“Na-atachinụ Ogologo Ntachi Obi”
1 Ka anyị na-ahụ ka ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie Setan na-akpụdewewanye nso, ọ dị mkpa ka anyị ‘na-atachi ogologo ntachi obi’ ka anyị na-echere ụbọchị mgbapụta Jehova. Karịsịa n’oge ọgwụgwụ a, ndị iro ọjọọ kpebisiri ike ịdọpụ uche anyị n’ihe iseokwu kasịnụ metụtara ọbụbụeze Jehova ma na-anwa anyị ịdọpụ uche anyị site n’ọtụtụ ihe nchụso onwe onye. N’ụzọ dị otú a, Setan ga-arabanye anyị n’ịbụ ndị ike gwụrụ ma ọ bụ n’iselata aka n’ọrụ ime nkwusa Alaeze. (Jes. 5:7, 8; Mat. 24:13, 14) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosipụta ụdị ntachi obi ahụ dị mkpa?
2 Site n’Inwe Njide Onwe Onye: Mgbe anyị zutere enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide n’ozi anyị, njide onwe onye ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eme nkwusa. A gaghị emenye anyị ụjọ ma ọ bụ kpasuo anyị iwe ngwa ngwa ma ọ bụrụ na ndị anyị na-ezute adịghị enye anyị ohere ikwu okwu ma ọ bụ ghara inwe obiọma. (1 Pita 2:23) Ume a sitere n’ime pụrụ igbochi anyị ikwu okwu na-adịghị mma banyere ndị nọ n’ókèala anyị bụ́ ndị na-egosi omume ọ gbasara m ma ọ bụ ịkpọasị n’ebe ọrụ anyị dị, na-aghọta na okwu dị otú ahụ ga-akụda anyị na ndị anyị na ha na-ejekọ ozi obi.
3 Site n’Iji Ntachi Obi Nọgide: A pụrụ ile ntachi obi anyị ule mgbe anyị nwesịrị nkwurịta okwu dị mma n’ozi ubi, anyị apụghị inweta onye ahụ nwere mmasị n’ụlọ ọzọ. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na ndị anyị na-amụrụ ihe adịghị enwe ọganihu dị ngwa ma ọ bụ na-egbu oge iwere nguzo maka eziokwu ahụ. Otú ọ dị, iji ntachi obi nọgide na-arụpụtakarị ihe dị mma. (Gal. 6:9) Otu nwanna nwanyị gaara otu nwanyị na-akatabeghị ahụ ọtụtụ nletaghachi tupu a malite inwe ọmụmụ Bible n’ezie. Ná nleta ise ndị mbụ, nwanyị ahụ na-eme ihe ndị ọzọ. Ná nleta nke isii, mmiri makasịrị nwanna nwanyị ahụ ahụ, nanị iru wee hụ na ọ dịghị onye nọ n’ụlọ. Ka o sina dị, n’ikpebisi ike inye nwanyị ahụ ohere ọzọ, nwanna nwanyị ahụ gara ọzọ wee hụ ka nwanyị ahụ dị njikere ịmụ ihe. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, onye ahụ a na-amụrụ ihe nọgidere na-enwe ọganihu, ná mkpirikpi oge kwa, ọ raara ndụ ya nye Jehova.
4 Anyị maara na ụbọchị Jehova agaghị egbu oge. Ya mere anyị na-echere otú ọ ga-esi mezuo ihe dị iche iche, na-amara na ntachi obi Chineke ga-arụpụta ihe ọma. (Hab. 2:3; 2 Pita 3:9-15) Anyị aghaghị ịtachi obi dị ka Jehova na-atachi ma ghara ịda mbà n’ozi ahụ. Site ‘n’okwukwe na ogologo ntachi obi,’ na-elegara Jehova anya inye gị ụgwọ ọrụ maka ịrụsi ọrụ ike gị.—Hib. 6:10-12.