Guzogide Ọdịnala Ndị Na-adịghị Asọpụrụ Chineke!
“EZIOKWU ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu,” ka Jisọs Kraịst kwuru. (Jọn 8:32) Ee, Iso Ụzọ Kraịst na-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha—nwere onwe ha pụọ n’ohu nke nkwenkwe na-enweghị isi, nwere onwe ha pụọ n’ikwere n’ozizi na olileanya ụgha, nwere onwe ha pụọ n’agbụ nke omume ndị rụrụ arụ.
Otú ọ dị, dị ka ọ dị n’oge gboo, ọtụtụ mgbe ndị Kraịst taa na-ezute nrụgide nke ịlaghachi n’ọdịnala oge mbụ. (Ndị Galetia 4:9, 10) Ọ bụghị na omenala nile a ma ama na-emerụ ahụ. N’ezie, onye Kraịst pụrụ ịhọrọ ịgbaso omenala ndị na-ewuli elu na ndị bara uru e nwere n’ógbè ya. Ma mgbe omenala gara n’ụzọ megidere Okwu Chineke, ndị Kraịst adịghị emebi okwukwe ha. N’ihi ya a maara Ndịàmà Jehova nke ọma maka ịjụ ikere òkè n’ememe Krismas, ụbọchị ọmụmụ, na omenala ndị ọzọ na-emegide Okwu Chineke.
Nguzo obi ike nke a arụpụtawo ọtụtụ mgbe ịchị ọchị na mmegide dị ukwuu site n’aka ndị enyi, ndị agbata obi, na ndị ikwu na-ekweghị ekwe. Karịsịa nke a adịwo otú a n’ala ụfọdụ nke Africa, ebe a na-edebe ụdị omenala dị iche iche n’oge ememe olili ozu, agbamakwụkwọ, na ọmụmụ. Nrụgide nke ikwenye pụrụ isi oké ike—ọtụtụ mgbe na-agụnye iyi egwu na omume ime ihe ike. Olee otú ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ pụrụ isi guzosie ike? Ọ̀ ga-ekwe omume izere esemokwu n’emebighị okwukwe onwe onye? Iji zaa ya, ka anyị nyochaa otú ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi siworo mee ihe banyere ọdịnala ụfọdụ megidere Akwụkwọ Nsọ.
Omenala Olili Ozu nke Nkwenkwe Na-enweghị Isi
N’ebe ndịda Africa e nwere ọtụtụ ọdịnala ndị e jikọtara ha na ememe olili ozu na ili ozu. N’ọtụtụ ebe ndị na-eru újú na-anọ abalị dum—ma ọ bụ ọtụtụ abalị—n’ụlọ iru újú, ebe a na-eme ka ọkụ nọgide na-enwu. A na-amachibido onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ iwu isi nri, ịkpa isi, ma ọ bụ ọbụna ịsa ahụ ruo mgbe e lisịrị ozu ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha ga-eji ngwakọta pụrụ iche nke mkpá akwụkwọ saa onwe ha ahụ. Ndị Kraịst hà na-anakwere omenala ndị dị otú ahụ? Ee e. Ha nile na-egosipụta ikwere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na egwu na-akụnwụ ahụ nke ndị nwụrụ anwụ.
Eklisiastis 9:5 na-ekwu, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” Ịmara eziokwu nke a na-eme ka mmadụ nwere onwe ya pụọ n’egwu nke ‘mmụọ ndị nwụrụ anwụ.’ Ma gịnị ka onye Kraịst kwesịrị ime mgbe ndị ikwu na-ebughị ihe ọjọọ n’obi kwuru ka o kere òkè n’ụdị ememe ndị dị otú ahụ?
Tụlee ahụmahụ nke otu Onyeàmà bụ́ onye Africa nke aha ya bụ Jane, bụ́ onye nna ya nwụrụ. Mgbe ọ bịarutere n’ụlọ ebe a nọ na-eme ememe olili ozu ahụ, a gwara ya ozugbo na ya na ihe fọdụrụ ná ndị ọzọ n’ime ezinụlọ ahụ ga-agba egwú gburugburu ozu ahụ abalị nile iji wee mee ka obi jụrụ mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ. “M gwara ha na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, apụghị m ikere òkè n’ihe omume ndị dị otú ahụ,” ka Jane na-akọ. “Otú ọ dị, n’ụbọchị na-esonụ mgbe e lisịrị ozu ahụ, ndị ikwu m meworo okenye kwuru na ha gaje ịsa ndị òtù ezinụlọ anyị ahụ ahụ dị ka ihe nchebe ndị ọzọ megide mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Ọzọ m jụrụ ikere òkè. N’otu oge ahụ, e debere mama m nanị ya n’ime ụlọ. Onye ọ bụla chọrọ ịhụ ya ga-ebu ụzọ ṅụọ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya a kwadebere maka nzube ahụ.
“M jụrụ itinye aka na nke ọ bụla n’ime ihe a. Kama nke ahụ m lara n’ụlọ ịkwadebe nri ụfọdụ, bụ́ ndị m bugara n’ụlọ ebe mama m nọ. Nke a mechuru ezinụlọ m ihu n’ezie. Ndị ikwu m chere na isi ezughị m okè.” Karịa nke ahụ, ha kwara ya emo ma kpọkwasị ya iyi, na-ekwu sị: “Ebe ọ bụ na ị jụwo ọdịnala anyị n’ihi okpukpe gị, mmụọ nna gị ga-enye gị nsogbu. N’ezie, o nwere ike ị pụghị ọbụna ịmụta ụmụ.” N’agbanyeghị nke ahụ, Jane jụrụ ịbụ onye e jiri iyi egwu mee ka o mee ya. Gịnị si na ya pụta? Ọ na-ekwu, sị: “N’oge ahụ enwere m ụmụ abụọ. Ugbu a m nwere isii! Nke a menyere ndị ahụ kwusiri ike na m gaghị amụta ụmụ ọzọ ihere.”
“Ime Ka A Dị Ọcha” n’Ụzọ Mmekọahụ
Omenala ọzọ na-agụnye ime ka a dị ọcha n’ụzọ omenala mgbe di ma ọ bụ nwunye mmadụ nwụsịrị. Ọ bụrụ na nwunye mmadụ anwụọ, ezinụlọ nke nwanyị ga-akpọtara nwoke ahụ nwunye ya nwụrụ nwanne nwunye ya ma ọ bụ nwanyị ọzọ ya na nwunye ya nwụrụ anwụ bụ ndị ikwu dị nso. Ọ bụ iwu na ọ ga-esoro ya nwee mmekọahụ. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ike ịlụ onye ọ bụla ọzọ ọ chọrọ. Otu ihe ahụ na-ewere ọnọdụ mgbe di nwanyị nwụrụ. E chere na ihe omume ahụ ga-eme ka di ma ọ bụ nwunye nke dị ndụ dị ọcha pụọ ná “mmụọ” nke di ma ọ bụ nwunye nke nwụrụ anwụ.
Onye ọ bụla jụrụ “ime ka a dị ọcha” dị otú ahụ na-etinye onwe ya n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye ndị ikwu wesara iwe. A pụrụ ikewapụ ya iche, kwaakwa ya emo ma na-akpọkwasị ya iyi ihe ọjọọ. Otú o sina dị, ndị Kraịst na-ajụ ịgbaso omenala nke a. Ha maara na mmekọahụ n’abụghị n’ime alụmdi na nwunye bụ ihe na-emerụ emerụ n’anya Chineke kama ịbụ otu ụdị nke “ime ka a dị ọcha.” (1 Ndị Kọrint 6:18-20) Ọzọkwa, ndị Kraịst gaje ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 7:39.
Di nwanyị bụ́ onye Kraịst si Zambia nke aha ya bụ Violet nwụrụ. Mgbe nke a gasịrị, ndị ikwu ya kpọtaara ya otu nwoke, na-arụgide ya isoro ya nwee mmekọahụ. Violet jụrụ, ijikwa nye ya ntaramahụhụ a machibidoro ya isere mmiri n’olulu mmiri ọha. A dọkwara ya aka ná ntị ka ọ ghara ije ije n’okporo ụzọ, ka ihe ọjọọ ghara ịdakwasị ya. Otú ọ dị, ọ jụrụ ikwe ka ndị ikwu ma ọ bụ ndị ime obodo ibe ya jiri iyi egwu mee ka o mee ya.
Mgbe e mesịrị a kpọrọ Violet òkù n’ụlọ ikpe obodo. N’ebe ahụ ọ kwụsiri ike ma kọwaa ihe ndị si n’Akwụkwọ Nsọ kpatara o ji jụ ikere òkè ná mmekọahụ rụrụ arụ. Ụlọ ikpe ahụ kpelaara ya ikpe, na-ekwu na a pụghị ịmanye ya ịrapara n’omenala na ọdịnala ndị megidere ihe ndị o kwere. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, njụsi ike ya imebi okwukwe ya nyere aka n’ibelata nrụgide a na-arụgide Ndịàmà ọzọ n’ime obodo ahụ bụ́ ndị mesịrị chee otu okwu ahụ ihu.
Onyeàmà bụ́ onye Africa aha ya bụ Monika guzogidere nrụgide yiri nke a mgbe di ya nwụsịrị. Ezinụlọ di ya siri ọnwụ inye ya di ọzọ. Monika na-ekwu, sị: “M jụrụ, kpebisie ike irubere iwu ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 7:39 isi.” Otú ọ dị, nrụgide ahụ akwụsịghị. “Ha yiri m egwu,” ka Monika na-echeta. “Ha kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na ị jụ, ị gaghị alụ di ọzọ ma ọlị.’ Ọbụna na ha zọọrọ na ụfọdụ n’ime ndị Kraịst ibe m esiwo ná nzuzo mee onwe ha ka ha dị ọcha n’ụzọ nke a.” Otú o sina dị, Monika guzosiri ike. “M nọrọ n’alụghị di ruo afọ abụọ, mgbe nke a gasịrị alụghachiri m di n’ụzọ nke ndị Kraịst,” ka ọ na-ekwu. Ugbu a Monika na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile.
Ime Ọpụpụ na Ịmụ Nwa Nwụrụ Anwụ
Ndị Kraịst na ndịda Africa aghaghịkwa ime ihe banyere omenala ndị gbara ime ọpụpụ na ịmụ nwa nwụrụ anwụ gburugburu. Ihe omume ọdachi ndị dị otú ahụ bụ ihe ndị si n’ezughị okè mmadụ pụta—ọ bụghị n’ihi ntaramahụhụ si n’aka Chineke. (Ndị Rom 3:23) Ma ọ bụrụ na ime apụọ nwanyị, ụfọdụ ọdịnala Africa na-achọ ka e mesoo nwanyị ahụ dị ka osu ruo oge ụfọdụ.
Ya mere otu nwanyị ime pụrụ na nso nso a nwere ihe ijuanya ịhụ ka otu Onyeàmà na-abịa n’ụlọ ya. Ka ọ na-abịarute nso, ọ kpọkuru ya, sị: “Abịakwala n’ebe a! Dị ka omenala anyị si dị, nwanyị ime ka pụsịrị ekwesịghị ka e leta ya.” Otú ọ dị, Onyeàmà ahụ gwara ya na Ndịàmà Jehova na-ewegara ụdị mmadụ nile ozi Bible, ha adịghịkwa eme omenala obodo ndị metụtara ime ọpụpụ. Mgbe ahụ ọ gụụrụ ya Aịsaịa 65:20, 23, na-akọwa na n’okpuru Alaeze Chineke ime ọpụpụ na ịmụ nwa nwụrụ anwụ agaghị ewere ọnọdụ. N’ihi ya, nwanyị ahụ nakweere ọmụmụ Bible ebe obibi.
Omenala ndị bụ nke nkwenkwe na-enweghị isi pụkwara isochi olili nke ụmụ ọhụrụ nwụrụ n’afọ. Mgbe otu Onyeàmà aha ya bụ́ Joseph jere ụdị olili ozu ahụ, a gwara ya na ndị nile nọ n’ebe ahụ aghaghị ịkwọ aka ha n’ahịhịa ọgwụ ụfọdụ ma tee ọgwụ ahụ n’obi ha. E kwuru na nke a ga-egbochi “mmụọ” nke nwa ọhụrụ ahụ ịbịaghachi ma na-emerụ ha ahụ. Joseph jiri ụzọ nkwanye ùgwù jụ, ebe ọ ma ozizi Bible na ndị nwụrụ anwụ apụghị imerụ ndị dị ndụ ahụ. Ma, ụfọdụ ndị nwara ịrụgide ya ite ọgwụ ahụ. Ọzọ Joseph jụrụ. N’ịhụ nguzo atụghị egwu nke onye Kraịst nke a, ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ jụkwara ahịhịa ọgwụ ahụ n’otu aka ahụ.
Zere Esemokwu, ma Guzosie Ike
Egwu nke ndị dị ndụ na ụjọ nke ịbụ onye e mere osu pụrụ ịbụ ikike siri ike maka mmadụ imebi okwukwe ya. Ilu 29:25 na-ekwu, sị: “Egwu mmadụ na-eweta ọnyà.” Ahụmahụ ndị a kọrọ n’elu na-egosi ịbụ eziokwu nke akụkụ ikpeazụ nke amaokwu ahụ: “Ma onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọrọ n’elu.”
Otú o sina dị, ọtụtụ mgbe a pụrụ izere esemokwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a kpọrọ onye Kraịst òkù n’olili ozu nke onye ikwu, o kwesịghị ichere ruo mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ọnọdụ pụrụ ime ka o mebie okwukwe ya. “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nhá.”—Ilu 27:12.
Ọ ga-abụ ihe amamihe iji akọ jụọ kpọmkwem omenala ndị a ga-eme. Ọ bụrụ na ndị a adịghị mma, onye Kraịst ahụ pụrụ iji ohere a kọwaa kpọmkwem ihe mere na ọ pụghị ikere òkè, na-eme otú ahụ ‘n’ịdị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi.’ (1 Pita 3:15, NW) Mgbe onye Kraịst ji nkwanye ùgwù kọwaa nguzo ya nke dabeere na Bible n’oge, ọtụtụ mgbe ndị ikwu ya na-achọkarị ịkwanyere nkweta ya ùgwù ma ghara inwecha ọchịchọ nke iji iyi egwu mee ihe.
N’agbanyeghị ihe bụ mmeghachi omume nke ndị ikwu, onye Kraịst apụghị nnọọ imebi okwukwe ya site n’ịgbaso ọdịnala ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke—n’agbanyeghị iyi egwu ma ọ bụ mkparị a pụrụ ịwụkwasị ya. E mewo ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’egwu nkwenkwe ndị na-enweghị isi. Pọl onyeozi gbara ume, sị: “Kraịst mere ka anyị pụọ n’ohu ka anyị wee nwere onwe anyị: ya mere na-eguzosinụ ike, unu ekwela ka e were yoke nke bụ ibu ọrụ tụhịa unu ọzọ.”—Ndị Galetia 5:1.
[Foto dị na peeji nke 29]
Ọtụtụ ndị kwenyere na onye ọ na-adịbeghị anya ọ nwụrụ pụrụ ịrụ ọrụ dị ka onye ngabita ma nyeruo ndị ikwu nwụworo oge dị anya ozi dị iche iche