Mgbakọ “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke 1996
N’OGE ochie ndị Jehova mere ememe atọ ndị bụ isi kwa afọ. N’otu aka ahụ, n’oge a ndị a kpọkwasịrị aha Jehova na-ezukọta ugboro atọ kwa afọ maka oge ememe. Ha na-enwe mmasị izukọta maka mgbakọ pụrụ iche otu ụbọchị, mgbakọ sekit ụbọchị abụọ, na mgbakọ distrikti ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ. N’afọ a, isiokwu nke mgbakọ distrikti bụ “Ndị Ozi nke Udo Chineke.”
Lee ka isiokwu ahụ si kwesị ekwesị! Chineke anyị, bụ́ Jehova, bụ “Chineke nke udo,” ee, “Chineke nke [na-enye, NW] udo.” Onyendú anyị, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ “Onyeisi Udo,” ozi ahụ nke ndị ohu Jehova na-ewetakwa bụ ozi nke udo Chineke. (Ndị Filipaị 4:9; Ndị Rom 15:33; Aịsaịa 9:6; Nehum 1:15) A haziwo usoro ihe omume mgbakọ dị mma nke ga-enyere mmadụ nile aka ịghọta n’ụzọ zuru ezu karị ịdị mkpa nke udo Chineke.
N’afọ a na Nigeria nanị, a ga-enwe 104 mgbakọ. Ma eleghị anya, a ga-enwe otu mgbakọ nke dị gị nso. Gịnị ma ị jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị banyere kpọmkwem mgbe na ebe ọ ga-abụ ma mgbe ahụ mee atụmatụ ịga? Ndị nile nwere mmasị n’udo na-adịgide adịgide, nke bụ ezie ga-enweta nnabata na-ekpo ọkụ.