Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 8/15 p. 4-7
  • Olee Mgbe Egwu Ga-akwụsị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Mgbe Egwu Ga-akwụsị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Ụwa Ọhụrụ Chineke
  • Ụwa nke Ndị Ohi Na-anọghị na Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ịnagide Imempụ n’Ime Ụwa nke Nọ n’Ọgba Aghara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Nnwere Onwe Pụọ N’ụjọ Ò Kwere Omume?
    Teta!—2005
  • Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Wakporo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 8/15 p. 4-7

Olee Mgbe Egwu Ga-akwụsị?

Ọ̀GA-EJU gị anya ịmata na e jikọtara ezi ịnọ ná ntụkwasị obi na otu nwoke nke biri ndụ 2,000 afọ gara aga? N’igosi mkpa e nwere maka ịhụnanya, Jisọs Kraịst tụrụ otu ilu kwesịrị ịrịba ama, sị: “Otu nwoke si na Jerusalem na-arịda ịga Jeriko; o wee daba n’etiti ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị gbara ya ọtọ tiekwa ya ihe otiti, wee laa, hapụ ya nnwụnye ọlụ.” Ọ bụ ezie na ndị njem abụọ leghaara onye ahụ e zuru ohi anya, otu onye Sameria nwere obi ọma gosiri obi ebere. Otú ọ dị, ònye na-elekọta ndị e mesoro mpụ taa? Ahụ efe dị aṅaa pụọ n’ụjọ ka anyị pụrụ ịtụ anya ya?—Luk 10:30-37.

Ka ha na-ekwupụta na ha kwere na Chineke, ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ mmadụ ga-ahụ na e debere iwu na ụkpụrụ iwu. Ma ịtụ nga ruo ogologo oge karị ma ọ bụ ndị uwe ojii a na-akwụ ụgwọ dị elu karị hà ga-eme ka mpụ ime ihe ike kwụsị? Ì kwenyere n’ezie na ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka idebe iwu, n’agbanyeghị ezi mgbalị nile e meworo ịhụ na e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịnọ ná ntụkwasị obi, ga-ewepụsị ihe ndị dị ka iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, mpụ a haziri ahazi, na ịda ogbenye? Ma, agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ anyị maka ezi omume agaghị abụ na nkịtị.—Matiu 5:6.

Abụ Ọma 46:1 na-asị: “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” Anyị ga-ahụ na okwu ndị a abụghị nanị abụ uri mara mma.

Dị ka ị maara, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-akọ kwa ụbọchị banyere oké ogbugbu n’agha obodo dị iche iche na mwakpo nke ndị na-eyi mmadụ egwu. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ọ ghọwo ihe zuru ebe nile bụ́ igbu ndị ntorobịa a na-achọghị ma ọ bụ ndị akaebe. N’ihi gịnị ka ndụ jiworo ghọọ nke a na-ejighị kpọrọ ihe otú a? Ọ bụ ezie na a pụrụ inwe ọtụtụ ihe kpatara ime ihe ike dị otú ahụ, e nwere otu nke anyị na-ekwesịghị ileghara anya.

Dị ka Okwu Chineke, bụ́ Bible, si kwuo, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’eziokwu, Jisọs Kraịst mere ka a mata Setan bụ́ Ekwensu ọ bụghị nanị dị ka onye ụgha kama dị ka “ogbu mmadụ.” (Jọn 8:44) N’inwe mmetụta n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ dị iche iche, mmụọ nke a e kere eke nke dị ike na-akwalite mmụba nke ime ihe ike nke taa. “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge,” ka Mkpughe 12:12 na-ekwu. Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, a ga-eji “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha” dochie anya ajọ usoro ihe nke a.—2 Pita 3:13.

Tụkwasị n’olileanya nke a dị ebube nke ụwa ọhụrụ, olee enyemaka anyị nwere kpọmkwem ugbu a?

Tupu e lenye anya n’azịza dị mma nye ajụjụ ahụ, ọ dị mma iburu n’uche na ọbụna ezi ndị Kraịst enweghị nkwa ọ bụla na a ga-echebe ha pụọ na mpụ. Pọl onyeozi kọwara ụfọdụ n’ime ihe ize ndụ ndị ya onwe ya zutere. Ọ nọwo “n’ize ndụ n’osimiri, n’ize ndụ site ná ndị na-apụnara mmadụ ihe, n’ize ndụ site ná ndị mba nke [ya], n’ize ndụ site ná ndị mba ọzọ, n’ize ndụ n’ime obodo, n’ize ndụ n’ime ọhịa, n’ize ndụ n’ime oké osimiri.” (2 Ndị Kọrint 11:26) Ma Pọl lanarịrị ihe ize ndụ ndị a. Ọ bụkwa otu ihe ahụ taa; site n’ilezi anya, anyị ka pụrụ ịdị na-arụ ọrụ anyị dị ka o kwesịrị ruo n’ókè o kwere mee. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ ndị ga-enye aka.

Ọ bụrụ na mmadụ bi n’agbata obi dị ize ndụ, àgwà ọma pụrụ ịbụ ihe nchebe, ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-ahụ ndị ọzọ nke ọma. Ọ bụ ezie na ndị ohi na-eme atụmatụ ma na-eme mpụ, ọtụtụ na-ewere onwe ha dị ka ndị mmadụ ndị ọzọ. Zere ịkatọ ihe ha na-eme, anwakwala ịchọpụta ihe ha tinyere aka na ya. N’ụzọ dị otú a, ị pụrụ ibelata ohere nke ịbụ onye e lekwasịrị anya maka imegwara. Buru n’uche na ndị ohi na-anwa ịchọpụta ndị zụtaworo ihe ọhụrụ ma ọ bụ onye na-eje ezumike n’ihi ya bụrụ ndị na-agaghị anọ n’ụlọ ha, ya mere dịrị akọ n’ihe ị na-ekpughere ndị ọzọ.

Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova achọpụtawo na aha ọma ha dị ka ndị ozi enyewo ha ọ̀tụ̀tụ̀ nchebe pụrụ iche. Ndị omekome egosiwo ọtụtụ mgbe na ha na-akwanyere ndị Kraịst dị otú ahụ ùgwù, bụ́ ndị na-ewepụta onwe ha n’inyere ndị mmadụ nọ n’ógbè ha aka n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Ndịàmà n’onwe ha abụghị ndị ogbu mmadụ ma ọ bụ ndị ohi, ha abụghịkwa ‘ndị na-ele ihe na-abụghị nke aka ha anya,’ n’ihi ya ha abụghị ihe iyi egwu.—1 Pita 4:15.

Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Ụwa Ọhụrụ Chineke

Anyị na-enwe mwute n’ihi ‘ịba ụba nke ihe na-emebi iwu’ bụ nke Jisọs Kraịst buru n’amụma, ma kama inwe nchekasị gabigara ókè, anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke ga-ekpochapụ ajọ usoro ihe nke a n’isi nso. E wezụga ibu amụma banyere nkwusa zuru ụwa ọnụ nke “ozi ọma nke a nke alaeze,” Jisọs chetaara ụmụazụ ya, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:12-14.

Anyị pụrụ ijide n’aka na a ga-ekpochapụ ndị na-awakpo ndị ọzọ, mgbe ụfọdụ na-eji obi ọjọọ a na-apụghị ikweta ekweta. Ilu 22:22, 23 na-asị: “Anapụla onye na-enweghị ike ihe n’ike, n’ihi na onye na-enweghị ike ka ọ bụ, azọpịakwala onye e wedara n’ala n’ọnụ ụzọ ámá: n’ihi na Jehova ga-ekpe ọnụ ha, wee pụnara ndị ahụ ndụ, bụ́ ndị na-apụnara ha ihe.” Jehova ga-ekpochapụ ndị na-emebi iwu, dị ka ndị ohi, ndị ogbu mmadụ, na ndị na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ. Ọzọkwa, ọ gaghị eleghara ndị e mesoro ụdị mpụ ndị ahụ anya. Ọ ga-emeri mfu ha nile wee weghachi ahụ ike ha n’ụzọ zuru ezu.

N’ezie, ndị ‘na-esi n’ihe ọjọọ ewezụga onwe ha, ma na-eme ezi ihe’ ga-enweta ndụ ebighị ebi site n’ịlanarị oké mkpagbu ahụ na-abịanụ ma ọ bụ site n’ịbụ ndị e si n’ọnwụ kpọlite. “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:27-29) A ga-enweta uru ndị dị otú ahụ n’ihi àjà mgbapụta nke Jisọs. (Jọn 3:16) Ma gịnị ka ndụ ga-adị ka ya n’ime Paradaịs ahụ e weghachiri?

Ndụ n’okpuru Alaeze Chineke ga-abụ ihe obi ụtọ n’ezie. Jehova na-ebu amụma, sị: “Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.” (Aịsaịa 32:18) Ndị nile ga-enweta ndụ ebighị ebi ga-agbanweworị ọdịdị mmadụ ha. Ọ dịghị onye ga-abụ onye ọjọọ ma ọ bụ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi, ọ dịghịkwa onye ga-abụ onye onye dị otú ahụ ga-emeso omume ọjọọ. Maịka onye amụma na-asị: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:4; Ezikiel 34:28) Lee otú o si dị iche n’agbata obi ndị dị ize ndụ nke taa!

[Igbe dị na peeji nke 6]

KPACHARA ANYA

Ọtụtụ ndị omekome na-arụ ọrụ oge nile, na-eme mpụ ọrụ aka ha. Ha pụrụ ịrụ ọrụ n’ìgwè nke mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ, ọbụna a sị na otu onye atụdo gị égbè. Ọ na-edowanye anya na ruo n’ókè onye omekome ahụ bụruru nwata, otú ahụ ka ọ na-adị ize ndụ karị. Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị bụrụ onye ọ dakwasịrị?

Nọrọ jụụ ka ị ghara ime ka ahụ ghara iru onye ohi ahụ ala—enweghị ahụmahụ ya pụrụ ịkpata ọnwụ. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, mee ka a mata na ị bụ. Ma, dịrị njikere inyefe ihe onye ohi ahụ chọrọ. Ọ bụrụ na i gbuo oge, ihe ize ndụ ahụ na-arị elu. E mesịa, ị pụrụ iche na ọ dịghị ize ndụ ịrịọ ka e nyeghachi gị akwụkwọ ndị e ji amata mmadụ ma ọ bụ ego bọs.

Ọtụtụ mgbe ị pụghị ịchọpụta onye bụ onye omekome. Ndị ohi ụfọdụ bụ ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ ma ọ bụ ndị ji ya mere ọrụ aka, ndị ọzọ chọrọ nanị ihe ha ga-eri. Ka o sina dị, ebula ego buru ibu. Zere igosipụta ọla, mgbaaka ọlaedo, ma ọ bụ elekere mgbanaka ndị dara oké ọnụ. Jee ije ma mee njem dị ka ị na-eme, n’egosighị ụjọ ọ bụla. Elekwasịla ndị mmadụ anya dị ka a ga-asị na ị chọrọ ịchọpụta ndị ha bụ. N’ihe banyere ịgba égbè n’okporo ámá, daa n’ala; a pụrụ ihichasị uwe mgbe e mesịrị.—Otu onye bụbu onye uwe ojii na Rio de Janeiro.

[Foto dị na peeji nke 5]

Nọrọ jụụ ma nyefee ihe onye ohi ahụ chọrọ. Ọ bụrụ na i gbuo oge, ihe ize ndụ ahụ na-arị elu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya