Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 4/15 p. 30
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imeri Ihe Ịma Aka nke Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Agụmakwụkwọ—Jiri Ya Nye Jehova Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Nanị Gị Na-eguzosi Ike n’Ihe”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Lee Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 4/15 p. 30

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ hụwo mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche dị ka ihe baara gị uru? Ọ bụrụ otú ahụ gịnị ma i jiri ajụjụ ndị na-esonụ nwalee ihe ị na-echeta:

◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ọdịda nke ndị Amọn? (Zefanaịa 2:9, 10)

Jehova adịghị ewere ya dị ka ihe dị nta iji ibu iro kwụghachi obi ọma ya, mgbe oge ya rukwara, ọ ga-emekwa ihe ọzọ, dị ka o mere n’oge ochie. (Tụlee Abụ Ọma 2:6-12.)—12/15, peji nke 10.

◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst si enwe udo?

Nke mbụ, ha “na Chineke dị n’udo site n’aka Onyenwe [ha] Jisọs Kraịst.” (Ndị Rom 5:1) Nke abụọ, ha nwere udo n’etiti onwe ha site n’ịzụlite “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” bụ́ nke “buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị udo.” (Jemes 3:17)—1/1, peji nke 11.

◻ Gịnị bụ ihe ụfọdụ e ji Okwu Chineke tụnyere, oleekwa otú nke a si na-enyere anyị aka?

E ji Okwu Chineke tụnyere mmiri ara na-emezi ahụ, nri siri ike, mmiri dị ọcha ma na-enye ume ọhụrụ, enyo, na mma agha dị nkọ. Ịghọta ihe okwu ndị a pụtara na-enyere onye ozi aka iji nkà jiri Bible na-eme ihe.—1/1, peji nke 29.

◻ Gịnị ka agụmakwụkwọ ziri ezi nke ụwa kwesịrị inyere anyị aka ime?

Ịgụ ihe nke ọma, ide ihe a pụrụ ịgụta, ito eto n’ụzọ echiche na omume, na inweta ọzụzụ dị irè a chọrọ maka ndụ a na-adị kwa ụbọchị na ije ozi dị nsọ n’ụzọ dị irè.—2/1, peji nke 10.

◻ Ihe dị aṅaa bara uru banyere agụmakwụkwọ ka anyị pụrụ ịmụta n’aka Jisọs?

E kwesịghị iji agụmakwụkwọ too onwe anyị, kama iji wetara Onye Nkụzi kasị ukwuu, bụ́ Jehova Chineke, otuto. (Jọn 7:18)—2/1, peji nke 10.

◻ Gịnị bụ Alaeze Chineke?

Alaeze ahụ bụ ọchịchị eluigwe nke Chineke guzobere nke ga-emezu uche Chineke, na-ekpochapụ mmetụta nile nke mmehie na ọnwụ ma na-eweghachi ọnọdụ ezi omume n’elu ala. (Daniel 2:44; Mkpughe 11:15; 12:10)—2/1, peji nke 16.

◻ Olee otú Bible si na-enye agụmakwụkwọ a chọrọ maka ịkwụsị ime ihe ike n’ụzọ na-adịgide adịgide?

Site n’Okwu ya, bụ́ Bible, Jehova na-akụziri ndị mmadụ ịbụ ndị na-ahụ udo n’anya na ndị ezi omume. (Aịsaịa 48:17, 18) Okwu Chineke nwere ike ịbami ma metụ mmadụ n’obi ma gbanwee echiche na akparamàgwà ya. (Ndị Hibru 4:12)—2/15, peji nke 6.

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na amụma Aịsaịa isi nke 35 nwere mmezu atọ?

Amụma Aịsaịa nwere mmezu mbụ ya mgbe ndị Juu lọghachiri site ná ndọrọ n’agha Babilọn na 537 T.O.A. Ọ na-emezu n’ụzọ ime mmụọ ugbu a kemgbe a tọhapụrụ Israel ime mmụọ site ná ndọrọ n’agha Babilọn Ukwu ahụ. Ọ ga-enwekwa mmezu nke atọ ya n’ihe metụtara nkwa Bible banyere ọnọdụ paradaịs nkịtị n’elu ala. (Abụ Ọma 37:10, 11; Mkpughe 21:4, 5)—2/15, peji nke 17.

◻ Olee otú e si gosi mmasị onwe onye Chineke nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ n’ọrụ ebube ndị Ọkpara ya, bụ́ Jisọs, rụrụ?

Ebe ọ bụ na Jisọs “apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe ya, ma ọ bụghị ihe Ọ hụrụ na Nna Ya na-eme,” ọmịiko ya na-ese onyoonyo nchegbu ịhụnanya nke Jehova maka ohu ya nke ọ bụla. (Jọn 5:19)—3/1, peji nke 5.

◻ Gịnị ka okwu Jisọs bụ́ “ili ncheta” nke e ji mee ihe na Jọn 5:28, 29 (NW) na-egosi?

Okwu Grik bụ́ mne·mei’on (ili ncheta) nke e ji mee ihe n’ebe a na-atụ aro na Jehova na-echeta ihe ndekọ nke onye ahụ nwụworonụ, tinyere àgwà ndị o ketara eketa na ihe ncheta ya zuru ezu. Nke a na-enye ihe àmà siri ike na Chineke na-eche banyere ụmụ mmadụ n’otu n’otu!—3/1, peji nke 6.

◻ Ozi ịdọ aka ná ntị dị aṅaa dị n’amụma Zefanaịa bụ ihe inyeaka dị irè nye anyị?

Taa abụghị oge ikwe ka obi abụọ gbanye mkpọrọgwụ n’ime obi anyị na iyigharị ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’ime uche anyị. Ọzọ, anyị kwesịrị ịnọ na nche megide mmetụta nile nke enweghị mmasị bụ́ nke na-akpata ike ọgwụgwụ. (Zefanaịa 1:12, 13; 3:8)—3/1, peji nke 17.

◻ N’ihi gịnị ka iguzosi ike n’ihe nye Chineke ji na-eweta ihe ịma aka?

N’ihi na iguzosi ike n’ihe na àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke anyị ketara site na nne na nna anyị na-asọkọrịta isi. (Jenesis 8:21; Ndị Rom 7:19) Nke ka mkpa, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ekpebisiwo ike ime ka anyị ghara iguzosi ike n’ihe nye Chineke. (Ndị Efesọs 6:12; 1 Pita 5:8)—3/15, peji nke 10.

◻ N’akụkụ anọ ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe, gịnịkwa ga-enyere anyị aka ime nke ahụ?

Akụkụ anọ bụ iguzosi ike n’ihe nye Jehova, nye nzukọ ya, nye ọgbakọ, na nye di ma ọ bụ nwunye anyị. Otu ihe enyemaka bụ ịghọta na imeri ihe ịma aka nke iguzosi ike n’ihe bụ nke e jikọrọ ya na iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta.—3/15, peji nke 20.

◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Devid nwere n’ịgbalị ibughachi igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jerusalem? (2 Samuel 6:2-7)

Devid leghaara ntụziaka nke Jehova nyewororị banyere ibu Igbe ahụ anya, nke a wetakwara ọdachi. Ihe mmụta ya bụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị kwesịrị ịta Jehova ụta maka nsogbu ndị na-apụta mgbe anyị leghaara ntụziaka ya nile doro anya anya. (Ilu 19:3)—4/1, peji nke 28, 29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya