Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-akwụsị?
IHE ụjọ na-awụ akpata oyi mgbe e nwesịrị ntiwapụ bọmbụ n’ahịa na-ekwo ekwo na Sarajevo; ogbugbu ọchụ na oké mbibi na Rwanda; ụmụaka agụụ na-agụgbu na-azọgharị nri na Somalia; ezinụlọ ndị isi gbaghasịrị bụ́ ndị na-agụkọ mfu ha mgbe ala ọma jijiji gasịrị na Los Angeles; ndị ọghọm ghọrọ bụ́ ndị na-enweghị enyemaka na Bangladesh idei mmiri bibisịrị. Ihe ndị dị otú ahụ a na-ahụ nke nhụjuanya ụmụ mmadụ na-eche anyị ihu kwa ụbọchị na TV ma ọ bụ na magazin na n’akwụkwọ akụkọ.
Mmetụta na-akpata mwute nke nhụjuanya ụmụ mmadụ bụ na ọ na-eme ka ụfọdụ ghara inwekwa okwukwe na Chineke. “Ịdị adị nke ihe ọjọọ ewepụtawo mgbe nile ihe mgbochi ndị kasị njọ maka okwukwe,” dị ka otu okwu ógbè ndị Juu na United States kwuru. Ndị dere ya na-ezo aka n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke Nazi dị ka Auschwitz na site na bọmbụ dị iche iche dị ka nke tiwapụrụ na Hiroshima. “Ajụjụ nke otú Chineke nke ezi ikpe na nke dị ike pụrụ isi kwere ka mgbuchapụ nke ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha dịrị na-enye akọ na uche ji okpukpe kpọrọ ihe nsogbu ma na-agbagwoju anya,” ka ndị dere ya kwuru.
N’ụzọ dị mwute, njupụta nke akụkọ ọdachi pụrụ inwe mmetụta ịma etili ná mmetụta uche mmadụ. Ọ bụrụhaala na o metụtaghị ndị enyi na ndị ikwu, ọtụtụ ndị na-achọpụta na ọ na-esiri ha ike ịbụ ndị nhụjuanya nke ndị ọzọ metụtara.
Ma, eziokwu bụ na anyị nwere ike inwe ọmịiko, ma ọ dịghị ihe ọzọ maka ndị nke anyị anyị hụrụ n’anya, kwesịrị ịgwa anyị ihe ụfọdụ banyere Onye Mere anyị. Bible na-asị na e kere mmadụ “n’onyinyo Chineke” nakwa ‘n’oyiyi ya.’ (Jenesis 1:26, 27) Nke a apụtaghị na ụmụ mmadụ dị ka Chineke n’ọdịdị. Ee e, n’ihi na Jisọs Kraịst kọwara na “Chineke bụ Mmụọ,” ‘mmụọ enweghịkwa anụ ahụ na ọkpụkpụ.’ (Jọn 4:24; Luk 24:39) Ịbụ ndị e mere n’oyiyi Chineke na-ezo aka n’ikike anyị nwere igosipụta àgwà dị iche iche nke Chineke. Ya mere, ebe ụmụ mmadụ nkịtị na-enwe ọmịiko maka ndị na-ahụju anya, anyị aghaghị ikwubi na Onye Okike mmadụ, Jehova Chineke, dị ọmịiko nakwa na ọ na-enwe mmetụta miri emi maka ụmụ mmadụ o kere bụ́ ndị na-ata ahụhụ.—Tụlee Luk 11:13.
Otu ụzọ Chineke siworo gosi ọmịiko ya bụ n’inye ihe a kpọrọ mmadụ nkọwa e dere ede nke ihe na-akpata nhụjuanya. Nke a ka o meworo n’Okwu ya, bụ́ Bible. Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na Chineke kere mmadụ ịnụ ụtọ ndụ, ọ bụghị ịhụju anya. (Jenesis 2:7-9) Ọ na-ekpughekwa na ụmụ mmadụ mbụ wetaara onwe ha nhụjuanya site n’ịjụ ịchịisi ezi omume nke Chineke.—Deuterọnọmi 32:4, 5; Ndị Rom 5:12.
N’agbanyeghị nke a, Chineke ka na-enwe ọmịiko maka ụmụ mmadụ na-ahụju anya. E gosipụtara nke a n’ụzọ doro anya ná nkwa ya iweta nhụjuanya ụmụ mmadụ ná ngwụsị. “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4; leekwa Aịsaịa 25:8; 65:17-25; Ndị Rom 8:19-21.
Nkwa ndị a dị ebube na-anwapụta na nhụjuanya ụmụ mmadụ na-emetụ Chineke n’ahụ nakwa na o kpebisiri ike iweta ya ná ngwụsị. Ma gịnị kpọmkwem kpatara nhụjuanya ụmụ mmadụ na nke mbụ ya, n’ihi gịnịkwa ka Chineke jiworo kwere ka ọ dịgide ruo ụbọchị anyị?
[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 2]
Ihu akwụkwọ: Alexandra Boulat/Sipa Press
[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 3]
Kevin Frayer/Sipa Press