Unu Abịala ná Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke”!
EE, OGE ahụ abịakwasịla anyị maka mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova maka 1994. Malite na June 1994 ruo January 1995, a nọọla na-anụrụ usoro ihe omume mgbakọ ụbọchị atọ ahụ n’ọtụtụ narị obodo dị iche iche gburugburu ụwa—nke mbụ na North America, e mesịa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ Europe, Esia, Central America na South America, Africa, Australia, na agwaetiti nile nke oké osimiri.
Lee nnọọ isiokwu na-akpali iche echiche ọ bụ—“Egwu Chineke”! Nke a abụghị egwu na-akụnwụ ahụ nke mmadụ onye ndụ ya dị n’ihe ize ndụ kama ọ bụ egwu nke Chineke, egwu nke na-enye udo nke uche na ọṅụ. Ilu nke Bible na-asị: “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.” (Ilu 22:4) Olee otú ịtụ egwu Chineke ga-esi rụpụta “akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ”? Nke ahụ ga-apụta ìhè mgbe a na-atọpe isiokwu nke mgbakọ ahụ n’ime ụbọchị atọ ndị jupụtara n’okwu, ntụle, ihe ngosi, na otu ihe nkiri.
Pọl onyeozi dere na anyị ekwesịghị “ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.” (Ndị Hibru 10:25) Ndịàmà Jehova weere ya n’ihe dị oké mkpa izukọ ugbo atọ n’izu maka ọmụmụ ihe ọgbakọ na ofufe. Otú ọ dị, mgbakọ distrikti kwa afọ pụrụ iche. Ha na-atụ anya ya ma na-ekwu maka ya ọtụtụ ọnwa mgbe ọ gafesịworo. Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọ gị òkù, n’agbanyeghị okpukpe gị, isonyere ha ná mgbakọ ha ma nụ ụtọ nke mkpakọrịta ndị Kraịst na ihe ọmụma ime mmụọ dị oké mkpa. Onye nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ ịgwa gị ebe na mgbe mgbakọ kasị dịrị gị nso ga-abụ.