Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 7/15 p. 28-30
  • Ndị Karaịt Na Ọchịchọ Ha Na-achọ Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Karaịt Na Ọchịchọ Ha Na-achọ Eziokwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Esemokwu ahụ Si Malite?
  • Ndị Karaịt na Ndị Rabaị Akpọtụọ
  • Olee Otú Ndị Rabaị Si Zaghachi?
  • Òtù Ndị Karaịt Enwekwaghị Ike Ịga n’Ihu
  • Iwu Ahụ E Nyere N’ọnụ—N’ihi Gịnị Ka E Ji Dee Ya Ede?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Ìhè Na-enwu Bbaa” Amụkwasị Bible Site n’Ọ́bá Akwụkwọ Kasị Ochie na Russia
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Gịnị Bụ Talmud?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Gịnị Bụ Ihe Odide Masoret Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 7/15 p. 28-30

Ndị Karaịt Na Ọchịchọ Ha Na-achọ Eziokwu

“NYOCHAA n’ime [Akwụkwọ Nsọ] nke ọma, adaberekwala n’echiche m.” Otu onye ndú ndị Karaịt na narị afọ nke asatọ O.A. kwuru okwu ndị ahụ. Olee ndị bụ ndị Karaịt? Ànyị pụrụ ịmụta ihe ọ bụla bara uru site n’ihe nlereanya ha? Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị aghaghị ịlaghachi azụ n’akụkọ ihe mere eme gaa n’esemokwu dịworo ogologo oge nke dubara n’òtù ndị Karaịt.

Olee Otú Esemokwu ahụ Si Malite?

Na narị afọ ndị ikpeazụ tupu Oge Anyị, nkà ihe ọmụma ọhụrụ bilitere n’okpukpe ndị Juu. Ọ bụ nchepụta nke na Chineke nyere Iwu abụọ n’Ugwu Saịnaị, otu nke e dere ede na otu nke e kwuru n’ọnụ.a Ka ọ na-erule narị afọ nke mbụ O.A., e nwere nsọrịta mpi ndị kpụ ọkụ n’ọnụ n’etiti ndị na-akwado nkụzi ọhụrụ a na ndị jụrụ ya. Ndị Farisii bụ ndị na-akwalite ya, ebe ndị Sadusii na ndị Essene so ná ndị megidere ya.

N’etiti ọnọdụ esemokwu nke a, Jisọs nke Nazaret pụtara dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. (Daniel 9:24, 25; Matiu 2:1-6, 22, 23) Jisọs chere ìgwè ndị Juu ahụ nile na-emegiderịta onwe ha ihu. N’iso ha tụgharịa uche, o kwuru okwu megide ime ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ozizi ha mmadụ nyere n’aka. (Matiu 15:3-9) Jisọs kụzikwara eziokwu ime mmụọ n’ụzọ ọ bụ nanị Mesaịa ahụ pụrụ ịkụzi. (Jọn 7:45, 46) Ọzọkwa, nanị ezi ụmụazụ Jisọs nyere ihe àmà nke nkwado Chineke. A bịara mata ha dị ka ndị Kristian.—Ọrụ 11:26.

Mgbe e bibiri ụlọ nsọ Jerusalem na 70 O.A., nanị ndị Farisii bụ òtù okpukpe lanarịrị n’enweghị ihe mere ya. Ugbu a n’enweghị usoro ndị nchụàjà, àjà dị iche iche, na ụlọ nsọ, okpukpe ndị Juu nke òtù Farisii pụrụ iwepụta ihe a ga-eji dochie ihe ndị a nile, na-ekwere ka ozizi e nyere n’aka idebe na nkọwa ha karịa Iwu e dere ede ike. Nke a mepere ụzọ maka ide “akwụkwọ nsọ” ndị ọhụrụ. Mishnah bu ụzọ pụta, ya na mgbakwụnye ya nile na nkọwa dị iche iche nke iwu ha e kwuru n’ọnụ. E mesịa, a gbakwụnyere nchịkọta ndị ọzọ nke ihe ndị e dere ede ma kpọọ ya Talmud. N’otu oge ahụ, ndị Kraịst si n’ezi ofufe dapụ malitere imebi nkụzi Jisọs. Ìgwè abụọ ahụ hiwere usoro okpukpe ndị dị ike—ikike ndị rabaị n’otu akụkụ na ikike ndị chọọchị n’akụkụ nke ọzọ.

N’ihi esemokwu ndị Juu na Rom nke na-ekpere arụsị, e mesịakwa Rom nke “ndị Kraịst,” ebe bụ isi nke okpukpe ndị Juu mesịrị bụrụ Babilọn. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e dere ihe odide Talmud n’ọdịdị ha kasị zuo ezu. Ọ bụ ezie na ndị rabaị zọọrọ na Talmud kpughere uche Chineke n’ụzọ zuru ezu karị, ọtụtụ ndị Juu hụtara mmetụta na-arị elu nke ikike ndị rabaị ma nwee agụụ maka okwu Chineke a gwara ha site n’ọnụ Mosis na ndị amụma.

Ná nkera ikpeazụ nke narị afọ nke asatọ O.A., ndị Juu na Babilọn bụ́ ndị megidere ikike na nkwenkwe ndị rabaị n’iwu ha e kwuru n’ọnụ nabatara onye ndú gụrụ akwụkwọ nke aha ya bụ Anan ben David. Ọ kpọsara ikike onye Juu ọ bụla nwere ịmụ Akwụkwọ Nsọ Hibru n’enweghị ihe mgbochi dị ka isi iyi e nwere nanị ya maka ezi okpukpe, n’asọpụrụghị nkọwa ndị rabaị ma ọ bụ Talmud. Anan kụziri, sị: “Nyochaa n’ime Torah ahụ [iwu Chineke e dere ede] nke ọma, adaberekwala n’echiche m.” N’ihi imesi Akwụkwọ Nsọ ike otú a, a matara ụmụazụ Anan dị ka Qa·ra·ʼimʹ, aha Hibru pụtara “ndị ọgụ akwụkwọ.”

Ndị Karaịt na Ndị Rabaị Akpọtụọ

Olee ihe atụ ụfọdụ nke nkụzi ndị Karaịt kpatara obi ọjọọ n’etiti ndị rabaị? Ndị rabaị machibidoro irikọ anụ na mmiri ara. Ha mere nke a dị ka nkọwa nke iwu e kwuru n’ọnụ nke Ọpụpụ 23:19, nke na-asị: “Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nke nne ya.” N’aka nke ọzọ, ndị Karaịt kụziri na amaokwu a pụtara kpọmkwem ihe o kwuru—n’etinyeghị ihe, n’ewepụghị ihe. Ha rụrụ ụka na ihe mgbochi ndị ahụ nke ndị rabaị bụ nchepụta mmadụ.

Dị ka nkọwa ha nke Deuterọnọmi 6:8, 9 si dị, ndị rabaị kwuru na ndị ikom bụ́ ndị Juu ga-eyi phylactery mgbe ha na-ekpe ekpere, nakwa na a ga-edebe mezuzah n’ọnụ ụzọ mbata ọ bụla.b Ndị Karaịt lere amaokwu ndị a anya dị ka ndị nwere nanị ihe atụ ha pụtara, n’ihi ya kwa jụ ụkpụrụ nchịkwa ndị dị otú ahụ nke ndị rabaị.

N’okwu ndị ọzọ ndị Karaịt dị aka ike nke ukwuu karịa ndị rabaị. Dị ka ihe atụ, tụlee echiche ha banyere Ọpụpụ 35:3, nke na-agụ, sị: “Unu afụnwula ọkụ n’ebe obibi unu nile n’ụbọchị izu ike.” Ndị Karaịt machibidoro ịhapụ oriọna ma ọ bụ ọkụ ka ọ nọgide na-enwu ọbụna ma ọ bụrụ na a mụnyere ya tupu Ụbọchị Izu Ike.

Karịsịa mgbe Anan nwụrụ, ndị ndú Karaịt ọtụtụ mgbe ekwekọrịtaghị n’ọ̀tụ̀tụ̀ na ọdịdị nke ihe mgbochi ụfọdụ, ozi ha edoghịkwa anya mgbe nile. Ndị Karaịt adịghị n’otu n’ihi na ha anabataghị otu onye ndú ọ bụla kama mesie ike ịgụ na ịkọwa Akwụkwọ Nsọ n’onwe onye, n’ụzọ megidere ikike nke ụzọ ndị rabaị. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nke a, òtù ndị Karaịt mụbara n’iwu ewu na ikike gabiga ógbè ndị Juu na Babilọn nke ukwuu ma gbasaa n’Etiti Ọwụwa Anyanwụ dum. Ọbụna na e hiwere otu isi obodo a ma ama nke Karaịt na Jerusalem.

N’ime narị afọ nke itoolu na iri O.A., ndị mmụta Karaịt mere nnọọ nke ọma n’ihe ọmụmụ e mere ka ọ dị ọhụrụ nke asụsụ Hibru ma nwetụ oge oké mmụba. Ha lere ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọ bụghị ozizi e nyere n’aka idebe, anya dị ka nke dị nsọ. Ụfọdụ ndị Karaịt ghọrọ ndị odeakwụkwọ na-elezi anya nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’ezie, ọ bụ ihe ịma aka ndị Karaịt kpalitere ihe ọmụmụ Masoret nke Akwụkwọ Nsọ n’etiti ndị Juu nile, na-eme ka e jide ihe odide Bible e chekwara n’izi ezi karị n’aka taa.

N’ime oge a nke uto dị ngwa, okpukpe ndị Juu nke ndị Karaịt banyere n’ọrụ ozi ala ọzọ pụtara ìhè n’etiti ndị Juu ndị ọzọ. Nke a ghọrọ ihe iyi egwu doro anya nye okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị.

Olee Otú Ndị Rabaị Si Zaghachi?

Nlụgwara ọgụ ndị rabaị bụ ajọ égbè ọnụ, na-eji ịdị nro dị aghụghọ na mgbanwegharị nke nkụzi eme ihe. N’ime narị afọ sochiri mwakpo Anan, okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị nakweere ọtụtụ n’ime ụzọ ndị Karaịt ji eme ihe. Ndị rabaị dịwanyere irè n’ihota Akwụkwọ Nsọ, na-ejikọta ụzọ ime ihe nke ndị Karaịt n’okwu ha.

Onye ndú kasịnụ n’agha ọnụ nke a a lụsoro ndị Karaịt bụ Saʽadia ben Joseph, onye ghọrọ onye isi nke ógbè ndị Juu na Babilọn ná nkera mbụ nke narị afọ nke iri O.A. Akwụkwọ bụ́ isi nke Saʽadia, The Book of Beliefs and Opinions, bụ nke Samuel Rosenblatt sụgharịrị gaa na Bekee, bụ́ onye kwuru n’okwu mmeghe ya, sị: “Ọ bụ ezie na . . . ọ bụ ya bụ o kwuchaa ọgwụ n’oge ya banyere Talmud, [Saʽadia] ejikebeghị isi iyi nke a nke ọdịnala ndị Juu mee ihe, ma eleghị anya n’ihi na ọ bụ ọchịchọ ya iji ngwá ọgụ ndị Karaịt n’onwe ha bụ́ ndị nabatara nanị Iwu E Dere Ede dị ka nke ziri ezi merie ha.”

N’ịgbaso nzọụkwụ Saʽadia, okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị mesịrị merie. O mezuru nke a site n’ịnabata nanị ihe zuru ezu iji wepụ ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ n’arụmụka ndị Karaịt. Moses Maimonides, onye mmụta Talmud a ma ama nke narị afọ nke 12, tiri ya aka ikpeazụ. Site n’àgwà ya nke ikwe ibe nọrọ n’ebe ndị Karaịt nọ bụ́ ndị o binyeere n’Ijipt, nakwa site n’ụzọ ọkà mmụta ya nke ime ka e kwere ihe, o nwetara mmasị ha ma belata ọkwá nke usoro ndị ndú ha.

Òtù Ndị Karaịt Enwekwaghị Ike Ịga n’Ihu

Ebe ọ na-adịkwaghị n’otu, gharakwa inwe usoro nlụgwara ọgụ a chịkwara nke ọma, òtù ndị Karaịt enwekwaghị ma ikike ma ụmụazụ. Ka oge na-aga, ndị Karaịt gbanwegharịrị echiche na ụkpụrụ ha dị iche iche. Leon Nemoy, onye dere akwụkwọ banyere òtù ndị Karaịt, dere, sị: “Ọ bụ ezie na Talmud nọgidere ná mmachibido iwu n’ọnụ, e ji nzuzo webata ọtụtụ ihe dị na Talmud n’ime usoro ndebe iwu na omenala ndị Karaịt.” Ya bụ na ndị Karaịt enwekwaghị nzube mbụ, ha nakweerekwara ihe dị ukwuu n’okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị.

A ka nwere ihe dị ka 25,000 ndị Karaịt n’Israel. A pụrụ ịchọta puku ole na ole ndị ọzọ n’ógbè ndị ọzọ, karịsịa na Russia na United States. Otú ọ dị, n’inwe ozizi ndị nke ha e nyere n’aka idebe, ha eyighị ndị Karaịt mbụ.

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’akụkọ ihe mere eme nke ndị Karaịt? Na ọ bụ ajọ ihie ụzọ ‘ime ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ozizi e nyere n’aka idebe.’ (Matiu 15:6) Inwere onwe ya pụọ n’ozizi ndị bụ ibu arọ bụ́ ndị mmadụ nyere n’aka idebe chọrọ ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ. (Jọn 8:31, 32; 2 Timoti 3:16, 17) Ee, ndị na-achọ ịmara na ime uche Chineke adịghị adabere n’ozizi mmadụ nyere n’aka idebe. Kama nke ahụ, ha na-eji ịdị uchu enyocha Bible ma na-etinye ntụziaka ndị bara uru nke Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ n’ọrụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa nke iwu a sịrị na ọ bụ nke e kwuru n’ọnụ, lee peji nke 8-11 nke broshuọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Phylactery bụ igbe nta abụọ dị nkuku anọ e ji akpụkpọ anụ mee nke ibe akwụkwọ abụọ nwere akụkụ ihe odide Akwụkwọ Nsọ dị n’ime ya. Dị ka ọdịnala si dị a na-eyi igbe ndị a n’ógwè aka ekpe na n’isi n’oge ekpere ụtụtụ n’ime izu. Mezuzah bụ akwụkwọ mpịakọta parchment nta e denyere Deuterọnọmi 6:4-9 na 11:13-21, debe ya n’ime igbe a kụdoro n’ọnụ ụzọ mbata.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ìgwè ndị Karaịt

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia, 1910

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya