Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 10/15 p. 4-7
  • Ụwa nke Ndị Ohi Na-anọghị na Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa nke Ndị Ohi Na-anọghị na Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ka Onye Na-ezu Ohi Ghara Izukwa Ohi Ọzọ”
  • Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Ụwa Ọhụrụ Chineke
  • Olee Mgbe Egwu Ga-akwụsị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • N’ihi Gịnị Ka Izu Ohi Ji Na-amụba?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ịnagide Imempụ n’Ime Ụwa nke Nọ n’Ọgba Aghara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Mgbe Ndị Oji Égbè Ezu Ohi Wakporo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 10/15 p. 4-7

Ụwa nke Ndị Ohi Na-anọghị na Ya

O MERE n’otu ntabi anya. Otu nwoke nke jikere nke ọma tụkwasịrị égbè n’isi Antônioa n’ihu ụlọ ya dị na São Paulo, Brazil, gwa ya ka o wepụta mkpịsị ugodi na akwụkwọ ụgbọ ala ya, wee nyara ya pụọ ngwa ngwa.

Na Rio de Janeiro, n’ihu nwa ya nwanyị dị afọ iri, ndị ikom anọ ji ngwá ọgụ zuru ezu jidere otu nwoke aha ya bụ́ Paulo. Mgbe ahụ, mgbe ha ji ụgbọ ala rute n’ụlọ ya, ndị abalị dị egwu ahụ banyere ma zuru ihe ha chọrọ, na-akwaju ụgbọ ala abụọ nke Paulo. N’iji ọnwụ yie nwunye Paulo egwu, ha kpọọrọ ya na onye na-arụrụ ya ọrụ dị ka ndị e ji eji gaa n’ụlọ ahịa Paulo ebe a na-ere ọla nke dị n’ógbè azụmahịa, bụ́ ebe ha bukọọrọ ihe ọ bụla bara uru dị na ya. Otú ọ dị, n’ụzọ a na-atụghị anya ya, ndị ohi ahụ mesịrị kpọọ na fon, na-ekwu ebe ha hapụworo ụgbọ ala ndị ahụ.

Lee ka o si bụrụ ihe mwute ịbụ onye e zunaara ego na ngwongwo e jisiri ike kpata! Ọ bụ ezie na ma Antônio ma Paulo emeghị otú ahụ, ndị ọzọ na-eme ihe n’onwe ha. Ha pụrụ igbu ma ọ bụ imerụ onye ohi ahụ ahụ, ma ọ bụ ha pụrụ igbu onwe ha. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onye ntorobịa pụnaara ya elekere ọ gbaa n’aka, otu nwanyị Brazil iwe ji mịpụtara égbè n’akpa ya wee gbaa onye ohi ahụ, na-egbu ya. Gịnị si na ya pụta? Akwụkwọ akụkọ O Estado de S. Paulo na-akọ, sị: “Ndị hụrụ ihe ahụ merenụ kwuru okwu ịja mma banyere àgwà nke nwanyị ahụ a na-amaghị onye ọ bụ, ọ dịghịkwa onye chọrọ inyere ndị uwe ojii aka ịkọwa onye ọ bụ.” Ọ bụ ezie na ọ na-agụsi ha agụụ ike ibi n’ụwa nke ndị ohi na-anọghị na ya, ndị Kraịst adịghị emegwara dị ka nwanyị ahụ mere. Ebe ọ bụ na ịbọ ọ́bọ̀ dịịrị Chineke, ha na-aṅa ntị n’okwu ndị dị n’Ilu 24:19, 20: “Emela ka iwe gị dị ọkụ n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ; ekwosola ndị na-emebi iwu ekworo. N’ihi na ọdịnihu agaghị adịrị onye ọjọọ.”

Ma ọ bụrụ na a wakpoo gị, gịnị ka ị pụrụ ime? Otu ihe nke mere na Rio de Janeiro na-egosi otú o si dị mkpa ịnọrọ jịị. Otu onye Kraịst, bụ́ Heloísa, ji bọs na-aga n’ebe ọ ga-eduzi ọmụmụ Bible. Ndị ikom abụọ malitere izu ndị njem ohi. Mgbe o rutere n’ebe bọs na-akwụsị bụ́ ebe ọ ga-arịtu, Heloisa gwara ha na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na ya na-agakwa iduzi otu ọmụmụ Bible. O gosiri Bible ya na akwụkwọ e ji amụ ya. N’ezughị ya ohi ọ bụla, ndị ohi ahụ kwere ka ọ rịtuo. Otú ọ dị, e kweghị onye njem ọzọ ka ọ pụọ. Onye na-anya ụgbọ ala ahụ mesịrị kwuo na ya ahụtụbeghị ihe ọ bụla dị ka ya.

Regina nọkwara jịị mgbe ndị ikom ji égbè nyere ya iwu ka ọ banye n’ụgbọ ala ya. N’igosi ha magazin Teta! nke aka ya, Regina gbara àmà. Ebe ọ bụ na ahụ na-ama ndị ohi ahụ jijiji, ọ gwara ha ka ha mepee igbe nkwasa ihe bụ́ ebe ọ na-etinye ụmụ ihe nracha. Ma mgbe ha hụrụ tepu Kingdom Melodies, ha malitere igere egwú ahụ. Ebe ọnọdụ ahụ ghọrọ nke enyi, ndị abalị dị egwu ahụ hapụrụ Regina n’emerụghị ya ahụ n’okporo ụzọ awara awara ahụ, na-emesi ya obi ike na ọ ga-achọta onye obi ọma nke ga-enyere ya aka. Mgbe o jere ije ruo minit iri, ọ hụrụ otu ụlọ, ma onye nwe ụlọ apụghị ikwere akụkọ ya, na-asị: “I yighị onye a wakpoworo; ahụ dị gị nnọọ jịị.”

Ọ bụ ezie na onye e zuru ohi pụrụ ịbụ onye a na-emerụghị ahụ, ahụmahụ dị otú ahụ nke na-akụghasị ahụ pụrụ ịkpata ihe ndị dị oké njọ ma e mesịa. ‘Onye ahụ e zuru ohi pụrụ inwe obi abụọ, ịkpọasị n’ebe ndị òtù ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị chọrọ inyere ya aka nọ, ghara inwe ike ịtụkwasị ndị ọzọ obi, na-echegbu onwe ya banyere ịhazi ihe ọ bụla, na-eche na ụwa jupụtara n’ikpe na-ezighị ezi,’ ka O Estado de S. Paulo na-akọ. N’ụzọ dị iche, onye e zuru ohi nke tụkwasịrị obi na Jehova Chineke yikarịrị ka ọ ga-alanarị ahụmahụ ahụ n’emerụghị ahụ n’ụzọ anụ ahụ na mmetụta uche. Otú o sina dị, ọ̀ bụ na ị gaghị ekweta na ọ ga-abụ ngọzi ma ọ bụrụ na e nwekwaghị mpụ ma ọ bụ ihe ọ bụla nke na-akpata ụjọ ọzọ?

“Ka Onye Na-ezu Ohi Ghara Izukwa Ohi Ọzọ”

Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-ahọrọ ụzọ ndụ anyaukwu ha, Okwu Chineke enyeworo ndị ohi aka ịgbanwe ọchịchọ ha na ọdịdị mmadụ ha. (Ndị Efesọs 4:28) N’inwe ezi nzube ná ndụ, nke dabeere na Bible, ha na-aṅa ntị n’okwu ahụ bụ: “Ọ dị mma inwe ihe nta n’ezi omume, karịa inwe ọtụtụ ihe omume ma ikpe ziri ezi adịghị ya.” (Ilu 16:8) Cláudio na-akọ, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile nọ n’ezinụlọ m bụ Ndịàmà, ma ọ dịghị mgbe m ṅara ntị n’ihe ha nwere ikwu banyere Jehova na nzube ya. Mgbe m na-alọta site ná njem nke chọrọ iru 2,000 kilomita n’otu ụgbọ ala pikọpụ e zutere ezute, agafere m ọtụtụ ebe nche ndị uwe ojii. N’ime nke ahụ achọpụtara m na m ghaghị ịgbanwe ndụ m. Agbalịwo m ime nke ahụ na mbụ ma o kweghị omume. N’oge a amalitere m iche echiche banyere ndị ikwu m ndị bụ Ndịàmà Jehova na otú ha si dị iche, na-enwe ọṅụ, obi ụtọ, na udo.” N’ihi nke ahụ, Cláudio malitere ịmụ Okwu Chineke, hapụ ọgwụ ọjọọ na ndị enyi ya na mbụ, ma ghọọ onye Kraịst na-eje ozi.

Ndị ọzọ na-aṅakwa ntị ugbu a n’okwu ahụ bụ́: “Unu atụkwasịla obi na mmegbu, ọzọ, n’ịpụnara mmadụ ihe unu aghọla ihe efu.” (Abụ Ọma 62:10) Mgbe ọ gasịrị mkpọrọ maka ọchụ nke ọ gaara egbu n’oge o zuru ohi, José, bụ́ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ na onye na-ere ọgwụ ọjọọ, ritere uru site n’isoro nwanne nwunye ya mụọ Bible. O sepụrụ aka n’ọgwụ ọjọọ, ugbu a ọ bụkwa Onyeàmà nke na-anụ ọkụ n’obi.

Otú o sina dị, ọdịdị mmadụ ọhụrụ adịghị abịa na mberede ma ọ bụ n’ụzọ ọrụ ebube. Oscar, bụ́ onye tinyeworo aka n’ụzọ miri emi n’ọgwụ ọjọọ na izu ohi, na-akọ, sị: “Ekpegaara m Jehova ekpere sitere n’ala ala obi nke na ọtụtụ mgbe ala ụlọ na-eyi ka ọ na-aghọ obere ọdọ mmiri nke jupụtara n’anya mmiri m.” Ee, e wezụga ịdị uchu n’ọmụmụ nke Okwu Chineke, ịnọgide n’ekpere, nke sitere n’obi dịkwa mkpa. Rịba ama amamihe dị n’echiche nke a yiri ekpere: “Enyela m ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ; mee ka m rie nri ruuru m: ka afọ wee ghara iju m, m wee gọọ agọ, sị, Ònye bụ Jehova? Ma ọ bụ ka e wee ghara ịnapụ m ihe nile, m wee zuo ohi, wee were aha Chineke m mee ihe ọjọọ.”—Ilu 30:8, 9.

A ghaghị iji ezi ịhụnanya dochie mmasị onwe onye: “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe, ka o wee nwee ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eketa.” (Ndị Efesọs 4:28) Dị ka ọ dị n’ọnọdụ nke ụfọdụ ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ́ ndị bụworo ‘ndị ohi ma ọ bụ ndị anyaukwu’ na mbụ, Jehova, site n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, ji ebere gbaghara ndị chegharịrịnụ. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Lee ka o si bụrụ ihe nkasi obi na n’agbanyeghị ihe anyị mere n’oge gara aga, anyị pụrụ ịgbanwe ụzọ ndụ anyị ma nweta amara Chineke!—Jọn 3:16.

Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Ụwa Ọhụrụ Chineke

Cheedị echiche banyere ụwa nke ndị ohi na-anọghị na ya. Ị gaghị anọ ná mkpa maka usoro na-efu oké ego nke idebe iwu site n’aka ndị ọkà ikpe, ndị ọkà iwu, ndị uwe ojii, na ụlọ mkpọrọ! Ọ ga-abụ ụwa nke jupụtara n’ihe onwunwe nke onye ọ bụla nọ na ya ga-akwanyere ndị ọzọ na ihe onwunwe ha ùgwù! Nke ahụ ò yiri ihe a na-apụghị ikwere? Chineke ọ̀ ga-etinye aka n’ezie n’ihe omume ụmụ mmadụ ma kwụsị mmebi iwu? Anyị na-akpọ gị òkù inyocha ihe àmà nke na-egosi na Bible bụ Okwu Chineke, na amụma ya nile bụkwa ihe kwesịrị ndabere. Ị ga-achọta ntọala siri ike maka inwe obi ike na mgbanwe na-abịa n’ọdịnihu. Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ igbochi Chineke iweta nnapụta ahụ e kwere ná nkwa nye ndị nile hụrụ ezi omume n’anya: “Emela ka iwe gị dị ọkụ n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ, ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo. N’ihi na dị ka ahịhịa ka a ga-ebipụ ha ngwa ngwa, dị ka akwụkwọ ahịhịa ndụ ka ha ga-akpọnwụ.” (Abụ Ọma 37:1, 2) Okwu ndị ahụ e dere n’oge dị anya gara aga ga-emezu kpam kpam n’oge na-adịghị anya.

Alaeze Chineke ga-akwụsị nhụjuanya na ajọ omume, bụ́ nke na-akpata oké ndakpọ olileanya na enweghị nchekwube. Ọ dịghị onye ga-anọ ná mkpa, na-enwe nrụgide izu ohi. A na-emesi anyị obi ike n’amụma ahụ bụ: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ dị ka Lebanon [oge ochie]: mmadụ ga-esikwa n’obodo waa okooko osisi dị ka ihe a kụrụ n’ala.” (Abụ Ọma 72:16) N’ezie, ná Paradaịs ahụ e weghachiri eweghachi, ọ dịghị ihe ga-emebi udo nke ụmụ mmadụ bụ́ ndị maara ma na-efe ezi Chineke ofufe.—Aịsaịa 32:18.

Lee aha nkwụghachi ụgwọ nke ahụ ga-abụ maka ịbụ ndị guzogidere ụzọ nile nke ụwa anyaukwu nke a! Ilu 11:19 na-asị: “Onye na-eguzosi ike n’ezi omume ga-eru ná ndụ: ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-eru n’ọnwụ nke aka ya.” Ee, mgbe e bipụsịrị ndị ajọ omume, ọ dịghị onye ọ bụla ga-enwe ihe ọ ga-eji tụọ ụjọ maka ndụ ya ma ọ bụ ihe onwunwe ya. Abụ Ọma 37:11 na-ekwe anyị nkwa nke a: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Igbe dị na peeji nke 5]

Ịnagide Ịdị Adị nke Izu Ohi

N’ỤLỌ—Ebe ndị ohi pụrụ ịwakpo ụlọ gị ma ị nọ n’ụlọ ma ọ bụ na ị nọghị, mechie ụzọ gị emechi ma kpọchie ya. Ndị ọkachamara na-atụ aro inwe ígwè ọrụ na-agba àmà ma ọ bụ nkịta na-eche nche. Gwa otu onye agbata obi nke ị tụkwasịrị obi mgbe ị ga-eje ezumike. Nọrọ jịị—ndị ohi na-eme ọsọ ọsọ, n’ụzọ a na-atụghị anya, ha pụkwara ịgbanwe atụmatụ ha ozugbo ma ọ bụrụ na ahụ amaa ha jijiji. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, kọwaa onwe gị ma gbalịa ịgba àmà. Ị pụrụ inwe ike ịkpali omume enyi ma ọ bụ ọmịiko. Eguzogidela ha, ọ gwụla ma a chọrọ imerụ gị ahụ.

N’ỌHA—Mụrụ anya ịhụta ma ọ dị onye na-eso gị n’azụ. Na-aga n’etiti ọwara ụzọ. Zere okporo ámá ndị gbara ọchịchịrị na nke ndị mmadụ na-adịghị aga. Jidesie akpa gị ma ọ bụ ihe onwunwe gị aka ike. Na-agasi ije ike dị ka à ga-asị na ọ dị ebe ị na-aga. Zere iyi uwe ndị dị oké ọnụ ma ọ bụ ọla ndị na-egbuke egbuke. Kpọrọ onye ị maara ma ị gaa ịzụta ihe mgbe ọnọdụ mere ka ọ dị mkpa. Jiri nanị ego dị gị mkpa, kesaakwa ha n’akpa uwe ma ọ bụ akụkụ dị iche iche.

N’ỤGBỌ ALA—Ọ bụrụ na “izuru ụgbọ ala mmadụ nọ na ya” aghọwo ihe na-ewerekarị ọnọdụ n’ógbè unu, anọdụla n’ime ụgbọ ala ị kwụwara akwụwa. Na-agbanwe ụzọ ị na-esi aga ma na-alata ọrụ. Soro ụzọ nke katụ mma, ọbụna ma à sị na ọ dịtụ anya. Tupu ị kwụsị, legharịa anya ịhụ ma ọ dị ihe ọ bụla yiri ihe a na-enyo enyo. Zere imeghe buutu gị n’ebe zoro ezo. Ahapụla ihe ndị bara uru n’ebe a pụrụ ịhụ ha n’ụgbọ ala. Mkpọrọ a na-akpọchi akpọchi ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-egbochi izu ohi nke a na-ahụ anya pụrụ ịkụda ndị ohi agụụ aka.

[Igbe dị na peeji nke 6]

“Unu akpadola akụ̀ n’ụwa nye onwe unu, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupukwa na-ezukwa ohi: kama kpadoonụ akụ̀ n’eluigwe nye onwe unu, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghị egwupukwa, ha adịghị ezukwa ohi.”—Matiu 6:19, 20

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya