Krismas—n’Ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Na-eme Ya na Japan?
IKWENYE na Fada Krismas gbanyere mkpọrọgwụ dị omimi n’obi ụmụntakịrị ná mba ahụ nke ndị na-ekpe okpukpe Buddha na Shinto, bụ́ Japan. Na 1989, ụmụntakịrị bụ ndị Japan degaara ụlọ ọrụ Santa World nke dị na Sweden akwụkwọ ọnụ ọgụgụ ya dị 160,000. Ọ dịghị mba ọzọ zigara akwụkwọ ozi karịrị nke ahụ. Ha dere akwụkwọ ozi ndị ahụ n’olileanya nke inweta ihe obi ha na-achọsi ike, ma ọ bụ ihe egwuregwu “Graphic Computer” ahụ ọnụ ahịa ya bụ 18,000 yen ($136, U.S.) ma ọ̀ bụkwanụ ihe egwuregwu vidio a na-ebugharị ebugharị nke ọnụ ahịa ya bụ 12,500 yen ($95, U.S.).
Nye ụmụ agbọghọ ndị Japan, inwe nwa okoro ha na ha yiri oge mkpapụ ná Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ bụ oké ihe. “Dị ka nnyocha e mere n’etiti ụmụ agbọghọ gosiri,” ka akwụkwọ akụkọ bụ Mainichi Daily News kọrọ, “38 pasenti kwuru na ha emewo atụmatụ ihe ha ga-eme ná Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ otu ọnwa tupu ụbọchị ahụ eruo.” Ụmụ okorobịa na-enwe ihe ọzọ ha bu n’obi n’ịchọ ka ha na ndị enyi ha nwanyị nọkọọ ná Mgbede Ụbọchị Bu Krismas Ụzọ. “Otu echiche dị mma bụ ka gị na enyi gị nwanyị kpekọọ ekpere nanị unu n’ụzọ dị nwayọọ,” ka otu magazin ndị na-eto eto tụrụ n’aro. “Nọrọ ebe mara mma mee ya. Mkpakọrịta unu ga-adịwanye omimi ngwa ngwa.”
Ndị Japan bụ di nwekwara olileanya ịkpalite ike majik ụfọdụ site n’omenala Krismas ha nke ịzụta “achịcha ịchọ mma” mgbe ha si ọrụ na-alọta. Ịrụ ọrụ Santa Claus nke bụ iwelata “achịcha” ahụ ụlọ bụ ihe a na-ewere na ọ na-akwụ ụgwọ maka nlefuru anya o lefuruworo ezinụlọ ya n’akụkụ fọdụrụ n’afọ ahụ.
N’ezie, Krismas agbanyewo mkpọrọgwụ n’etiti ndị Japan ahụ na-abụghị ndị Kristian. N’eziokwu, 78 pasenti nke mmadụ ndị otu usoro ụlọ ahịa nyochara kwuru na ha na-eme ihe pụrụ iche maka Krismas. Nkezi ya hiri nne nke ukwuu ná mba nke ọ bụ nanị 1 pasenti nke ndị bi n’ime ya na-ekwu na ha kwenyere n’Iso Ụzọ Kraịst. Ọ bụ ezie na ha na-ekwu na ha bụ ndị okpukpe Buddha ma ọ bụ ndị Shinto, ha na-atụsara nnọọ ahụ ịnọrị ezumike nke a nke ndị “Kristian.” N’almanak ya, gụnyere ememe ndị ọzọ nke ndị Japan, Ụlọ Chi ndị Shinto ahụ a ma ama, bụ́ Ise, depụtara December 25 dị ka “ụbọchị ọmụmụ Kraịst.” Otú ọ dị, ọhụhụ a na-ahụ ndị na-abụghị ndị Kristian ka ha na-eri, na-akwari, na-ewelite ajụjụ ahụ bụ:
Ememe Òle Ndị Ka Krismas Bụ?
Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary kọwara Krismas dị ka “oriri ndị Kraịst nke a na-eme na December 25 . . . nke e ji echeta ọmụmụ Kraịst.” E lewo ya anya dị ka oge maka “ndị Kraịst” ‘ịdị n’otu ná mmetụta nke ọṅụ ha n’ụbọchị ọmụmụ Kraịst.’
Ndị na-eme ememe Krismas dị ka ihe metụtara nanị okpukpe pụrụ ile ndị na-eme ka ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị ihe omume nkịtị site n’oriri na nkwari na inyerịta onyinye anya dị ka ihe mkpasu iwe na ọbụna ihe na-ekwulu Chineke. “Na Japan, anyị nwere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke oké azụmahịa: e nweghị Kraịst ọ bụla dị na ya,” ka otu onye America bi na Japan dere. “Dị ka ndị Ọdịda Anyanwụ Ụwa si ele ihe anya,” ka otu onye ọzọ dere banyere Krismas nke ndị Japan, “ọ bụghị anụ torotoro ahụ [nke a na-adịghị ahụkebe n’ahịa ndị Japan] bụ ihe na-adịghị ya, kama ọ bụ ihe ahụ kasị mkpa, bụ́ mmụọ nke Krismas.”
Ya mere, gịnị bụ mmụọ nke Krismas? Ọ̀ bụ ọnọdụ nke ije ofufe nru na chọọchị, ya na ịbụ abụ carol dị iche iche, ahịhịa holly, na kandụl ya, bụ́ nke ọtụtụ ndị na-eji eme ihe nanị n’otu mgbe ahụ ha na-eje chọọchị n’afọ? Ka ọ̀ bụ ịhụnanya ahụ, obi ụtọ ahụ, na inyerịta onyinye nke na-akpali ọtụtụ mmadụ imesapụ aka? Ọ̀ bụ ọnọdụ ịda jụụ nke a na-enwe n’ihu agha mgbe ndị agha na-edebe ụbọchị ole na ole nke “udo n’elu ala”?
N’ụzọ dị ịtụnanya, mmụọ Krismas ahụ adịghị eweta udo ọbụna n’ụlọ. Dị ka otu nnyocha e mere na 1987 n’England gosiri, e mere atụmatụ na ‘agha’ ga-etiwapụ na 70 pasenti n’ime ezinụlọ ndị Britain n’oge Krismas nke afọ ahụ. Ise okwu n’ihi ego ga-abụ ihe kasị na-akpata ya. Ịṅụbiga mmanya ókè na mmadụ arụzughị ọrụ dịịrị ya n’ezinụlọ na-edujekwa n’ịlụ ọgụ.
“Ana m eche na ọ dị ihe na-efunarị anyị banyere ihe Krismas pụtara n’ezie,” ka otu onye si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa nke bi na Japan dere, bụ́ onye jere obodo ya n’oge Krismas n’oge na-adịghị anya gara aga. “Na Dec. 25 ọ bụla, ana m enwe ọchịchọ nke ịlaghachi n’ụdị ochie ahụ nke Krismas a na-eme n’ogologo oge gara aga—ememe ndị ọgọ mmụọ ahụ nke e ji eme ememe ụbọchị kasị ogologo nke oge oyi site n’ife osisi dị iche iche ofufe na inwe oriri oké mkpọtụ nke ìgwè mmadụ. Anyị ka nwere ihe nile ahụ e ji achọ mma, bụ́ ndị metụtara ndị ọgọ mmụọ—ahịhịa mistletoe, holly, osisi fir na ihe ndị ọzọ—ma n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, Krismas abụbeghị otu ihe ahụ kemgbe ndị Kristian weghaara ya n’ike ma mee ka ọ ghọọ ememe okpukpe.”
Ọ bụ ihe a na-adịghị arụ ụka na Krismas bụ ezumike ndị ọgọ mmụọ. Ndị Kraịst oge gboo emeghị ya “n’ihi na ha lere ememe ncheta ọmụmụ nke onye ọ bụla anya dị ka omenala ndị ọgọ mmụọ,” ka akwụkwọ The World Book Encyclopedia kwuru. Ememe ndị ọgọ mmụọ bụ Saturnalia na nke Afọ Ọhụrụ bụ ebe e si nweta ime oriri na nkwari na inyerịta onyinye.
Ọ bụrụ na Krismas bụ nke ndị ọgọ mmụọ n’ezie, ezi ndị Kraịst aghaghị ịjụ ajụjụ ahụ bụ, Krismas ọ̀ dịịrị ndị Kraịst? Ka anyị hụ ihe Bible kwuru banyere ime ememe ụbọchị ọmụmụ Kraịst.
[Igbe dị na peeji nke 4]
Mmalite nke Ememe Krismas
Ọ bụ ezie na a machakwaghị kpọmkwem ihe nile metụtara ya n’ihi na o wewo ogologo oge, ihe dị iche iche na-egosi na ka ọ na-erule afọ 336 O.A., chọọchị ndị Rom amalitewo ime otu ụdị nke Krismas. “E leziri anya debe ụbọchị a ga na-eme Krismas ka ọ bụrụ December 25,” ka akwụkwọ bụ The New Encyclopædia Britannica kọwara, “iji kwazụga n’ụsọ oké ememe ahụ nke chi nke anyanwụ.” Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị ọgọ mmụọ na-eme oriri oké mkpọtụ nke ìgwè mmadụ ha n’oge ememe nke ma Saturnalia ndị Rom ma nke oriri ụbọchị kasị ogologo nke oge oyi ndị Celt na ndị Germany. Akwụkwọ bụ The New Caxton Encyclopedia kwuru na “Chọọchị ahụ weere ohere ahụ mee ihe ime ka ememe ndị a ghọọ nke ndị Kristian.”