Krismas—N’ihi Gịnị Ka E Ji Eme Ya Ọbụna n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa?
SANTA CLAUS nke Krismas na-echetara anyị otu nkwenkwe ochie e nwere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Nke ahụ bụ nkwenkwe ndị Korea nwere banyere otu onye aha ya bụ Chowangshin, a pụkwara ịhụ ihe yiri nke ahụ n’etiti ụfọdụ ndị China na ndị Japan.
E weere Chowangshin dị ka chi na-ahụ maka kichin, chi nke ọkụ bụ́ onye e jikọrọ ya na ofufe ndị Korea fere ọkụ n’oge ochie. (N’oge ochie, ndị Korea na-eji nlezianya esi n’otu ebe agụrụ icheku ọkụ aga ebe ọzọ, na-akpachara anya ịhụ na ha anyụghị ma ọlị.) E kweere na chi a na-eleba anya n’omume ndị òtù ezinụlọ ruo otu afọ, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ na-esi n’ekwu na na mpio anwụrụ ọkụ arịgo n’eluigwe.
Dị ka e kweere, Chowangshin na-akọrọ eze eluigwe ihe ọ gatara n’ụbọchị nke 23 nke ọnwa December n’ikwekọ ná mpụta nke ọnwa. A na-atụ anya na ọ ga-esi na mpio anwụrụ ọkụ na n’ekwu lọghachi n’ọgwụgwụ afọ, na-eweta ụgwọ ọrụ na ntaramahụhụ dị ka omume onye ọ bụla si dị. N’ụbọchị nlọghachi ya, ndị òtù ezinụlọ ga-amụnye kandụl n’ime kichin nakwa n’ebe ọ bụla ọzọ n’ụlọ ahụ. E nwere ebe ọzọ ihe osise nke chi kichin ahụ si yie Santa Claus—e ji àgwà na-acha uhie uhie see ya! Ọ dị mgbe ọ bụ omenala na nwunye nwa mmadụ ga-akwa sọks ọdịnala abụọ nke ndị Korea ma were ha nye nne di ya n’etiti oge oyi (ihe dị ka December 22). Nke ahụ bụ iji gosipụta ọchịchọ ya ka nne di ya dị ogologo ndụ, ebe ọ bụ na ụbọchị na-aka adị ogologo site n’ụbọchị ahụ.
Ị́ hụghị myirịta ndị dị n’etiti ihe ndị a a kọrọ n’elu na Krismas? Akụkọ na omenala ha yiritara: mpio anwụrụ ọkụ, kandụl, inye onyinye, sọks, agadi nwoke yi uwe na-acha uhie uhie, na ụbọchi ememe ha. Ma, ọ bụghị nanị myirịta ndị dị otú ahụ mere e ji anakwere Krismas n’ụzọ dị mfe na Korea. Ọ fọla nke nta ka nkwenkwe ahụ e nwere banyere Chowangshin pụọ n’anya n’oge mbụ e webatara Krismas na Korea. N’ezie, ihe ka ọtụtụ ná ndị Korea taa amaghị na ọ dị mgbe nkwenkwe dị otú ahụ dị.
Ka o sina dị, nke a na-egosi otú omenala ndị e jikọrọ ha na etiti oge oyi na ọgwụgwụ afọ si gbasaa n’ụwa nile site n’ụzọ dị iche iche. Na narị afọ nke anọ O.A., chọọchị bụ́ isi n’Alaeze Ukwu Rom gbanwere aha Saturnalia, bụ́ ememe ọmụmụ chi anyanwụ nke ndị Rom na-ekpere arụsị, ma mee ka nke a bụrụ akụkụ Krismas. Ememe Krismas bụ nnọọ ntụteghachi nke omenala obodo nke a gụgharịrị aha. Olee otú nke ahụ si kwe omume?
Òkè Inye Onyinye Na-ekere
Inye onyinye bụ otu omenala nke na-akwụsịbeghị. Ruo ogologo oge, ndị Korea enwetawo ọṅụ dị ukwuu site n’inye na ịnara onyinye. Nke a bụ otu ihe mere ememe Krismas ji na-ewu ewu na Korea.
Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, nye ndị agha United States nọ na Korea bụ́ ndị chọrọ ime ka mmekọrịta ha na ndị mmadụ sie ike, chọọchị bụ ebe dị mma izukọta na ikesa onyinye na ihe enyemaka. E mere nke a karịsịa n’Ụbọchị Krismas. Ọtụtụ ụmụaka ji oké mmasị gaa chọọchị, n’ebe ahụ kwa ka e nyere ha chocolate na nke mbụ ya. Dị ka ị pụrụ ịghọta, ọtụtụ n’ime ha na-atụzi anya ka Krismas ọzọ ruo.
Nye ụmụaka ndị ahụ, Santa Claus bụ onye agha America nke kpu okpu uhie. Ilu 19:6 na-asị: “Onye ọ bụla bụkwaara onye na-enye onyinye enyi.” Ee, inye onyinye dịrị nnọọ irè. Ma dị ka ị pụrụ ikwubi site n’amaokwu ahụ, onyinye dị otú ahụ adịghị eme ka e nwee ọbụbụenyi na-adịgide adịgide. Ọbụna na Korea, ahụmahụ ọtụtụ ndị nwere na chọọchị akarịghị ịracha chocolate n’oge ha bụ ụmụaka. Otú ọ dị, e chefughị Krismas. Tinyere ọnọdụ akụ̀ na ụba Korea nke na-arị elu n’ike n’ike, azụmahịa mụbara, inye onyinye n’oge Krismas bụkwa ụzọ dị mfe isi mee ka ndị mmadụ na-azụ ihe. Ndị na-achụ nta ego ji Krismas mee ihe iji mụbaa uru ahịa ha.
Nke ahụ na-eme ka ị ghọta ihe Krismas dị ka ya n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa taa. N’ilekwasị anya n’oké ịzụ ihe a ga-enwe n’oge Krismas, a na-emepụta ngwá ahịa ndị ọhụrụ. Atụmatụ maka mkpọsa ngwá ahịa na-amalite n’etiti oge okpomọkụ. Ọnụ ọgụgụ ihe a na-ere na-akasị arị elu n’ọgwụgwụ afọ, n’ihi ịzụ ihe onyinye Krismas, kaadị, na egwú. Leenụ, mkpọsa ngwá ahịa ga-eme ka onye ntorobịa nọ n’ezinụlọ ihe dịtụụrụ mma nwee obi ilu ma ọ bụrụ na ọ nọ n’ụlọ ná Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ ma ghara inweta onyinye ọ bụla.
Ka Ụbọchị Krismas na-eru nso, ụlọ ahịa ukwu na ndị nta dị na Seoul na-ejupụta ná ndị bịara ịzụ ihe onyinye, otú ahụ ka ọ dịkwa n’obodo ndị ọzọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. A na-enwe ọnọdụ agaghị ihu ma ọ bụ azụ n’okporo ụzọ. Ndị mmadụ na-ejupụta na họtel, ógbè achụmnta ego, n’ụlọ nri, na n’ụlọ oriri na nkwari abalị. A pụrụ ịnụ ụda oriri oké mkpọtụ—ịbụ abụ n’olu dara ụda. Ná Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ, a na-ahụ ndị ikom na ndị inyom mmanya na-egbu ka ha na-aga n’okporo ámá a tụsasịrị ihe.
Otú ahụ ka ọ dị. Krismas n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa abụghịzi ezumike nke ndị sị na ha bụ ndị Kraịst na-eduzi. N’ụzọ doro anya, na Korea dịkwa ka ọ dị n’ebe ọ bụla ọzọ, azụmahịa ebutewo ụzọ n’irite uru dị ukwuu n’ezumike a nke Krisendọm. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ nanị iji ya mere oge azụmahịa mere Krismas ji ghọọ ihe na-ekwekọtụghị ná mmụọ nke Kraịst? Ọ dị ezi ndị Kraịst mkpa inyochakwu ihe ndị siri ike nke a gụnyere.
Mmalite nke Krismas
Anụ ọhịa e tinyere n’ime ogige n’ebe a na-edebe anụ ọhịa ka bụ anụ ọhịa. Ọ ga-abụkwa ihie ụzọ dị ize ndụ iche na ọ ghọwo anụ ụlọ nanị n’ihi na ọ nọọla n’ime ogige ruo oge ụfọdụ ma na-eyi ka ọ̀ na-eso ụmụ ya egwuri egwu. Ị pụrụ ịnụwo akụkọ banyere ebe anụ wakporo ndị na-arụ ọrụ n’ogige ebe a na-edebe anụ ọhịa.
N’ụzọ ụfọdụ, anyị pụrụ ikwu nnọọ otu ihe ahụ banyere ememe Krismas. Na mbụ ọ bụ “anụ ọhịa” nke na-adịghị n’Iso Ụzọ Kraịst. N’okpuru isiokwu nta bụ́ “Ihe Jikọrọ Ya na Saturnalia nke Rom,” akwụkwọ bụ́ The Christian Encyclopedia (dị n’asụsụ Korean)a na-ekwu banyere Krismas, sị:
“Ememe Saturnalia na Brumalia nke ndị na-ekpere arụsị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’omenala ndị na-ewu ewu nke na mmetụta ndị Kraịst apụghị iwezụga ha n’ụsọ. Nnakwere eze ukwu Constantine nakweere Sunday (ụbọchị Phœbus na Mithras nakwa Ụbọchị Onyenwe Anyị) . . . pụrụ idugawo ndị Kraịst nke narị afọ nke anọ iche na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ime ka ụbọchị ọmụmụ nke Ọkpara Chineke na nke anyanwụ dabakọọ. Ememe ndị ahụ na-ekpere arụsị tinyere ememe oké mkpọtụ nakwa oriri na nkwari ya, na-ewu nnọọ ewu nke na obi dị ndị Kraịst ụtọ inweta ihe ngọpụ iji nọgide na-eme ememe ahụ, na-agbanwetụ ọnọdụ uche ma ọ bụ otú a na-eji eme ya.”
Ì chere na ihe dị otú ahụ pụrụ ime n’enweghị ndị ọ bụla megidere ya? Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ekwu, sị: “Ndị Kraịst na-eme nkwusa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa nakwa na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa mere mkpesa megide ejighị ihe kpọrọ ihe na-ekwesịghị ekwesị nke e ji na-eme ememe ụbọchị ọmụmụ Kraịst, ebe ndị Kraịst nọ na Mesọpotemia boro ụmụnna ha nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ebubo ikpere arụsị na ife anyanwụ ofufe n’ihi ịnakwere ememe ndị na-ekpere arụsị a dị ka nke ndị Kraịst.” N’ezie, ihe agazighị agazi site ná mmalite. “Ma, a nakweere ememe ahụ ngwa ngwa, ọ ghọkwara nke e guzobesiri ike n’ikpeazụ nke na ọbụna mgbanwe ndị Protestant nke narị afọ nke iri na isii apụghị iwezụga ya,” ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ekwu.
Ee, e webatara ememe chi anyanwụ, nke na-abụghị akụkụ ezi Iso Ụzọ Kraịst, n’ime chọọchị bụ́ isi. A gụgharịrị ya aha—ma njimara ikpere arụsị ya ka dịgidere. O nyekwara aka ime ka ikpere arụsị bamie abamie n’ime chọọchị ndị na-aza ndị Kraịst n’ọnụ, nyekwa aka mebie ọnọdụ ime mmụọ nke ndị mmadụ n’otu n’otu. Akụkọ ihe mere eme na-agba akaebe na ka Krisendọm nọ na-eto, e ji omume rụrụ aru na agha ime ihe ike dochie àgwà mbụ ahụ bụ́ “na-ahụnụ ndị iro unu n’anya.”
Ka oge na-aga, o doro anya na n’agbanyeghị aha adịgboroja ya, Krismas ji oriri oké mkpọtụ, ịṅụbiga mmanya ókè, oriri na nkwari, ịgba egwú, inye onyinye, na iji okooko osisi na-adịghị ama ọkọchị achọ ebe obibi mma gosipụta na o sitere n’aka ndị na-ekpere arụsị. Iji nweta ihe mgbaru ọsọ kasịnụ nke azụmahịa—irekwu ihe—e jiriwo Krismas mee ihe n’ụzọ nile o kwere mee maka abamuru onwe onye. Usoro mgbasa ozi na-eto ya; ọ na-amasịkwa nnọọ ọha na eze. N’ebe ndịda Seoul, otu ụlọ ahịa nke na-ere nanị uwe ime pụtara n’akụkọ ụwa na telivishọn site n’igosipụta na windo ya, osisi Krismas nke e ji nanị uwe ime chọọ mma. A hụrụ ọnọdụ na-egosi na a na-agba Krismas, ma a hụghị ihe ama ọ bụla nke ịnabata Kraịst.
Nkọwa Akwụkwọ Nsọ Banyere Krismas
Gịnị ka anyị na-amụta site n’akụkọ ihe mere eme dị otú ahụ? Ọ bụrụ na a kpọchie uwe n’ụzọ na-ahaghị nhata site ná mmalite, nanị ụzọ a ga-esi emezi ọnọdụ ahụ bụ site n’ịmaliteghachi n’isi. Nke ahụ ọ́ bụghị eziokwu? N’agbanyeghị eziokwu ahụ, ụfọdụ na-arụ ụka na n’agbanyeghị mkpọrọgwụ ọ gbanyere n’ofufe anyanwụ nke ndị na-ekpere arụsị, Krisendọm anakwerela Krismas. Ya mere ha na-eche na e doola ezumike ahụ nsọ dị ka ụbọchị ọmụmụ Kraịst ma mee ka o nwee ihe ọhụrụ ọ pụtara.
Anyị pụrụ ịmụta ihe bara uru site n’otu ihe omume weere ọnọdụ na Juda oge ochie. Na 612 T.O.A., ndị Juda webatara ofufe anyanwụ nke ndị na-ekpere arụsị n’ime ụlọ nsọ dị na Jerusalem. È doro ikpere arụsị dị otú ahụ nsọ site n’ịbụ nke a nọ na-eme n’ebe e mere maka ofufe dị ọcha nke Jehova Chineke? Onye so dee Bible bụ́ Ezikiel dere banyere ofufe anyanwụ ahụ e fere n’ụloukwu Jerusalem, sị: “Lee, n’ọnụ ụzọ ụlọukwu nke Jehova, n’etiti ụzọ mbata na ebe ịchụàjà, ka ihe ha ka [iri ndị ikom abụọ na ise] nọ, . . . chee ihu ha n’akụkụ Ihu anyanwụ; ndị ahụ na-akpọkwa isiala nye anyanwụ chee Ihu anyanwụ ihu. O wee sị m, Ị̀ hụwo, nwa nke mmadụ? Ọ̀ bụụrụ ụlọ Juda ihe dị mfe ime ihe arụ nile nke ha meworo n’ebe a? n’ihi na ha emejuwo ala ha n’ihe ike, wee chigharịa ịkpasu m iwe; ma, lee, ha na-esetịpụ alaka ruo imi ha.”—Ezikiel 8:16, 17.
Ee, kama ịbụ ihe e doro nsọ, ofufe ndị na-ekpere arụsị ahụ tinyere ụlọ nsọ ahụ dum n’ihe ize ndụ. Omume ndị dị otú ahụ gbasara ebe nile na Juda ma tụnye ụtụ n’ịba ụba nke ime ihe ike na omume rụrụ arụ n’ala ahụ. Otú ahụ ka ọ dị na Krisendọm, bụ́ ebe omume ndị gbanyere mkpọrọgwụ n’ofufe anyanwụ nke Saturnalia na-apụta ìhè n’oge Krismas. N’ụzọ dị ịrịba ama, afọ ole na ole mgbe Ezikiel hụsịrị ọhụụ ahụ, Jerusalem nwetara ikpe ọmụma Chineke—o zutere mbibi n’aka ndị Babilọn.—2 Ihe E Mere 36:15-20.
Ị pụrụ ịhụtawo nkọwa ahụ ọkà mmụta bụ́ onye Korea nyere banyere Jisọs na-eto eto, bụ́ nke a kọrọ n’isiokwu bu ụzọ, dị ka ihe na-atọ ọchị. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na n’ịbụ ihe onye na-enweghị ezi ihe ọmụma banyere Kraịst kwuru, mmeghachi omume ahụ kwesịtụrụ ekwesị. Ọ pụrụ ime ka ndị na-eme ememe Krismas chesie echiche ike. N’ihi gịnị? N’ihi na Krismas adịtụghị egosipụta Kraịst n’ụzọ ziri ezi. N’ezie, ọ na-ezochi ezi ọnọdụ ọ nọ na ya ugbu a. Jisọs abụghịzi nwa ọhụrụ nọ n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ.
Ugboro ugboro, Bible na-eme ka ọ pụta ìhè na Jisọs bụzi Mesaịa, Eze dị ike nke Alaeze eluigwe Chineke. (Mkpughe 11:15) Ọ dị njikere ịkwụsị ịda ogbenye na nhụsianya bụ́ ndị ụfọdụ mmadụ na-echefubeghị n’oge Krismas ka ha na-arụ ọrụ ebere.
N’eziokwu, Krismas ababeghịrị ma ala Krisendọm ma mba ndị ọzọ, gụnyere ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, uru ọ bụla. Kama nke ahụ, ọ dọpụwo uche n’ebe ezi ozi ndị Kraịst banyere Alaeze Chineke na ọgwụgwụ usoro ihe dị ugbu a dị. (Matiu 24:14) Anyị na-agba gị ume ịjụ Ndịàmà Jehova banyere otú ọgwụgwụ ahụ ga-esi bịa. Ị pụkwara isi n’aka ha mata ngọzi na-adịgide adịgide ndị ga-esochizi n’elu ụwa, n’okpuru nduzi nke Alaeze Chineke na Eze ya na-achị achị, bụ́ Jisọs Kraịst.—Mkpughe 21:3, 4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ dabeere n’akwụkwọ bụ́ The New Schaff-Herzog Encyclopedia of Religious Knowledge.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo/dị na peeji nke 5]
Ọtụtụ ụmụaka ji oké mmasị gaa chọọchị ma nata onyinye chocolate. Ha na-atụzi anya ka Krismas ọzọ ruo
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Krismas nyere aka ime ka ikpere arụsị bamie abamie n’ime chọọchị ndị na-aza ndị Kraịst n’ọnụ
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo/dị na peeji nke 8]
Kraịst abụghịzi nwa ọhụrụ kama ọ bụ Eze dị ike nke Alaeze Chineke
[Foto dị na peeji nke 7]
Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ n’ebe ndịda Seoul, Korea