Ụgwọ Ọrụ nke Nnọgidesi Ike
Ọ BỤ nwanyị Gris nke bi na Finisia n’afọ 32 O.A. Nwa ya nwanyị nọ n’oké ọrịa, ọ na-agụsikwa nwanyị ahụ agụụ ike ka a gwọọ ya. N’ịnụ na otu onye ọbịa na-eleta ógbè ya—onye ala ọzọ nke a na-ekwu na o nwere ikike ịgwọ ndị ọrịa—o kpebisiri ike ịhụ ya ma rịọ maka enyemaka ya.
Mgbe o zutere ya, o gburu ikpere n’ala, na-arịọ, sị: “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid; mmụọ ọjọọ na-ejisi nwa m nwanyị ike.” N’ụzọ dị otú ahụ, nwanyị Gris ahụ rịọrọ Jisọs ka ọ gwọọ nwa ya nwanyị.
Ị̀ pụrụ iji anya nke uche hụ obi ike na obi umeala a chọrọ n’aka nwanyị ahụ iji mee nke a? Jisọs bụ oké mmadụ nke nwere ike na aha dị ukwuu, o buwokwa ụzọ mee ka a mara na ya achọghị ka onye ọ bụla mara ebe ọ nọ. Ọ kpọrọwo ndị ozi ya gaa Finisia iji zurutụ nnọọ ike, ọ bụghị ịrụ ọrụ n’etiti ndị Jentaịl na-ekweghị ekwe. Ọzọkwa, Jisọs bụ onye Juu ma nwanyị ahụ bụ onye Jentaịl, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na nwanyị ahụ maara otú ndị Juu si asọ iso ndị mba ọzọ a bụrụ ọnụ akpakọrịta oyi. Ka o sina dị, ọ kwụụrụ chịm ná mkpebi ya inweta ọgwụgwọ maka nwa ya nwanyị.
Jisọs na ndị ozi ya nwara ịkụda nwanyị ahụ obi ka ọ ghara ịchọ enyemaka n’oge ahụ. Na mbụ, Jisọs azaghị ya okwu. E mesịa, n’ihi ákwá ọ nọgidere na-ebe n’akwụsịghị akwụsị, ndị ozi ahụ n’ahụ mgbakasị gwara Jisọs: “Zilaga ya; n’ihi na ọ na-etiso anyị mkpu.”
Ma nwanyị ahụ gbara isi akwara. Kama ịla, ọ dara n’ala n’ụkwụ Jisọs, na-asị: “Onyenwe anyị, nyere m aka.”
N’izo aka n’ibu ọrụ ya bụ isi nye ụmụ Israel na, n’otu oge ahụ, na-anwale okwukwe na mkpebisi ike ya, Jisọs ji ọmịiko kọwaara ya, sị: “Ọ dịghị mma ịnara nri ụmụ [Israel] tụpụrụ ụmụ nkịta [ndị Jentaịl].”
Kama ịbụ onye okwu ịsọ asọ a banyere agbụrụ ya kpasuru iwe, o ji obi umeala nọgidesie ike n’arịrịọ ya site n’ịzaghachi: “Ee, Onyenwe anyị: n’ihi na ọbụna ụmụ nkịta na-eri ụfọdụ n’ime irighiri nke na-adapụta na table nke ndị nwe ha.”
Jisọs nyere ụgwọ ọrụ maka nnọgidesi ike nwanyị Gris ahụ site n’ịja okwukwe ya mma na imezu arịrịọ ya. Leedị ọṅụ ya mgbe ọ latara ụlọ hụ na a gwọwo nwa ya nwanyị kpam kpam!—Matiu 15:21-28; Mak 7:24-30.
Dị ka nwanyị narị afọ mbụ ahụ, nnọgidesi ike dị anyị mkpa ná mgbalị anyị nile ime ihe na-atọ Jehova ụtọ na inweta afọ ọma ya. Dị ka n’ọnọdụ nke nwanyị Gris ahụ, Bible na-emesi anyị obi ike na a ga-enye ụgwọ ọrụ nke ọma maka nnọgidesi ike anyị “n’ime ihe ọma.”—Ndị Galetia 6:9.
Gịnị bụ nnọgidesi ike? N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa? Olee ihe ndị pụrụ ime ka anyị ghara inwekwa àgwà a, ka anyị daa mbà ma ọ bụ chịlie aka? Olee ụgwọ ọrụ ndị anyị pụrụ ịtụ anya inweta ma ọ bụrụ na anyị egosipụta nnọgidesi ike ugbu a n’ijere Onye Okike na Nna anyị, bụ́ Jehova, ozi?
Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa ngwaa bụ́ “nọgidesie ike” dị ka “ijigidesi aka ike ma tagide n’otu nzube, ọnọdụ, ma ọ bụ ihe omume, n’agbanyeghị ihe mgbochi, ịdọ aka ná ntị, ma ọ bụ ihe ndọghachi azụ; . . . ịnọgide na-adị; ịnọte aka.”
Ugboro ugboro Bible na-agba ndị ohu Jehova ume ịnọgidesi ike n’ime uche ya. Dị ka ihe atụ, a gwara anyị ka anyị ‘nọgide buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ,’ ‘jidesie ihe ọma ike,’ ‘nọgidesie ike n’ekpere,’ na ka ‘ike ghara ịgwụ anyị’ n’ime ihe ọma.—Matiu 6:33, NW; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21; Ndị Rom 12:12; Ndị Galetia 6:9.
N’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị, nnọgidesi ike bụ àgwà anyị nile na-aghaghị inwe ma zụlite iji nọgide ndụ. Ma e nweghị ya anyị apụghị ịrụzu ezi ihe ọ bụla nke na-adịgide adịgide. Tụlee ihe atụ nke nwa na-anwa ịkwụrụ ọtọ ma tụọ ụkwụ mbụ ya na-ama jijiji. O siri ike ịhụ nwa ọhụrụ nke pụrụ ịmụta ịkwụ ọtọ na ịgagharịrị onwe ya n’ime otu ụbọchị. Dị ka ụmụaka, ma eleghị anya anyị nile anwawo ma daa ọtụtụ ugboro tupu anyị emesịa ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ịga nke ọma n’ịga ije. Gịnị gaara emewo ma ọ bụrụ na mgbe anyị dara nke mbụ ya, anyị kpebiri ịkwụsị ịnwale? Anyị pụrụ ịka na-egbegharị igbe! Nnọgidesi ike dị mkpa iji ruo ihe mgbaru ọsọ ndị bara uru ma nweta mmụba ndị ruru ya na nkà na ùgwù onwe onye. Dị ka a na-ekwu, “Onye ndidi nwe mmeri.”
Ndị sụworo ụzọ ogologo oge maara na ikike ma ọ bụ onyinye ndị pụrụ iche adịghị eme ka e jide ihe ịga nke ọma n’aka. Ọ na-achọ nrapagidesi ike, mkpebisi ike ime uche Jehova n’ụzọ zuru ezu, na obi ike n’agbanyeghị ihe ndọghachi azụ ndị na-adị nwa oge, ọbụna ịda mbà n’obi. A ghaghị ilegide ihe mgbaru ọsọ nke ikere òkè ná ngọzi Chineke ruo ebighị ebi anya nke ọma.
Ee, anyị nile ndị na-achọ inweta afọ ọma Jehova, ndị na-achọkwa imeri n’ọsọ nke ndụ ahụ nwere mkpa nnọgidesi ike, njisi ike, na ntachi obi. Ma e nweghị àgwà ndị a, anyị pụrụ nnọọ ịhapụ inweta ihu ọma Jehova na ụgwọ ọrụ nke ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.—Abụ Ọma 18:20; Matiu 24:13; 1 Timoti 6:18, 19.
Ọ na-esikarị ike onye Kraịst ịnọgidesi ike n’ihe omume ime mmụọ ya karịa n’ibu ọrụ ya ndị ọzọ. Nwoke pụrụ ịnọgide na-arụsi ọrụ ego ike iji lekọta mkpa anụ ahụ nke ezinụlọ ya, ma ọ pụrụ inwe ‘oké ike ọgwụgwụ’ iduziri nwunye na ụmụ ya ọmụmụ Bible mgbe nile. Olee ihe ndị na-eme ka nnọgidesi ike n’ọrụ ndị Kraịst siere ọtụtụ ndị oké ike?
Otu ihe bụ nkụda aka, nke na-esite n’erughị eru na adịghị ike dị iche iche nke onwe anyị. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị uche n’ihie ụzọ anyị dị iche iche n’ụzọ na-adịghị mma, obi pụrụ ikoropụ anyị, anyị ewee daa mbà, na-eche na ọ dịghị mgbe Jehova ga-enwe ike ịgbaghara anyị mmehie anyị nile.
Ihe ọzọ bụ ọnọdụ ụwa nke omume rụrụ arụ, mmekpu, na ịkpọasị. (1 Jọn 2:15, 16) Otu n’ime “omume ọma” ndị mmetụta ụwa pụrụ imebi ma ọ bụ ibibi bụ nnọgidesi ike ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrint 15:33.
Mmegide ma ọ bụ enweghị mmasị ọha mmadụ n’ozi anyị dị nsọ pụrụ ibelata nnọgidesi ike anyị n’ọrụ nkwusa ahụ. N’ihi nkụda mmụọ, anyị pụrụ ikwubi na ndị mmadụ n’ókèala anyị achọghị nnọọ eziokwu ahụ. Nke a pụrụ ime ka anyị jụọ sị, ‘Olee isi ya?’ na ịgbahapụ ihe ùgwù anyị pụrụ iche nke ije ozi.
Mmụọ ụwa nke imeju ọchịchọ onwe onye pụkwara imetụta anyị. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji dọgbusie onwe anyị n’ọrụ ike ma chụọ àjà otú a ebe ndị ọzọ nile yiri ka ha na-eme onwe ha obi ụtọ ma ọ bụ na-enwe ntụsara ahụ?—Tụlee Matiu 16:23, 24.
Iji nọgidesie ike n’ime uche Jehova, ọ dị anyị mkpa iyikwasị ọdịdị ndị Kraịst na ibi ndụ dị ka mmụọ si chọọ, ọ bụghị anụ ahụ. (Ndị Rom 8:4-8; Ndị Kọlọsi 3:10, 12, 14) Inwe echiche Jehova n’okwu ahụ ga-eme ka anyị nwee ike ịga n’ihu n’ihe omume ime mmụọ anyị ndị dị mkpa.—1 Ndị Kọrint 16:13.
Ihe Atụ Dị Iche Iche nke Nnọgidesi Ike
Jehova enyewo anyị ọtụtụ ihe atụ na-akpali akpali nke ndị ohu ya bụ́ ndị nọgidesiri ike n’ihe ma kwesị ntụkwasị obi nye ya gabiga ọtụtụ ule. Site n’ịtụle ha, anyị na-ahụ ụzọ anyị pụrụ isi zụlite ma gosipụta nnọgidesi ike ndị Kraịst na ihe mere o ji baa oké uru.
Ihe atụ kasịnụ bụ Jisọs, onye tara ahụhụ dị ukwuu iji too aha Jehova. Bible na-agba anyị ume ịmụ nke ọma ọrụ ya dum nke nnọgidesi ike site ná nraranye: “Ya mere ka anyị onwe anyị, ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị, Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW] Ya, na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke. N’ihi na, tụgharịanụ uche n’Onye ahụ Nke tachiworo obi ná nkwugide dị otú a, bụ́ nke ndị mmehie na-ekwugide onwe ha, ka ike ghara ịgwụ unu, unu wee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.”—Ndị Hibru 12:1-3.
Ọsọ ndụ ahụ bụ nke ịgbaru n’ebe dị anya, ọ bụghị nke ịgbasi ike ruo n’ebe dị nso. Ọ bụ ya mere nnọgidesi ike yiri nke Kraịst ji dị anyị mkpa. Ihe mgbaru ọsọ, ma ọ bụ ebe mgbaru, nwere ike a gaghị na-ahụ ya anya n’akụkụ ka ukwuu nke ọsọ ahụ. Ihe mgbaru ọsọ ahụ aghaghị ido anya n’anya nke uche anyị ka anyị wee jiri uche na-achụso ya n’ọsọ ahụ dum, nke na-achọ ihe dị ukwuu. Jisọs nwere onyinyo dị otú ahụ, ya bụ, “ọṅụ e debere n’ihu Ya,” n’uche ya.
Gịnị ka a gụnyere n’ọṅụ a maka ndị Kraịst taa? Otu ihe bụ ụgwọ ọrụ nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe maka mmadụ ole na ole na ndụ ebighị ebi n’elu ụwa maka ọtụtụ ndị. Ọzọ, ọ bụ mmetụta nke afọ ojuju nke na-esite n’ịmara na mmadụ ewetaworo obi Jehova ọṅụ ma kere òkè n’ido aha Chineke nsọ.—Ilu 27:11; Jọn 17:4.
Ihe a gụnyere n’ọṅụ a bụ iso Jehova nwee mmekọrịta chiri anya, nke dị ụtọ. (Abụ Ọma 40:8; Jọn 4:34) Mmekọrịta dị otú ahụ na-enye ume ma na-akwagide ndụ, na-enye mmadụ ume iji ntachi obi gbaa ọsọ ahụ ghara ịda mbà. Ọzọkwa, Jehova na-agọzi mmekọrịta ahụ site n’ịwụkwasị ndị ohu ya mmụọ nsọ ya, na-arụpụta mmụba nke ọṅụ na ọrụ na-enye ọṅụ.—Ndị Rom 12:11; Ndị Galetia 5:22.
Ịtụle ihe atụ Job nke okwukwe na-anọgidesi ike bara uru. O zughị okè, o nwekwara ihe ọmụma dị nta banyere ọnọdụ ya. Ya mere mgbe ụfọdụ, ọ dabara ná ngọpụrụ onwe onye na obi nkoropụ. Otú ọ dị, ọ nọgidere na-egosipụta oké mkpebisi ike ijigide nguzosi ike n’ezi ihe ya nye Jehova, na-agbahapụghị Ya mgbe ọ bụla. (Job 1:20-22; 2:9, 10; 27:2-6) Jehova nyere Job ụgwọ ọrụ maka nraranye ya nke nnọgidesi ike, na-enye ya ọtụtụ ngọzi ime mmụọ na anụ ahụ na olileanya nke ndụ ebighị ebi. (Job 42:10-17; Jemes 5:10, 11) Dị ka Job, anyị pụrụ ịta ahụhụ dị ukwuu na mfu n’oge ndụ anyị ugbu a, ma obi pụkwara isi anyị ike ná ngọzi Jehova maka ntachi obi anyị n’ikwesị ntụkwasị obi.—Ndị Hibru 6:10-12.
N’oge ndị a, Ndịàmà Jehova dị ka otu ìgwè egosipụtawo nnọgidesi ike ndị Kraịst n’ime uche Jehova. Dị ka ihe atụ, ọrụ ụlọ n’ụlọ ha site ná nnọgidesi ike na nkwusa ihu ọha ndị ọzọ emewo ka ụwa nile lekwasị ha na ozi ha anya. Usoro mgbasa ozi ezowo aka ọtụtụ mgbe n’ịnụ ọkụ n’obi na mkpebisi ike ha ikwusa ozi ọma n’agbanyeghị mmegide na ọnwụnwa. Otu n’ime ndị a ọbụna dere okwu ọchị bụ́ “Ọ dịghị onye na-agbanahụ Ndịàmà Jehova!”—Matiu 5:16.
Jehova agọziwo mgbalị nnọgidesi ike nke Ndịàmà ya site ná mkpụrụ bara ụba n’ozi ahụ. Rịba ama ahụmahụ nke Ndịàmà ụfọdụ nwere nkà n’Itali laa azụ n’afọ ndị 1960 mgbe e nwere ihe dị ka 10,000 Ndịàmà na-eme nkwusa ná mba nke ihe karịrị 53,000,000 mmadụ. N’otu obodo 6,000 mmadụ bi, e nweghị otu Onyeàmà. Ụmụnna na-eleta ya natara mmeghachi omume mbuso iro nye ozi ha.
Oge ọ bụla ụmụnna ahụ gara ebe ahụ ime nkwusa, ọtụtụ ụmụ nwanyị, na ọbụna ụmụ nwoke, ndị obodo ahụ ga-achịkọta ụmụ okorobịa, na-agba ha ume ịdị na-esogharị Ndịàmà ma na-afụrụ ha mkpọrọhịhị, na-emekwa oké ụzụ. Mgbe minit ole na ole nke omume a gasịrị, a na-amanye ụmụnna ahụ ịla ma gaa n’obodo ọzọ. Ná mgbalị iji gbazuo àmà ma ọ dịghị ihe ọzọ otu ugbo nye ndị nile bi n’obodo a, ụmụnna ahụ kpebiri ime nkwusa n’ebe ahụ nanị n’ụbọchị mmiri zoro nke ukwuu, n’olileanya nke na ndị na-eto eto agaghị enye ha nsogbu. Ha chọpụtara na ndị obodo ahụ adịghị achọ ka mmiri dee ha nanị iji nyee ndị nkwusa ahụ nsogbu. N’ụzọ dị otú a a gbara àmà dị mma. A chọtara ndị nwere mmasị. A malitere ọmụmụ Bible ndị ọhụrụ. N’ihi ya, ọ bụghị nanị na e hiwere ọgbakọ na-eme nke ọma n’obodo nta ahụ kamakwa a malitere ịrụ ọrụ nkwusa ahụ ọbụna n’ụbọchị ndị anwụ na-acha. Jehova anọgidewo na-agọzi nnọgidesi ike nke Ndịàmà ya n’ógbè ahụ na n’Itali dum. E nwere ugbu a ihe karịrị 200,000 Ndịàmà Jehova ná mba ahụ.
Ụgwọ ọrụ nile nke nnọgidesi ike n’ime ihe ziri ezi buru ibu. Site n’ike mmụọ Chineke, Ndịàmà Jehova enwewo ike ịrụzu oké ihe na-enweghị atụ n’akụkọ ihe mere eme mmadụ, ya bụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ọnụ ụzọ dị iche iche na n’ebe ndị ọzọ, nye ọtụtụ nde mmadụ. (Zekaraịa 4:6) Ha ejiwo ọṅụ hụ ka a na-emezu amụma Bible n’uto dị ịtụnanya na ume nke nzukọ Jehova n’elu ụwa. (Aịsaịa 54:2; 60:22) Ha na-ejigide akọ na uche dị ọcha n’ebe Chineke nọ, ha na-enwekwa obi ụtọ n’olileanya nke ndụ ebighị ebi. Karịsịa ihe nile, ha na-eso Onye Okike ha, bụ́ Jehova Chineke, enwe mmekọrịta chiri anya.—Abụ Ọma 11:7.
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Jisọs nyeghachiri nnọgidesi ike obi umeala nke nwanyị Gris a ụgwọ ọrụ
[Foto dị na peeji nke 26]
A gụnyere ndụ n’ime Paradaịs n’ọṅụ e setịpụrụ n’ihu ndị Kraịst taa