Bible—Gịnị Bụ Ezi Abamuru Ya?
“BIBLE bụ ihe omimi, akwụkwọ nke a na-emeghị ka a ghọta ya,” ka otu onye nwe ụlọ kwuru. Onye ọzọ kwuru, sị: “Amaara m na Bible bụ akwụkwọ dị mkpa, ma ọ dịghị oké ihe m maara banyere ya. O siri ike nghọta.”
“Ọtụtụ ndị Kraịst maara . . . ihe dị nta banyere Bible,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star kwuru. Otu nwaada bụ́ onye Katọlik kwuru, sị: “Inwe Bible na-enye m mmetụta dị mma. Ọ na-eweta udo nke uche.” “Bible dị ka ihe nduzi ụzọ nke na-eduzi mmadụ gabiga oké osimiri nke ndụ bụ́ nke na-adịghị larịị, nke jupụtara n’ebili mmiri gaa n’ebe dị nchebe,” ka otu onye ọkụ azụ na-ekwu. N’okwu nke onye bụbu onye Hindu, “Bible bụ Okwu Chineke na onyinye e nyere ihe a kpọrọ mmadụ, ọ bụkwa ọgwụ maka ahụhụ ime mmụọ.”
Echiche dị iche iche banyere ezi abamuru nke Bible dị ọtụtụ dịkwa iche iche. Ma, gịnị bụ ezi abamuru ya?
Bible bụ akwụkwọ dịnụ nke kasị mkpa na nke a kasị kesaa ọtụtụ ebe. N’ime peji ya nile ka e nwere azịza nye nsogbu ndị kasị dị mgbagwoju anya ụmụ mmadụ nweworo ahụmahụ ha ma ọ bụ ka ga-eche ihu. Ịdị irè nke ndụmọdụ ya enweghị atụ. Ụkpụrụ omume ọ na-akwado enweghị nke karịrị ya. Ozi ya dị ike na-abakwa uru. Akwụkwọ nke a abamuru ya na-enweghị oyiri kwesịrị ka e si n’ọbọ́ akwụkwọ anyị were ya ma jiri nlezianya tụlee ya, nyochasiekwa ya ike.
Anyị pụrụ imepe Bible n’obi ike nile na o ziri ezi, kwesị ndabere, bụrụkwa eziokwu, n’akụkụ nile. Ihe akụkọ ndị merenụ e dekọrọ na ya bụ ndị akụkọ ihe mere eme nkịtị na-anwapụta. Ugboro ugboro, ihe ndị a chọpụtara ná nkà igwupụta ihe mgbe ochie na-akwado na Bible bụ eziokwu. Ezoghị ọnụ nke ihe dị ka 40 mmadụ dere Bible na-ewepụ ha iche dị ka ndị ikom na-ekwu eziokwu ma na-eguzosi ike n’ezi ihe. Nkwekọ n’ime nke Bible na-egosi na o siteghị n’aka ụmụ mmadụ. Ihe ndị mere eme e dekọrọ na ya bụ ezie. Ndị ọ na-ekwu banyere ha dịrị adị n’ezie. Ebe na ógbè ndị o zoro aka na ha dịrị adị n’ezie. Ọzọkwa, Bible nwere amụma ndị pụtara ìhè na-egosipụta Jehova Chineke n’ụzọ ngọpụ na-adịghị ya dị ka Onye Nchepụta nke Bible.—2 Pita 1:21.
Onye Ozizi Ukwu anyị hụrụ na ihe ọmụma banyere uche na nzube ya ga-adịrị ndị chọrọ ịma ihe ndị dị otú ahụ. N’ezie, Jehova na-agwa anyị n’okwu doro anya na ọ bụ uche ya ka ụdị mmadụ nile mụọ Okwu ya ma “bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4; Ilu 1:5, 20-33) Nke a bụ otu n’ime ihe ndị kasị mkpa anyị pụrụ iji ndụ anyị mee. Ọ bụ ihe ịma aka anyị na-aghaghị iche ihu. Ndị Kraịst oge mbụ ghọtara nke a. A kwaliri otu n’ime ha ikwu, sị: “Nke a ka m na-ekpekwa ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-ababigakwa ókè karị nke ukwuu n’ime mmazụ na nghọta nile; ka unu wee nwaa ihe ha na ibe ha dị iche.”—Ndị Filipaị 1:9, 10; Ndị Kọlọsi 1:9, 10.
Bible bụ ụzọ bụ isi Onye Okike si eme ka ezinụlọ mmadụ na-amara uche na nzube ya, ọ na-akọwakwa ụzọ anyị n’otu n’otu si abata ná nzube ahụ. N’ime ya e dekọrọ ihe ndị mere n’oge gara aga, ọ na-esekwa onyinyo doro anya maka ọdịnihu. Bible na-esetịpụ ozizi ziri ezi ma na-agbazi anyị n’ihe banyere ihe anyị kwesịrị ikwere ma ọ bụ ghara ikwere. (Ọrụ 17:11; 2 Timoti 3:16, 17) Ọ na-enye ụkpụrụ akparamagwa ndị mmadụ kwesịrị iji bie ndụ, ọ na-eduzikwa ụmụ mmadụ n’ụzọ nke ihe ịga nke ọma na obi ụtọ. (Matiu, isi 5 ruo 7) Ọ na-ekwusi okwu ike banyere Alaeze Chineke dị ka olileanya nanị ya dịịrị ihe nile a kpọrọ mmadụ, na-egosikwa ụzọ gọọmenti ya si bụrụ ngwá ọrụ a ga-eji mee ka aha ya dị nsọ ma wepụ ọkaaka ya n’ụta. Bible na-akọwa ụzọ dị anyị mkpa ịgbaso iji nwee mmekọrịta chiri anya, nke ịhụnanya n’ebe Onye Na-enye anyị Ndụ nọ, bụ́ Jehova.
Ọzọkwa, Bible na-eguzo nanị ya dị ka akwụkwọ ga-eduba gị n’ihe mgbata n’ọsọ kasịnụ ihe a kpọrọ mmadụ ga-erite mgbe ọ bụla—ndụ ebighị ebi n’elu ụwa paradaịs dị ka ụmụ mmadụ zuru okè. (Ndị Rom 6:23) Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya na-agwa anyị, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’ezie akwụkwọ nke nwere nnukwute abamuru dị otú ahụ kwesịrị ịkpali anyị ịmụta ihe anyị na-aghaghị ime iji nweta ihe mgbata n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi. Bible bụ akwụkwọ nke e mere ka a ghọta ya, dị ka isiokwu anyị na-esonụ ga-egosi.