Mee Ka Ozizi Na-enye Ezi Ndụ Bụrụ Ụzọ Ndụ Gị
“Nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile.”—1 TIMOTI 4:8.
1, 2. Ruo ókè hà aṅaa ka ndị mmadụ na-egosi nchegbu maka ahụ ike ha, gịnịkwa ka ọ na-arụpụta?
IHE ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ga-ekwenye ozugbo na ezi ahụ ike bụ otu n’ime ihe onwunwe ndị kasị dị oké ọnụ ahịa ná ndụ. Ha na-etinye oge na ego dị ukwuu n’ịhụ na ha nọgidere n’ahụ ike anụ ahụ na n’ijide n’aka na ha nwetara nlekọta ọgwụ na ahụ ike kwesịrị ekwesị mgbe ọ dị ha mkpa. Dị ka ihe atụ, na United States, ihe nlekọta ahụ ike were n’otu afọ na-adịbeghị anya gara aga karịrị $900 ijeri. Nke ahụ gbakọtara ihe karịrị nnọọ $3,000 kwa afọ maka nwoke, nwanyị, na nwatakịrị ọ bụla ná mba ahụ, ihe ọ na-ewekwa maka onye ọ bụla ná mba ndị ọzọ mepere emepe adịkebeghịkwa ala karị.
2 Gịnị ka mmefu a dum n’oge, ume, na ego wetaworo? N’ezie ọ dịghị onye ga-agọnahụ na, n’ozuzu ya, anyị nwere ihe nlekọta ahụ ike kasị bụrụ ọgbara ọhụrụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme. Ma, nke a adịghị apụta kpọmkwem ibi ndụ ezi ahụ ike. N’ezie, n’otu okwu na-esetịpụ usoro ihe omume e mere atụmatụ ya maka nlekọta ahụ ike na United States, onye isi ala gosipụtara na tinyere “ajọ mfu nke ime ihe ike ná mba a,” ndị bi na United States “nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ka elu nke ọrịa AIDS, nke ise sịga na ịṅụbiga mmanya ókè, nke ntụrụ ime ndị nọ n’agbata afọ ndụ iri na atọ na iri na itoolu, nke ịmụ ụmụ na-adịrughị arọ otú kwesịrị” karịa mba ọ bụla ọzọ mepere emepe. Gịnị bụ nkwubi okwu ya? “Anyị aghaghị ịgbanwe ụzọ anyị nile ma ọ bụrụ na anyị chọrọ n’ezie inwe ahụ ike dị ka otu ndị.”—Ndị Galetia 6:7, 8.
Ụzọ Ndụ Na-enye Ahụ Ike
3. N’iburu ọdịnala ndị Gris oge ochie n’uche, ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere?
3 Na narị afọ mbụ, a ma ndị Gris ama maka uche ha mikpuru n’ịkwalite ọdịnala ọdịdị ahụ, ịfụli uru ahụ, na ịsọ mpi mmega ahụ. Site n’iburu ọnọdụ nke a n’uche, e nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ idegara nwa okoro ahụ bụ́ Timoti akwụkwọ, sị: “Ọnwụnwa nke ahụ bara uru nye ihe nta; ma nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Otú a, Pọl na-egosipụta ihe ndị mmadụ taa na-amalite ịghọta, ya bụ, na ndokwa nlekọta ọgwụ na ahụ ike ma ọ bụ ọdịdị ahụ adịghị eme ka e jide n’aka ezi ụzọ ndụ nke na-enye ahụ ike. Ma, Pọl na-ekwe anyị nkwa na ihe a na-apụghị iji gwurie egwu bụ ịzụlite ahụ ịdị mma n’ime mmụọ na nsọpụrụ Chineke.
4. Gịnị bụ abamuru ụfọdụ nke nsọpụrụ Chineke?
4 Ụzọ dị otú ahụ bara uru maka “ndụ ugbu a” n’ihi na ọ na-enye nchebe megide ihe nile na-emerụ ahụ nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ma ọ bụ ndị nwere nanị “ụdị [ma ọ bụ, ọdịdị] nke nsọpụrụ Chineke,” na-ewetara onwe ha. (2 Timoti 3:5; Ilu 23:29, 30; Luk 15:11-16; 1 Ndị Kọrint 6:18; 1 Timoti 6:9, 10) Ndị kwere ka nsọpụrụ Chineke kpụzie ndụ ha nwere nkwanye ùgwù na-enye ezi ndụ maka iwu na ihe nile Chineke chọrọ n’aka mmadụ, nke ahụ na-akwalikwa ha ime ozizi na-enye ezi ndụ nke Chineke ụzọ ndụ ha. Ụzọ dị otú ahụ na-ewetara ha ahụ ike, afọ ojuju, na obi ụtọ ime mmụọ na nke anụ ahụ. Ha ‘na-akpadokwara onwe ha ntọala ọma nye oge gaje ịbịa, ka ha wee jide ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.’—1 Timoti 6:19.
5. Ntụziaka dịgasị aṅaa ka Pọl nyere n’isi nke abụọ nke akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs?
5 Ebe ọ bụ na ndụ nke ozizi na-enye ezi ndụ nke Chineke na-eduzi na-eweta ngọzi ndị dị otú ahụ ugbu a na n’ọdịnihu, ọ dị anyị mkpa ịmara, n’ụzọ a pụrụ ime eme, ụzọ anyị pụrụ isi mee ozizi na-enye ezi ndụ nke Chineke ụzọ ndụ anyị. Pọl onyeozi nyere azịza ya n’akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs. Anyị ga-arịba isi nke abụọ nke akwụkwọ ahụ ama n’ụzọ pụrụ iche, bụ́ ebe o nyere Taịtọs ntụziaka ka ọ “na-ekwu ihe nile kwesịrị ozizi ahụ nke na-enye ezi ndụ.” N’ezie anyị nile, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị, pụrụ irite uru site ‘n’ozizi na-enye ezi ndụ’ dị otú ahụ taa.—Taịtọs 1:4, 5; 2:1.
Ndụmọdụ Maka Agadi Ndị ikom
6. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere maka “agadi ndị ikom,” n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ihe obi ọma n’ebe ọ nọ ime otú ahụ?
6 Na mbụ, Pọl nwere ndụmọdụ maka agadi ndị ikom nọ n’ọgbakọ ahụ. Biko gụọ Taịtọs 2:2. “Agadi ndị ikom,” dị ka otu ìgwè bụ ndị a na-asọpụrụ ma na-elegara anya dị ka ihe nlereanya nke okwukwe na iguzosi ike n’ihe. (Levitikọs 19:32; Ilu 16:31) N’ihi nke a, ndị ọzọ pụrụ ịla azụ inye agadi ndị ikom ndụmọdụ ma ọ bụ aro ụfọdụ n’okwu ndị na-esichaghị ike. (Job 32:6, 7; 1 Timoti 5:1) Ya mere, ọ bụ ihe obi ọma n’akụkụ nke Pọl ibu ụzọ gwa agadi ndị ikom okwu, ọ ga-adịkwara ha mma iburu okwu Pọl n’obi na ijide n’aka na ha, dị ka Pọl, kwesịrị nṅomi.—1 Ndị Kọrint 11:1; Ndị Filipaị 3:17.
7, 8. (a) Gịnị ka ‘inwe anya udo’ gụnyere? (b) N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji jiri “uche zuru okè” debe “iji ihe akpọrọ ihe” ná nhazi?
7 Agadi ndị ikom bụ́ ndị Kraịst, na nke mbụ ya, ‘ga-enwe anya udo.’ Ọ bụ ezie na okwu mbụ e ji mee ihe pụrụ izo aka n’àgwà ịṅụ mmanya (“inwe anya doro edo,” Kingdom Interlinear), ọ pụtakwara ịnọ na nche, inwe isi zuru okè, ma ọ bụ ịmụrụ anya. (2 Timoti 4:5; 1 Pita 1:13) Otú a, ma ọ̀ bụ n’ịṅụ mmanya ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ, agadi ndị ikom aghaghị inwe anya udo, ọ bụghị na-emefe ihe ma ọ bụ na-agabiga ókè.
8 E mesịa, ha ‘ga na-eji ihe akpọrọ ihe’ ma “nwee uche zuru okè.” Iji ihe na-akpọrọ ihe, ikwesị ịkwanyere ùgwù, na ikwesị nsọpụrụ, na-esokarị imewanye okenye. Otú ọ dị, ụfọdụ pụrụ inwe àgwà nke iji ihe a kpọrọ ihe gabiga ókè, ghara ịdị na-anakwere ụzọ imesi ihe ike nke ndị ntorobịa. (Ilu 20:29) Ọ bụ ya mere a na-eji “uche zuru okè” na-edebe “iji ihe akpọrọ ihe” ná nhazi. Ọ dị agadi ndị ikom mkpa ịnọgide na-eji ihe akpọrọ ihe n’ụzọ kwekọrọ n’afọ ndụ ha, ma n’otu oge ahụ nọrọ n’ezi nhazi, na-enwe nchịkwa zuru ezu nke mmetụta na mkpali ha nile.
9. N’ihi gịnị ka agadi ndị ikom na-aghaghị iji nwee ezi ahụ ike n’okwukwe na ịhụnanya na karịsịa ná ntachi obi?
9 N’ikpeazụ, agadi ndị ikom gaje ‘inwe ezi ndụ n’ime okwukwe anyị, n’ime ịhụnanya, n’ime ntachi obi.’ Ọtụtụ mgbe n’ihe ndị o dere, Pọl depụtakọrọ okwukwe na ịhụnanya ha na olileanya. (1 Ndị Kọrint 13:13; 1 Ndị Tesalọnaịka 1:3; 5:8) N’ebe a o ji “ntachi obi” dochie “olileanya.” Ma eleghị ya ọ bụ n’ihi na ọ pụrụ ịdị mfe mmetụta nke obi nkoropụ isochi ịkawanye nká. (Eklisiastis 12:1) Otú ọ dị, dị ka Jisọs gosipụtara, “onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ọzọkwa, agadi ndị ikom bụ ndị kwesịrị ilereanya nye ndị ọzọ ọ bụghị nanị n’ihi afọ ndụ ha ma ọ bụ ahụmahụ kama n’ihi àgwà ime mmụọ ha ndị bara ụba—okwukwe, ịhụnanya, na ntachi obi.
Maka Agadi Ndị Inyom
10. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere maka “agadi ndị inyom” nọ n’ime ọgbakọ?
10 Pọl cheziri agadi ndị inyom nọ n’ọgbakọ ihu. Biko gụọ Taịtọs 2:3. “Agadi ndị inyom” bụ ndị meworo okenye karị n’etiti ụmụ nwanyị n’ọgbakọ, gụnyere ndị nwunye “agadi ndị ikom” na nne na nne ochie nke ndị ọzọ nọ na ya. N’ihi ya, ha pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu, maka ihe ọma ma ọ bụ maka ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere Pọl ji jiri “otú ahụ” malite okwu ya, na-apụta na “agadi ndị inyom” nwekwara ibu ọrụ ụfọdụ ha kwesịrị ilekọta iji mezuo òkè ha n’ime ọgbakọ.
11. Gịnị bụ omume dị nsọ?
11 Nke mbụ, “ka agadi ndị inyom dị nsọ n’omume ha,” ka Pọl kwuru. “Omume” bụ ngosipụta a na-ahụ anya nke àgwà na ọdịdị ime mmadụ, dị ka e gosipụtara ya n’akparamagwa na ọdịdị ile anya. (Matiu 12:34, 35) Mgbe ahụ, gịnị kwesịrị ịbụ àgwà ma ọ bụ ọdịdị nke agadi inyom bụ́ onye Kraịst? Ná nchịkọta, ‘ịdị nsọ.’ A sụgharịtara nke a site n’okwu Grik nke pụtara “ihe nke kwesịrị ekwesị n’ime ndị mmadụ, omume ma ọ bụ ihe e doro nsọ nye Chineke.” Nke a bụ n’ezie ndụmọdụ kwesịrị ekwesị n’ihi mmetụta ha na-enwe n’ahụ ndị ọzọ, karịsịa n’ahụ ndị inyom bụ ụmụ agbọghọ karị n’ọgbakọ.—1 Timoti 2:9, 10.
12. Iji ire eme ihe n’ụzọ dị aṅaa na-ezighị ezi ka mmadụ nile kwesịrị izere?
12 Ihe na-eso bụ ihe abụọ na-adịghị mma: “ghara ịbụ ndị na-ebo ebubo ụgha, gharakwa ịbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya ókè.” Ọ na-akpali mmasị na e jikọrọ abụọ ndị a ọnụ. “N’oge ochie, mgbe mmanya bụ ihe ọṅụṅụ e nwere nanị ya,” ka Professor E. F. Scott na-ekwu, “ọ bụ ná nnọkọ oriri ha ndị dị nta ka agadi ndị inyom na-akatọsị ụdị mmadụ nke ndị agbata obi ha.” Ụmụ nwanyị na-enwekarị nchegbu banyere ndị mmadụ karịa ụmụ nwoke, bụ́ ihe kwesịrị ịja mma. Ma, nchegbu pụrụ iretọ banye n’ịgba àsị̀rị̀ na ọbụna nkwutọ, karịsịa mgbe mmanya mere ka ire nwere onwe ya. (Ilu 23:33) N’ezie, ndị nile na-agbaso ụzọ ndụ nke na-enye ezi ndụ, ndị ikom na ndị inyom, ga-eme nke ọma ịkpachara anya maka ọnyá nke a.
13. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka agadi ndị inyom pụrụ isi bụrụ ndị na-ezi ihe?
13 Maka ụzọ bara uru isi jiri oge e nwere mee ihe, a gbara agadi ndị inyom ume “ka ha bụrụ ndị na-ezi ihe ọma.” N’ebe ọzọ, Pọl nyere ntụziaka doro anya na ụmụ nwanyị ekwesịghị ịbụ ndị nkụzi n’ime ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 14:34; 1 Timoti 2:12) Otú ọ dị, nke a adịghị egbochi ha inye ezinụlọ ha na ọha mmadụ ihe ọmụma dị oké ọnụ ahịa nke Chineke. (2 Timoti 1:5; 3:14, 15) Ha pụkwara ịrụzu ihe ọma dị ukwuu site n’ihe nlereanya ha nke ndị Kraịst nye ndị inyom bụ ụmụ agbọghọ n’ọgbakọ, dị ka amaokwu ndị na-esonụ na-egosi.
Maka Ụmụ Agbọghọ
14. Olee otú ụmụ agbọghọ bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi gosi ezi nhazi n’ilekọta ọrụ ha dị iche iche?
14 N’ịgba agadi ndị inyom ume ka ha “bụrụ ndị na-ezi ihe ọma,” Pọl kpọtụrụ ụmụ agbọghọ aha kpọmkwem. Biko gụọ Taịtọs 2:4, 5. Ọ bụ eziokwu na ihe ka ukwuu nke ntụziaka ahụ dabeere n’ihe ndị a na-eme n’ụlọ, ụmụ agbọghọ bụ́ ndị Kraịst agaghị emefe ihe ókè, na-ekwere ka nchegbu ihe ndị a na-ahụ anya chịa ndụ ha. Kama nke ahụ, ha ‘ga-enwe uche zuru okè, dị ọcha, bụrụ ndị ezi mmadụ,’ karịsịakwa ihe nile, dịrị njikere ịkwado ndokwa ịbụ isi nke ndị Kraịst, “ka e wee ghara ikwulu okwu Chineke.”
15. N’ihi gịnị ka a ga-eji ịja ọtụtụ ụmụ agbọghọ n’ọgbakọ mma?
15 Taa, ọnọdụ ezinụlọ agbanwewo nke ukwuu site n’ihe ọ bụ n’ụbọchị Pọl. E kewara ọtụtụ ezinụlọ ekewa n’ihe banyere okwukwe, ndị ọzọ nwekwara nanị nne ma ọ bụ nanị nna. Ọbụna n’ezinụlọ nke a na-asị na o zuru ezu, nwunye ma ọ bụ nne bụ onye ji oge nile na-edozi ụlọ na-aghọwanye ihe dị ụkọ. Ihe a dum na-atụkwasị ụmụ agbọghọ bụ́ ndị Kraịst oké nrụgide na ibu ọrụ, ma nke a adịghị eme ka ha nwere onwe ha pụọ n’ibu ọrụ ha dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ. Ya mere, ọ bụ ihe oké obi ụtọ ịhụ ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-ekwesị ntụkwasị obi ka ha na-arụsi ọrụ ike ihazi ọtụtụ ọrụ ha dị iche iche ma nọgide na-agbalị idebe ọdịmma nile nke Alaeze n’ọnọdụ mbụ, ụfọdụ ọbụna na-anọ n’ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ nke oge nile. (Matiu 6:33) Ha kwesịrị ịja mma n’ezie!
Maka Ụmụ Okorobịa
16. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nwere maka ụmụ okorobịa, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji kwesị oge ya?
16 Pọl cheziri ụmụ okorobịa ihu, gụnyere Taịtọs. Biko gụọ Taịtọs 2:6-8. N’ihi ụzọ ejighị ihe kpọrọ ihe na nke mbibi nke ndị ntorobịa taa—ise sịga, iji ọgwụ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, mmekọahụ na-ezighị ezi, na nchụso ndị ọzọ nke ụwa, dị ka egwuregwu ndị ara na egwú na ntụrụndụ rụrụ arụ—nke a bụ n’ezie okwu ndụmọdụ kwesịrị oge ya maka ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị chọrọ ịgbaso ụzọ ndụ nke na-enye ezi ndụ na nke na-eju afọ.
17. Olee otú nwa okorobịa pụrụ isi “nwee uche zuru okè” bụrụkwa “ihe atụ nke ọrụ ọma”?
17 N’adịghị ka ndị ntorobịa nke ụwa, okorobịa bụ́ onye Kraịst kwesịrị ‘inwe uche zuru okè,’ na-abụkwa ‘ihe atụ nke ọrụ ọma.’ Pọl kọwara na ọ bụghị ndị na-amụ ihe nanị, kama ndị “a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ,” na-enweta uche zuru okè na nke onye tozuru okè. (Ndị Hibru 5:14) Lee ka o si dị ebube ịhụ ndị na-eto eto ka ha na-enye oge na ume ha n’afọ ofufo iji kere òkè zuru ezu n’ọtụtụ ọrụ ndị dị n’ọgbakọ ndị Kraịst, kama ịdị na-emefusị ume ntorobịa ha ná nchụso dị iche iche nke ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị! Site n’ime otú ahụ, ha, dị ka Taịtọs, pụrụ ịghọ ihe ilereanya nke “ọrụ ọma” n’ọgbakọ ndị Kraịst.—1 Timoti 4:12.
18. Gịnị ka emebighị emebi n’ozizi, ime ihe n’iji ihe akpọrọ ihe, na okwu ọnụ ịbụ nke na-enye ezi ndụ pụtara?
18 E chetaara ụmụ okorobịa na ha kwesịrị ịdị ‘na-egosi emebighị emebi n’ime ozizi ha, ikwesị nsọpụrụ, okwu nke na-enye ezi ndụ, nke a na-apụghị ịma ikpe.’ Ozizi nke ‘a na-emebighị emebi’ aghaghị ịdaberesi ike n’Okwu Chineke; ya mere, ụmụ okorobịa aghaghị ịbụ ndị mmụta dị uchu nke Bible. Dị ka agadi ndị ikom, ụmụ okorobịa ga-ejikwa ihe na-akpọrọ ihe. Ọ dị ha mkpa ịghọta na ịbụ onye ozi nke Okwu Chineke bụ ibu ọrụ siri ike, n’ihi ya kwa ha aghaghị ‘ịdị na-ebi obi n’ụzọ kwesịrị ozi ọma ahụ.’ (Ndị Filipaị 1:27) N’otu aka ahụ okwu ọnụ ha aghaghị ‘ịdị na-enye ezi ndụ’ nke na ‘a pụghị ịma ya ikpe’ ka ha ghara inye ihe ọ bụla mere ndị na-emegide emegide ga-eji mee mkpesa.—2 Ndị Kọrint 6:3; 1 Pita 2:12, 15.
Maka Ndị Ohu na Ndị Oje Ozi
19, 20. Olee otú ndị na-arụrụ ndị ọzọ ọrụ pụrụ isi “chọọ ozizi nke Onye nzọpụta anyị Chineke mma”?
19 N’ikpeazụ, Pọl chere ndị ndị ọzọ were n’ọrụ ihu. Biko gụọ Taịtọs 2:9, 10. Ọtụtụ n’ime anyị taa abụghị ndị ohu ma ọ bụ ndị oje ozi, ma ọtụtụ bụ ndị e were n’ọrụ na ndị ọrụ na-ejere ndị ọzọ ozi. N’ihi ya, ụkpụrụ ndị Pọl depụtara bakwara nnọọ uru taa.
20 ‘Ido onwe ha n’okpuru ndị nwe ha n’ihe nile’ pụtara na ndị Kraịst e were n’ọrụ aghaghị ịkwanyere ndị were ha n’ọrụ na ndị nlekọta ọrụ ha ezigbo ùgwù. (Ndị Kọlọsi 3:22) Ha aghaghịkwa ịbụ ndị a ma ama dị ka ndị ọrụ na-akwụwa aka ọtọ, na-etinye ọrụ ụbọchị zuru ezu dị ka ihe ruuru onye were ha n’ọrụ. Ha aghaghịkwa ijigide ụkpụrụ dị elu nke akparamagwa ndị Kraịst n’ebe ọrụ ha n’agbanyeghị omume nke ndị ọzọ n’ebe ahụ. Ihe a dum bụ “ka ha wee chọọ ozizi nke Onye nzọpụta anyị Chineke mma n’ihe nile.” Lee ka anyị si anụ ọtụtụ mgbe ihe obi ụtọ a na-arụpụta mgbe ndị na-ekiri ihe na-emenụ zaghachiri nke ọma n’eziokwu ahụ n’ihi ezi akparamagwa nke Ndịàmà ha na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ndị ha were n’ọrụ! Nke a bụ ụgwọ ọrụ nke Jehova na-enye ndị na-agbaso ozizi na-enye ezi ndụ ọbụna n’ebe ọrụ ha.—Ndị Efesọs 6:7, 8.
Ndị E Mere Ka Ha Dị Ọcha
21. N’ihi gịnị ka Jehova ji wepụta ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, oleekwa otú anyị kwesịrị isi zaghachi?
21 Ozizi na-enye ezi ndụ nke Pọl kọwaruru ala abụghị nanị usoro iwu nke ụkpụrụ akparamagwa ma ọ bụ echiche omume ọma dị iche iche nke anyị pụrụ ile anya na ya otú anyị chọrọ. Pọl gara n’ihu ịkọwa nzube ya. Biko gụọ Taịtọs 2:11, 12. Site n’ịhụnanya na amara ya na-erughịrị mmadụ n’ebe anyị nọ, Jehova Chineke ewepụtawo ozizi na-enye ezi ndụ ka anyị wee mụta ibi ndụ nwere nzube na nke na-eju afọ n’oge ndị a dị oké egwu ma dị ize ndụ. Ị̀ dị njikere ịnakwere na ime ozizi na-enye ezi ndụ ụzọ nke ndụ gị? Ime otú ahụ ga-apụtara gị nzọpụta.
22, 23. Ngọzi ndị dị aṅaa ka anyị na-erite site n’ime ozizi na-enye ezi ndụ ụzọ nke ndụ anyị?
22 Karịa nke ahụ, ime ozizi ahụ na-enye ezi ndụ ụzọ ndụ anyị na-ewetara anyị ihe ùgwù pụrụ iche ugbu a na olileanya obi ụtọ maka ọdịnihu. Biko gụọ Taịtọs 2:13, 14. N’ezie, ime ozizi ahụ na-enye ezi ndụ ụzọ ndụ anyị na-esetịpụ anyị iche pụọ n’ụwa a rere ure na nke na-anwụ anwụ dị ka ndị e mere ka ha dị ọcha. Okwu Pọl kwekọrọ n’ihe ncheta Mosis nyere ụmụ Israel na Saịnaị: “Jehova . . . ga-emekwa gị ka ị kachasịa mba nile O meworo elu, ịbụ otuto, ịbụkwa aha, ịbụkwa ihe mara mma; ka i wee bụrụkwara Jehova, bụ́ Chineke gị, ndị nsọ, dị ka O kwuworo.”—Deuterọnọmi 26:18, 19.
23 Ka anyị chebe ihe ùgwù nke ndị Jehova e mere ka ha dị ọcha site n’ime ozizi na-enye ezi ndụ ụzọ nke ndụ anyị! Na-amụ anya mgbe nile ịjụ ụdị ọ bụla nke asọpụrụghị Chineke na agụụ nile nke ụwa, si otú ahụ na-anọgide na-adị ọcha ma kwesị ekwesị ka Jehova jiri anyị na-eme ihe n’ọrụ dị ebube nke ọ na-ahụ na a na-arụ taa.—Ndị Kọlọsi 1:10.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka nsọpụrụ Chineke ji baa uru nye ihe nile?
◻ Olee otú agadi ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi gbasoo ozizi na-enye ezi ndụ dị ka ụzọ nke ndụ?
◻ Ozizi dị aṅaa na-enye ezi ndụ ka Pọl nwere maka ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ n’ime ọgbakọ?
◻ Ihe ùgwù na ngọzi dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta ma ọ bụrụ na anyị emee ozizi na-enye ezi ndụ ụzọ nke ndụ anyị?
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ọtụtụ ndị taa na-etinye ndụmọdụ dị na Taịtọs 2:2-4 n’ọrụ