Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 12/15 p. 4-7
  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ntọala Nwere Ntụpọ
  • E Webatara Mmerụ
  • Ụbọchị Ezumike Zuru Ụwa Ọnụ
  • Mgbanwegharị Krismas
  • “Hụkwanụ Eziokwu na Udo n’Anya”
  • Krismas—n’Ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Na-eme Ya na Japan?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Krismas—N’ihi Gịnị Ka E Ji Eme Ya Ọbụna n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Ka Krismas Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Oge Krismas—Gịnị Ka A Na-eme na Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 12/15 p. 4-7

Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A

NYE ọtụtụ nde ndị mmadụ n’ụwa nile, oge Krismas bụ oge oké ọṅụ n’afọ. Ọ bụ oge nke nri mara abụba, ọdịnala ọkpụtọrọkpụ ndị a a na-asọpụrụ, na nnọkọ ọnụ nke ezinụlọ. Ezumike Krismas bụkwa oge mgbe ndị ikwu na ibe na-enwe ọṅụ inyerịta kaadị na onyinye.

Otú ọ dị, nanị afọ 150 gara aga, Krismas bụ ụbọchị ezumike dị nnọọ iche. N’akwụkwọ ya bụ́ The Battle for Christmas, prọfesọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Stephen Nissenbaum na-ede, sị: “Krismas . . . bụ oge ịṅụ oké mmanya mgbe a gbahapụrụ ụkpụrụ nduzi ndị chịrị omume ndị mmadụ n’ihu ọha na nwa oge na-ahọrọ ‘oriri na ọṅụṅụ’ a na-akparaghị oké, ụdị nke December Mardi Gras.”

Nye ndị ji egwu nsọpụrụ na-ele Krismas anya, nkọwa a pụrụ ịdị na-enye nsogbu n’obi. N’ihi gịnị ka onye ọ bụla ga-eji metọọ ụbọchị ezumike yiri ka ọ na-echeta ọmụmụ nke Ọkpara Chineke? Azịza ya pụrụ iju gị anya.

Ntọala Nwere Ntụpọ

Site ná mmalite ya na narị afọ nke anọ, esemokwu agbawo Krismas gburugburu. Dị ka ihe atụ, e nwere okwu banyere ụbọchị ọmụmụ Jisọs. Ebe Bible na-akapịghị ụbọchị ma ọ bụ ọnwa a mụrụ Kraịst ọnụ, a tụwo aro ụbọchị dị iche iche. Na narị afọ nke atọ, otu ìgwè nke ndị ọkà mmụta okpukpe Ijipt tinyere ya na May 20, ebe ndị ọzọ họọrọ ụbọchị ndị bu ụzọ, dị ka March 28, April 2, ma ọ bụ April 19. Ka ọ na-erule narị afọ nke 18, e jikọtawo ọmụmụ Jisọs na ọnwa ọ bụla nke afọ! Mgbe ahụ, olee otú e si họrọ December 25 n’ikpeazụ?

Ihe ka n’ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwenyere na ọ bụ Chọọchị Katọlik kenyere December 25 dị ka ụbọchị a mụrụ Jisọs. N’ihi gịnị? “O yikarịrị ka ihe kpatara ya,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, “bụ na ndị Kraịst oge mbụ chọrọ ka ụbọchị ahụ dabakọọ n’ememe ndị na-ekpere arụsị nke Rom na-aka akara ‘ụbọchị ọmụmụ nke anyanwụ a na-emerighị emeri.’” Ma n’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ́ ndị ndị na-ekpere arụsị kpagburu n’ụzọ dị oké njọ ruo ihe karịrị narị afọ abụọ na ọkara ga-eji kwenyere ndị na-akpagbu ha ná mberede?

E Webatara Mmerụ

Na narị afọ mbụ, Pọl onyeozi dọrọ Timoti aka ná ntị na “ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ” ga-amịbata n’ọgbakọ ndị Kraịst ma duhie ọtụtụ ndị. (2 Timoti 3:13) Oké ndapụ n’ezi ofufe nke a malitere mgbe ndị ozi nwụsịrị. (Ọrụ 20:29, 30) Mgbe ihe a sị na ọ bụ ntọghata nke Constantine na narị afọ nke anọ gasịrị, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-ekpere arụsị nugara n’ụdị Iso Ụzọ Kraịst nke dịzi n’oge ahụ. Gịnị si na ya pụta? Akwụkwọ bụ́ Early Christianity and Paganism na-ekwu, sị: “Oké ìgwè nke ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst kpuchiri òtù dị nnọọ obere nke ezi ndị kwere ekwe na-anụ ọkụ n’obi.”

Lee otú okwu Pọl si bụrụ eziokwu! O yiri ka mmerụ nke ndị ọgọ mmụọ na-elo ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ọ dịghịkwa ebe mmerụ nke a ka pụta ìhè karịa n’ememe ụbọchị ezumike dị iche iche.

N’ezie, nanị ememe e nyere ndị Kraịst iwu idebe bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. (1 Ndị Kọrint 11:23-26) N’ihi omume ịkwa iko ndị e jikọrọ ha na ememe ndị Rom, ndị Kraịst oge mbụ ekereghị òkè na ha. N’ihi nke a, ndị na-ekpere arụsị narị afọ nke atọ kọchara ndị Kraịst, na-asị: “Unu adịghị aga ihe ngosi; unu enweghị mmasị n’ihe ngosi ọha; unu na-ajụ oriri na ọṅụṅụ ọha, kpọọkwa ịsọ mpi dị nsọ asị.” N’aka nke ọzọ, ndị na-ekpere arụsị turu ọnụ, sị: “Anyị na-efe ndị bụ chi n’obi ụtọ, n’oriri na ọṅụṅụ, abụ na egwuregwu.”

Ka ọ na-erule n’etiti narị afọ nke anọ, ntamu ahụ belatara. Olee otú o si mee? Ka ọtụtụ ndị Kraịst adịgboroja gbebatara n’ìgwè ahụ, echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ mụbara. Nke a dugara n’ikwenyere ụwa nke ndị Rom. N’ikwu banyere nke a, akwụkwọ bụ́ The Paganism in Our Christianity na-ekwu, sị: “Ọ bụ ụkpụrụ doro anya nke ndị Kraịst iweghara ememe ndị na-ekpere arụsị bụ́ ndị ọdịnala mere ka ọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ, na inye ha nkọwa ndị Kraịst.” Ee, oké ndapụ n’ezi ofufe na-enwe mmetụta ya. Ịdị njikere nke ndị a sị na ha bụ ndị Kraịst dị iweghara ememe ndị na-ekpere arụsị wetaziri ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnabata n’ime ógbè ahụ. N’oge na-adịghị anya, ndị Kraịst bịara nwee ọtụtụ ememe a na-eme kwa afọ dị nnọọ ka ndị na-ekpere arụsị n’onwe ha. N’abụghị ihe ijuanya, Krismas bụ nke mbụ n’ime ha.

Ụbọchị Ezumike Zuru Ụwa Ọnụ

Ka ụdị Iso Ụzọ Kraịst ahụ bụ isi gbasara na Europe nile, Krismas so ya gbasaa. Chọọchị Katọlik nakweere echiche bụ na ọ dabara adaba ime ka ememe na-enye ọṅụ n’ịsọpụrụ ụbọchị a mụrụ Jisọs bụrụ nke na-adịgide adịgide. N’ihi nke a, na 567 O.A., Kansụl nke Tours “kpọsara ụbọchị 12 ndị ahụ site na Krismas ruo Epiphany dị ka oge dị nsọ na oge ememe.”—The Catholic Encyclopedia for School and Home.

N’oge na-adịghị anya Krismas mịkọọrọ ọtụtụ akụkụ site n’ememe owuwe ihe ubi rụrụ arụ nke ebe ugwu Europe. Oriri na nkwari nọgidere na-adị ebe nile karịa ime ezi omume ka ndị na-eri oriri oké mkpọtụ na-ekere òkè n’iribiga nri na ịṅụbiga mmanya ókè. Kama ikwu okwu megide àgwà ọjọọ dị otú ahụ, chọọchị kwadoro ya. (Tụlee Ndị Rom 13:13; 1 Pita 4:3.) Na 601 O.A., Popu Gregory mbụ degaara Mellitus, onye ozi ala ọzọ ya nọ n’England akwụkwọ, na-agwa ya “ka ọ ghara ịkwụsị ime ememe ndị na-ekpere arụsị oge ochie dị otú ahụ, kama ka o mee ka ha kwekọọ n’ememe nke Chọọchị, na-agbanwe nanị ihe mere e ji eme ha site na nke ndị na-ekpere arụsị gaa ná mkpali ndị Kraịst.” Otú a ka Arthur Weigall, onye bụbu onyeisi nlekọta nke ihe ọkpụtọrọkpụ nke gọọmenti Ijipt si na-akọ ya.

N’oge Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ndị mmadụ bu mgbanwe n’uche nwere mkpa nke ikwu okwu megide mmebiga ihe ókè dị otú ahụ. Ha zipụrụ ọtụtụ iwu megide “mmetọ oriri na nkwari nke Krismas.” Dr. Penne Restad, n’akwụkwọ ya bụ́ Christmas in America—A History, na-asị: “Ụfọdụ ndị ụkọchukwu mesiri ike na oge nke oké mkpali na imefe ihe ókè dị ihe a kpọrọ mmadụ na-ezughị okè mkpa, ọ bụrụhaala na e mere ya n’okpuru nlekọta ndị Kraịst.” Nke a nanị tinyere ihe ná mgbagwoju anya ahụ. Otú ọ dị, nke a enweghị ihe o mere, n’ihi na omenala ndị na-ekpere arụsị bụrịị nke ya na Krismas kekọrọ n’ụzọ chiri anya nke na ihe ka n’ọtụtụ mmadụ adịghị njikere ịhapụ ha. Onye na-ede ihe bụ́ Tristram Coffin si otú a tinye ya: “Ndị mmadụ n’ozuzu ha na-eme kpọmkwem ihe ha na-emebu mgbe nile n’aṅaghị ntị n’arụmụka nke ndị na-achịkwa omume ndị ọzọ.”

Ka ọ na-erule oge ndị Europe malitere ibiri n’Ụwa Ọhụrụ, Krismas bụ ụbọchị ezumike a maara nke ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, Krismas enwetaghị ihu ọma n’ebe ndị ndị ọcha na-achị. Ndị mgbanwe Puritan lere ememe ahụ anya dị ka nke ndị na-ekpere arụsị ma machibido ya iwu na Massachusetts n’agbata 1659 na 1681.

Mgbe e wepụsịrị mmachibido iwu ahụ, ememe Krismas mụbara n’ebe ndị ahụ ndị ọcha na-achị, karịsịa ná ndịda nke New England. Otú ọ dị, n’ihi akụkọ mgbe gara aga nke ụbọchị ezumike ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ụfọdụ nwere nchegbu ka ukwuu n’ikpori ndụ karịa inye Ọkpara Chineke nsọpụrụ. Otu omenala Krismas nke na-emebikarị ihe bụ nke ịṅụ mmanya aghara aghara. Ìgwè ndị ikom dị aghara ga-aba n’ụlọ ndị agbata obi bara ọgaranya ma kwuo ka e nye ha nri na ihe ọṅụṅụ n’efu n’ụdị nke onye jụ a ghọgbuo ya. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ajụ, a na-akpọkarị ya iyi, mgbe ụfọdụkwa e bibie ụlọ ya.

Ọnọdụ ndị dị n’afọ ndị 1820 kawanyere njọ ruo n’ókè nke na “ọgba aghara Krismas” ghọrọ “oké ihe iyi egwu nye ọha na eze,” ka Prọfesọ Nissenbaum na-ekwu. N’obodo ukwu ndị dị ka New York na Philadelphia, ndị ọgaranya nwere ụlọ malitere igo ndị nche n’ọrụ iche ala na ụlọ ha nche. Ọbụna na a sịrị na New York City haziri ndị ọrụ uwe ojii a zụrụ nke ọma maka mmeghachi omume nye ọgba aghara n’oge Krismas nke 1827/1828!

Mgbanwegharị Krismas

Narị afọ nke 19 wetara mgbanwe na-enweghị atụ nye ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị mmadụ, ngwongwo, na akụkọ malitere ịga ngwa ngwa karị ka e nweziri ọtụtụ okporo ụzọ na okporo ígwè. Mgbanwe n’usoro mmepụta ihe wetaara ọtụtụ nde ọrụ, ọtụtụ ụlọ mmepụta ihe nọgidekwara na-emepụta ngwá ahịa. Usoro mmepụta ihe wetakwara nsogbu ọha na eze ndị ọhụrụ na ndị dị mgbagwoju anya, bụ́ ndị mesịrị metụta ụzọ e si gbaa Krismas.

Ọ dịwo anya ndị mmadụ jiworo ụbọchị ezumike mee ihe dị ka ụzọ isi mee ka nkekọ ezinụlọ siwanye ike, otú ahụ ka ọ dịkwa Krismas. Site n’iji ụzọ nhọrọ megharịa ụfọdụ n’ime ọdịnala Krismas ndị ka mee ochie, ndị na-akwalite ya gbanwere ya n’ụzọ dị irè site n’ihe yiri oriri na ọṅụṅụ ọha na eze a na-achịkwaghị achịkwa gaa n’ụbọchị ezumike dabeere n’ezinụlọ.

N’ezie, ka ọ na-erule ná ngwụsị narị afọ nke 19, e lewara Krismas anya dị ka ihe ngwọta nye ọrịa nile nke ndụ ọgbara ọhụrụ America. “N’ime ụbọchị ezumike nile,” ka Dr. Restad na-ekwu, “Krismas bụ ụzọ zuru okè isi buba okpukpe na mmetụta okpukpe n’ebe obibi na maka imezi mmebiga ihe ókè na ọdịda nke ọha mmadụ.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Inye onyinye, ịrụ ọrụ ebere, ọbụna mgbanwerịta ekele ụbọchị ezumike nke enyi na enyi na ịchọ mma na ịnụ ụtọ osisi na-adịghị ama ọkọchị e doro na palọ, ma ọ bụ, ka e mesịrị, n’ụlọ nzukọ Sunday school, jikọrọ onye òtù ezinụlọ ọ bụla n’ebe ibe ya nọ, n’ebe chọọchị dị, nakwa n’ebe ọha na eze nọ.”

N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ ndị taa na-eme ememe Krismas dị ka otu ụzọ isi gosipụta ịhụnanya ha maka ibe ha na iji nye aka ichekwa ịdị n’otu nke ezinụlọ. Otú ọ dị, ihe a na-agaghị eleghara anya bụ akụkụ ndị nke ime mmụọ. Ọtụtụ nde ndị mmadụ na-eme ememe Krismas iji nye ọmụmụ Jisọs nsọpụrụ. Ha pụrụ ịga ofufe ndị pụrụ iche, mee ihe ngosi Ọmụmụ Jisọs n’ụlọ, ma ọ bụ kpee ekpere ekele nye Jisọs n’onwe ya. Ma olee otú Chineke si ele okwu ahụ anya? Ihe ndị a ọ̀ na-enweta nkwado ya? Tụlee ihe Bible nwere ikwu.

“Hụkwanụ Eziokwu na Udo n’Anya”

Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Jisọs dịrị ndụ dị ka okwu ndị ahụ si dị. O kwuru eziokwu mgbe nile. O ṅomiri Nna ya n’ụzọ zuru okè, bụ́ “Jehova, Chineke nke eziokwu.”—Abụ Ọma 31:5; Jọn 14:9.

Site na peji nile nke Bible, Jehova emewo ka o doo anya na ọ kpọrọ ụdị nile nke aghụghọ asị. (Abụ Ọma 5:6) N’ihi nke a, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe megidere ihe e bu n’obi na ọtụtụ ihe e jikọrọ ya na Krismas na-enye echiche ụgha? Dị ka ihe atụ, chee banyere akụkọ ifo maka Santa Claus. Ị̀ nwatụwo ịkọrọ nwatakịrị ihe kpatara Santa ji na-ahọrọ isi ná mpio anwụrụ ọkụ na-aba n’ụlọ kama isi n’ọnụ ụzọ, dị ka ọtụtụ ndị kweere n’ọtụtụ ala? Oleekwa otú Santa si eleta ọtụtụ nde ebe obibi n’otu abalị nanị? Gịnị banyere anụ reindeer na-efe efe? Mgbe nwatakịrị matara na a ghọgbuwo ya n’ihe banyere ikwere na Santa bụ mmadụ n’ezie, ọ̀ bụ na ọ dịghị ebelata ntụkwasị obi ya n’ebe nne na nna ya nọ?

The Catholic Encyclopedia na-ekwu hoo haa, sị: “Omenala ndị na-ekpere arụsị . . . ghọrọ Krismas.” Mgbe ahụ n’ihi gịnị ka Chọọchị Katọlik na chọọchị ndị ọzọ nke Krisendọm ji nọgide na-eme ka ụbọchị izu ike nke omenala ya na-amaliteghị n’ebe ndị Kraịst nọ na-adịgide? Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị egosi ịnabata ozizi ndị na-ekpere arụsị?

Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jisọs agbaghị ndị mmadụ ume ife ya ofufe. Jisọs n’onwe ya sịrị: “Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Matiu 4:10) N’otu aka ahụ, mgbe e bulisịrị Jisọs elu n’eluigwe, otu mmụọ ozi gwara Jọn onyeozi ka ọ “kpọọ isiala nye Chineke,” na-egosi na o nwebeghị ihe gbanwere banyere okwu a. (Mkpughe 19:10) Nke a na-eduga n’ajụjụ bụ́, Jisọs ọ̀ ga-akwado nraranye nke ofufe nile a a na-enye ya, n’abụghị nye Nna ya, n’oge Krismas?

N’ụzọ doro anya, ihe ndị bụ eziokwu banyere Krismas oge a adịghị egosipụta ya dị ka ihe dị mma. Ọ bụ n’ụzọ dị ukwuu ụbọchị ezumike e chepụtara echepụta nke nwere ihe àmà dị ukwuu na-arụtụ aka n’oge ya gara aga rụrụ arụ. Mgbe ahụ, n’ezi akọ na uche nile, ọtụtụ nde ndị Kraịst ekpebiwo ịghara ịgba Krismas. Dị ka ihe atụ, otu ntorobịa a kpọrọ Ryan na-ekwu banyere Krismas, sị: “Ndị mmadụ na-enwe oké mkpali banyere ụbọchị ole na ole n’afọ mgbe ezinụlọ na-abịakọ ọnụ, mmadụ nile na-enwekwa obi ụtọ. Ma gịnị pụrụ nnọọ iche banyere nke ahụ? Nne na nna m na-enye m onyinye mgbe nile n’afọ!” Onye ntorobịa ọzọ, dị afọ 12, na-ekwu, sị: “Ọ dịghị adị m ka o nwere ihe a napụrụ m. Ana m anata onyinye mgbe nile n’afọ, ọ bụghị nanị n’otu ụbọchị pụrụ iche mgbe a na-arụgide ndị mmadụ ịzụta onyinye.”

Zekaraịa onye amụma gbara ndị Israel ibe ya ume ka ha ‘hụ eziokwu na udo n’anya.’ (Zekaraịa 8:19) Dị ka Zekaraịa na ndị ikom oge ochie ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị, ọ bụrụ na anyị ‘ahụ eziokwu n’anya,’ ọ̀ bụ na anyị agaghị ezere ememe okpukpe ụgha na-adịghị enye “Chineke nke dị ndụ nke bụkwa onye eziokwu,” bụ́ Jehova, nsọpụrụ?—1 Ndị Tesalọnaịka 1:9.

[Foto dị na peeji nke 7]

“Ọ dịghị adị m ka o nwere ihe a napụrụ m. Ana m anata onyinye mgbe nile n’afọ”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya