Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 6 p. 15
  • Ndị Kraịst, Hà Kwesịrị Ịna-agba Krismas?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Kraịst, Hà Kwesịrị Ịna-agba Krismas?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Krismas—n’Ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Na-eme Ya na Japan?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ihe I Kwesịrị Ịmara Banyere Krismas
    Teta!—2002
  • Mkpọrọgwụ nke Krismas Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Gịnị Ka Krismas Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 6 p. 15

NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .

Ndị Kraịst, Hà Kwesịrị Ịna-agba Krismas?

Ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ụwa kweere na Krismas bụ ememme e ji echeta ụbọchị a mụrụ Jizọs Kraịst. Ma, ị̀ jụtụla onwe gị ma Ndị Kraist oge mbụ, dị ka ndịozi Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, hà gbara Krismas? Ị̀ ma ihe Baịbụl kwuru gbasara ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ? Ọ bụrụ na anyị amata azịza ajụjụ ndị a, ọ ga-enyere anyị aka ịma ma Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-agba Krismas.

Ihe mbụ anyị kwesịrị ịma bụ na o nweghị ebe Baịbụl kwuru na Jizọs ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ fere Chineke chetara ụbọchị ọmụmụ ya. Akwụkwọ Nsọ kọrọ naanị gbasara mmadụ abụọ mere ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ ha. Mmadụ abụọ ndị a anaghị efe Jehova, bụ́ Chineke e dere Okwu ya na Baịbụl. Baịbụl akọghị akụkọ ọma gbasara ememme ncheta ọmụmụ abụọ ndị a. (Jenesis 40:20; Mak 6:21) Otu akwụkwọ aha ya bụ Encyclopædia Britannica, kwuru na Ndị Kraịst oge mbụ akwadoghị “ememme ndị ọgọ mmụọ bụ́ icheta ụbọchị ọmụmụ.”

Olee ụbọchị a mụrụ Jizọs?

Baịbụl ekwughị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jizọs. Otu akwụkwọ aha ya bụ McClintock and Strong’s Cyclopedia kwuru, sị: “Anyị agaghị esili n’Agba Ọhụrụ ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ mata ụbọchị a mụrụ Kraịst.” O doro anya na ọ bụrụ na Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-echeta ụbọchị a mụrụ ya, ọ gaara eme ka ha mata kpọmkwem ụbọchị a mụrụ ya.

Ihe nke abụọ bụ na o nweghị ebe e dere na Baịbụl na Jizọs ma ọ bụ onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya gbara Krismas. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru na ebe mbụ a kpọtụrụ ịgba Krismas aha bụ na kalenda Philocalus, bụ́ kalenda ndị Rom. Ọ bụ n’afọ 336 ka e dere akwụkwọ e si nweta ihe ndị e dere na kalenda ahụ. Ihe ọ pụtara bụ na e dechaala Baịbụl, ihe dị ka narị afọ atọ agaakwa Jizọs bịara n’ụwa tupu e nwee ebe mbụ a kpọtụrụ Krismas aha. Akwụkwọ ahụ kwuziri, sị: “O doro anya na ọ bụghị Chineke kwuru ka a na-agba Krismas, e kwughịkwa ka a na-agba ya n’Agba Ọhụrụ.”a

Olee ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta?

Onye Ozizi Ukwu anyị bụ́ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe doro anya ọ chọrọ ka ha na-eme, e dekwara ihe ndị ahụ na Baịbụl. Ịgba Krismas esoghị n’otu n’ime ha. Otú ahụ onye nkụzi na-agaghị achọ ka ụmụ akwụkwọ ya hapụ ihe ọ gwara ha mee, mewa ihe ọzọ, Jizọs achọghịkwa ka ndị na-eso ụzọ ya ‘gabiga ihe e dere ede’ n’Akwụkwọ Nsọ.—1 Ndị Kọrịnt 4:6.

Ma, e nwere otu ihe dị oké mkpa Ndị Kraịst oge mbụ mere. Ọ bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs. Jizọs ji aka ya gwa ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha ga na-echeta ọnwụ ya, gosikwa ha otú ha ga-esi na-eme ya. E dere otú ọ chọrọ ka ha si na-eme ya na ụbọchị ọ nwụrụ na Baịbụl.—Luk 22:7, 19; 1 Ndị Kọrịnt 11:25.

Dị ka anyị hụrụla, Krismas bụ ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ. Ndị Kraịst oge mbụ emeghịkwa ememme ndị ọgọ mmụọ a. Ihe ọzọkwa bụ na e nweghị ebe Baịbụl kwuru na Jizọs ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ gbara Krismas. N’ihi ihe ndị a anyị lebara anya na ha, ọtụtụ nde Ndị Kraịst nọ n’ụwa niile ekpebiela na ha agaghị na-agba Krismas.

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ihe ndị a na-eme na Krismas si malite, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . . Olee Ihe Ndị I Kwesịrị Ịma Banyere Krismas?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Disemba 1, 2014. Ọ dịkwa na www.jw.org/ig.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya