Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/15 p. 15-20
  • Ndị Ntorobịa—Ozizi Ònye Ka Unu Na-ege Ntị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ntorobịa—Ozizi Ònye Ka Unu Na-ege Ntị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ na Ozizi Ha
  • Ịkwalite Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
  • Mee Nnyocha Onwe Onye
  • Gụzogide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
  • Rite Uru Site n’Izi Ihe Chineke
  • Mee Nhọrọ nke Ziri Ezi
  • Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?
    Teta!—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/15 p. 15-20

Ndị Ntorobịa​—⁠Ozizi Ònye Ka Unu Na-ege Ntị?

“Ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị . . . ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.”​—⁠1 TIMOTI 4:1.

1. (a) Nhọrọ dị aṅaa ka ndị ntorobịa nwere? (b) Olee otú Jehova si ezi ihe?

AJỤJỤ dị ebe a e chere ndị ntorobịa n’ihu bụ, Ozizi ònye ka unu na-ege ntị? Nke a na-atụ aro na unu ndị na-eto eto nwere nhọrọ ime. Nhọrọ ahụ bụ n’etiti ịnakwere izi ihe Chineke na ịgbaso izi ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ. Jehova na-ezi ihe site n’Okwu ya, bụ́ Bible, nakwa site n’ozi nke ndị o ji eme ihe dị ka ndị nnọchiteanya ya n’elu ụwa. (Aịsaịa 54:13; Ọrụ 8:​26-⁠39; Matiu 24:​45-⁠47) Ma ò juru gị anya na ndị mmụọ ọjọọ na-ezikwa ihe?

2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịnọ ná nche megide ozizi ndị mmụọ ọjọọ karịsịa n’oge a?

2 Pọl onyeozi dere, sị: “N’oge ikpeazụ ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Timoti 4:1) Ebe ọ bụ na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” mgbe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-arụsi ọrụ ike karịsịa, ị̀ na-ahụ ihe mere anyị ji jụọ ajụjụ ahụ, Ozizi ònye ka unu na-ege ntị? (2 Timoti 3:​1-⁠5; Mkpughe 12:​7-⁠12) N’ihi na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya dị aghụghọ, ụzọ ha si arụ ọrụ bụrụ nke oké nrafu, ọ dị oké mkpa na i ji nlezianya tụgharịa uche n’ajụjụ a.​—⁠2 Ndị Kọrint 11:​14, 15.

Ndị Mmụọ Ọjọọ na Ozizi Ha

3. Olee ndị bụ ndị mmụọ ọjọọ, gịnị bụ nzube ha, oleekwa ụzọ ha si achọ imezu ya?

3 Ndị mmụọ ọjọọ bụbu ndị mmụọ ozi Jehova, ma ha nupụụrụ Onye Okike ha isi wee si otú ahụ ghọọ ndị na-akwado Setan. (Matiu 12:24) Nzube ha bụ imerụ ndị mmadụ na ichigharị ha ihu pụọ n’ijere Chineke ozi. Iji mezuo nke a, ndị mmụọ ọjọọ na-eji ndị nkụzi bụ́ ụmụ mmadụ na-akwalite ụzọ ndụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, nke rụrụ arụ nke Jehova kagburu. (Tụlee 2 Pita 2:​1, 12-⁠15.) Ntụleghachi nke otú ndị bụbu ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi si ghọọ ndị mmụọ ọjọọ ga-enyere gị aka ịmata ozizi ha na ụzọ ndụ nke ozizi ndị a na-akwalite.

4. (a) N’ihi gịnị ka ndị mmụọ ozi nupụrụ isi ji bịa n’ụwa n’ụbọchị Noa? (b) Gịnị mere ndị mmụọ ozi ahụ dị obi ọjọọ na ụmụ ha n’oge Iju Mmiri ahụ?

4 N’ụbọchị Noa, ndị mmụọ ozi ụfọdụ nwere oké mmasị n’ebe ụmụ ndị inyom mara mma nke ndị mmadụ nke na ndị mmụọ a e kere eke hapụrụ ọnọdụ ha n’eluigwe bịa n’ụwa. Mmekọrịta mmekọahụ ha na ndị inyom rụpụtara ụmụ gwara ọgwa a na-akpọ ndị Nefilim. Ebe ọ bụ na ọ bụghị ihe kwekọrọ n’okike ndị mmụọ e kere eke iso ụmụ mmadụ bikọọ, ihe ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi so ndị inyom ahụ mee dị njọ dị nnọọ ka ihe omume nile nke ndina ụdị onwe onye nke ndị ikom Sọdọm mere. (Jenesis 6:1-⁠4; 19:4-⁠11; Jud 6, 7) Ọ bụ ezie na ndị nwunye ndị mmụọ ozi ahụ lara n’iyi ná mmiri Iju Mmiri ahụ tinyere ụmụ ha gwara ọgwa, ndị mmụọ ozi ahụ dị obi ọjọọ nwoghapụrụ anụ ahụ ha e nwoghatara enwoghata ma laghachi n’eluigwe ebe ha ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ na-esonyere Setan Ekwensu.​—⁠2 Pita 2:4.

5. Ụdị ihe e kere eke ndị dị aṅaa ka ndị mmụọ ọjọọ bụ, oleekwa otú ha si anwa ikpu iwu nile nke Chineke ihu?

5 N’iburu n’uche ọnọdụ akụkọ ihe mere eme nke a, ị̀ na-ahụ ụdị ihe ndị e kere eke ndị mmụọ ọjọọ bụ n’ezie? Ha bụ ndị mmekpu mmekọahụ bụ́ ndị a na-adịghị ahụ anya na-akwado ụwa nke a ara mmekọahụ na-agba. Ọ bụ ezie na e gbochiwo ha inwoghakwa ọzọ dị ka mmadụ, ha na-enweta obi ụtọ site ná mmekọahụ rụrụ arụ nke ndị ha pụrụ imerụ n’elu ụwa. (Ndị Efesọs 6:​11, 12) Ndị mmụọ ọjọọ na-anwa ikpu iwu nile nke Jehova banyere ịdị ọcha na omume ọma ihu site n’ime ka ha yie ihe mgbochi ndị na-adịghị mkpa. Ndị mmụọ ozi ndị a dị obi ọjọọ na-akwalite mmekọahụ rụrụ arụ dị ka ụzọ ndụ kwesịrị ekwesị, nke dị ụtọ.

Ịkwalite Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ

6. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji nwee ihe ijuanya na ndị mmụọ ọjọọ na-akwalite ozizi ha n’ụzọ dị aghụghọ?

6 Na ndị mmụọ ọjọọ ga na-akwalite ozizi ha n’ụzọ dị aghụghọ ekwesịghị iju anyị anya, ebe ọ bụ na nke a bụ ụzọ onye ndú ha, Setan Ekwensu, ji mee ihe n’ịghọgbu Iv. Cheta na ọ gwara ya okwu dị ka à ga-asị na ọ chọrọ inyere ya aka. “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” ka Setan jụrụ. Mgbe ahụ o ji akọ nwaa iweda izi ihe Chineke ala site n’ịgwa Iv na ọ ga-erite uru site n’iri site n’osisi ahụ a machibidoro iwu. “N’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya,” ka Ekwensu kwere nkwa ya, “a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:​1-⁠5) Otú a a ghọgburu Iv, ee rafuo ya, banye n’inupụrụ Chineke isi.​—⁠2 Ndị Kọrint 11:3; 1 Timoti 2:​13, 14.

7. Gịnị bụworo mmetụta nke ozizi dị aghụghọ nke ndị mmụọ ọjọọ, ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka nke a na-enyekwa?

7 N’oge ndị a kwa, a rafuwo ọtụtụ ndị. Ndị mmụọ ọjọọ ejiwo oké aghụghọ kwalite mmekọahụ rụrụ arụ nke na ọ ghọwo ihe ọtụtụ ndị na-emegidebu ya na-anakwere. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onye na-ede akụkụ okwu ndụmọdụ n’akwụkwọ akụkọ na United States zara otu akwụkwọ ozi n’ihe banyere ndị na-alụghị di na nwunye inwe mmekọahụ, o dere sị: “Ọ dịbughị mgbe m chere na m ga-agbanwe nguzo m n’isiokwu a, ma ekwerewo m ugbu a na mmadụ abụọ na-echesi echiche ike ịlụ onwe ha kwesịrị ime mkpapụ ụfọdụ ná ngwụsị izu iji nwalee inwe nkwekọrịta ha.” Mgbe ahụ o kwukwasịrị: “Apụghị m ikwere na ọ bụ m dere nke ahụ!” Ọ pụghị ọbụna ikwere na ya atụwo aro maka ịkwa iko, ma ọ bụ ihe o meworo! N’ụzọ doro anya, anyị aghaghị ilezi anya ka ozizi ndị mmụọ ọjọọ ghara imetụta ụzọ anyị si ele omume ndị Chineke kagburu anya.​—⁠Ndị Rom 1:​26, 27; Ndị Efesọs 5:​5, 10-⁠12.

8. (a) Olee otú e si eji okwu ahụ bụ “ụwa” eme ihe na Bible? (b) Ònye na-achị ụwa, oleekwa otú ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị isi lee ụwa anya?

8 Anyị agaghị echezọ mgbe ọ bụla na Setan bụ “onye isi ụwa nke a.” N’ezie, Pọl onyeozi kwuru na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19) N’eziokwu, mgbe ụfọdụ Jisọs jiri okwu ahụ bụ “ụwa” na-ezo aka n’ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ nọ. (Matiu 26:13; Jọn 3:16; 12:46) Otú ọ dị, ọtụtụ ugboro karị, o jiri okwu ahụ bụ́ “ụwa” zoo aka n’ebe ọha mmadụ dum a haziri ahazi nke na-adịghị n’ime ezi ọgbakọ ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Jisọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ‘agaghị esite n’ụwa’ (ọha mmadụ na-adịghị eme ezi omume) nakwa na n’ihi na ha esiteghị n’ụwa, ụwa ga-akpọ ha asị. (Jọn 15:19; 17:14-⁠16) Bible dọkwuru anyị aka ná ntị na anyị kwesịrị izere ịbụ enyi nke ụwa nke a Setan na-achị.​—⁠Jemes 4:4.

9, 10. (a) Ihe ndị dị aṅaa nke ụwa na-akpalite ọchịchọ na-ekwesịghị ekwesị maka mmekọahụ? (b) Olee otú o si kwe omume ịmata onye na-akpata ihe ntụrụndụ nke ụwa na-akụzi?

9 Jọn onyeozi gbara ume, sị: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya.” O kwukwara, sị: “Ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa.” (1 Jọn 2:​15, 16) Chee echiche banyere nke a. Gịnị dị n’ime ụwa taa nke na-akpalite agụụ ihe ọjọọ maka, dị ka ihe atụ, mmekọahụ iwu na-akwadoghị? (1 Ndị Tesalọnaịka 4:​3-⁠5) Gịnị banyere ihe kanụ n’egwú ndị e nwere n’ụwa? Otu onye uwe ojii mgbazi olu na California sịrị: “N’ụzọ bụ isi, egwú ahụ na-akụzi na ọ dịghị mkpa na i gere ndị mụrụ gị ntị, nakwa na i kwesịrị ibi ndụ gị n’ụzọ ị chọrọ.” Ị̀ na-amata isi iyi nke nkụzi egwú dị otú ahụ na-enye?

10 Cheta na Setan, n’ụzọ bụ isi, gwara Iv, sị: ‘Ọ dị ihe na-efunahụ gị. Bie ndụ n’ụzọ ị chọrọ. Mee mkpebi ndị nke gị banyere ihe dị mma na ihe dị njọ. Ọ baghị uru na ị na-ege Chineke ntị.’ (Jenesis 3:​1-⁠5) Ọ̀ bụ na nke ahụ abụghị otu ụdị ozi ahụ a na-achọta n’ihe kanụ n’egwú ndị e nwere n’ụwa? Ma ndị mmụọ ọjọọ adịghị ezi ihe nanị site n’egwú. Ha na-ejikwa usoro ihe omume azụmahịa telivishọn, ihe nkiri sịnịma, na vidio na-akụzi ihe. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, usoro mgbasa ozi nke ụwa na-enye ntụrụndụ nke na-eme ka ozizi omume ọma nke Chineke yie ihe mmegbu. Ha na-akwado ịkwa iko site n’ikwusi okwu ike banyere ya na igosipụta ya dị ka ihe a na-achọsi ike.

11. N’ikwu n’ụzọ omume ọma, gịnị ka telivishọn na-akụzi?

11 Magazin bụ́ U.S.News & World Report kwuru, sị: “Na 1991, njikọ usoro telivishọn atọ [nke U.S.] gosipụtara ihe karịrị 10,000 mmekọahụ n’oge ọtụtụ ndị na-elekarị telivishọn; maka ọnọdụ ihe nkiri ọ bụla na-egosi ndị lụrụ di na nwunye na-enwe mmekọahụ, njikọ ndị ahụ gosiri ọnọdụ ihe nkiri 14 nke mmekọahụ n’abụghị n’ime alụmdi na nwunye.” Site n’igosi ihe karịrị 9,000 mmekọahụ iwu na-akwadoghị n’oge ndị mmadụ ji ekirikarị telivishọn n’otu afọ, gịnị ka ị ga-asị na telivishọn na-akụzi? Barry S. Sapolsky, onye so dee akụkọ ahụ bụ́ “Mmekọahụ n’Oge Ndị Mmadụ Ji Ekirikarị Telivishọn: Iji 1979 Tụnyere 1989,” kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye nọ n’oge uto ekirie TV ọtụtụ afọ ebe ndị mmadụ na-eme mgbaratụ ma ọ bụ na-enwe mmekọahụ doro anya, ọtụtụ puku onyinyo ndị a n’ọtụtụ afọ ndị ahụ ga-akụziri ha na mmekọahụ na-atọ ụtọ​—⁠na ọ dịghịkwa eweta nsogbu ọ bụla.” Ajụjụ ọ bụla adịghị banyere nke a: Ntụrụndụ ụwa na-akụziri ndị na-eto eto na e nweghị iwu ọ bụla, na a na-anakwere ịkwa iko, nakwa na e nweghị ihe ọjọọ ndị ọ bụla na-esite n’ibi ndụ n’ụzọ Chineke kagburu.​—⁠1 Ndị Kọrint 6:18; Ndị Efesọs 5:​3-⁠5.

12. N’ihi gịnị ka ntụrụndụ ụwa ji eche ihe iyi egwu n’ihu ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst?

12 A haziri egwú, sịnịma, vidio, na telivishọn ụwa ịdọrọ mmasị ndị na-eto eto. Ha na-akwado ozizi rụrụ arụ nke ndị mmụọ ọjọọ! Ma nke a ò kwesịrị ịbụ ihe ijuanya? Chee echiche banyere ya. Ọ bụrụ na okpukpe ụgha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ akụkụ nke ụwa Setan​—⁠o dokwara anya na ha bụ⁠—​ezi uche ọ̀ dị n’ikwere na ntụrụndụ nke ụwa na-akwado ga-enwere onwe ya pụọ ná mmetụta ndị mmụọ ọjọọ? Ọ dị unu ndị na-eto eto mkpa karịsịa ịnọ ná nche ka unu wee ghara “ikwe ka ụwa dị unu gburugburu kwanye unu n’ụkpụrụ nke ya onwe ya.”​—⁠Ndị Rom 12:2, The New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips.

Mee Nnyocha Onwe Onye

13. Nnyocha onwe onye dị aṅaa ka e kwesịrị ime?

13 A dịghị ekpebi okwu nke ozizi onye ị na-ege ntị site nanị n’okwu ọnụ gị kamakwa site n’ọrụ gị nile. (Ndị Rom 6:16) Ya mere jụọ onwe gị sị, ‘À na-enwe mmetụta n’akparamagwa m na ụzọ ndụ m n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị site n’ihe m na-amụta n’usoro mgbasa ozi nke okwu nrafu ụwa? Ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ hà pụrụ ịdị na-egbebata ná ndụ m?’ Iji nyere gị aka ịza ajụjụ ndị dị otú ahụ, gịnị ma i jiri oge na mgbalị ị na-etinye n’ịmụ Bible, ịga nzukọ ndị Kraịst, na ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke tụnyere oge ị na-etinye n’ikiri TV, ige egwú, ikere òkè n’egwuregwu na-amasịkarị gị, ma ọ bụ n’itinye aka n’ihe omume ndị dị otú ahụ? Ebe ọ bụ na ihe dị ukwuu​—⁠n’ezie, ndụ gị kpọmkwem⁠—​dị n’ihe ize ndụ, mee nnyocha onwe onye nke bụ eziokwu.​—⁠2 Ndị Kọrint 13:5.

14. Gịnị ga-emetụta ahụ ike ime mmụọ anyị, echiche dị aṅaa na-emetụ n’ahụ ka anyị kwesịkwara iburu n’uche?

14 Ị maara nke ọma na nri nkịtị ị na-eri ga-emetụta ahụ ike nkịtị gị. N’otu aka ahụ, ihe i ji azụ uche na obi gị na-emetụta ahụ ike ime mmụọ gị. (1 Pita 2:​1, 2) Ọ bụ ezie na ị pụrụ iduhie onwe gị banyere ihe ndị na-amasị gị n’ezie, ị pụghị iduhie Onyeikpe anyị, Jisọs Kraịst. (Jọn 5:30) Ya mere jụọ onwe gị sị, ‘Ọ bụrụ na Jisọs nọ n’ụwa, ihere ọ̀ ga-eme m ma ọ bata n’ụlọ m ma nụ egwú m ma ọ bụ hụ ihe m na-ekiri?’ Eziokwu ahụ na-emetụ n’ahụ bụ na Jisọs na-ekiri ma mara ọrụ anyị nile.​—⁠Mkpugge 3:15.

Gụzogide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ

15. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji lụsie ọgụ ike iji guzogide ozizi ndị mmụọ ọjọọ?

15 Nrụgide ndị mmụọ ọjọọ na-arụgide ndị na-eto eto ịṅa ntị n’ozizi ha dị ukwuu. Ndị mmụọ ọjọọ ndị a yiri ka ha na-enye ndụ nke ime onwe onye ihe ụtọ ugbu a​—⁠nke inwe ọṅụ na ihe ụtọ. Iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, Mosis oge ochie jụrụ “ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge” dị ka onye òtù a ma ama nke ezinụlọ Fero. (Ndị Hibru 11:​24-⁠27) Ọ dịghị mfe ịjụ ihe ndị mmụọ ọjọọ na-enye, ya mere ị ghaghị ịlụsi ọgụ ike iji mee ihe ziri ezi. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’ihi na anyị eketawo mmehie, obi anyị na-achọkwa mgbe mgbe ime ihe ọjọọ. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 5:12) N’ihi ọchịchọ ime mmehie, ọbụna Pọl onyeozi aghaghị imesi onwe ya ike ma ghara ikwe ka ọchịchọ anụ ahụ chịa ya.​—⁠1 Ndị Kọrint 9:27; Ndị Rom 7:​21-⁠23.

16. Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi guzogide nrụgide nile nke itinye aka n’omume rụrụ arụ?

16 Ọ bụ ezie na a pụrụ ịnwa gị ‘iso ìgwè mmadụ tinye aka n’ihe ọjọọ,’ Chineke pụrụ inyere gị aka iguzogide nrụgide ndị na-esite n’aka ndị ọgbọ gị ịgbaso ụzọ ọjọọ. (Ọpụpụ 23:2; 1 Ndị Kọrint 10:13) Ma ị ghaghị ịṅa ntị ná ntụzi Chineke, na-ewere okwu ya nile akpọrọ ihe dị oké ọnụ ahịa n’obi gị. (Abụ Ọma 119:​9, 11) Ọ dị gị mkpa ịghọta na mgbe ndị na-eto eto kpapụrụ onwe ha iche, ọchịchọ mmekọahụ pụrụ ịrị elu ma duba n’imebi iwu Chineke. “Mgbe mụ na enyi m nwoke nọ nanị anyị, ahụ m na-achọ ime otu ihe ma ụbụrụ m na-agwa m ka m mee ihe ọzọ,” ka otu onye ntorobịa kwetara. Ya mere mata ebe ike gị ruru ma ghọta na obi dị aghụghọ. (Jeremaịa 17:9) Akpapụla onwe gị iche. (Ilu 18:1) Kpaa ókè ná ngosipụta nke ịhụnanya. Nke dịkwa oké mkpa, na-eso ndị hụrụ Jehova n’anya na ndị nwere nkwanye ùgwù miri emi maka iwu ya nile na-akpachi anya.​—⁠Abụ Ọma 119:63; Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33.

17. Gịnị pụrụ inyere ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst aka inweta ume iji guzogide ozizi ndị mmụọ ọjọọ?

17 Ihe ọmụmụ e ji nlezianya mee nke akwụkwọ dị iche iche nke ndị Kraịst a haziri maka ịgba gị ume n’ụzọ ime mmụọ ga-enyere gị aka. Dị ka ihe atụ, tụlee akwụkwọ bụ́ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gị​—⁠Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya na isiakwụkwọ bụ́ “Ịgba Mgba nke Ime Ihe Ziri Ezi” n’akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Kwee ka ntụziaka Akwụkwọ Nsọ e wepụtara bamie n’ime uche na obi gị, ọ ga-agbakwa gị ume. Otu ihe bụ eziokwu ị na-agaghị echefu mgbe ọ bụla bụ na n’ụwa nke a ndị mmụọ ọjọọ na-achịkwa ime ihe ziri ezi adịghị mfe. Ya mere lụsie ọgụ ike. (Luk 13:24) Wulite ike ime mmụọ gị. Eṅomila ndị na-adịghị ike, ndị na-atụ egwu, bụ́ ndị na-agbaso ìgwè mmadụ.

Rite Uru Site n’Izi Ihe Chineke

18. Gịnị bụ abamuru ụfọdụ nke ịṅa izi ihe Chineke ntị?

18 Chetakwa na ọ dịghị mgbe ihe ọ bụla bara uru ga-efunahụ gị n’ihi ịṅa ntị n’izi ihe Jehova. Ọ hụrụ gị n’anya n’ezie, ọ bụkwa n’ihi ya ka o ji “na-ezi gị ime ihe na-aba uru.” (Aịsaịa 48:17) Ya mere ṅaa ntị n’izi ihe Jehova ma zere obi mgbu nke akọ na uche e merụrụ emerụ, mfu nke ùgwù onwe onye, afọ ime a na-achọghị, ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, ma ọ bụ ihe ọghọm ndị yiri ha. Jehova na-aṅụrị ọṅụ mgbe ndị na-ejere ya ozi nyere ya azịza maka ihe ịma aka Setan nke na ụmụ mmadụ agaghị ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’okpuru ule. (Job 1:​6-⁠12) Ọ bụrụ na i mee ka obi Jehova ṅụrịa site n’ikwesị ntụkwasị obi nye ya, ị ga-alanarị mgbe ọ ga-ama ụwa a ikpe, ebe ndị nile na-elelị iwu ya ga-ala n’iyi.​—⁠Ilu 27:11; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 1 Jọn 2:17.

19. Gịnị bụ abamuru nke iso ndị nwere ekele maka abamuru nile nke izi ihe Jehova na-akpakọrịta?

19 Ọ bụrụ na i soro ndị nwere ekele maka ihe Jehova mewooro ha na-akpachi anya, ị pụrụ ịmụta ihe site n’ahụmahụ ha. Otu onye nke ọgwụ ọjọọ rịburu ahụ na onye na-eme omume rụrụ arụ kọwara, sị: “À sị na mụ egeghị Jehova ntị, m gaara anwụwo. Onye m gaara alụ nwụrụ site n’ọrịa AIDS. Ndị ụwa nile mụ na ha na-akpachibu anya anwụwo site n’ọrịa AIDS ma ọ bụ na-achọ ịnwụ. M na-ahụ ha ọtụtụ mgbe n’okporo ámá, m na-ekelekwa Jehova kwa ụbọchị maka iwu ya nile ndị na-achịkwa ndị ya na ndị ga-eme ka anyị nọgide na-adị nsọ ma ọ bụrụ na anyị etinye ha n’ọrụ. Enwebeghị m obi ụtọ, afọ ojuju, na ịnọ ná ntụkwasị obi ná ndụ m otú a na mbụ.” N’eziokwu, ịṅa ntị n’izi ihe Jehova na-abara anyị uru mgbe nile!

Mee Nhọrọ nke Ziri Ezi

20, 21. (a) Nhọrọ abụọ dị aṅaa ka ndị ntorobịa nwere? (b) Abamuru dị aṅaa na-adịgide adịgide ga-abịa site n’ịṅa izi ihe Chineke ntị?

20 Anyị na-agba unu ndị na-eto eto ume, sị: Mee nhọrọ nke ziri ezi site n’ijere Jehova ozi. Mgbe ahụ kpebisie ike ịrapagide ná mkpebi ahụ. (Joshua 24:15) N’ezie, ị pụrụ ime nanị otu n’ime nhọrọ ndị ahụ. Jisọs sịrị na e nwere ụzọ nke dị warawara dịkwa obosara​—⁠nke dị mfe isi mee ihe na-atọ onwe onye ụtọ. Ụzọ ahụ na-eduba n’ọnwụ, ná mbibi. Ụzọ nke ọzọ dị mkpagide. Ọ bụ ụzọ siri ike isi mee njem n’ụwa nke a nke ibi ndụ rụrụ arụ, nke ndị mmụọ ọjọọ na-achịkwa. Ma ụzọ ahụ ga-emesịa duba ndị na-eso ya n’ụwa ọhụrụ Chineke nke dị ebube. (Matiu 7:​13, 14) Olee ụzọ nke ị ga-eso? Ozizi ònye ka ị ga-aṅa ntị?

21 Jehova na-ahapụrụ anyị nhọrọ ahụ ime. Ọ dịghị anwa ịmanye anyị ijere ya ozi. “Ndụ na ọnwụ . . . ka m tinyeworo n’ihu gị,” ka onye amụma Chineke bụ́ Mosis kwuru, na-agba ume: “Gị họrọkwa ndụ.” A na-eme nhọrọ nke a ‘site n’ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu ya, na ịrapara n’ahụ ya.’ (Deuterọnọmi 29:2; 30:19, 20) Ka i jiri amamihe họrọ ịṅa izi ihe Chineke ntị ma nụ ụtọ ndụ na-enweghị ọgwụgwụ n’ụwa ọhụrụ Chineke nke dị ebube.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Olee ndị bụ ndị mmụọ ọjọọ, gịnịkwa ka ha na-akụzi?

◻ Olee otú ndị mmụọ ọjọọ si akwalite ozizi ha taa?

◻ Olee otú o si ekwe omume iguzogide ozizi ndị mmụọ ọjọọ?

◻ Gịnị bụ abamuru ndị dị n’ịṅa ntị n’izi ihe Jehova?

[Foto dị na peeji nke 16]

Tupu Iju Mmiri ahụ, ndị mmụọ ozi nupụrụ isi na ụmụ ha kwalitere ime ihe ike na omume retọrọ eretọ

[Foto dị na peeji nke 18]

Ihere ọ̀ ga-eme gị ma ọ bụrụ na Jisọs anụ egwú na-amasịkarị gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya