Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwfq isiokwu 18
  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?
  • Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwukarị
  • Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas?
  • Ò nwere oké ihe dị n’ịgba Krismas?
  • Ihe Ndị Mmadụ Na-atụ Anya Ya n’Oge Krismas
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Anaghị Agba Krismas?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Krismas—n’Ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Na-eme Ya na Japan?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
ijwfq isiokwu 18
Ebe nne na nna na-agwa obere nwa ha nwoke okwu, ka ọ na-emepe onyinye dị ná ngwugwu.

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwukarị

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas bụ maka na ha ekweghị na Jizọs.

Nke bụ́ eziokwu: Anyị bụ Ndị Kraịst. Anyị kweere na ọ bụ naanị n’aka Jizọs Kraịst ka a ga-esi zọpụta anyị.—Ọrụ Ndịozi 4:12.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ndịàmà Jehova na-akpata ọgba aghara n’ezinụlọ n’ihi na ha na-agwa ndị òtù ha agbala Krismas.

Nke bụ́ eziokwu: Anyị ejighị ezinụlọ egwu egwu, anyị na-ejikwa Baịbụl eme ka ezinụlọ dị iche iche na-ebi n’udo.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ihe ya na ịgba Krismas na-eso, ya bụ, inye onyinye, ikwu ka e nwee udo n’elu ụwa, na ime amara, na-efunahụ unu.

Nke bụ́ eziokwu: Anyị na-agbalị emesapụ aka, na-emekwa udo kwa ụbọchị. (Ilu 11:25; Ndị Rom 12:18) Dị ka ihe atụ, otú anyị si enwe ọmụmụ ihe anyị na otú anyị si ekwusa ozi ọma dabara n’ihe Jizọs kwuru, nke bụ́, “unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Ihe ọzọkwa bụ na anyị na-agwa ndị mmadụ na ọ bụ Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee ezigbo udo n’ụwa.—Matiu 10:7.

Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas?

  • Jizọs nyere anyị iwu ka anyị na-echeta ọnwụ ya, ọ bụghị ọmụmụ ya.—Luk 22:19, 20.

  • Ndịozi Jizọs na ndị mbụ soro ụzọ Jizọs agbaghị Krismas. Otu akwụkwọ a na-akpọ New Catholic Encyclopedia sịrị na “ọ bụ malite n’afọ 243 gawa ka e mewere oriri maka ọmụmụ Kraịst.” Ọ pụtara na e bidoro ime ya, ihe karịrị otu narị afọ onyeozi ikpeazụ Jizọs nwụchara.

  • E nweghị ihe gosiri na ọ bụ n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba ka a mụrụ Jizọs. Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ ya.

  • Anyị kweere na ememme Krismas adịghị Chineke mma n’ihi na o si n’ememme ndị ọgọ mmụọ malite.—2 Ndị Kọrịnt 6:17.

Ò nwere oké ihe dị n’ịgba Krismas?

Ọtụtụ ndị ka na-agba Krismas n’agbanyeghị na ha ma na o si n’ememme ndị ọgọ mmụọ nakwa na Baịbụl akwadoghị ya. Ndị dị otú a nwere ike ịna-ajụ, sị: Gịnị mere ụfọdụ Ndị Kraịst ga-eji ghara ịgba ya ebe ọtụtụ Ndị Kraịst na-agba ya? Ò nwere oké ihe dị na ya?

Baịbụl gwara anyị ka anyị na-eche echiche n’onwe anyị n’ihi na anyị nwere ‘ikike iche echiche.’ (Ndị Rom 12:1, 2) Baịbụl na-akụzikwara anyị ka anyị jiri eziokwu kpọrọ ihe. (Jọn 4:23, 24) Ọ bụ eziokwu na otú ndị ọzọ si were anyị dị anyị mkpa, ma anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka ndị ọzọ kpọọ anyị asị.

Ọ bụ eziokwu na anyị kpebiri na anyị agaghị na-agba Krismas, ma anyị na-ahapụ ndị mmadụ ka ha jiri ka ha kpebie ma hà ga-agba ma ọ̀ bụ na ha agaghị agba. Anyị anaghịkwa enye ndị na-agba ya nsogbu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya