Ihe Nile E Deworo n’Akwụkwọ Nsọ Bara Uru Iji Zie Ihe
1 Echiche e nwere banyere abamuru nke Bible dị ọtụtụ ma dịkwa iche iche. Otú ọ dị, o doro anyị anya na n’ime ya e nwere azịza nye nsogbu ndị na-agbagwoju ihe a kpọrọ mmadụ anya nakwa nduzi ndị a pụrụ ịtụkwasị obi maka ụzọ nke aka anyị ná ndụ. (Ilu 3:5, 6) Amamihe nke ndụmọdụ ya enweghị atụ. E nweghị ihe karịrị ụkpụrụ omume ọ na-akwado. Ozi ya dị ike, “nwee ike ịtụpụta echiche na ịzụ nile nke obi.” (Hib. 4:12) Olee ụzọ anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka ịhụ mkpa nke iwepụta akwụkwọ a n’ebe ndebe akwụkwọ ma jiri ezi nlezianya nyochaa ya? Ị pụrụ ịchọ ịnwale aro ụfọdụ ndị a mgbe ị na-enyefe Akwukwọm nke Akukọ Bible na November. A haziri akwụkwọ a karịsịa maka obere ụmụntakịrị, ma onye ọ bụla pụrụ irite uru site na 116 akụkọ nke akwụkwọ ahụ.
2 Ebe ọtụtụ ga-achọ ịghọta Bible, ị pụrụ iji ụzọ nnyefe nke a mee ihe:
◼ “Otu akwụkwọ akụkọ kọrọ, sị: ‘Ọtụtụ ndị Kraịst maara ihe dị nta banyere Bible.’ Onye ọzọ sịrị: ‘Bible bụ ihe omimi, akwụkwọ nke e mere ka a ghara ịghọta aghọta.’ Gịnị bụ echiche gị? E mere Bible ka a ghọta ya?” Nye ohere maka nzaghachi. Gụọ Joshua 1:8 ma gaa n’ihu: “Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ụmụ mmadụ kwesịrị ịghọta Bible. Ọ dị mkpa. Ị pụrụ inweta abamuru nke nghọta bụ isi Bible site n’enyemaka nke akwụkwọ a bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible. Ọ bụ nchịkọta dị mfe nke Bible.” Gụpụtara onye nwe ụlọ paragraf nke 2 na 3 nke okwu mmalite, ma nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya.
3 Nke a bụ aro ọzọ ị pụrụ ịtụle:
◼ “Mgbe ọ bụla anyị gụrụ akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ gee ntị n’akụkọ anyị na-anụ banyere nsogbu ọzọ siri ike nke na-eme ka anyị nwee nchegbu. [Kpọtụ uche n’ihe omume ụfọdụ na-enye nsogbu nke a kọrọ n’akụkọ n’oge na-adịbeghị anya.] Ọ̀ dị mgbe nsogbu ndị a ga-agwụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ka m gosi gị ihe mere anyị pụrụ iji tụkwasị Bible obi.” Rụtụ aka n’ihe ụfọdụ pụtara ìhè site ná trakti bụ́ Ihe Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Bible Obi. Nyefee Akwukwọm nke Akukọ Bible ma mee ndokwa ịlaghachi azụ n’oge na-adịghị anya ịtụle Akụkọ nke 114.
4 Ebe ọtụtụ maara banyere ọrụ ebube Jisọs, ị pụrụ ịnwale ụzọ nke a:
◼ “Ọtụtụ ndị maara nnọọ banyere ọrụ ebube Jisọs rụrụ n’oge ozi elu ala ya. Ma è nwere ihe mmụta ndị anyị pụrụ inweta site n’ọrụ ebube ndị a?” Nye ohere maka nzaghachi. Sapeta Akụkọ nke 96 ma kọọ isi ihe dị na ya. Kọwaa na ọrụ ebube nile nke Jisọs pụtara ihe karịrị nanị ngosipụta na-akpali akpali nke ike. Ha gbara ume ime ihe ọma, ngosipụta nke mmesapụ aka na ngosi nke ọmịiko. Nke ka mkpa, ha jere ozi dị ka ngosi bu ụzọ nke ihe ọ ga-arụzu n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ya. Chee akwụkwọ ahụ n’ihu n’ụtụ a na-enyefe ya, ma kwuo na ị ga-alaghachi maka inwekwu mkparịta ụka.
5 Onye Ozizi Kasị Ukwuu anyị ahụwo na e mere ka ihe ọmụma nke nzube ya bụrụ ihe ga-erute mmadụ nile aka. Jiri Akwukwọm nke Akukọ Bible nyere ndị chọrọ ịmụta ihe aka. Inyere ndị ọzọ aka ịghọta ezi abamuru nke Bible bụ otu n’ime ihe kasị mma nke anyị pụrụ imere ha; ọ pụrụ ịzọpụta ndụ ha.—Ilu 1:32, 33.