Otu Ohi Akụọ Afọ n’Ala n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa
Dị ka Eunice Ebuh si kọọ
“Ndị oji égbè ezu ohi mere atụmatụ ime mwakpo n’ụbọchị anyị na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’ụlọ anyị. Anyị na-eghewere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na ndị nwere mmasị ọnụ ụzọ ámá anyị oghe. O yiri ka ndị ohi ahụ hà maara otú anyị si eme na oge nzukọ anyị. Anyị maara nnọọ na ha ezuwo otu ụgbọala n’ebe ọzọ ma bịa chere n’akụkụ ọnụ ụzọ anyị n’ụbọchị na n’oge ọmụmụ akwụkwọ ahụ.
“Dị ka o si dapụta, izu ha bịara bụ izu nleta nke onye nlekọta sekit. Kama izukọ n’ụlọ anyị, anyị zukọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe nzukọ gbasara, e nwere nzukọ ndị okenye. Dị ka ọ na-adịkarị, mụ na ụmụ anyị gaara alawo, ma di m, bụ́ onye okenye, gwara anyị ka anyị chere ya. Ọ sịrị na ya agaghị anọ ọdụ. Ya mere anyị cheere.
“E mesịa anyị chọpụtara na ụgbọala anyị enweghị ike ịgbanwu. Onye nlekọta sekit na di m enweghị ike idozi ya. Onye mekanik anyị kpọrọ enweghịkwa ike idozi ya.
“Ụmụ anyị aghaghị iji ụkwụ laa. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, alakwara m. Alaruru m n’ihe dị ka elekere anya iri. Ma mụ ma ụmụ anyị ejighị ụgbọala banye n’ogige ebe obibi anyị, bụ́ nke gaara achọwo ka e meghee ọnụ ụzọ ukwu anyị.
“Mgbe m banyere ọnụ ụlọ ihi ụra m, anụrụ m ụda égbè, ọ dara nnọọ ụda. Echere m echiche banyere ihe na-emenụ. Agbalịrị m ịkpọ ndị uwe ojii na telifon, ma fon anaghị arụ ọrụ. Agbadara m n’ala ma kpọchie ibo ígwè e si abata abata, jirizie ọsọ gaa imechi ibo nke dị n’etiti. Agbanyụrụ m ọkụ. Ụmụ m nọ na-ama jijiji, ya mere a gwara m ha ka ha nọrọ jụụ. Anyị kpekọrọ ekpere ọnụ maka nchebe Jehova. Ka ọ dịgodị, di m ka nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-agbalị ịgbanwu ụgbọala ahụ.
“Elepụrụ m anya na windo ma hụ otu nwoke tọgbọrọ n’okporo ámá ná mpụga ọnụ ụzọ anyị. O yiri ka ndị ohi ahụ alawo, ya mere ekunyere m nwoke ahụ e merụrụ ahụ n’ime ụgbọala m ma kwọga ya n’ụlọ ọgwụ. Ọ bụ ihe ize ndụ, ma aghaghị m ime ihe. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọ nwụrụ n’echi ya.
“N’agbanyeghị ọdachi ahụ, ihe gaara akawo nnọọ njọ. Nleta onye nlekọta sekit mere ka anyị ghara inwe ọmụmụ akwụkwọ n’ụlọ anyị. Mmebi ụgbọala anyị mere ka anyị ghara ịkwọ ụgbọala laa dị ka otu ezinụlọ. Di m, bụ́ onye ndị ohi ahụ gaara ejichiwo, alọtaghị n’ụlọ ruo nnọọ mgbe oge gacharala. Ihe ndị a na ihe ndị ọzọ baara anyị uru n’abalị ahụ.
“Jehova bụ ebe anyị e wusiri ike na ebe mgbaba anyị. Ọ bụ dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ si kwuo: ‘Ọ bụrụ na Jehova echeghị obodo, n’efu ka onye nche mụrụwooro anya.’”—Abụ Ọma 127:1.