Ha Chọtara Udo n’Ime Ụwa nke Nọ n’Ọgba Aghara
IHE osise ahụ dị n’ihu magazin a na-egosi ọgbọ agha kpụ ọkụ n’ọnụ nke dị na Bosnia na Herzegovina. Udo ọ̀ pụrụ ịdị n’ụdị ebe dị otú ahụ? N’ụzọ na-eju anya, azịza ya bụ ee. Ka ndị Roman Katọlik, Eastern Orthodox, na ndị Alakụba nọ n’ala ahụ ọdachi dakwasịrị nọ na-alụ agha maka ókèala, udo na-agụsi ọtụtụ ndị agụụ ike, ụfọdụ achọtawokwa ya.
Ezinụlọ Djorem bụ ndị bi na Sarajevo, ha bụkwa Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị ọgba aghara nile dị n’obodo ahụ, ọ bụ omume ha ije leta ndị agbata obi ha iji soro ha kerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) N’ihi gịnị? N’ihi na ezinụlọ Djorem maara na Alaeze a dị adị n’ezie, na e guzobewo ya rịị n’eluigwe, nakwa na ọ bụ olileanya kasị mma na nke e nwere nanị ya maka udo nye ihe a kpọrọ mmadụ. Ndịàmà Jehova nwere obi ike zuru ezu n’ihe Pọl onyeozi kpọrọ “ozi ọma nke udo.” (Ndị Efesọs 2:17) N’ihi ndị dị ka Bozo na Hena Djorem, ọtụtụ ndị na-achọta udo na Bosnia na Herzegovina.
Udo nke Bụ Ezie Ga-abịa
E nwere ọtụtụ ihe ọzọ ikwu banyere ezinụlọ Djorem. Otú ọ dị, ka anyị buru ụzọ kwuo banyere di na nwunye ọzọ nwetara obi ike n’Alaeze Chineke. Aha ha bụ Artur na Arina. Ha na ụmụ ha ndị nwoke ndị ka dị ntakịrị bibu n’otu mba n’ókèala nke ebe bụbu Soviet Union. Mgbe agha ime obodo tiwapụtara, Artur lụụrụ otu akụkụ agha. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ọ jụrụ onwe ya, sị, ‘N’ihi gịnị ka m ji na-alụso ndị a bụbu ndị agbata obi m ọgụ?’ Ọ hapụrụ mba ahụ, mgbe ọtụtụ ihe isi ike gasịkwara, ya na ntakịrị ezinụlọ ya bịarutere Estonia.
Mgbe o jere nleta na St. Petersburg, Artur zutere Ndịàmà Jehova ma nwee mmasị n’ihe ọ mụtara banyere Alaeze Chineke. Uche Jehova bụ na n’oge na-adịghị anya Alaeze Chineke ga-abụ nanị ọchịchị ga na-achị ihe a kpọrọ mmadụ. (Daniel 2:44) Mgbe ahụ ụwa ga-abụ ebe udo dị, n’enwekwaghị agha ime obodo ma ọ bụ agha mba dị iche iche. Aịsaịa buru amụma banyere oge ahụ, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.
N’ịrịba ama foto e ji aka see n’ime otu akwụkwọ e ji amụ Bible nke otu Onyeàmà gosiri ya banyere ụwa ọhụrụ ọdịnihu ahụ nke udo dị n’ime ya, Artur kwuru na ya bibu n’ebe dị otú ahụ. Otú ọ dị, agha ime obodo nọ na-ebibi ya ugbu a. Mgbe ọ laghachiri Estonia, Artur na ezinụlọ ya na-amụtakwu ihe banyere Alaeze Chineke site n’ọmụmụ Bible nke ha na Ndịàmà Jehova.
Udo n’Etiti Ọgba Aghara
Abụ Ọma 37:37 na-asị: “Rịba onye zuru okè ama, leekwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdịnihu dịịrị onye udo.” N’ezie, udo nke onye zuru okè, nke zikwara ezi n’anya Chineke abụghị nanị n’ọdịnihu ya. Ọ na-anụ ụtọ ya ugbu a. Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume? Tụlee ahụmahụ nke otu nwoke aha ya bụ Paul.
Paul bi n’otu ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke dịpụrụ adịpụ n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke ebe ndịda Etiopia, ọ bụ ezie na o si ná mba agbata obi. N’obodo ya, o zutere otu n’ime Ndịàmà Jehova nke na-arụrụ ụlọ ọrụ na-egwupụta mmanụ ọrụ, nwoke a nyekwara ya akwụkwọ e ji amụ Bible, bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi.a Paul ezuteghị Onyeàmà ahụ ọzọ, ma o jiri nlezianya mụọ akwụkwọ ahụ. Agha ime obodo chụgara ya n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị n’Etiopia, n’ebe ahụkwa, ọ gwara ndị ọzọ okwu banyere ihe ndị ọ mụtaworo. Otu ìgwè dị ntakịrị bịara nakwere nke a dị ka eziokwu. Dabere n’ihe ndị ha mụtaworo, n’oge na-adịghị anya ha malitere ime nkwusa gwa ndị ọzọ nọ n’ogige ahụ.
Paul degaara isi ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society akwụkwọ na-arịọ maka enyemaka. O juru otu onye ozi nke e si Addis Ababa zite anya ịhụ 35 mmadụ ka ha nọ na-echere ya, dị njikere ịmụkwu ihe banyere Alaeze Chineke. E mere ndokwa iji nye aka n’ụzọ chiri anya.
Olee otú a pụrụ isi kwuo na ndị dị ka Paul nwere udo? Ndụ adịghịrị ha mfe, ma ha nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ. Mgbe ọgba aghara nke ụwa a metụtara ha, ha na-etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ.” N’ihi ya, ha nwere afọ ojuju nke dị ụkọ taa. Okwu Pọl onyeozi gwara ọgbakọ Filipaị na-emetụta ha: “Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” N’ezie, ha na-enwe mmetụta nke inwe mmekọrịta chiri anya ha na Jehova, bụ́ “Chineke nke udo.”—Ndị Filipaị 4:6, 7, 9.
Udo nke Dị Ugbu A
Ọ bụ Jisọs Kraịst bụ Eze ahụ nke e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze nke Alaeze Chineke, onye a kpọrọ “Onyeisi Udo” n’ime Bible. (Aịsaịa 9:6) Onye amụma oge ochie ahụ kwuru banyere ya, sị: “Ọ ga-agwakwa mba nile okwu udo: Ọ ga-achịkwa achị site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’Osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.” (Zekaraịa 9:10) Okwu ndị sitere n’ike mmụọ nsọ dị ka ndị a nwere mmetụta dị omimi ná ndụ nke otu nwoke aha ya bụ José.
N’otu oge José nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ọ bụ onye na-eyi ọha egwu, e jidekwara ya ka ọ nọ na-akwadebe iji bọmbụ bibie ebe obibi ndị uwe ojii. O chere na ọ bụ nanị ime ihe ike ga-amanye gọọmenti imeziwanye ọnọdụ ndị dị ná mba ya. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, Ndịàmà Jehova malitere iso nwunye ya na-amụ Bible.
Mgbe a tọhapụsịrị José, ya onwe ya mụkwara Bible, n’oge na-adịghị anya okwu nke Abụ Ọma 85:8 malitere imezu n’ebe ọ nọ: “M ga-anụ ihe Chineke, bụ́ Jehova, ga-ekwu: n’ihi na Ọ ga-agwa ndị Ya, gwakwa ndị ebere Ya, okwu udo.” Otú ọ dị, amaokwu ahụ ji ịdọ aka ná ntị mechie: “Ka ha ghara ịlaghachi [n’ịtụkwasị onwe onye obi, NW].” Ya mere, onye na-achọ udo Jehova agaghị anwa anwa ime ihe n’ịdabere n’onwe ya ma ọ bụ n’imegide uche Ya.
Taa, José na nwunye ya bụ ndị ozi bụ́ ndị Kraịst. Ha na-eduzi ndị ọzọ gaa n’Alaeze Jehova dị ka ngwọta nye nsogbu ndị José gbalịburu iji bọmbụ ndị ọ na-emepụta n’onwe ya gwọta. Ha dị njikere ịtụkwasị obi na Bible, bụ́ nke sịrị: “Jehova ga-enye ezi ihe.” (Abụ Ọma 85:12) N’ezie, na nso nso a José jere leta ebe obibi ndị uwe ojii ahụ ọ nọbu na-eme atụmatụ ibibi. N’ihi gịnị? Iji gwa ezinụlọ ndị bi ebe ahụ okwu banyere Alaeze Chineke.
Ndị Udo
N’Abụ Ọma 37:10, 11, Bible na-asị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” Lee aha olileanya dị ebube ọ bụ!
Otú ọ dị, rịba ama na udo Jehova bụ nanị maka “ndị dị umeala n’obi.” Ọ pụrụ ịdị ndị na-achọ udo mkpa ịmụta ịbụ ndị udo. Nke a bụ ihe mere n’ọnọdụ nke Keith, onye bi na New Zealand. A kọwara Keith dị ka onye “siri ike n’ọkpụkpụ aka na n’àgwà, na-ese okwu, ma na-arụ ụka.” O so n’otu òtù ndị omekome ma biri n’ụlọ nke bụ ebe e wusiri ike n’ezie, nke nwere ubi nkịta atọ na-eche nche na ya ka ndị mmadụ ghara ịwabata. Nwunye ya, onye mụrụ ụmụ ya isii, agbawo ya alụkwaghịm.
Mgbe Keith zutere Ndịàmà Jehova, ozi ọma ahụ nwere mmetụta dị omimi n’ahụ ya. N’oge na-adịghị anya ya na ụmụ ya na-eso Ndịàmà na-eje nzukọ. Ọ kpara ntutu ya nke ruru n’úkwù, malitekwa ịgwa ndị òtù ya mbụ okwu banyere Alaeze Chineke. Ụfọdụ n’ime ndị a malitekwara ịmụ Bible.
Dị ka ọtụtụ nde ndị nwere obi ziri ezi n’ụwa nile, Keith amalitewo itinye okwu Pita onyeozi n’ọrụ: “Onye ahụ nke na-achọ ịhụ ndụ n’anya, na ịhụ ezi ụbọchị, . . . ya sikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya, mee ezi ihe; ya chọọ udo, gbasookwa ya.” (1 Pita 3:10, 11) Nwunye mbụ nke Keith kwetara ya na ya ịlụgharị, ugbu a kwa ọ na-amụ ‘ịchọ udo na ịgbaso ya.’
Udo Jehova abụrụwo ihe na-azọpụta ndụ nye ọtụtụ ndị, gụnyere otu onye na-emebu egwuregwu nke a mụrụ n’ebe bụbu U.S.S.R. Nwoke a ritere ọtụtụ ihe nrite n’asọmpi Olympic, ma ọ ghọrọ onye na-enwekwaghị obi ụtọ wee chigharịkwuru ọgwụ ọjọọ na mmanya na-aba n’anya. Mgbe afọ 19 nke jupụtara n’ọtụtụ ihe omume gasịrị bụ́ ndị gụnyere ntaramahụhụ afọ atọ n’ogige ọrụ mmanye na Siberia, iji ụgbọ mmiri mee njem gaa Canada dị ka onye na-ezo ezo, na ịnọ n’ọnụ ọnwụ ugboro abụọ n’ihi àgwà ya nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ, o kpegaara Chineke ekpere maka enyemaka iji chọta ezi nzube ná ndụ. Ọmụmụ Bible nke o sooro Ndịàmà Jehova na-asụ asụsụ Russian nwee nyeere ya aka ịchọta azịza nye ajụjụ ya nile. Taa, nwoke a, dị ka ọtụtụ nde ndị ọzọ, na Chineke dị n’udo, nweekwa udo n’ime onwe ya.
Olileanya nke Mbilite n’Ọnwụ
N’ikpeazụ, ka anyị laghachikwuru Bozo na Hena Djorem na Sarajevo. Di na nwunye a nwere otu nwa nwanyị dị afọ ise, bụ́ Magdalena. N’ọnwa July gara aga, ha atọ si n’ụlọ na-apụ iji kere òkè ọzọ n’ọrụ ime nkwusa ha mgbe otu ogbunigwe na-agbawa agbawa gburu ha nile. Gịnị banyere udo ahụ ha na-ekwusara ndị ọzọ maka ya? Ogbunigwe ahụ gburu ha ò gosiri na nke a abụghị ezi udo?
Ọ dịghị ma ọlị! N’usoro ihe nke a, ọdachi dị iche iche na-eme. Bọmbụ na ogbunigwe na-egbu ndị mmadụ. Ndị ọzọ na-anwụ n’ihi ọrịa ma ọ bụ ihe mberede. Ọtụtụ na-anwụ n’ihi ịka nká. A gụpụghị ndị nwere udo nke Chineke, ma ikwe omume nke ụdị ihe ndị ahụ adịghị eme ka ha ghara inwe olileanya.
Jisọs kwere enyi ya bụ́ Mata nkwa, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25) Ezinụlọ Djorem kwenyere nke a, dịkwa ka Ndịàmà Jehova nile kwenyere ya. Ezinụlọ Djorem nwekwara okwukwe na ọ bụrụ na ha anwụọ, na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ baa n’ime ụwa nke ga-abụ mgbe ahụ ebe udo dị n’ezie. Jehova Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
Ntakịrị oge tupu ọ nwụọ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Udo nke m ka M na-enye unu. . . . Ka obi unu ghara ịlọ mmiri.” (Jọn 14:27) Anyị so ezinụlọ Djorem na-aṅụrị ọnụ, bụ́ ndị nwererị udo ahụ na ndị gaje inwe ya n’ezie n’ụzọ ka zuo ezu ná mbilite n’ọnwụ. Obi dị anyị ụtọ maka ndị nile na-efe Jehova, bụ́ Chineke nke udo, ofufe. Ndị dị otú ahụ nwere udo nke uche. Ha na Chineke dị n’udo. Ha na-eso ndị ọzọ adị n’udo. Ha nwekwara obi ike n’ọdịnihu udo. Ee, ha achọtawo udo, ọ bụ ezie na ha na-ebi n’ime ụwa nke nọ n’ọgba aghara. N’ezie, ndị nile na-efe Chineke ofufe n’ime mmụọ na eziokwu nwere udo. Ka gị onwe gị chọtakwa udo dị otú ahụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara ya.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ha achọtawo udo n’agbanyeghị ịdị na-ebi n’ime ụwa nke nọ n’ọgba aghara