Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 12/15 p. 2-4
  • Gịnị Ka Krismas Pụtara Nye Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Krismas Pụtara Nye Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ihe Omume Achụmụnta Ego”
  • Krismas—n’Ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Na-eme Ya na Japan?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Krismas—N’ihi Gịnị Ka E Ji Eme Ya Ọbụna n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Ndị Mmadụ Na-atụ Anya Ya n’Oge Krismas
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 12/15 p. 2-4

Gịnị Ka Krismas Pụtara Nye Gị?

Olee otú ị ga-esi zaa? Krismas bụ (1) oge isoro ezinụlọ gị nọkọọ; (2) oge nnọkọ oriri na ọṅụṅụ; (3) oge ikpe okpukpe; (4) oge nchekasị; (5) oge icheta oge ndị gara aga; (6) oge nke oké azụmahịa.

ỌBỤ ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe ijuanya, n’ime ihe gafere 1,000 mmadụ a gbara ajụjụ ọnụ na Britain, nanị 6 pasent lere Krismas anya dị ka ihe bụ n’ụzọ bụ isi ememe okpukpe. N’ụzọ dị iche, 48 pasent na-eche banyere Krismas n’ụzọ ka ukwuu dị ka oge isoro ezinụlọ ha nọkọọ. N’ezie, ọtụtụ na-ekwusi ike na ọ bụ oge pụrụ iche nye ụmụntakịrị. Dị ka a na-ahụkarị, mgbe a jụrụ otu nwa agbọghọ nta dị afọ 11 ihe kasị amasị ya banyere Krismas, ọ zaghachiri, sị: “Mkpali ahụ, mmetụta nke obi ụtọ, [na] inye onyinye.” Akwụkwọ bụ́ The Making of the Modern Christmas na-ekweta na “ihe ndị a kasị emesi ike na . . . Krismas ‘ọdịnala’ bụ n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya n’ebe obibi, ezinụlọ na karịsịa ụmụntakịrị.”

Ma ọ bụ karịsịa na Krisendọm ọdịda anyanwụ ka Krismas bụ ihe omume ezinụlọ, mgbe ndị ikwu na-ezukọta ịgbanwerịta onyinye. Ná mba ebe Chọọchị Eastern Orthodox gbanyesiri mkpọrọgwụ ike, ndị mmadụ na-etinyekarị uche n’Ista; ma, oge Krismas na-abụkarịkwa oge ezumike.

“Ihe Omume Achụmụnta Ego”

Krismas “enwewo usoro oké mgbanwe . . . nke azụmahịa,” ka akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu. Ma eleghị anya ọ dịghị ebe ọzọ nke a bụ eziokwu karịa na Japan.

“Ndị Japan ahapụwo ngosi nile nke okpukpe ma gbanwee Krismas ịghọ ihe omume achụmụnta ego kpam kpam,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Daily Record nke Washington na-akọ. Krismas na Japan, ka ọ na-ekwukwasị, bụ “ememe bụ isi nke a na-emesikarị azụmahịa ike na ya kama ghara ịdị na-emesicha akụkụ nke okpukpe ike.”

Ọbụna n’ọtụtụ mba ndị a na-akpọ nke ndị Kraịst, ọ na-esikarị ike ịchọpụta ‘akụkụ a nke okpukpe.’ Ihe dị ka 40 afọ gara aga, otu mpempe akwụkwọ na-ekwugide ime Krismas kwara arịrị, sị: “Ụwa azụmahịa na-akwalite Krismas. Ọ bụ oge a kasị achụta ego n’afọ. Ndị o ji ego achụ ego sị na ha bụ ndị Kraịst na-elepụ anya n’ihu maka oge Krismas, ọ bụghị n’ihi Kraịst, kama n’ihi uru ego.” Lee ka okwu ndị ahụ si bụrụ eziokwu taa! N’ọtụtụ ala, ọ na-afọ nke nta ka anyị ghara iru ọnwa atọ ndị ikpeazụ n’afọ tupu anyị ewee malite ịnụ ihe ncheta dị iche iche nke ụbọchị ole fọrọnụ iji zụta ihe onyinye dị iche iche maka Krismas ọzọ. Azụmahịa na-ebiriwanye ọkụ ka afọ na-agwụ, na-enwe ihe ruru otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ihe nile e rere n’ụlọ ahịa dị iche iche n’ime otu afọ n’oge Krismas.

N’agbanyeghị ihe Krismas pụtara nye gị ugbu a, ị pụrụ ịdị na-eche otú o si malite. N’ezie, Bible ọ̀ na-akwado inye onyinye nke Krismas? Ememe Krismas nke taa hà bụ n’ezie nke ndị Kraịst? Ka anyị lee.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji 2]

Ihu Akwụkwọ: Thomas Nast/Dover Publications, Inc., 1978

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya