Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/1 p. 10-15
  • Ndị Ohu Chineke—Ndị A Haziri Ahazi na Ndị Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ohu Chineke—Ndị A Haziri Ahazi na Ndị Obi Ụtọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Hazikwara Ndị Ohu nke Oge A Ahazi
  • Ndị A Haziri Ahazi ma Na-enwe Obi Ụtọ
  • Ịhụnanya Na-emepụta Obi Ụtọ
  • Obi Ụtọ A Kpaara Ókè Ugbu A
  • Ezi Obi Ụtọ n’Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Otú E Si Enweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-efe “Chineke Bụ́ Onye Obi Ụtọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Jehova Na-ahazi Ihe Ya Ahazi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/1 p. 10-15

Ndị Ohu Chineke​—⁠Ndị A Haziri Ahazi na Ndị Obi Ụtọ

“Ndị ihe na-agara nke ọma [“ndị obi ụtọ,” NW] ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.”​—⁠ABỤ ỌMA 144:15.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji nwee ikike isetịpụrụ ndị ohu ya ụkpụrụ? (b) Gịnị bụ abụọ n’ime njimara Jehova ndị anyị kwesịrị ịchọ iṅomi karịsịa?

JEHOVA bụ Ọkaaka Eluigwe na Ala, Chineke nke pụrụ ime ihe nile, Onye Okike. (Jenesis 1:1; Abụ Ọma 100:3) N’ihi ya, o nwere ikike isetịpụrụ ndị ohu ya ụkpụrụ omume, ebe ọ maara ihe kasị mma maka ha. (Abụ Ọma 143:8) Ọ bụkwa Onye Nlereanya Bụ Isi ha nwere, bụ́ onye ha nwere mkpa iṅomi àgwà ya nile. “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya,” ka otu onyeozi dere.​—⁠Ndị Efesọs 5:1.

2 Njimara Chineke nke dị anyị mkpa iṅomi bụ nke metụtara nhazi. Ọ bụghị “Chineke nke aghara.” (1 Ndị Kọrint 14:33) Mgbe anyị ji nlezianya nyochaa ihe Chineke keworo, a na-amanye anyị ikwubi na ọ bụ Onye kasị nwee nhazi n’eluigwe na ụwa. Otú ọ dị, njimara ọzọ nke Chineke nke ọ chọrọ ka ndị ohu ya ṅomie bụ obi ụtọ ya, n’ihi na ọ bụ “Chineke obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11, NW) Otú a, e ji obi ụtọ mee ka ikike ime nhazi ya dị n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. E jighị otu njimara achụrụ ọzọ àjà.

3. Olee ụzọ eluigwe jupụtara na kpakpando si na-egosi ike Chineke nwere ime nhazi?

3 Ihe nile Jehova meworo, site na ndị kasị ukwuu ruo na ndị kasị nta na-enye ihe àmà na ọ bụ Chineke nke nhazi. Tụlee, dị ka ihe atụ, eluigwe na ala a na-ahụ anya. O nwere ọtụtụ puku ijeri nke kpakpando. Ma ndị a agbasasịghị aghara aghara. Onye ọkà mmụta nnyocha mbara igwe bụ́ George Greenstein kwuru na e nwere “ụkpụrụ ná nhazi nke kpakpando.” A haziri ha n’ime ìgwè dị iche iche a na-akpọ ụyọkọ kpakpando, ụfọdụ ha na-enwe ọtụtụ narị nde kpakpando. A na-agbakọkwa na e nwere ọtụtụ ijeri nke ụyọkọ kpakpando dị iche iche! A hazikwara ụyọkọ kpakpando ndị ahụ ahazi, ọtụtụ n’ime ha (site n’ole na ole ruo n’ọtụtụ puku) ịbụ ndị e jikọtara ọnụ n’otu gaa n’ùkwù ụyọkọ kpakpando. A na-echekwa na a haziri ùkwù ụyọkọ kpakpando dị iche iche gaa n’ọbụna ìgwè ka ukwuu a na-akpọ nnukwute ùkwù.​—⁠Abụ Ọma 19:1; Aịsaịa 40:​25, 26.

4, 5. Nye ihe atụ nke nhazi n’etiti ihe ndị dị ndụ n’elu ụwa.

4 A na-ahụ nhazi magburu onwe ya nke ihe ndị Chineke kere eke n’ebe ọ bụla, ọ bụghị nanị n’eluigwe a na-ahụ anya kamakwa n’elu ala, ya na nde kwuru nde nke ihe ndị dị ndụ na ya. Banyere ihe ndị a nile, Paul Davies, onye ọkachamara ná mmụta physics, dere na ndị na-achọpụta ihe “na-enwe ijuanya” n’ihi “nhazi dị ebube ma dị mgbagwoju anya nke ụwa a na-ahụ anya.”​—⁠Abụ Ọma 104:24.

5 Tụlee ihe atụ ole na ole nke “nhazi dị mgbagwoju anya” ahụ a na-achọta n’ihe ndị dị ndụ. Onye dọkịta na-awa ahụ n’akwara bụ́ Joseph Evans kwuru banyere ụbụrụ mmadụ na ọkpụkpụ azụ, sị: “Ịdị adị nke ịdị n’usoro dị ebube fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-eri ọnụ.” Banyere mkpụrụ ndụ anya nkịtị na-adịghị ahụ, onye ọkà n’ihe banyere ụmụ nje bụ́ H. J. Shaughnessy sịrị: “Ịdị mgbagwoju anya na usoro mara mma nke ụwa nke ihe ndị dị ndụ anya nkịtị na-adịghị ahụ bụ nke e wuru n’ụzọ dị ebube nke na o yiri akụkụ nke usoro Chineke guzobere.” Onye ọkà n’ihe ọmụmụ banyere ndụ nke ihe ndị dịkarịsị nta bụ́ Michael Denton kwuru banyere ụkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa (DNA) dị n’ime mkpụrụ ndụ, sị: “Ọ na-arụ ọrụ nke ọma nke na ihe ọmụma nile . . . dị mkpa iji kwuo kpọmkwem ọdịdị nke ụdị dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ dịtụworo adị n’elu ụwa . . . bụ nke a pụrụ ijikọta n’ime ngaji nta e ji aṅụ tii, a ka nweekwa ohere maka ihe ọmụma nile dị n’ime akwụkwọ nile e detụworo.”​—⁠Abụ Ọma 139:16.

6, 7. Ụdị nhazi dị aṅaa ka e gosiri n’etiti ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ, oleekwa otú ha na-esi egosi ekele maka Onye Mere ha?

6 Ọ bụghị nanị na Jehova haziri ihe okike ya ndị a na-ahụ anya kama ọ na-ahazikwa ihe okike ya ndị bụ́ mmụọ n’eluigwe. Daniel 7:10 na-agwa anyị na ndị mmụọ ozi ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru ‘iri puku ụzọ iri puku na-eguzokwa ọtọ n’ihu Jehova.’ Otu narị nde nke ndị mmụọ e kere eke dị ike ndị na-eje ozi, e kenyere nke ọ bụla ọrụ ya kwesịrị ekwesị! Ọ na-ebu isi iche banyere nkà ọ na-aghaghị iwe iji hazie ụdị ọnụ ọgụgụ buru ibu otú ahụ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Bible kwuru, sị: “Gọzienụ Jehova, ndị mmụọ ozi Ya, unu ndị dike dị ike, ndị na-eme okwu Ya, n’ige ntị olu nke okwu Ya. Gọzienụ Jehova, usuu ndị agha [bụ́ mmụọ ozi] Ya nile; unu ndị na-ejere Ya ozi, ndị na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ.”​—⁠Abụ Ọma 103:​20, 21; Mkpughe 5:11.

7 Lee ka ọrụ Onye Okike ahụ si bụrụ nke a haziri n’ụzọ dị ebube na nke na-arụ ọrụ nke ọma! Ọ bụghị ihe ịtụnanya na ihe ndị e kere eke bụ́ mmụọ dị ike n’ógbè eluigwe na-akpọsa n’ụzọ na-akpali ịtụ egwu na nke ịnọ n’okpuru, sị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.”​—⁠Mkpughe 4:11.

8. Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na Jehova na-ahazi ndị ohu ya n’ụwa?

8 Jehova na-ahazikwa ndị ohu ya n’elu ụwa. Mgbe o wetara Oké Iju Mmiri nke oge Noa na 2370 T.O.A., Noa na mmadụ asaa ndị ọzọ lanarịrị Iju Mmiri ahụ dị ka ezinụlọ a haziri ahazi. N’Ọpụpụ nke 1513 T.O.A., Jehova kpọpụtara ọtụtụ nde ndị ya n’agbụ ndị Ijipt ma nye ha ụkpụrụ iwu ndị e depụtasịrị nke ọma iji hazie ihe ha na-eme kwa ụbọchị na ofufe ha. Mgbe e mesịkwara, n’Ala Nkwa ahụ, a haziri ọtụtụ iri puku n’ime ha maka ije ozi pụrụ iche n’ụlọ nsọ ahụ. (1 Ihe Emere 23:​4, 5) Na narị afọ mbụ, a haziri ọgbakọ ndị Kraịst dị iche iche n’okpuru nduzi Chineke: “Ya onwe ya nyekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ozi; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi.”​—⁠Ndị Efesọs 4:​11, 12.

A Hazikwara Ndị Ohu nke Oge A Ahazi

9, 10. Olee otú Jehova siworo hazie ndị ya n’oge anyị?

9 N’otu aka ahụ, Jehova ahaziwo ndị ohu ya nke oge a ka ha wee nwee ike ịrụ ọrụ ya maka oge anyị n’ụzọ dị irè​—⁠ikwusa ozi ọma nke Alaeze ya tupu ya eweta usoro ihe nke a dị ugbu a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke ná njedebe. (Matiu 24:14) Tụlee ihe ọrụ nke a zuru ụwa ọnụ gụnyere na otú ezi nhazi si dị mkpa. A na-enye ọtụtụ nde ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka ọzụzụ ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Bible. Iji nye aka n’ọzụzụ nke a, a na-ebipụta ọnụ ọgụgụ buru ibu nke Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible. Leenụ, ugbu a a na-ebi ihe karịrị nde 16 nke mbipụta ọ bụla nke Ụlọ Nche na 118 asụsụ, na Teta! ihe dị ka nde 13 na 73 asụsụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụru na a na-ebipụta ha nile n’otu oge ahụ ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị ohu Jehova nile nweta otu ụdị ihe ọmụma ahụ n’otu oge ahụ.

10 Tụkwasị na nke a, a haziri ihe karịrị 73,000 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile izukọ kwa mgbe maka ozizi Bible. (Ndị Hibru 10:​24, 25) E nwekwara ọtụtụ puku nzukọ ndị ka ibu​—⁠mgbakọ sekit na mgbakọ distrikti dị iche iche⁠—​kwa afọ. E nwere ihe owuwu zuru ụwa ọnụ dị ukwuu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, ebe obibi Betel, na ihe owuwu dị iche iche maka obibi akwụkwọ dabeere na Bible, ndị ọhụrụ ma ọ bụ ndị e meziwanyere. E nwere ụlọ akwụkwọ dị iche iche maka ọzụzụ dị elu nke ndị na-akụzi Bible, dị ka Watchtower Bible School of Gilead maka ndị ozi ala ọzọ na Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ, ndị a na-eduzi n’ala dị iche iche gburugburu ụwa.

11. Abamuru ọdịnihu dị aṅaa ga-abịa site n’ịmụta ezi nhazi ugbu a?

11 Lee otú Jehova siworo hazie ndị ya nọ n’elu ụwa nke ọma ‘ijezu ozi ha,’ na-abụ ndị ndị mmụọ ozi ya na-eje ozi nyeere aka! (2 Timoti 4:5; Ndị Hibru 1:​13, 14; Mkpughe 14:6) Site n’inye ndị ohu ya ntụziaka n’ụzọ nke ezi nhazi ugbu a, Chineke na-arụzu ihe ọzọkwa. A na-akwadebe ndị ohu ya nke ọma otú ọ ga-abụ mgbe ha lanarịrị ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, ha ga-abụworị ndị a haziri ịmalite ndụ n’ụwa ọhụrụ ahụ. Mgbe ahụ, n’ụzọ a haziri ahazi n’okpuru nduzi Jehova, ha ga-amalite iwu Paradaịs ahụ zuru ụwa ọnụ. Ha ga-abụkwa ndị a kwadebere nke ọma ịkụzi ihe nile Chineke chọrọ maka ndụ nye ọtụtụ nde ndị a ga-esi n’ọnwụ kpọlite.​—⁠Aịsaịa 11:9; 54:13; Ọrụ 24:15; Mkpughe 20:​12, 13.

Ndị A Haziri Ahazi ma Na-enwe Obi Ụtọ

12, 13. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova chọrọ ka ndị ya nwee obi ụtọ?

12 Ọ bụ ezie na Jehova bụ onye ọrụ dị ike nke ukwuu na onye nhazi magburu onwe ya, ọ bụghị onye na-enweghị mmetụta, na-adịghị eme mgbanwe, ma ọ bụ onye na-enweghị uche. Kama nke ahụ, ọ bụ Onye na-ekpo ọkụ, nwere obi ụtọ nke na-eche maka obi ụtọ anyị. “Ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi,” ka 1 Pita 5:7 na-ekwu. Anyị pụrụ ịhụ nlekọta ya na ọchịchọ ọ chọrọ ka ndị ohu ya nwee obi ụtọ n’ihe o meworo maka ụmụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Chineke kere nwoke na nwanyị ahụ zuru okè, o debere ha na paradaịs nke obi ụtọ. (Jenesis 1:26-⁠31; 2:8, 9) O nyere ha ihe nile dị ha mkpa iji mee ka ha nwee obi ụtọ kasị ukwuu. Ma ha tụfuru ha nile site ná nnupụisi. Dị ka ihe si ná mmehie ha pụta, anyị ketara ezughị okè na ọnwụ.​—⁠Ndị Rom 3:23; 5:12.

13 Ọ bụ ezie na anyị ezughị okè ugbu a, anyị bụ́ mmadụ ka pụrụ ịchọta obi ụtọ n’ihe Chineke meworo. E nwere ọtụtụ ihe ndị na-ewetara anyị ọṅụ​—⁠ugwu ndị dị ebube; ọdọ mmiri, osimiri, oké osimiri na ụsọ osimiri bụ́ ndị mara mma; okooko osisi ndị na-esi ísì ụtọ, ndị tụrụ àgwà ọma na ihe ọkụkụ ndị ọzọ n’ụdị dị iche iche; ụba nke nri ndị na-atọ ụtọ; ọdịda anyanwụ mara mma nke ike na-adịghị agwụ anyị ikiri; eluigwe jupụtara na kpakpando nke anyị na-enwe ọṅụ ichebara echiche n’abalị; ihe okike ụmụ anụmanụ ya na ọdịdị ha dị iche iche dị ukwuu na ụmụ ọhụrụ na-adọrọ mmasị ya na omume egwuregwu ha; egwú ndị na-akpali akpali; ọrụ ndị bara uru ma na-akpali mmasị; ezi ndị enyi. O doro anya na Onye mere ndokwa maka ụdị ihe ndị ahụ bụ onye obi ụtọ, bụ́ onye ọ na-amasị ime ndị ọzọ obi ụtọ.

14. Ezi nguzo dị aṅaa ka Jehova chọrọ n’aka anyị n’iṅomi ya?

14 Otú a, nanị ịrụ ọrụ nke ọma n’ụzọ a haziri ahazi abụghị ihe Jehova chọrọ. Ọ chọkwara ka ndị ohu ya nwee obi ụtọ, dị ka o nwere obi ụtọ. Ọ chọghị ka ha jiri ịnụbiga ọkụ n’obi ókè na-ahazi ihe ruo n’ókè nke imebi obi ụtọ ha. Ndị ohu Chineke aghaghị iji obi ụtọ na-etinye nkà nhazi ha n’ọrụ, dị ka ọ na-eme, n’ihi na ebe mmụọ nsọ ya dị ike dị, n’ebe ahụ ka obi ụtọ na-adị. N’ezie, Ndị Galetia 5:22 na-egosi na mkpụrụ nke abụọ nke mmụọ nsọ Chineke nke na-arụ ọrụ n’elu ndị ya bụ “ọṅụ.”

Ịhụnanya Na-emepụta Obi Ụtọ

15. N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji dị oké mkpa n’obi ụtọ anyị?

15 Ọ bụ ihe na-adọrọ oké mmasị ịrịba ama na Bible sịrị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:​8, 16) Ọ dịghị mgbe ọ sịrị: “Chineke bụ nhazi.” Ịhụnanya bụ àgwà bụ isi nke Chineke, ndị ohu ya aghaghịkwa iṅomi ya. Nke ahụ mere mkpụrụ mbụ nke mmụọ Chineke e depụtara ná Ndị Galetia 5:22 ji bụrụ “ịhụnanya,” “ọṅụ” na-esote ya. Ịhụnanya na-emepụta ọṅụ. Mgbe anyị na-eṅomi ịhụnanya Jehova ná mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ, obi ụtọ na-esochi, n’ihi na ndị na-ahụ n’anya bụ ndị na-enwe obi ụtọ.

16. Olee otú Jisọs si gosipụta mkpa nke ịhụnanya?

16 Ozizi ndị Jisọs ziri mere ka ịdị mkpa nke iṅomi ịhụnanya Chineke pụta ìhè. Ọ sịrị: “Dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.” (Jọn 8:28) Gịnị, karịsịa, ka e ziri Jisọs nke, n’otu aka ahụ, o ziri ndị ọzọ? Ọ bụ na iwu abụọ kasị ukwuu bụ ịhụ Chineke n’anya na ịhụ onye agbata obi n’anya. (Matiu 22:​36-⁠39) Jisọs mere ihe atụ ụdị ịhụnanya ahụ. Ọ sịrị: “Ana m ahụ Nna m n’anya,” na-egosipụta ya site n’ime uche Chineke ruo ọnwụ. O gosikwara ịhụnanya o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ site n’ịnwụ maka ha. Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst nọ n’Efesọs, sị: ‘Kraịst anyị hụkwara unu n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi unu.’ (Jọn 14:31; Ndị Efesọs 5:2) Otú a, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nke a bụ ihe M nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka M hụrụ unu n’anya.”​—⁠Jọn 15:​12, 13.

17. Olee otú Pọl si gosi na ịhụ ndị ọzọ n’anya dị oké mkpa?

17 Pọl kwupụtara otú ịhụnanya Chineke nke a si dị oké mkpa site n’ikwu, sị: “A sị na eji m asụsụ dị iche iche nke mmadụ na nke ndị mmụọ ozi na-ekwu okwu, ma enweghị m ịhụnanya, aghọwo m ọla na-ara ara, ma ọ bụ ájà ọla na-ada ụda. A sịkwa na enwere m onyinye ibu amụma, matakwa ihe omimi nile na ihe ọmụma nile; a sịkwa na enwere m okwukwe nile, nke mere m ga-enwe ike ibubiga ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla. A sịkwa na eweere m ihe nile m nwere zụọ ndị ogbenye, a sịkwa na araara m ahụ m nye ka e wee ree m ọkụ, ma enweghị m ịhụnanya, ọ baghị m uru ọ bụla. . . . Okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.”​—⁠1 Ndị Kọrint 13:​1-3, 13.

18. Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’aka Jehova nke na-atụkwasị ihe n’obi ụtọ anyị?

18 Mgbe anyị ṅomiri ịhụnanya Jehova, anyị pụrụ ijide n’aka ịhụnanya ya n’ebe anyị nọ, ọbụna mgbe anyị jehiere, n’ihi na ọ bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) Ọ bụrụ na anyị echegharịa n’ezi obi mgbe anyị jehiere, Chineke adịghị agụkọ ihe ndị a kama ọ na-agbaghara anyị n’ịhụnanya. (Abụ Ọma 103:​1-⁠3) Ee, “Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” (Jemes 5:11) Ịmara nke a na-etinye ihe n’obi ụtọ anyị.

Obi Ụtọ A Kpaara Ókè Ugbu A

19, 20. (a) N’ihi gịnị ka obi ụtọ zuru ezu na-agaghị eji kwe omume ugbu a? (b) Olee otú Bible si gosi na anyị pụrụ inwe obi ụtọ a kpaara ókè n’oge a?

19 Otú ọ dị, ọ̀ pụrụ ikwe mee inwe obi ụtọ taa, ebe anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke ụwa nke a jupụtara ná mpụ, ime ihe ike, omume rụrụ arụ n’okpuru Setan, ebe ọrịa na ọnwụ na-eche anyị ihu? N’ezie, anyị apụghị ịtụ anya inweta ugbu a ọ̀tụ̀tụ̀ nke obi ụtọ ga-adị n’ụwa ọhụrụ Chineke, ụdị ahụ Okwu ya buru amụma ya: “Lee, M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke.”​—⁠Aịsaịa 65:​17, 18.

20 Ihe ndị ohu Chineke pụrụ inwe ugbu a bụ obi ụtọ a kpaara ókè n’ihi na ha maara uche ya ma nwee ezi ihe ọmụma banyere ngọzi ya ndị magburu onwe ha ndị ga-abịa n’oge na-adịghị anya na paradaịs ụwa ọhụrụ ya. (Jọn 17:3; Mkpughe 21:4) Ọ bụ nke ahụ mere Bible ji nwee ike ikwu, sị: “O Jehova nke usuu nile nke ndị agha, obi ụtọ na-adịrị mmadụ ahụ na-atụkwasị gị obi,” “obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla na-atụ egwu Jehova, bụ́ onye na-eje ije n’ụzọ ya nile,” “obi ụtọ na-adịrị ndị dị umeala n’obi, ebe ha ga-eketa ụwa.” (Abụ Ọma 84:12; 128:1; Matiu 5:5, NW) Ya mere, n’agbanyeghị ọnọdụ ndị siri ike dị ugbu a anyị na-agbaso mgba, anyị pụrụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke obi ụtọ. Ọbụna mgbe ihe ọjọọ mere anyị, anyị adịghị enwe mwute dị ka ndị na-amaghị Jehova na ndị na-enweghị olileanya nke ndụ ebighị ebi na-eme.​—⁠1 Ndị Tesalọnaịka 4:13.

21. Olee otú inye onwe ha na-esi etinye ihe n’obi ụtọ nke ndị ohu Jehova?

21 Obi ụtọ na-abịakwara ndị ohu Jehova n’ihi na ha na-etinye oge, ume, na ihe ndị ha nwere n’ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Bible, karịsịa ndị ‘na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile’ a na-eme n’ụwa Setan. (Ezikiel 9:4) Bible kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla ji nchebara echiche na-emeso onye dị ala; n’ụbọchị ọdachi Jehova ga-enye ya ụzọ mgbapụ. Jehova n’onwe ya ga-ekpuchi ya ma chebe ya ndụ. A ga-akpọ ya onye obi ụtọ n’elu ala.” (Abụ Ọma 41:​1, 2, NW) Dị ka Jisọs kwuru, “obi ụtọ na-adị n’inye enye karịa n’ịnara anara.”​—⁠Ọrụ 20:35, NW.

22. (a) Banyere obi ụtọ, jiri ndị ohu Chineke tụnyere ndị na-adịghị ejere ya ozi. (b) Ihe dị aṅaa pụrụ iche mere anyị ji kwesị ịtụ anya inwe obi ụtọ?

22 Ya mere ọ bụ ezie na ndị ohu Chineke apụghị ịtụ anya obi ụtọ kasị ukwuu n’oge dị ugbu a, ha pụrụ inweta obi ụtọ nke ndị na-adịghị ejere Chineke ozi na-adịghị enweta. Jehova kwuru, sị: “Lee, ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma, ma unu onwe unu ga-eti mkpu site n’ihe mgbu nke obi, unu ga-esitekwa ná ntiwa nke mmụọ unu kwasie ákwá ike.” (Aịsaịa 65:14) Ọzọkwa, ndị na-ejere Chineke ozi nwere ihe pụrụ iche mere ha ga-eji enwe obi ụtọ ugbu a​—⁠ha nwere mmụọ nsọ ya nke “Chineke nyere ndị na-ekwenyere Ya.” (Ọrụ 5:32) Chetakwa, ebe mmụọ Chineke dị, obi ụtọ na-adị ebe ahụ.​—⁠Ndị Galetia 5:22.

23. Gịnị ka anyị ga-atụle n’ọmụmụ ihe anyị ọzọ?

23 Ná nzukọ nke ndị ohu Chineke taa, “ndị okenye” bụ́ ndị na-edu ndú n’ọgbakọ na-ekere òkè dị mkpa, na-etinye ihe n’obi ụtọ nke ndị Jehova. (Taịtọs 1:5) Olee otú ndị a kwesịrị isi lee ibu ọrụ ha na mmekọrịta ha na ụmụnna ndị nwoke na nwanyị ime mmụọ ha anya? Isiokwu anyị ọzọ ga-atụle nke a.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Olee otú ihe okike si agba akaebe nke Jehova ịbụ onye nwere nhazi?

◻ Olee otú Jehova siworo hazie ndị ohu ya n’oge gara aga na n’oge ugbu a?

◻ Ezi nguzo dị aṅaa ka Jehova chọrọ anyị n’aka?

◻ Ruo n’ókè hà aṅaa ka ịhụnanya dịruru ná mkpa n’obi ụtọ anyị?

◻ Ụdị obi ụtọ dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’oge anyị?

[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 10]

N’elu: Site n’ikike nke ROE/Anglo-Australian Observatory, David Malin sere foto

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya