Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 12/15 p. 23-25
  • Ì Kwesịrị Ikpegara Jisọs Ekpere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Kwesịrị Ikpegara Jisọs Ekpere?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Ekpere?
  • Ịmata Jisọs n’Ekpere Anyị
  • Olee Otú E Si ‘Akpọku Aha Jisọs’?
  • Ihe Jisọs Pụrụ Imere Anyị
  • Olee Otú I Si Asọpụrụ Jisọs?
  • Ekpere Ndị A Na-anabata
  • Banyere Ekpere Chineke Na-anụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 12/15 p. 23-25

Ì Kwesịrị Ikpegara Jisọs Ekpere?

ỤFỌDỤ na-ewere ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ikpegara Jisọs ekpere. Na Germany, a kụziworo ọtụtụ ndị n’oge ha bụ ụmụaka na tupu ha erie nri ha kwesịrị ịchịkọba aka ha wee kelee Jisọs Kraịst.

Dị ka Bible si kwuo, n’ezie Jisọs nọ n’ọkwá dị elu n’eluigwe. Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ pụtara na anyị kwesịrị ikpegara ya ekpere? Ị pụrụ iso ná ndị na-ekpegara Jisọs ekpere n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ, ma gịnị ka Jisọs n’onwe ya na-eche banyere ekpere ndị dị otú ahụ?

Nke mbụ, n’ihi gịnị ka ajụjụ ndị a jidị na-ebilite? N’ihi na Bible na-asị na Jehova Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.” Mgbe ahụ, ọ bụchaghị ihe ijuanya na ndị ohu Chineke n’oge ochie, dị ka ndị Israel, kpegaara nanị Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, ekpere.​—⁠Abụ Ọma 5:1, 2; 65:2.

Ihe ọ̀ gbanwere mgbe Jisọs, bụ́ Ọkpara Chineke, bịara n’elu ala iji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ site ná mmehie na ọnwụ? Ee e, a ka na-ekpegakwara Jehova ekpere. Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs n’onwe ya kpegaara Nna ya nke eluigwe ekpere ugboro ugboro, ọ kụzikwaara ndị ọzọ ime otú ahụ. Cheedị nnọọ echiche banyere ekpere ihe nlereanya ahụ, nke a na-akpọ mgbe ụfọdụ Ekpere Onyenwe Anyị ma ọ bụ Nna Anyị Bi n’Eluigwe, nke bụ otu n’ime ekpere ndị a kasị mara nke ọma n’ụwa. Jisọs akụzighịrị anyị ikpegara ya ekpere; o nyere anyị ihe nlereanya nke a: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha Gị nsọ.”​—⁠Matiu 6:6, 9; 26:39, 42.

Ugbu a ka anyị lerukwuo anya karị n’isiokwu ahụ site n’inyocha ihe ekpere bụ n’ezie.

Gịnị Bụ Ekpere?

Ekpere ọ bụla bụ otu ụdị nke ife ofufe. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akwado nke a, na-asị: “Ekpere bụ otu ụdị nke ife ofufe nke mmadụ pụrụ ịnọ na ya nye Chineke nsọpụrụ, ekele, nkwupụta, ma ọ bụ arịrịọ.”

N’otu oge Jisọs sịrị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” Jisọs rapagidere n’eziokwu ahụ bụ́ isi nke bụ́ na ofufe​—⁠n’ihi ya kwa ekpere⁠—​bụ nke a ga-ekpegara nanị Nna ya, bụ́ Jehova Chineke.​—⁠Luk 4:8; 6:12.

Ịmata Jisọs n’Ekpere Anyị

Jisọs nwụrụ dị ka àjà mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ, bụrụ onye Chineke kpọlitere n’ọnwụ, e buliekwa ya n’ọkwá dị elu. Dị ka ị pụrụ iche n’echiche, ihe a nile mere ka e nwee mgbanwe n’ihe banyere ekpere ndị a na-anabata. N’ụzọ dị aṅaa?

Pọl onyeozi na-akọwa oké mmetụta nke ọkwá Jisọs na-enwe n’ebe ekpere dị otú a, sị: “N’ihi nke a Chineke welikwara Ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, nke ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’elu ụwa na ihe nile dị n’okpuru ala, ka ire nile ọ bụla wee kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto.”​—⁠Ndị Filipaị 2:​9-⁠11.

Okwu ndị ahụ bụ́ “n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala,” ọ̀ pụtara na anyị ga na-ekpegara ya ekpere? Ee e. Okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a “na-egosi aha ahụ nke ọ bụ na ya ka e jikọtara ndị na-egbu ikpere n’ala, nke ọ bụ na ya ka e jikọtara (πᾶν γόνυ) ofufe nile. Aha ahụ nke Jisọs nataworo na-akwali mmadụ nile ná nsọpụrụ e jikọrọ ọnụ.” (A Grammar of the Idiom of the New Testament, nke G. B. Winer dere) N’ezie, ka ekpere wee bụrụ nke a nabatara, ọ ghaghị ịbụ nke e kpere “n’aha Jisọs,” ma, ka o sina dị, a na-ekpegara ya Jehova Chineke, na-ejekwa ozi maka otuto nke ya. N’ihi nke a, Pọl na-asị: “N’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ.”​—⁠Ndị Filipaị 4:6.

Dị ka otu ọwara ụzọ si na-eduje n’otu ebe, otú a ka Jisọs si bụrụ “ụzọ” nke na-eduje n’ebe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nọ. “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na Mụ,” ka Jisọs kụziiri ndị ozi ahụ. (Jọn 14:6) Otú a anyị kwesịrị ikpegara Chineke ekpere anyị site na Jisọs ọ bụghị kpọmkwem gakwuru Jisọs n’onwe ya.a

‘Ma,’ ka ụfọdụ pụrụ ịjụ, ‘ọ̀ bụ na Bible akọghị na ma onye na-eso ụzọ bụ́ Stifen ma Jọn onyeozi gwara Jisọs nọ n’eluigwe okwu?’ Nke ahụ bụ eziokwu. Otú ọ dị, ihe omume ndị a emetụtaghị ekpere, ebe Stifen na Jọn n’otu n’otu hụrụ Jisọs n’ọhụụ wee gwa ya okwu kpọmkwem. (Ọrụ 7:​56, 59; Mkpughe 1:​17-⁠19; 22:20) Buru n’uche na ọbụna nanị ịgwa Chineke okwu abụghị n’onwe ya ekpere. Adam na Iv gwara Chineke okwu, na-enye ihe ngọpụ ndị mere ha ji mee oké mmehie ha, mgbe O kpere ha ikpe ka mmehie ha n’Iden gasịrị. Ha ịgwa ya okwu n’ụzọ dị otú ahụ abụghị ekpere. (Jenesis 3:​8-⁠19) N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi izo aka n’ebe ọgwụgwa Stifen ma ọ bụ Jọn gwara Jisọs okwu dị dị ka ihe àmà na-egosi na anyị kwesịrị n’ezie ikpegara ya ekpere.

Olee Otú E Si ‘Akpọku Aha Jisọs’?

Ị̀ na-enwe obi abụọ na-adịgide adịgide, ka nọgide na-eche na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ikpegara Jisọs ekpere? Otu nwanyị degaara otu alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society akwụkwọ, sị: “N’ụzọ dị mwute, ekwetabeghị m na ndị Kraịst mbụ ekpegaraghị Jisọs ekpere.” O bu okwu Pọl ndị dị ná 1 Ndị Kọrint 1:2 n’uche, ebe o hotara “ndị nile na-akpọku aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst n’ebe nile.” Otú ọ dị, mmadụ kwesịrị ịrịba ama na n’asụsụ mbụ e ji mee ihe, okwu ahụ bụ́ “ịkpọku” pụrụ ịpụta ihe ndị ọzọ ma e wezụga ekpere.

Olee otú e si ‘kpọkuo’ aha Kraịst n’ebe nile? Otu ụzọ bụ na ụmụazụ Jisọs nke Nazaret kwupụtara hoo haa na ọ bụ ya bụ Mesaịa ahụ nakwa “Onye nzọpụta nke ụwa,” na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube n’aha ya. (1 Jọn 4:14; Ọrụ 3:6; 19:5) Ya mere, akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible na-ekwu na ahịrị okwu ahụ bụ́ “ịkpọku aha Onyenwe anyị . . . pụtara ikwupụta ịbụ onyenwenụ ya kama ikpegara ya ekpere.”

Ịnakwere Kraịst na igosipụta okwukwe n’ọbara ya ọ wụfuru, nke mere ka mgbaghara mmehie kwe omume, sokwa ‘n’ịkpọku aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.’ (Jiri Ọrụ Ndị Ozi 10:43 tụnyere 22:16.) Anyị na-akpọkwa aha Jisọs n’ụzọ nkịtị mgbe ọ bụla anyị na-ekpegara Chineke ekpere site na ya. Ya mere, ọ bụ ezie na ọ na-egosi na anyị pụrụ ịkpọku aha Jisọs, Bible adịghị egosi na anyị kwesịrị ikpegara ya ekpere.​—⁠Ndị Efesọs 5:20; Ndị Kọlọsi 3:17.

Ihe Jisọs Pụrụ Imere Anyị

Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa n’ụzọ doro anya, sị: “Ọ bụrụ na unu ga-arịọ ihe ọ bụla n’aha m, m ga-eme ya.” Nke a ọ̀ chọrọ ịdị na-ekpegara ya ekpere? Ee e. Arịrịọ ahụ bụ nke a na-arịọ Jehova Chineke​—⁠kama n’aha Jisọs. (Jọn 14:13, 14, NW; 15:16) Anyị na-arịọ Chineke ka Ọkpara Ya, bụ́ Jisọs, jiri oké ike ya na ikike ya mee ihe n’ihi anyị.

Olee otú Jisọs si agwa ezi ụmụazụ ya okwu taa? A pụrụ iji nkọwa Pọl nyere banyere ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ mee ihe atụ. O ji ya tụnyere ahụ, jirikwa Jisọs Kraịst tụnyere isi. “Isi” na-enyezu ndị òtù nke ahụ ime mmụọ ahụ ihe na-akpa ha site ‘na nkwonkwo na ákwárà ya nile,’ ma ọ bụ ụzọ na ndokwa dị iche iche maka inyezu ọgbakọ ya ihe oriri ime mmụọ na nduzi. (Ndị Kọlọsi 2:19) N’otu aka ahụ, taa Jisọs na-eji ‘onyinye dị iche iche dị na mmadụ’ ma ọ bụ ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ eme ihe iji na-edu ndú n’ime ọgbakọ, ọbụna na-enye mgbazi olu ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. E meghị ndokwa ọ bụla ka ndị òtù nke ọgbakọ na-agwa Jisọs okwu kpọmkwem ma ọ bụ na-ekpegara ya ekpere, ma ha kwesịrị n’ezie​—⁠ee, ha aghaghị⁠—​ikpegara Nna Jisọs, bụ́ Jehova Chineke ekpere.​—⁠Ndị Efesọs 4:​8-⁠12.

Olee Otú I Si Asọpụrụ Jisọs?

Banyere nzọpụta nke ụmụ mmadụ, lee aha ọkwá bụ isi nke Jisọs ji! Pita onyeozi tiri mkpu, sị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ: n’ihi na aha ọzọ dị iche adịghịkwa n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.” (Ọrụ 4:12) Ị̀ maara ịdị mkpa nke aha Jisọs?

Site n’ekpegaraghị Jisọs n’onwe ya ekpere, anyị adịghị eleda ọkwá ya anya. Kama nke ahụ, a na-asọpụrụ Jisọs mgbe anyị na-ekpe ekpere n’aha ya. Dịkwa nnọọ ka ụmụaka na-asọpụrụ ndị mụrụ ha site n’irube isi, anyị na-asọpụrụ Jisọs Kraịst site n’irube isi n’iwu ya dị iche iche, karịsịa iwu ọhụrụ ahụ nke ịhụrịta ibe anyị n’anya.​—⁠Jọn 5:23; 13:34.

Ekpere Ndị A Na-anabata

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ikpe ekpere ndị a na-anabata? Mgbe ahụ kpegara ha Jehova Chineke, meekwa otú ahụ n’aha Ọkpara ya, bụ́ Jisọs. Bịa mara uche Chineke, kwekwa ka ekpere gị gosipụta nghọta ahụ. (1 Jọn 3:21, 22; 5:14) Nweta ume site n’okwu ndị ahụ dị n’Abụ Ọma 66:20: “Onye a gọziri agọzi ka Chineke bụ, Onye na-ewezụgaghị ekpere m, O sighịkwa n’ebe m nọ wezụga ebere Ya.”

Dị ka anyị hụworo, ekpere bụ otu ụdị nke ofufe nke dịịrị nanị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Site n’ikpegara Jehova Chineke ekpere anyị nile, anyị na-egosi na anyị bu nduzi Jisọs nke ikpe ekpere n’uche: “Nna anyị nke bi n’eluigwe.”​—⁠Matiu 6:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ụfọdụ pụrụ ikpegara Jisọs ekpere n’ihi na ha kwetara na ọ bụ Chineke. Ma Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ya onwe ya fekwara Jehova, bụ́ Nna ya ofufe. (Jọn 20:17) Maka ntụle sara mbara nke isiokwu nke a, lee akwụkwọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya