Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 12/15 p. 21-25
  • Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Wakporo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Wakporo
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nchebe na Okwu Chineke
  • Ibelata Iyi Egwu nke Izu Ohi
  • Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Bịara
  • Ịnọrọ Jụụ
  • Otu Ohi Akụọ Afọ n’Ala n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olee Mgbe Egwu Ga-akwụsị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ụwa nke Ndị Ohi Na-anọghị na Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha Ọzọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 12/15 p. 21-25

Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Wakporo

N’IKOYI, bụ́ ógbè dịpụrụ nnọọ adịpụ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ụlọ ukwu aghọwo ebe ndị e wusiri ike. Ọtụtụ nwere mgbidi ndị dị mita atọ n’ịdị elu, ndị e gwugidechara ígwè ndị pịrị ọnụ, ugegbe a kụwara akụwa, ma ọ bụ waya hịkọrọ ahịkọ ndị dị ka agụba. Ndị nche na-eche akatamkpo ọnụ ụzọ ama ndị e ji ihe mkpọchi, ihe ngebichi, chen, na igodi mee ka ọ dị nchebe. A na-akụchi windo akụchi. Ọnụ ụzọ ndị e ji ígwè rụọ na-ekewapụ ọnụ ụlọ ihi ụra site n’akụkụ ndị ọzọ nke ụlọ. N’abalị, a na-atọhapụ nkịta ndị buru ibu site n’ebe ndị a kpọchibidoro ha. Ìhè ndị na-enwu zaa na-eme ka ọchịchịrị gbaa ọsọ, usoro iche nche ndị ji kọmputa arụ ọrụ na-ebekwa nwayọọ nwayọọ mgbe ala dị mma.

Ọ dịghị onye na-enwe obi abụọ na e nwere mkpa nke ime ka ebe obibi ya dịrị nchebe. Isiakụkọ ndị pụtara n’akwụkwọ akụkọ na-akwa arịrị, sị: “Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Ezukọrọ Ihe Ógbè”; “Ụmụaka Na-ezu Ohi Enwekwaghị Nchịkwata”; na “Ụjọ, Ka Òtù Ndị Omempụ Okporo Ámá Weghaara [Otu Obodo Ukwu].” Nke a bụ ọnọdụ dị n’ọtụtụ mba. Dị ka Bible buru n’amụma, anyị bi n’oge dị oké egwu n’ezie.—2 Timoti 3:1.

Ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ, gụnyere nke iji égbè ezu ohi, na-arị elu gburugburu ụwa. N’ụzọ na-arị elu, gọọmenti enweghị ike ma ọ bụ adịghị njikere ichebe ụmụ amaala ha. Ná mba ụfọdụ ndị uwe ojii, bụ́ ndị ndị ohi karịrị n’ọnụ ọgụgụ, nweekwa égbè karịa ha, enweghị ezigbo ngwá ọrụ iji zaa òkù ndị a na-akpọ maka enyemaka. Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ekiri ihe na-emenụ adịghị achọ itinye aka.

Ndị o metụtara, bụ́ ndị na-enweghị ike ịdabere n’enyemaka sitere n’aka ndị uwe ojii ma ọ bụ ọha na eze, na-abụ ndị a hapụrụ ịzọrọ isi onwe ha. Otu onye Kraịst bụ́ okenye bi n’otu mba ka na-emepe emepe kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i tie mkpu, ndị ohi ahụ ga-akwarụ ma ọ bụ gbuo gị. Chefuo banyere enyemaka si n’ebe ọzọ. Ọ bụrụ na enyemaka abịa, ọ dị mma, ma atụla anya ya ma ọ bụ kpọọ òkù maka ya n’ihi na ịkpọ òkù maka enyemaka pụrụ nanị ịbụ ikotekwu nsogbu.”

Nchebe na Okwu Chineke

Ọ bụ ezie na ndị Kraịst abụghị akụkụ nke ụwa, ha nọ n’ụwa. (Jọn 17:11, 16) Ya mere dị ka onye ọ bụla ọzọ, ha na-eme atụmatụ ndị ezi uche dị na ha maka nchebe ha. Ma, n’adịghị ka ọtụtụ ndị na-adịghị ejere Jehova ozi, ndị Chineke na-achọ nchebe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị Kraịst.

N’ụzọ dị iche, ndị mmadụ ná mba ụfọdụ nke Africa na-etinye aka na majik n’ịchọ ichebe onwe ha pụọ n’ohi. Onye dibịa pụrụ ịkawa aka, obi, ma ọ bụ azụ nke onye ọ na-emere ọgwụ. Mgbe ahụ ọ na-etebanye ọgwụ n’ime ebe ahụ ọ kawara akawa, kwuo okwu ịgọ mmụọ ụfọdụ, a na-ewerekwa ya na ndị ohi agaghị akpa onye ahụ aka. Ndị ọzọ na-edote ọtụmọkpọ ma ọ bụ ọgwụ n’ụlọ ha, na-ekwenye na “nchebe” dị otú ahụ ga-eme ka ndị ohi hapụ ha n’emekpaghị ha ahụ.

Ezi ndị Kraịst enweghị ihe jikọrọ ha na ụdị majik ọ bụla. Bible na-akatọ ụdị ọ bụla nke mgbaasị, nke a zikwara ezi ebe ọ bụ na omume ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ndị mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ na-emekọ ihe, bụ́ kpọmkwem ndị na-akwalite ime ihe ike n’ụwa.—Jenesis 6:2, 4, 11.

Ụfọdụ ndị na-achọsi nchebe ike site n’iburu égbè. Otú ọ dị, ndị Kraịst na-ewere okwu Jisọs kpọrọ ihe, bụ́ onye sịrị: “Ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Ndị Chineke ‘akpụgharịwo mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè,’ ha adịghịkwa azụrụ égbè iji chebe onwe ha site n’ohi ma ọ bụ mwakpo.—Maịka 4:3.

Gịnị banyere ime ndokwa maka ndị nche bu égbè? Ọ bụ ezie na nke a ga-abụ mkpebi dịịrị onwe onye, cheta na ndokwa dị otú ahụ na-etinye égbè ahụ n’aka onye ọzọ. Gịnị ka onye were ndị nche n’ọrụ ga-atụ anya n’aka ndị nche ahụ ma onye ohi bịa? Ọ̀ ga-atụ anya ka ndị nche ahụ gbaa onye ohi ahụ égbè ma ọ dị mkpa iji chebe ndị mmadụ na ihe onwunwe ndị ha na-eche nche?

Nguzo ndị Kraịst na-ewere n’ịjụ majik na ngwá ọgụ dị ka ngwá ọrụ nchebe pụrụ iyi ihe nzuzu n’anya ndị na-amaghị Chineke. Otú ọ dị, Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọọ n’elu.” (Ilu 29:25) Ọ bụ ezie na Jehova na-echebe ndị ya n’ozuzu ha, ọ dịghị etinye aka mgbe nile iji chebe ndị ohu ya pụọ n’ohi. Job kwesịrị ntụkwasị obi n’ụzọ pụtara ìhè, ma Chineke kwere ka ìgwè ndị na-eme ihe ike kwakọrọ anụ ụlọ Job, na-eweta ọnwụ nke ndị na-ejere ya ozi. (Job 1:14, 15, 17) Chineke kwekwara ka Pọl onyeozi nọrọ “n’ize ndụ site ná ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (2 Ndị Kọrint 11:26) Ka o sina dị, Chineke na-akụziri ndị ohu ya ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị na-ebelata ihe ize ndụ nke ohi. Ọ na-enyekwa ha ihe ọmụma nke na-enyere ha aka imeghachi omume n’ụzọ ndị ga-ebelata inwe ike inweta mmerụahụ mgbe a nwara izu ha ohi.

Ibelata Iyi Egwu nke Izu Ohi

Nwoke amamihe ahụ kwuru eri oge, sị: “Afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.” (Eklisiastis 5:12) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị nwere ọtụtụ ihe pụrụ ịdị na-enwe oké nchegbu banyere ihe onwunwe ha ifunahụ ha nke na ha adịghị ehi ụra ka ha na-eche banyere ya.

Ya mere otu ụzọ isi belata ọ bụghị nanị nchegbu kamakwa iyi egwu nke ohi bụ izere ịkpakọba ihe onwunwe ndị dị oké ọnụ n’ụzọ bara uba. Onyeozi ahụ nwere ike mmụọ nsọ dere, sị: “Ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa.” (1 Jọn 2:16) Otu agụụ ahụ nke na-akwali ndị mmadụ ịzụ ihe ndị dara oké ọnụ na-akwalikwa ndị ọzọ izu ohi. “Oké okwu nke ibi obi” pụkwara ịbụ ịkpọ ndị ahụ nwere ọchịchọ nke ịkwakọrọ ihe mmadụ òkù.

E wezụga ibi ndụ na-adịghị adọta oké mmasị, ihe nchebe ọzọ megide ohi bụ igosipụta na ị bụ ezi onye Kraịst. Ọ bụrụ na i gosi ndị ọzọ ịhụnanya, na-akwụwa aka ọtọ n’ụzọ i si eme ihe, dịkwa irè n’ozi ndị Kraịst, ị pụrụ inwe aha ọma n’ógbè gị n’ihi ịbụ ezigbo mmadụ, onye kwesịrị ka a kwanyere ùgwù. (Ndị Galetia 5:19-23) Aha ọma dị otú ahụ nke ndị Kraịst pụrụ ịbụ nnọọ ihe nchebe karịa ngwá ọgụ.

Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Bịara

Otú ọ dị, gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndị ohi abata n’ebe obibi gị ma bakwute gị? Cheta na ndụ gị ka ihe onwunwe mkpa. Kraịst Jisọs sịrị: “Eguzogidela onye bụ ajọ onye: kama onye ọ bụla na-akpụ gị ụra ná ntị aka nri, tụgharịakwara ya ntị ọzọ. Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-achọ . . . ka o wee nara gị uwe ime gị, hapụkwara ya oké uwe gị.”—Matiu 5:39, 40.

Nke a bụ ndụmọdụ amamihe dị na ya. Ọ bụ ezie na iwu ejighị ndi Kraịst inye ndị omekome ihe ọmụma banyere ihe onwunwe ha, ndị ohi yikarịrị ka ha ga-eme ihe ike ma ọ bụrụ na ha ahụta nguzogide, ekwenyeghị ekwenye, ma ọ bụ aghụghọ. Ọtụtụ n’ime ha, “ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ,” bụ ndị a na-akpali n’ụzọ dị mfe ịkpa àgwà ọjọọ nke obi ịta mmiri.—Ndị Efesọs 4:19.

Samuel bi n’otu ebe e wuru ọgbara ụlọ. Ndị ohi nọchibigidere ụlọ ahụ ma na-esite n’otu ụlọ gaa n’ọzọ, na-akwakọrọ ihe. Samuel nụrụ ụda égbè, ibo ụzọ ndị a na-akụpịa, na ndị mmadụ na-eti mkpu, na-akwakwa ákwá. Mgbapụ apụghị ikwe omume. Samuel gwara nwunye ya na ụmụ ya nwoke atọ ka ha gbudo ikpere n’ala, chilie aka ha elu, mechie anya ha, ma chere. Mgbe ndị ohi ahụ tikabatara, Samuel gwara ha okwu ka ọ na-ele anya n’ala, na-amara na ọ bụrụ na ya elee ha anya n’ihu, ha pụrụ iche na ọ ga-amata ha ma e mesịa. “Batanụ,” ka ọ sịrị. “Ihe ọ bụla unu chọrọ, werenụ. Unu nwere onwe unu iwere ihe ọ bụla. Anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị agaghị eguzogidekwa unu.” Nke a juru ndị ohi ahụ anya. N’ime ihe karịrị otu awa ma ọ bụ ihe yiri ya sochirinụ, ngụkọta nke ndị ikom 12 bucha égbè batara n’ìgwè n’ìgwè. Ọ bụ ezie na ha zuuru ọla, ego, na ngwongwo electronics, a kụghị ezinụlọ ahụ ihe ma ọ bụ maa ha mma dị ka e mere ndị ọzọ bi n’ụlọ ahụ. Ezinụlọ Samuel kelere Jehova maka ndụ ha.

Nke a na-egosi na mgbe a bịara n’ihe banyere ego na ihe onwunwe, ndị e zuru ohi bụ́ ndị na-eguzogideghị ndị ohi pụrụ ibelata ịbụ ndị e nwere ike merụọ ahụ.a

Mgbe ụfọdụ onye Kraịst ịgba àmà pụrụ ịbụ ihe nchebe pụọ ná mmerụahụ. Mgbe ndị ohi wakporo ụlọ Ade, ọ gwara ha, sị: “Amaara m na ihe siiri unu ike, ọ bụkwa ya mere unu ji arụ ụdị ọrụ a. Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị kweere na otu ụbọchị onye ọ bụla ga-enwe ihe ga-ezuru ya na ezinụlọ ya iri. Onye ọ bụla ga-ebi n’udo na obi ụtọ n’okpuru Alaeze Chineke.” Nke ahụ belatara ime ihe ike nke ndị ohi ahụ. Otu n’ime ha sịrị: “O wutere anyị na anyị abịawo n’ụlọ gị, ma ị ghaghị ịghọta na agụụ ji anyị.” Ọ bụ ezie na ha napụrụ Ade ihe onwunwe ya, ha emetụghị ya ma ọ bụ ezinụlọ ya aka.

Ịnọrọ Jụụ

Ọ dịghị mfe ịnọrọ jụụ n’ọnọdụ dị ize ndụ, karịsịa mgbe nzube bụ́ isi nke ndị ohi bụ iyi ndị ha wakporo egwu ikwenyere ha. Ekpere ga-enyere anyị aka. Jehova pụrụ ịnụ mkpu anyị na-etiku ya maka enyemaka, ọ bụ ezie na e kwupụtaghị ya ekwupụta, bụrụkwa nke dị nkenke. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya.” (Abụ Ọma 34:15) Jehova na-anụ olu anyị, ọ pụkwara inye anyị amamihe iji nagide ọnọdụ ọ bụla n’ụzọ dị jụụ.—Jemes 1:5.

E wezụga ekpere, ihe ọzọ na-enye aka ịnọ jụụ bụ iburu ụzọ kpebie ihe ị ga-eme na ihe ị na-agaghị eme ma ọ bụrụ na e zuo gị ohi. N’ezie, ọ gaghị ekwe omume ibu ụzọ mara ọnọdụ ị ga-achọta onwe gị na ya. Ma, ọ dị mma iburu ụkpụrụ ụfọdụ n’uche, dị nnọọ ka ọ bụ ihe amamihe dị na ya iburu usoro nchebe ụfọdụ n’uche a dịghị ama ama ụlọ ị nọ na ya enwuru ọkụ. Ibu ụzọ chee echiche ga-enyere gị aka ịnọrọ jụụ, izere ịma jijiji, na ịgbanahụ mmerụahụ.

E kwuru echiche Chineke banyere izu ohi n’ụzọ doro anya: “Mụ onwe m, Jehova, na-ahụ ikpe ziri ezi n’anya, ana m akpọ nnapụ n’ihe ike n’ajọ omume asị.” (Aịsaịa 61:8) Jehova nyere onye amụma ya bụ́ Ezikiel ike mmụọ nsọ idenye izu ohi dị ka mmehie jọgburu onwe ya. (Ezikiel 18:18) Ma, otu akwụkwọ Bible ahụ na-egosikwa na Chineke ga-eji ebere gbaghara onye chegharịrị ma nyeghachi ihe o zuru n’ohi.—Ezikiel 33:14-16.

N’agbanyeghị ibi n’ụwa nke ime mpụ jupụtara, ndị Kraịst na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya nke ịdị ndụ n’okpuru Alaeze Chineke, mgbe izu ohi na-agaghị adịkwa ọzọ. Banyere oge ahụ, Bible na-ekwe nkwa, sị: “[Ndị Chineke] ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”—Maịka 4:4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ezie, nkwenye nwere ókè. Ndị ohu Jehova adịghị ekwenye n’ụzọ ọ bụla na-emebi iwu Chineke. Dị ka ihe atụ, onye Kraịst agaghị eji ọchịchọ obi kwe ka e dinaa ya n’ike.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya