Krismas—Ọ̀ Bụ n’Ezie nke Ndị Kraịst?
DỊ KA akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, “Krismas bụ ụbọchị ndị Kraịst na-eme ememe ncheta ọmụmụ Jisọs Kraịst.” Ka o sina dị, akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ekwukwa, sị: “Ndị Kraịst oge gboo emeghị ememe ncheta ọmụmụ [Jisọs] n’ihi na ha lere ememe ncheta ọmụmụ nke onye ọ bụla anya dị ka omenala ndị ọgọ mmụọ.”
Akwụkwọ bụ́ The Making of the Modern Christmas, nke Golby na Purdue dere na-ekweta, sị: “Ndị Kraịst oge gboo emeghị ememe ncheta ọmụmụ nke Kraịst. Ememe ncheta ọmụmụ n’onwe ha bụ ndị e jikọtara ha na omume ndị ọgọ mmụọ; Oziọma ndị ahụ ekwughị ihe ọ bụla banyere ụbọchị a mụrụ Kraịst kpọmkwem.”
Ọ bụrụ na ime ememe ncheta ọmụmụ enweghị mmalite nke ndị Kraịst, olee otú ncheta ọmụmụ Kraịst si ghọọ ememe bụ isi nke “ndị Kraịst” otú a?
Mmalite Ndị Ọgọ Mmụọ nke “Krismas”
“Onye ọ bụla riri oriri, ṅụrịakwa ọṅụ, a kwụsịtụrụ ọrụ na azụmahịa kpam kpam ruo oge ụfọdụ, e ji ahịhịa laurel na osisi ndị na-adịghị agbụsị akwụkwọ chọọ ụlọ dị iche iche mma, ndị enyi gbanwerịtara nleta na onyinye dị iche iche, ndị na-ere ahịa na-enye ndị na-azụ ha ahịa onyinye. Oge ahụ dum bụ oge ịṅụrị ọṅụ na ọfọ ọma, ndị mmadụ tinyekwara aka n’ụdị ntụrụndụ nile.”—Paganism in Christian Festivals, nke J. M. Wheeler dere.
Nkọwa nke a ò kwekọrọ n’ihe omume Krismas ndị ị maara? N’ụzọ na-eju anya nke a abụghị Krismas! Kama nke ahụ, nke ahụ bụ nkọwa nke Saturnalia—ememe ndị ọgọ mmụọ na-ewe otu izu nke ndị Rom nke e jikọtara ya na oge ehihie kasị adị mkpirikpi (nke e sepụtara na peji chere nke a ihu). E mere ememe ncheta ọmụmụ nke anyanwụ ahụ a na-emerighị emeri na December 25, ụbọchị ememe bụ isi nke okpukpe Mithra nke Rom.
Dị ka akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica si kwuo, “December 25, ụbọchị ọmụmụ nke Mithra, bụ́ chi ndị Iran nke ìhè na . . . ụbọchị a raara nye anyanwụ nke a na-apụghị imeri emeri, tinyere ụbọchị na-esote Saturnalia, bụ nke chọọchị weghaara dị ka Krismas, ụbọchị ọmụmụ nke Kraịst, iji meghasịa mmetụta nke ememe ndị a.” Otú a ka ememe ncheta ọmụmụ nke ndị ọgọ mmụọ si gaa n’ihu nanị site n’ịgbanwe aha, site na Mithra gaa na Kraịst!
Otú ọ dị, ị pụrụ iche na ọmụmụ nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs, bụ ihe pụrụ iche, nke e kwesịrị ịdị na-echeta. Nlenye anya n’ihe Bible na-akọ banyere nke a ga-abụ ihe na-enye ihe ọmụma nke ukwuu.
Ihe Omume Na-enye Ọṅụ
Isi nke 2 nke Oziọma Luk kọrọ ihe ndị gbara ya gburugburu. Luk na-agwa anyị otú ndị mmụọ ozi nke eluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ dị ala, ndị ohu Chineke ji okpukpe kpọrọ ihe, na Meri n’onwe ya si meghachi omume n’ihe omume a kwesịrị ịrịba ama.
Buru ụzọ tụlee banyere “ndị ọzụzụ atụrụ . . . na-anọ n’ọhịa” bụ ndị “na-echekwa ìgwè atụrụ ha n’abalị,” nke ha na-agaraghị na-eme n’etiti oge oyi. Mgbe “mmụọ ozi nke Onyenwe anyị” bịara, ebube Chineke wee waa gburugburu ha, na mbụ ụjọ tụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ. E mesiri ha obi ike mgbe mmụọ ozi ahụ kọwara, sị: ‘Unu atụla egwu; n’ihi na lee, ana m ezi unu ozi ọma nke oké ọṅụ nke ga-adịrị ndị nile: n’ihi na taa ka a mụrụ nye unu Onye nzọpụta, Nke bụ Kraịst Onyenwe anyị.’ Mgbe “ìgwè usuu ndị mmụọ ozi nke eluigwe” bịara na mberede, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ matara na ọmụmụ nwa nke a dị iche ná ndị ọzọ nile. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ndị mmụọ ozi ahụ ewetaraghị nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ onyinye ọ bụla. Kama nke ahụ, ndị mmụọ ozi ahụ toro Jehova, na-asị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị Ya ezi mma.”—Luk 2:8-14.
Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ chọrọ ịhụ nwa ọhụrụ nke a n’onwe ha, n’ihi na ọ bụ Jehova bụ onye mara ọkwa nke ihe omume obi ụtọ ahụ. Mgbe ha hụrụ nwa ọhụrụ ahụ ka o dina n’ihe e ji enye anụ nri, ha gwara ndị mụrụ ya ihe ndị mmụọ ozi ahụ kwururị. Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ pụwaziri, “na-enye Chineke otuto,” ọ bụghị nwa ọhụrụ ahụ.—Luk 2:15-18, 20.
Obi abụọ adịghị ya na Meri, bụ́ nne Jisọs, ṅụrịrị ọṅụ n’ọmụmụ ọ mụrụ nwa mbụ ya n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ma o rukwara ‘nkwubi okwu dị iche iche n’obi ya.’ Ka e mesịrị, n’ịbụ onye di ya, bụ́ Josef sonyeere, o jere Jerusalem ná nrubeisi n’Iwu Mosis. Nke a abụghị ememe ncheta ọmụmụ. Kama nke ahụ, ọ bụ oge ije chee nwa ọhụrụ ahụ n’ihu Chineke, “dị ka e deworo ya n’iwu Onyenwe anyị, Nwa mbụ ọ bụla bụ́ oké nke gụghere akpa nwa, a ga-akpọ ya ihe nsọ nye Onyenwe anyị.”—Luk 2:19, 22-24.
N’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem, Meri na Josef zutere Simeon, bụ́ onye Luk na-akọwa dị ka “onye ezi omume na onye na-atụ egwu Chineke, na-eche nkasi obi nke Israel.” N’okpuru ike nke mmụọ nsọ, a gwawo ya na ọ gajeghị ịnwụ tupu ọ hụ “Kraịst nke Onyenwe anyị.” Ihe ọzọ merenụ bụkwa “na Mmụọ [Chineke].” Simeon kuuru nwa ọhụrụ ahụ n’aka ya, ee e, ọ bụghị iji nye ya onyinye, kama nke ahụ, iji gọzie Chineke, na-asị: “Onyenwe m, ugbu a ka Ị na-ahapụ ohu Gị ka ọ laa n’udo, dị ka okwu Gị si dị; n’ihi na anya m ahụwo nzọpụta Gị, nke I doziri n’ihu ndị nile.”—Luk 2:25-32.
Ọzọ, onye amụma nwanyị ahụ nke meworo agadi bụ́ Ana bịaruru nso. Ya onwe ya kwa “wee kelee Chineke, gwakwa ndị nile na-eche mgbapụta nke Jerusalem okwu banyere Ya.”—Luk 2:36-38.
Meri, Simeon, Ana, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, tinyere ndị mmụọ ozi nke eluigwe, ha nile ṅụrịrị ọṅụ n’ọmụmụ Jisọs. Otú ọ dị, biko rịba ama na ha emikpughị onwe ha n’oriri oké mkpọtụ nke ncheta ọmụmụ, nke ha ji etinyekwanụ aka n’inye onyinye. Kama nke ahụ, ha toro Jehova, Onye Na-enye Ihe nke eluigwe bụ́ onye nyere ha ụzọ nzọpụta.
Ma, ụfọdụ pụrụ iche, sị, ‘N’ezie inye onyinye nke Krismas apụghị ịdị njọ, n’ihi na ọ̀ bụ na “ndị ahụ maara ihe” ejighị onyinye dị iche iche sọpụrụ Jisọs?’
Onyinye Dị Iche Iche nke Krismas
Ọzọkwa ka anyị nyochaa ihe ndekọ Bible. Ị ga-ahụ na e dekọrọ ya n’Oziọma Matiu, isi nke 2. E hotaghị ememe ncheta ọmụmụ ọ bụla, e nyeghịkwa oge ọ bụla kpọmkwem, ọ bụ ezie na o doro anya na ọ bụ oge ụfọdụ mgbe ọmụmụ Jisọs gasịrị. N’amaokwu nke 1, Matiu na-akpọ ndị ahụ bịara nleta “ndị na-agụ kpakpando [Grik, maʹgoi] ndị sitere n’ọwụwa anyanwụ” (NW), n’ihi ya bụrụ ndị ọgọ mmụọ na-amaghị banyere Jehova Chineke. Kpakpando ndị ikom ndị a gbasoro duuru ha gaa ọ bụghị kpọmkwem n’ebe a mụrụ Jisọs na Betlehem, kama na Jerusalem, ebe Eze Herọd na-achị.
Mgbe onye ọchịchị ọjọọ nke a nụrụ ka ha na-ajụ banyere “Onye a mụrụ ịbụ Eze ndị Juu,” o jekwuuru ndị nchụàjà ije chọpụta kpọmkwem “ebe a ga-amụ Kraịst” ka o wee hụ na e gburu nwa ahụ. Ndị nchụàjà zara ya site n’ihota amụma Maịka nke gosiri na ebe a ga-amụ Mesaịa ahụ bụ na Betlehem. (Maịka 5:2) Herọd ji ihu abụọ nye ndị ọbịa ya ntụziaka, sị: “Gaanụ chọpụta nke ọma okwu banyere Nwatakịrị ahụ; ma mgbe ọ bụla unu ga-achọta Ya, bịa kọọrọ m, ka mụ onwe m wee jeekwa kpọọ isiala nye Ya.” Ndị ahụ na-agụ kpakpando gara n’ihu na njem ha, kpakpando ahụkwa “na-aga n’ihu ha, ruo mgbe ọ bịara guzo n’elu ebe Nwatakịrị ahụ nọ.” Rịba ama na a kọwara ya dị ka “Nwatakịrị,” ọ bụghị nwa a mụrụ ọhụrụ.—Matiu 2:1-10.
Dị ka ndị Ọwụwa Anyanwụ rigotara n’ọkwá bụ́ ndị na-eje ileta onye ọchịchị, ndị ọgọ mmụọ ahụ na-agụ kpakpando dara n’ala ma “chee [nwatakịrị ahụ] onyinye n’ihu, ọlaedo, na frankincense na myrrh.” Matiu na-ekwukwasị: “Ebe Chineke dụrụ ha ọdụ ná nrọ ka ha ghara ịlaghachi jekwuru Herọd, ha wee wezụga onwe ha gaa ala ha site n’ụzọ ọzọ.”—Matiu 2:11, 12.
Site n’ihe ndekọ a dị mkpirikpi nke Akwụkwọ Nsọ, ụfọdụ ndị pụrụ ịnwa ịchọta ihe nkwado maka inye onyinye Krismas ha. Ka o sina dị, akwụkwọ bụ́ Discovering Christmas Customs and Folklore na-akọwa na omenala nke dị ugbu a nke inye onyinye na-achọta mkpọrọgwụ ya n’ime onyinye nke Saturnalia nke ndị Rom na-enye ndị agbata obi ha dara ogbenye. “Chọọchị oge gboo . . . ji akọ wefee ihe ọ pụtara n’ememe ncheta nwere usoro mmeghachi ihe efu nke onyinye ndị Magi ahụ.” Lee ka nke a si dị iche n’ebe ndị na-efe ezi ofufe nọ—dị ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ dị ala—bụ́ ndị ọ bụ nanị ito Chineke ka ha mere n’ọmụmụ Jisọs!
Sọpụrụ Kraịst Dị Ka Eze!
Taa Jisọs abụkwaghị nwa ọhụrụ. Ọ bụ Onye Ọchịchị dị ike, Eze nke Alaeze eluigwe nke Chineke, e kwesịkwara inye ya nsọpụrụ kwekọrọ n’ihe ọ bụ.—1 Timoti 6:15, 16.
Ọ bụrụ na ị bụ onye toruworo ogo mmadụ ugbu a, ọ̀ dịtụwo mgbe o juru gị anya, mgbe ndị mmadụ na-egosi foto gị dị ka onye bụ nwa ọhụrụ n’ihu gị? N’eziokwu, foto ndị dị otú ahụ na-echetara ndị mụrụ gị banyere ọṅụ ha nwere mgbe a mụrụ gị. Ma ugbu a i nweworo ihe e ji mara gị, ọ̀ bụ na ọ dịghị amasị gị karịa ka ndị ọzọ na-ahụ gị otú ị dị? N’otu aka ahụ, chee echiche otú o si bụrụ enweghị nkwanye ùgwù n’ebe Kraịst Jisọs nọ mgbe ndị na-azọrọ na ha bụ ụmụazụ ya mikpuru onwe ha nke ukwuu kwa afọ n’ọdịnala ndị ọgọ mmụọ nke Krismas na n’ịsọpụrụ nwa ọhụrụ ruo n’ókè nke na ha adịghị asọpụrụ ya dị ka Eze. Leenụ, ọbụna na narị afọ nke mbụ, onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi tụgharịrị uche n’izi ezi nke iche banyere Kraịst n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ọ bụ ugbu a—Eze n’eluigwe. Pọl dere, sị: “Ọbụna a sị na anyị amawo Kraịst dị ka anụ ahụ maara, ma ugbu a anyị amaghị Ya ọzọ otú a”!—2 Ndị Kọrint 5:16.
N’isi nso, Kraịst dị ka Eze nke Alaeze Chineke, ga-emezu nkwa amụma nke iwepụ ahụ ụfụ, ịta ahụhụ, ọrịa, na ọnwụ. Ọ bụ ya bụ Onye ga-ahụ na onye ọ bụla nwere ụlọ zuru ezu na ọrụ na-akwụghachi ụgwọ ọrụ n’okpuru ọnọdụ nke Paradaịs n’elu ala ebe a. (Aịsaịa 65:21-23; Luk 23:43; 2 Ndị Kọrint 1:20; Mkpughe 21:3, 4) N’ezie, ihe ndị a bụ ihe zuru ezu mere a ga-eji zere asọpụrụghị Jisọs!
N’ịgbaso ihe nlereanya nke Kraịst n’onwe ya, ezi ndị Kraịst na-agbalị inye ndị agbata obi ha otu n’ime onyinye ndị kasịnụ nke onye ọ bụla pụrụ inye—nghọta nke nzube Chineke, nke pụrụ iduje ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ụdị inye onyinye nke a na-ewetara ha oké ọṅụ, ọbụna dị ka Jisọs kwuru: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35; Luk 11:27, 28.
Ọ dịghị esiri ndị Kraịst nwere ezi mmasị n’ebe ibe ha nọ ike igosi ịhụnanya ha n’oge ọ bụla n’afọ site n’ala ala obi ha. (Ndị Filipaị 2:3, 4) Dị ka ihe atụ dị mfe, lee aha ihe mkpali ọ ga-abụ ịnata otu ihe osise site n’aka onye na-eto eto bụ onye Kraịst, onye sere ya dị ka ngosipụta nke ekele, mgbe o gesịrị okwu sitere na Bible! Onyinye a na-atụghị anya ya nke sitere n’aka onye ikwu dị ka ngosipụta nke ịhụnanya onye ahụ bụkwa ihe na-agba ume. N’otu aka ahụ, ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị Kraịst na-enweta ọṅụ dị ukwuu mgbe ha họọrọ oge ndị kwesịrị ekwesị n’afọ inye ụmụ ha onyinye. Ụdị mmesapụ aka dị otú a nke ndị Kraịst abụghị nke echiche ibu ọrụ e chere na e nwere n’ụbọchị ememe dị iche iche ma ọ bụ ọdịnala ndị ọgọ mmụọ mebiri.
N’ihi ya, taa ihe karịrị nde ndị Kraịst anọ na ọkara bụ́ ndị sitere ná mba nile adịghị eme ememe Krismas. Ndị a bụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-eji ọrụ n’aka mgbe nile site n’ịgbara ndị agbata obi ha àmà banyere ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Ị pụkwara ịhụ ha mgbe ha bịara n’ebe obibi gị, ma eleghị anya n’oge na-adịghị anya. Ka nnabata ịnụ ọkụ n’obi gị nke ihe ndị ha wetaara gị duje ezinụlọ gị n’ọṅụ dị ukwuu, ka unu na-amụta ụzọ isi too Jehova Chineke n’ụbọchị ọ bụla n’afọ.—Abụ Ọma 145:1, 2.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị Kraịst na-enye ndị agbata obi ha otu n’ime onyinye kasịnụ—nghọta nke nzube dị iche iche nke Chineke nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi
[Ebe e si nweta foto dị na peeji 4]
Culver Pictures