndị a na-alụ ugbu a, otu onye nta akụkọ Ịtali kwuru, sị: “Ajụjụ na-ebilitere onwe ya bụ ma ịkpọasị ọ́ bụghị ihe kasị emetụ emetụ n’obi n’oge anyị a.” N’ịtụle ọnọdụ ahụ, ị̀ na-eche na ọ bara uru ịtụ anya ihe dị iche, ihe ka mma? Ka atụmanya dị otú ahụ ọ̀ bụ nanị ọchịchị maka Ebe Ihe Nile Zuru Okè, nrọ na-apụghị ime eme? Ànyị na-ebi n’ụwa kasị mma a pụrụ inwe?

Ndị a abụghị nchegbu ndị ọhụrụ. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị mmadụ anọwo na-arọ nrọ maka ụwa nke nkwekọrịta, ikpe ziri ezi, ịga nke ọma, na ịhụnanya ga-achị. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma kọwara echiche ha maka Usoro Ọchịchị ndị kachasị mma, ụwa ndị ka mma. Ma n’ụzọ dị mwute, ha enwebeghị ike ịkọwa otú ha pụrụ isi dị adị.

Ọ̀ dị ihe usoro ngụkọ nke a dịworo ọtụtụ narị afọ nke ọtụtụ nrọ, Ebe Ihe Nile Zuru Okè, na oké atụmanya ụmụ mmadụ maka ọha mmadụ ka mma pụrụ ịkụziri anyị?

[Foto dị na peeji nke 3]

Nke a ọ̀ bụ ụwa kachasị mma a pụrụ inwe?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya