Olee Otú Ị Pụrụ Isi Lanarị n’Agbata Obi Dị Ize Ndụ?
“ỤJỌ na-atụ m oge nile. Ana m atụ egwu n’ime ígwè mbugo. Ana m atụ egwu n’ime ụgbọ ala m. Ana m atụ egwu n’ime ụlọ m. Mpụ zuru ebe nile. A na-ezu ndị mmadụ ohi mgbe nile,” ka Maria na-ekwu. Ị̀ na-enwe mmetụta yiri nke nwanyị a bụ́ onye Brazil, na-atụ egwu n’agbata obi gị, karịsịa n’ọchịchịrị nke abalị?
Ịgụ akwụkwọ ndị na-akọ banyere ụzọ e si jide ndị omempụ pụrụ ịdị na-akpali akpali, ma ná ndụ a na-adị n’ezie ọ dịghị arụpụtakebe ihe dị mma. Ọ pụrụ ịbụ na a gaghị ejide ndị mere mpụ. Ma ọ bụ n’ihe banyere igbu mmadụ, mmadụ aghaghị ịnọ nanị ya n’enweghị di, nna, ma ọ bụ nwa nwoke, n’enweghị nwunye, nne, ma ọ bụ nwa nwanyị. Mpụ ime ihe ike ọ̀ na-arị elu n’ógbè gị? Ebe dị jụụ gị na ezinụlọ gị ga-anọ ná nchebe ọ̀ na-agụ gị agụụ? Ma ọ bụ, ọ bụrụ na a manye gị ịzụlite ụmụ gị n’ógbè mpụ jupụtara, gịnị ka ị pụrụ ime iji lanarị?
N’ezie, a ka nwere obodo ukwu ebe ndị a na-enwekebeghị mpụ. N’ọtụtụ ala, ndị mmadụ ka na-ebi n’ịdị jụụ nke ime ime obodo ma ọ bụ n’ime obodo ndị dị ntụsara ahụ. Ma ihe na-agbanwe ngwa ngwa ọbụna n’ógbè ndị a na-elebu anya dị ka ebe mpụ na-adịghị. Dị ka ihe atụ, na Brazil na 50 afọ gara aga, 70 pasent nke ndị obodo ahụ bi n’ime ime obodo. Ugbu a 70 pasent bi n’obodo ukwu dị iche iche. E nweela ịrị elu nke nsogbu ógbè ndị mepere emepe bụ́ ndị so ohere ọrụ dị iche iche bịa, dị ka mpụ na ime ihe ike. Ma ì bi n’ógbè dị ize ndụ ma ọ bụ na i bighị, ị ka ga-ejerịrị ọrụ ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ ma mee ọtụtụ ihe ndị ọzọ n’ebe na-abụghị n’ụlọ.
N’ikweta “nsogbu oké ụjọ” juru ebe nile, otu onye isi uwe ojii na Rio de Janeiro na-ehota ikpe na-ezighị ezi nke ọha mmadụ na mpụ a haziri ahazi dị ka ihe ndị na-akpata ya. Ọ na-echekwa na akwụkwọ akụkọ dị iche iche na telivishọn so na-akpata ụjọ zuru ebe nile, “jiri akụkọ ọjọọ dị iche iche na-akpatara ọha mmadụ obi nkoropụ.” Iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ, ndakpọ ezinụlọ, na nkụzi ụgha nke okpukpe sokwa na-akpata mmebi iwu ahụ na-arị elu. Gịnịkwa ka ọdịnihu ga-eweta? Mmepụta a nọgidere na-emepụta ihe ngosi ime ihe ike, bụ́ ndị akwụkwọ dị iche iche na ihe nkiri sinima na-eme ka a ga-asị na ha abụghị ihe ọ bụla site n’igosi ha dị ka ihe ntụrụndụ, ọ̀ ga-eme ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-adịghị enwe mmetụta maka ndị ọzọ? Ógbè ndị a na-ele anya dị ka ndị mpụ na-adịghị na ha hà ga-aghọkwa ndị dị ize ndụ?
Ebe ọ bụ na ime ihe ike abụghị ihe na-atọ ọchị nye onye e mesoro ya, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịnọ ná nchebe. Ka a sịkwa ihe mere ụmụ amaala ndị na-echegbu onwe ha ji na-achọ ka e nwekwuo ndị ọrụ uwe ojii n’okporo ámá nakwa ntaramahụhụ ụlọ mkpọrọ ka sie ike ma ọ bụ ọbụna ntaramahụhụ ọnwụ! N’agbanyeghị ihe ize ndụ ya, ụfọdụ na-azụta égbè maka nchebe onwe onye. Ndị ọzọ chọrọ ka ndị ọchịchị gbochie ire égbè. Ma n’agbanyeghị akụkọ ọjọọ bụ na mpụ jupụtara ebe nile, ọ dịghị mkpa inwe obi nkoropụ. N’ezie, e zutụbeghị ọtụtụ ndị bi n’obodo ukwu ndị dị ka Johannesburg, Mexico City, New York, Rio de Janeiro, na São Paulo ohi. Ka anyị tụlee otú ndị mmadụ si alafere n’agbata obi dị ize ndụ.
Ịnọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi
Banyere ógbè mpụ juru na ya, otu onye na-ede akwụkwọ na-ekwu banyere “ọgụgụ isi na nnọgidesi ike nke ọtụtụ puku ndị Brazil ndị nwetaworo ùgwù ụfọdụ na ịdị mma n’agbanyeghị ọnọdụ ibi ndụ ndị ka dị njọ.” Mgbe o biworo na Rio de Janeiro ruo 38 afọ, Jorge na-ekwu, sị: “Ana m ezere okporo ámá na ógbè ụfọdụ, adịghịkwa m egosi ọchịchọ ọ bụla inyochata ihe ndị na-eme. M na-ezerekwa ịnọ n’okporo ámá n’abalị, adịghịkwa m atụbiga ụjọ ókè. Ọ bụ ezie na m na-elezi anya, m na-ele ndị mmadụ anya dị ka ha na-akwụwa aka ọtọ, jiri nkwanye ùgwù na nsọpụrụ na-emeso ha.”
Ee, zere nsogbu na-enweghị isi. Etinyela anya n’ihe dịịrị ndị ọzọ. Eledala eziokwu ahụ bụ na ụjọ gabigara ókè pụrụ inwe mmetụta n’usoro nzirita ozi nke ahụ, na-eme ka ọbụna ndị na-akpa àgwà ọma mee ihe na-echeghị ya eche. Banyere ọrụ ya n’ógbè ndị dị ize ndụ, Odair na-ekwu, sị: “M na-agbalị inwe echiche ziri ezi, n’adịghị eji egwu ihe ọjọọ ndị pụrụ imenụ emejupụta uche m n’ihi na ndị a na-akpata ahụ erughị ala na oké ụjọ na-enweghị isi. M na-agbalị ịkwanyere mmadụ nile ùgwù.” E wezụga ịmụrụ anya na ịghara ịnọdebe ndị a na-enyo enyo, ọ na-ekwukwasị ihe enyemaka ọzọ iji chịkwaa mmetụta uche mmadụ: “Karịsịa ihe nile, m na-azụlite obi ike n’ebe Jehova Chineke nọ, na-echeta na ọ dịghị ihe ọ bụla ọ na-adịghị ahụ, ihe ọ bụla nke mekwara bụ n’ihi na o kwere ka o mee.”
Ma, ọ dịghị onye nwere mmasị ịdị na-ebi n’ụjọ mgbe nile. Ọzọkwa, ònye ga-agọnarị na ụjọ na nrụgide gabigara ókè na-emerụ ahụ ike mmetụta uche na nke anụ ahụ ahụ? Ya mere, olileanya dị aṅaa dịịrị ndị na-atụ ụjọ na a pụrụ ịwakpo ha n’oge ọ bụla? Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-atụ ụjọ na ọnọdụ dị njọ karị n’ihe banyere mpụ ka dị n’ihu, ọ̀ dị mgbe anyị ga-ahụ ngwụsị nke ime ihe ike? Anyị na-akpọ gị òkù ịgụ isiokwu na-esonụ bụ́, “Olee Mgbe Egwu Ga-akwụsị?”