N’ihi Gịnị Ka Ndịàmà Ji Nọgide Na-abịa?
‘HA ABỊAKWALA ọzọ! Ma ha bịara ebe a nanị izu ole na ole gara aga!’ Nke ahụ ọ̀ na-agagharị n’uche gị mgbe otu onye n’ime Ndịàmà Jehova bịara ná nke gị? Ndịàmà Jehova na-eleta ọtụtụ nde taa mgbe nile. Ị pụrụ ịjụ, Gịnị mere ha ji nọgide na-abịa ebe ha maara na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nwere okpukpe nke ha ma ọ bụ enweghị mmasị? Ajụjụ ahụ kwesịrị ọzịza.
Ibu Ọrụ n’Ebe Chineke Nọ
Ndịàmà Jehova amụtawo site n’Akwụkwo Nsọ na kemgbe 1914, afọ ahụ Agha Ụwa nke Mbụ malitere, ihe na-eme n’ụwa anọwo na-emezu amụma dị iche iche nke Bible banyere ọgwụgwụ nke usoro ụwa nke dị ugbu a na ọchịchị Alaeze Chineke na-abịanụ n’elu ụwa nke a. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ nke ime ihe ike, mwụfu ọbara, na ịkpọ asị yiri ka o mewo ka aka ihe a kpọrọ mmadụ ghara iru ná ngwọta ndọrọ ndọrọ ọchịchị nye nsogbu ha karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Agha dị iche iche na iyi egwu nke ka na-eti ezinụlọ mmadụ ihe otiti bụ ihe na-egosi na ịchịisi mmadụ adawo ada ịgbanwe obi, uche, na omume ndị mmadụ. Ọnụma ndị gbaworo mkpọrọgwụ banyere ihe ndị mere n’oge gara aga ka na-emebi mmekọrịta dị n’etiti ebo, agbụrụ, na òtù okpukpe dị iche iche. Nke ahụ bụ eziokwu n’akụkụ ndị tiwasịworo etiwasị dị ka Afghanistan, Ebe Ugwu Ireland, Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ, India, South Africa, na ebe bụbu Yugoslavia. Mgbe ahụ, gịnị bụ nanị ngwọta na-adịgide adịgide?
Gịnị Na-akpali Ndịàmà?
Ndịàmà Jehova ghọtara na ngwọta Chineke—ọchịchị Alaeze site n’aka Kraịst Jisọs nke o kwere ná nkwa—bụ nanị ihe ngwọta dị irè. Jisọs ọbụna gụnyere arịrịọ maka ọchịchị Alaeze ahụ n’ekpere ihe atụ ya a ma ama: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” Ndịàmà kwenyere na ekpere a n’ezie na-arịọ maka ntinye aka Chineke n’ihe omume nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Matiu 6:9, 10.
Ya mere n’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova na-eji enwe mkpa mgbe nile ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ iji gbalịa izi ozi ahụ? N’ihi iwu abụọ nke Jisọs mere ka ọ pụta ìhè: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu. Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Matiu 22:37-39.
Ndịàmà chọrọ inwetara onwe ha ngọzi Chineke, ebe ọ bụkwa na ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya, ha chọkwara ka ha nweta otu ụdị ngọzi ahụ. Otú a, n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị na-arụgide ha ije leta ndị agbata obi ha. Ha chọrọ ọ dịkarịa nta inye ha ohere nke ịmara ihe “Chineke dị ngọzi” kweworo ná nkwa maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’elu ala e mere ka ọ dị ọcha.—1 Timoti 1:11; 2 Pita 3:13.
Onye ozi ala ọzọ ndị Kraịst bụ́ Pọl kweere ná nkwa Chineke nile wee nwee ike ide, sị: “Pọl, ohu nke Chineke, na onye ozi nke Jisọs Kraịst, dị ka okwukwe ndị Chineke họpụtara si dị, ya na mmazu nke eziokwu ahụ nke dị n’ụzọ nsọpụrụ Chineke, n’olileanya nke ndụ ebighị ebi, nke Chineke, Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha, kwere nkwa ya tupu mgbe ebighị ebi eruo.” Ee, Chineke, “Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha,” “kwere nkwa” ndụ ebighị ebi nye ndị ji obi umeala na-achọ ịmara na ijere ya ozi.—Taịtọs 1:1, 2; Zefanaịa 2:3.
À Na-akwụ Ndịàmà Ụgwọ?
Site n’oge ruo n’oge ndị ụfọdụ ekwuwo na a na-akwụ Ndịàmà ụgwọ maka ozi ha. Nke ahụ bụ ụgha chara acha! Ha na-eji okwu Pọl gwara ọgbakọ nọ na Kọrint akpọrọ ihe: “Anyị adịghị eji okwu Chineke atụ mgbere dị ka ọtụtụ ndị mmadụ na-eme, kama site n’obi eziokwu, ee, dị ka ndị Chineke zitere, n’ihu Chineke, na-esonyere Kraịst, anyị na-ekwu okwu.”—2 Ndị Kọrint 2:17, NW.
Ụfọdụ ndị ndú okpukpe na-ekwu okwuchukwu maka ego, ma ọ bụ ụgwọ a kwụrụ maka ije ozi okpukpe ma ọ bụkwanụ ịkpọsa ụlọ ọrụ azụmahịa mgbe ha na-ekwu okwuchukwu na TV. Ihe ka n’ọtụtụ okpukpe nwere òtù ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ.
N’ụzọ dị iche, Ndịàmà enweghị òtù ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ, ọtụtụ mgbekwa akwụkwọ ha ndị dabeere na Bible bụ nke a na-enyefe ndị ji ezi obi na-achọ eziokwu n’efu, ọ bụ ezie na a na-akpali ọtụtụ n’ime ndị a inye onyinye afọ ofufo. A na-ejizi nke a kwụchie ego a na-emefu n’ọrụ nkwusa a zuru ụwa ọnụ. N’ikwekọ na ndụmọdụ Jisọs: “N’efu ka unu natara, nyenụ n’efu,” Ndịàmà na-emefu ihe ha nwere, tinyere oge na ume, n’itinye ọtụtụ nde hour kwa afọ n’ije ozi Chineke n’efu. Otú a, ha na-akụziri ndị nwere mmasị ihe site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa site n’ọmụmụ Bible ebe obibi.—Matiu 10:8; 28:19, 20; Ọrụ 20:19, 20.
Ihe ndị bụ eziokwu na-egosi na Ndịàmà Jehova ebughị ego n’obi dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, maka ọgbakọ ógbè ha, ma ọ bụ maka Watch Tower Society. Ọ dịghị onye na-anata ụgwọ ọ bụla maka ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Mgbe ahụ olee ụzọ a na-esi enweta ego e ji akwado ọrụ ahụ? Site n’onyinye afọ ofufo nke ndị nwere ekele gburugburu ụwa na-enye. A dịghị anakọta ụtụ.
Mmetụta Ịgba Àmà Ha Na-enwe
Ndị ọha mmadụ hà amatawo banyere ozi ụlọ n’ụlọ na nkwusa mberede nke Ndịàmà? Ihe àmà dị n’ụlọ mgbasa ozi na-aza ee dara ụda n’ajụjụ ahụ. A kpọtụwo Ndịàmà Jehova aha n’oge ihe omume TV na sịnịma dị iche iche mgbe a na-egosi mmadụ ka ọ na-akụ aka n’ọnụ ụzọ. Ihe osise ndị na-atọ ọchị akpọtụwo Ndịàmà aha. Ọrụ ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ bụ nke a maara nke ọma nke na ndị na-ese ihe na-atọ ọchị gburugburu ụwa agụnyewo izo aka n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Nke a pụrụ iyi ihe ịkwa emo, ma ha na-adaberekarị n’eziokwu bụ́ isi—na a ma Ndịàmà ama maka nkwusa ụlọ n’ụlọ ha nọgidere na-eme.—Ọrụ 20:20.
Otu ihe osise na-atọ ọchị ná nso nso a gosiri otu nwoke na-arị ugwu ịga kpọtụrụ “guru.” Ọ sịrị: “Gwa m ihe ndị dị ebube gaje ime!” Olee otú “guru” ahụ si zaghachi? “Eem . . . A ga-enwe ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara.” Onye ahụ na-achọ ịmata ihe ajụọ, sị: “Gịnị bụ ozi ọma ahụ?” N’ajụjụ a “guru” ahụ zaghachiri: “Chineke ga-ehichapụ anya mmiri nile ọ bụla . . . ọnwụ ma ọ bụ iru újú ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ!” Onye ahụ bịara nleta ajụọ, sị: “Olee otú i si mara ihe ndị ahụ?” Gịnị bụ azịza ya? “Ọ dịghị onye ga-agbanarị Ndịàmà Jehova!” Nke ahụ aghaghị ịbụworị eziokwu nye onye ahụ na-ese ihe ndị na-atọ ọchị n’onwe ya!
Ihe dị mkpa n’ihe osise a na ndị ọzọ yiri ya bụ na ọ na-ekpughe ọ bụghị nanị nleta Ndịàmà nọgidere na-eme kamakwa nkwekọ nke ozi ha. Nanị n’okwu ole na ole, onye ahụ na-ese ihe nyere akụkụ bụ isi nke ịgba àmà ụlọ n’ụlọ ha na akwụkwọ nsọ ha na-ehota.—Tụlee Matiu 24:7, 29; Mkpughe 21:3, 4.
Eziokwu ahụ bụ na ihe ka ọtụtụ na-ajụ ozi ahụ adịghị akụda Ndịàmà aka ma ọ bụ belata ịnụ ọkụ n’obi ha. Pita onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị, na-asịkwa, Olee ebe nkwa nke ọbịbịa Ya dị? N’ihi na site n’ụbọchị nna anyị ha dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.” N’agbanyeghị nke a, n’ịbụ ndị ịhụnanya na-akpali, Ndịàmà na-anọgide na-eleta ndị agbata obi ha, ha ga-emekwa nke ahụ ruo mgbe Chineke ga-eweta usoro ihe rụrụ arụ dị ugbu a ná njedebe.—2 Pita 3:3, 4.
Jisọs sịrị na n’ụbọchị ikpeazụ, a ga-ebu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ. Iji gaa n’ihu n’inyocha ihe kpatara ya na ụzọ a ga-esi eme ya, lee isiokwu abụọ na-esonụ.—Mak 13:10.
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ndịàmà Jehova enweghị òtù ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ ọnwa—ha nile bụcha ndị ozi afọ ofufo