Ihe Ndị Mmadụ Na-atụ Anya Ya n’Oge Krismas
‘Mgbagharị na-ezu anyị ahụ́ n’oge Krismas. N’ihi ya, anyị anaghị enwecha ohere ka anyị na ndị ikwu na ibe anyị nọrịa otú o kwesịrị. Mgbe ụfọdụ, ike na-agwụcha anyị nke na anyị anaghị enwe obi ụtọ anyị tụrụ anya inwe.’ —BRAD HENRY, ONYE BỤ́BU GỌVANỌ STEETI ỌKLAHOMA [N’AMERỊKA]. O KWURU YA NA DISEMBA 23, 2008.
Ọ NA-ABỤ oge Krismas ruwe, abụ ndị a na-abụ, fim, na ihe ndị ọzọ a na-egosi na tiivi na-eme ka ịgba Krismas gụsiwe ndị mmadụ ike. Olee ihe i chere na ọ bụ ya kacha eme ka ndị mmadụ na-agba Krismas?
● Ọ̀ bụ ka ha cheta Jizọs Kraịst?
● Ọ̀ bụ ka ha nweta obi ụtọ ma ha nye ndị mmadụ onyinye?
● Ọ̀ bụ ka ha nyere ndị nọ ná mkpa aka?
● Ọ̀ bụ ka ha na ndị ezinụlọ ha nọrịa?
● Ka ọ̀ bụ ka ha mee ka ha na ndị ọzọ dịrị n’udo?
Ihe ahụ Gọvanọ Henry kwuru gosiri na ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike imezu nke ọ bụla n’ime ihe ise a n’oge Krismas. Oge Krismas na-abụkarị oge mgbagharị, oge ike na-agwụcha ndị mmadụ, na oge ndị mmadụ ji achụ ego. Ajụjụ bụzi, ndị mmadụ hà nwere ike inweta ezigbo obi ụtọ ha chere na ha ga na-enweta n’oge Krismas?
Baịbụl gwara anyị niile ka anyị na-echeta Jizọs Kraịst, ka anyị na-enye ndị ọzọ onyinye, ka anyị na-enyere ndị nọ ná mkpa aka, nakwa ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na-anọrị. Ọ gwakwara anyị otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo. N’ihi ya, ihe isiokwu isii na-esonụ ga-eleba anya abụghị ihe mere ụfọdụ ndị anaghị agba Krismas,a kama ọ ga-aza ajụjụ ndị na-esonụ:
● Gịnị ka ụfọdụ ndị chere na ọ bụ ya mere e kwesịrị iji na-agba Krismas?
● Gịnị mere o ji esiri ndị mmadụ ike imezu ihe ha bu n’obi na-agba Krismas?
● Olee ihe Baịbụl kwuru nke nyeerela ọtụtụ nde mmadụ aka ịchọpụta ihe bara uru karịa Krismas?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke mere ụfọdụ ndị ji kpebie na ha agakwaghị na-agba Krismas, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị—Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Anaghị Agba Krismas?” Ọ dị na peeji nke 10.