Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 2/1 p. 8
  • A Ga-ekwusa Ozi Ọma nke Alaeze Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Ga-ekwusa Ozi Ọma nke Alaeze Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Ghaghịkwa Ibu Ụzọ Kwusaa Ozi Ọma nke A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Àmà Nye Mba Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ijere Chineke ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 2/1 p. 8

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

A Ga-ekwusa Ozi Ọma nke Alaeze Ahụ

ERI ọtụtụ narị afọ onye iro bụ isi nke Chineke, bụ́ Setan Ekwensu, ejiriwo ụzọ aghụghọ jiri gọọmenti ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe ụgha mee ihe ná mgbalị ya igbochi mgbasa nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ma ụzọ ndị a ga-ada. Jisọs buru amụma na “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe [ọ bụghị, “e nwere ike ikwusa” ma ọ bụ, “a pụrụ ikwusa”] n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.”—Matiu 24:14.

Ọdịda Setan apụtawo ìhè na Gris. N’ala ahụ Chọọchị Greek Orthodox anwawo igbochi Ndịàmà Jehova ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ma, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosipụta, mgbe oge ruru eziokwu Bible na-erute ndị nwere obi eziokwu n’agbanyeghị mmegide.

N’ihe dị ka 30 afọ gara aga, otu ụkọchukwu Greek Orthodox nakweere ozi ọma ahụ, ọbụnakwa kwupụta mmasị ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, ndị ikwu ya megidere nzọụkwụ nke a n’ụzọ siri ike ma rụgide ya ịgbahapụ mkpakọrịta ya na Ndịàmà. Iji mee ihe masịrị ezinụlọ ya, ọ gara n’ihu n’ịchụso ọrụ ya dị ka ụkọchukwu; ma, ọ nọgide na-aghọta na Ndịàmà Jehova enyeworo ya aka ịmụta eziokwu ahụ, na ya agbahapụwo ya iji gbanwere ọnọdụ a ma ama n’okpukpe ụgha.

Otú o sina dị, mgbe ụfọdụ o kwuru okwu ọma banyere Ndịàmà Jehova mgbe ohere ya bilitere. Ọbụna ọ dụrụ ndị mmadụ ọdụ ọtụtụ oge na ọ bụrụ na ha chọrọ ịmụta eziokwu Bible, ha kwesịrị isoro Ndịàmà mụọ ihe. Kemgbe ọtụtụ afọ, ụfọdụ gbasoro aro ya n’ezie.

N’oge na-adịbeghị anya onye ụkọchukwu ahụ dara ọrịa ma ghọta na ya pụrụ ịnwụ n’oge na-adịghị anya. Mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, ọ kpọkọrọ ụmụ ya, ha nile gbakọtakwara n’akụkụ àkwà ya.a Mgbe ahụ ọ kọwaara ha na ọ bụrụ na ya anwụọ, ha pụrụ izute ya ọzọ. Ọ gwara ha okwu banyere ozizi Bible nke ụmụ mmadụ ịbụ ndị Jehova kpọlitere n’ọnwụ ịdị ndụ na paradaịs n’elu ala, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịhụ ka nke ahụ mere n’ezie, ha aghaghị ịmụta eziokwu ahụ site na Bible ma kewapụ onwe ha n’okpukpe ụgha. Ọ rịọrọ ha ka ha soro Ndịàmà Jehova na-akpakọ ma site n’aka ha mụta otú e si aghọ ezi ndị Kraịst.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ụkọchukwu ahụ nwụrụ. Otú ọ dị, ndụmọdụ ikpeazụ ya nke o nyere ụmụ ya mịpụtara ihe ndị dị mma. Nwa ya nwanyị, dị ka ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ikwu ya, anọwo na-emegide Ndịàmà Jehova na ọrụ ha n’ụzọ dị ukwuu. Ma ọ pụghị ileghara arịrịọ sitere n’ezi obi nke nna ya na-anwụ anwụ rịọrọ anya, ya mere ọ kpọtụụrụ Ndịàmà Jehova n’oge na-adịghị anya ma malite ịmụ Bible. N’oge na-adịbeghị anya ya onwe ya ghọrọ Onyeàmà, na-arara ndụ ya nye Jehova Chineke ma na-egosipụta nraranye ya site na baptism mmiri.

Na Gris na n’ime ihe karịrị 230 ala ndị ọzọ, Ndịàmà Jehova na-adabere n’ike nke mmụọ nsọ Chineke. Ọ bụ site na nkwado zuru ezu nke mmụọ nsọ ka ha na-ekere òkè ná mmezu nke amụma Jisọs: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Chọọchị Greek Orthodox na-enye ndị ụkọchukwu ya ohere ịlụ nwanyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya