Ikerịta Nkasi Obi nke Jehova Na-enye
“Olileanya anyị banyere unu na-eguzosikwa ike; ebe anyị matara na, dị ka unu bụ ndị na-enwekọ ahụhụ nile, otú a ka unu na-enwekọkwa nkasi obi ahụ.”—2 NDỊ KỌRINT 1:7.
1, 2. Gịnị bụworo ahụmahụ nke ọtụtụ ndị ghọworo ndị Kraịst taa?
ỌTỤTỤ ndị na-agụ Ụlọ Nche ugbu a tolitere n’enweghị ihe ọmụma nke eziokwu Chineke. Ikekwe nke ahụ bụ eziokwu banyere gị. Ọ bụrụ otú ahụ, cheta mmetụta i nwere ka anya nke nghọta gị malitere imeghe. Dị ka ihe atụ, mgbe ị ghọtara na nke mbụ ya na ndị nwụrụ anwụ adịghị ata ahụhụ kama na ha amaghị ihe ọ bụla, ọ̀ bụ na i nweghị ahụ efe? Mgbe ị mụtakwara banyere olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ, na a ga-akpọlite ọtụtụ ijeri gaa ná ndụ n’ụwa ọhụrụ Chineke, á kasighị gị obi?—Eklisiastis 9:5, 10; Jọn 5:28, 29.
2 Gịnị banyere nkwa Chineke kwere ịkwụsị ajọ omume na ime ka elu ala a bụrụ paradaịs? Mgbe ị mụtara banyere nke a, ọ́ kasighị gị obi ma mee ka i jupụta n’ịtụsi anya ike? Olee otú ọ dị gị mgbe ị mụtara na nke mbụ ya banyere ikwe omume nke anwụghị ma ọlị kama nke ịlanarị baa na Paradaịs elu ala na-abịanụ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i nwere obi ụtọ. Ee, ị ghọọla otu onye natara ozi nkasi obi Chineke nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa ugbu a n’ụwa nile.—Abụ Ọma 37:9-11, 29; Jọn 11:26; Mkpughe 21:3-5.
3. N’ihi gịnị ka ndị na-eso ndị ọzọ na-ekerịta ozi nkasi obi nke Chineke ji na-enwetakwa mkpagbu?
3 Otú ọ dị, mgbe ị gbalịrị isoro ndị ọzọ kerịta ozi Bible, ị bịakwara ghọta na “ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Ikekwe ụfọdụ n’ime ndị bụbu ndị enyi gị kwara gị emo n’ihi igosipụta okwukwe ná nkwa Bible. Ọbụnadị na ọ pụrụ ịbụ na i nwetawo mkpagbu n’ihi ịnọgide na-esoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ọ pụrụ ịbụ na mmegide ahụ esiwanyela ike ka ị malitere na-eme mgbanwe iji mee ka ndụ gị kwekọọ n’ụkpụrụ Bible. Ị malitere inweta mkpagbu ahụ Setan na ụwa ya na-ewetara mmadụ nile nakweere nkasi obi Chineke.
4. N’ụzọ dị aṅaa dị iche iche ka ndị ọhụrụ nwere mmasị pụrụ isi meghachi omume nye mkpagbu?
4 N’ụzọ dị mwute, dị ka Jisọs buru n’amụma, mkpagbu na-eme ka ụfọdụ sụọ ngọngọ ma kwụsị mmekọrịta ha na ọgbakọ ndị Kraịst. (Matiu 13:5, 6, 20, 21) Ndị ọzọ na-atachiri mkpagbu obi site n’itinye uche ha ná nkwa ndị na-akasi obi ha na-amụta. N’ikpeazụ ha na-arara ndụ ha nye Jehova ma bụrụ ndị e mere baptism dị ka ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Matiu 28:19, 20; Mak 8:34) N’ezie, mkpagbu adịghị akwụsị ozugbo e mere onye Kraịst baptism. Dị ka ihe atụ, ịnọgide na-adị ọcha pụrụ ịbụ mgba tara akpụ nye onye bitụworo ndụ rụrụ arụ. Ndị ọzọ aghaghị ịgbaso mmegide nke ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe nọgideworo na-emegide ha mgba. N’agbanyeghị ụdị mkpagbu ọ bụ, ndị nile ji ikwesị ntụkwasị obi na-achụso ndụ nke nrara nye Chineke pụrụ ijide otu ihe n’aka. N’ụzọ dịịrị onwe ha kpọmkwem, ha ga-enweta nkasi obi na enyemaka Chineke.
“Chineke nke Nkasi Obi Nile”
5. Tinyere ọtụtụ ule nke Pọl nwere, gịnịkwa ka o nwetara?
5 Otu onye nwere ekele nke ukwuu maka nkasi obi nke Chineke na-enye bụ Pọl onyeozi. Mgbe ọ gabigachara oge ule dị ukwuu n’Esia na Masedọnia, o nwetara ahụ efe dị ukwuu mgbe ọ nụrụ na ọgbakọ dị na Kọrint azaghachiwo nke ọma nye akwụkwọ ozi ya nke ịdọ aka ná ntị. Nke a kpaliri ya idegara ha akwụkwọ ozi nke abụọ, bụ́ nke nwere okwu otuto na-esonụ: “Onye a gọziri agọzi ka Ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.
6. Gịnị ka anyị na-amụta site n’okwu Pọl ndị a na-achọta ná 2 Ndị Kọrint 1:3, 4?
6 Okwu ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ na-enye ihe ọmụma dị ukwuu. Ka anyị tụlee ha. Mgbe Pọl na-ekwupụta otuto ma ọ bụ ekele nye Chineke ma ọ bụ rịọ ya arịrịọ n’akwụkwọ ozi ya, anyị na-ahụkarị na ọ na-agụnyekwa ekele dị ukwuu maka Jisọs, Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst. (Ndị Rom 1:8; 7:25; Ndị Efesọs 1:3; Ndị Hibru 13:20, 21) Ya mere, Pọl na-agwa ‘Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst’ okwu otuto a. Mgbe ahụ, na nke mbụ ya n’ihe odide ya, o ji mkpọaha Grik a sụgharịrị “obi ebere nile” mee ihe. Mkpọaha a sitere n’okwu e ji egosi iru újú n’ahụhụ nke onye ọzọ. Pọl si otú a na-akọwa mmetụta dị nro nke Chineke maka onye ọ bụla n’ime ndị ohu Ya na-ekwesị ntụkwasị obi nke na-enweta mkpagbu—mmetụta dị nro nke na-akpali Chineke ime ihe n’ụzọ ebere n’ihi ha. N’ikpeazụ, Pọl legaara Jehova anya dị ka isi iyi nke àgwà a a na-achọsi ike site n’ịkpọ ya ‘Nna nke obi ebere nile.’
7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova bụ ‘Chineke nke nkasi obi nile’?
7 “Obi ebere nile” nke Chineke na-arụpụta ahụ efe nye onye ahụ na-enwe mkpagbu. Ya mere, Pọl gara n’ihu na-akọwa Jehova dị ka “Chineke nke nkasi obi nile.” N’ihi ya, n’agbanyeghị nkasi obi anyị pụrụ inweta site n’obiọma nke ndị kwere ekwe ibe anyị, anyị pụrụ ilegara Jehova anya dị ka isi iyi ya. Ọ dịghị ezi nkasi obi, nke na-adịgide adịgide nke na-adịghị esite n’aka Chineke. Ọzọ, ọ bụ ya kere mmadụ n’onyinyo ya, si otú a na-eme ka anyị nwee ike ịbụ ndị na-akasi obi. Ọ bụkwa mmụọ nsọ Chineke na-akwali ndị ohu ya igosi ndị nkasi obi dị mkpa obi ebere.
Ndị A Zụrụ Ịbụ Ndị Na-akasi Obi
8. Ọ bụ ezie na Chineke abụghị isi iyi nke ule anyị, mmetụta dị aṅaa bara uru ka ịtachi obi nye mkpagbu pụrụ inwe n’ahụ anyị?
8 Ọ bụ ezie na Jehova Chineke na-ekwe ka ule dị iche iche bịakwasị ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụghị isi iyi nke ule ndị dị otú ahụ ma ọlị. (Jemes 1:13) Otú ọ dị, nkasi obi ọ na-enye mgbe anyị na-atachi obi ná mkpagbu pụrụ ịzụ anyị ịmata mkpa nke ndị ọzọ karị. Gịnị ga-esi na ya apụta? “Ka anyị wee pụ isite ná nkasi obi nke Chineke ji kasie anyị onwe anyị obi kasie ndị ahụ obi ndị nọ ná mkpagbu ọ bụla.” (2 Ndị Kọrint 1:4) N’ụzọ dị otú a Jehova na-azụ anyị ịbụ ndị so ndị kwere ekwe ibe anyị na ndị anyị na-ezute n’ozi anyị na-ekerịta nkasi obi ya n’ụzọ dị irè ka anyị na-eṅomi Kraịst ma ‘na-akasi ndị nile na-eru újú obi.’—Aịsaịa 61:2; Matiu 5:4.
9. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi n’ahụhụ? (b) Olee otú a na-esi akasi ndị ọzọ obi mgbe anyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi ná mkpagbu?
9 Pọl tachiri obi n’ọtụtụ ahụhụ ya n’ihi nkasi obi bara ụba ọ natara n’aka Chineke site na Kraịst. (2 Ndị Kọrint 1:5) Anyị onwe anyị kwa pụrụ inweta ụba nke nkasi obi site n’ịtụgharị uche ná nkwa dị oké ọnụ ahịa nke Chineke, site n’ikpe ekpere maka nkwado nke mmụọ nsọ ya, nakwa site n’inweta azịza Chineke nye ekpere anyị nile. Otú a a ga-ewusi anyị ike ịnọgide na-akwado ọbụbụeze Jehova na ime Ekwensu onye ụgha. (Job 2:4; Ilu 27:11) Mgbe anyị jiworo ikwesị ntụkwasị obi tachie obi n’ụdị ọ bụla nke mkpagbu, anyị kwesịrị, dị ka Pọl, inye Jehova otuto nile, onye nkasi obi ya na-eme ka ndị Kraịst nwee ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’okpuru ule. Ntachi obi nke ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nwere mmetụta na-akasi obi n’ebe òtù ụmụnna nọ, na-eme ka ndị ọzọ kpebisie ike ‘ịtachi obi n’otu ahụhụ ahụ.’—2 Ndị Kọrint 1:6.
10, 11. (a) Gịnị bụ ụfọdụ ihe kpataara ọgbakọ Kọrint oge ochie ahụhụ? (b) Olee otú Pọl si kasie ọgbakọ dị na Kọrint obi, olileanya dịkwa aṅaa ka o kwupụtara?
10 Ndị Kọrint nwere òkè ha nke ahụhụ na-abịakwasị ezi ndị Kraịst nile. Tụkwasị na nke a, ndụmọdụ ịchụpụ onye na-akwa iko na-enweghị nchegharị dị ha mkpa. (1 Ndị Kọrint 5:1, 2, 11, 13) Ịghara ime nke a na ịkwụsị esemokwu na nkewa ewetaworo ọgbakọ ahụ mmechuihu. Ma ha mesịrị tinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ ma gosipụta ezi nchegharị. N’ihi ya, ọ jara ha mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ ma kwuo na nzaghachi ha dị mma nye akwụkwọ ozi ya akasiwo ya obi. (2 Ndị Kọrint 7:8, 10, 11, 13) N’ụzọ doro anya, onye ahụ a chụpụrụ echegharịwokwa. Ya mere Pọl dụrụ ha ọdụ ‘ịgbaghara ya kasiekwa ya obi, ka a ghara iji ihe mwute nke na-ewutebiga ụdị nwoke ahụ ókè loda mmadụ dị otú a n’ụzọ ọ bụla.’—2 Ndị Kọrint 2:7.
11 Akwụkwọ ozi nke abụọ nke Pọl aghaghị n’ezie ịkasiworị ọgbakọ ahụ dị na Kọrint obi. Nke a bụkwa otu n’ime ebumnobi ya. Ọ kọwara, sị: “Olileanya anyị banyere unu na-eguzosikwa ike; ebe anyị matara na, dị ka unu bụ ndị na-enwekọ ahụhụ nile, otú a ka unu na-enwekọkwa nkasi obi ahụ.” (2 Ndị Kọrint 1:7) Ná mmechi nke akwụkwọ ozi ya, Pọl gbara ume, sị: “Ka a na-akasi unu obi: . . . Chineke nke ịhụnanya na udo ga-anọnyekwara unu.”—2 Ndị Kọrint 13:11.
12. Mkpa dị aṅaa ka ndị Kraịst nile nwere?
12 Lee ihe dị mkpa anyị pụrụ ịmụta site na nke a! Ọ dị mkpa ka ndị òtù nile nke ọgbakọ ndị Kraịst “na-enwekọkwa nkasi obi” nke Chineke na-enye site n’Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na nzukọ elu ala ya. Ọbụna ndị a chụpụrụ pụrụ inwe mkpa nke nkasi obi ma ọ bụrụ na ha echegharịwo ma dozie ụzọ ha na-ezighị ezi. N’ihi ya, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” eguzobewo ndokwa ebere iji nyere ha aka. Otu ugboro n’afọ ndị okenye abụọ pụrụ ije leta ụfọdụ ndị a chụpụrụ achụpụ. Ọ pụrụ ịbụ na ndị a adịkwaghị egosi àgwà nnupụisi ma ọ bụ na-eme mmehie dị oké njọ, ha pụkwara inwe mkpa nke enyemaka iji were nzọụkwụ dị mkpa iji bụrụ ndị a nabataghachiri.—Matiu 24:45; Ezikiel 34:16.
Mkpagbu Pọl n’Esia
13, 14. (a) Olee otú Pọl si kọwaa oge nke mkpagbu siri ike nke o nwere ahụmahụ ya n’Esia? (b) Ihe omume dị aṅaa ka Pọl pụrụ ibuworị n’uche?
13 A pụghị iji ụdị ahụhụ nke ọgbakọ ndị Kọrint hụworo ruo ugbu a tụnyere ọtụtụ mkpagbu nke Pọl na-aghaghị ịtachiri obi. N’ihi ya, ọ pụrụ ichetara ha, sị: “Ụmụnna m, anyị achọghị ka unu ghara ịmara ihe banyere mkpagbu anyị nke a kpagburu anyị n’Esia, na e bogburu anyị nke ukwuu hie nne, karịa ike anyị, ya mere anyị nwebigara obi abụọ ókè ma anyị ga-adịkwa ndụ: ee, anyị onwe anyị enwewo ọzịza a zara n’ime onwe anyị na ọ bụ ọnwụ, ka anyị wee ghara ịtụkwasị obi n’onwe anyị, kama ọ bụ na Chineke Onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie: Onye dọpụtara anyị n’oké ọnwụ dị otú a, Ọ ga-adọpụtakwa anyị: Onye anyị leworo anya Ya na Ọ ga na-adọpụtakwa anyị ọzọ.”—2 Ndị Kọrint 1:8-10.
14 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Bible kwenyere na Pọl na-ezo aka n’ọgba aghara ahụ mere n’Efesọs, nke gaara akpata ọnwụ Pọl nakwa nke ndị Masedọnia abụọ na-eso ya eme njem, bụ́ Gaịọs na Aristakọs. A kpụụrụ ndị Kraịst abụọ a n’ike banye n’ebe a na-ekiri ihe nke jupụtara n’ìgwè ndị na-eme ihe ike bụ́ ndị “weere otu olu na-eti mkpu ihe ha ka oge hour abụọ, sị, Daịana [chi nwanyị] nke ndị Efesọs dị ukwuu.” N’ikpeazụ, otu onye ọrụ ọchịchị obodo ahụ nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka ìgwè mmadụ ahụ jụrụ. Egwu a e yiri ndụ Gaịọs na Aristakọs aghaghị inyeworị Pọl nsogbu n’obi nke ukwuu. N’ezie, ọ chọrọ ịbanye wee soro ìgwè ahụ na-eme ihe ike nke na-anụbiga ọkụ n’obi ókè tụgharịa uche, ma e gbochiri ya itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ n’ụzọ dị otú a.—Ọrụ 19:26-41.
15. Ọnọdụ dị aṅaa gafere ókè ka o nwere ike ịbụ ihe a kọwara ná 1 Ndị Kọrint 15:32?
15 Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na Pọl na-akọwa ọnọdụ gabigara ókè nke ukwuu karịa ihe a merenụ. N’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint, Pọl jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na abụ m rịị onye na-alụ ọgụ megide anụ ọhịa n’Efesọs dị ka mmadụ si eme, uru gịnị baara m?” (1 Ndị Kọrint 15:32) Nke a pụrụ ịpụta na ọ bụghị nanị ndị yiri anụ ọhịa yiri ndụ Pọl egwu kama anụ ọhịa nkịtị mere otú ahụ n’ámá egwuregwu nke Efesọs. Mgbe ụfọdụ a na-enye ndị omempụ ntaramahụhụ site n’ịmanye ha ịlụso anụ ọhịa ọgụ ka ìgwè mmadụ akpịrị ọbara na-akpọ nkụ na-ekiri ya. Ọ bụrụ na Pọl bu n’uche na ya echeworị anụ ọhịa nkịtị ihu, ọ ghaghị ịbụ na mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka ọ nwụọ a zọpụtawo ya n’ọnwụ ike n’ụzọ ọrụ ebube, dị nnọọ ka a zọpụtara Daniel n’ọnụ ọdụm nkịtị.—Daniel 6:22.
Ihe Atụ Ndị nke Oge A
16. (a) N’ihi gịnị ka ọtụtụ Ndịàmà Jehova pụrụ iji ghọta mkpagbu ndị Pọl nwetara? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka banyere ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha? (ch) Mmetụta ọma dị aṅaa bịaworo mgbe ndị Kraịst ji nke nta lanarị ọnwụ?
16 Ọtụtụ ndị Kraịst nke oge a pụrụ ịghọta mkpagbu ndị Pọl nwetara. (2 Ndị Kọrint 11:23-27) Taakwa, ndị Kraịst abụrụwo ndị ‘e bogburu nke ukwuu hie nne, karịa ike ha,’ ọtụtụ echewokwa ọnọdụ ndị ha ‘nwebigara obi abụọ ókè ma ha ga-adịkwa ndụ’ n’ime ha ihu. (2 Ndị Kọrint 1:8) Ụfọdụ anwụwo n’aka ìgwè ndị ogbu mmadụ na ndị mkpagbu dị obi ọjọọ. Anyị pụrụ ijide n’aka na ike na-akasi obi nke Chineke mere ka ha nwee ike ịtachi obi nakwa na ha nwụrụ na-etinyesi obi na uche ha ike ná mmezu nke olileanya ha, ma ọ̀ bụ olileanya eluigwe ma ọ bụ nke elu ala. (1 Ndị Kọrint 10:13; Ndị Filipaị 4:13; Mkpughe 2:10) N’ọnọdụ ndị ọzọ, Jehova agbanwewo ihe, a napụtawokwa ụmụnna anyị n’aka ọnwụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị nwetaworo ụdị nnapụta ahụ azụlitewo ntụkwasị obi ka ukwuu “na Chineke Onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie.” (2 Ndị Kọrint 1:9) Mgbe e mesịrị, ha pụrụ iji ọbụna obi ike ka ukwuu kwuo okwu ka ha na-eso ndị ọzọ na-ekerịta ozi nkasi obi nke Chineke.—Matiu 24:14.
17-19. Ahụmahụ ndị dị aṅaa na-egosi na ụmụnna anyị nọ na Rwanda abụwo ndị na-enwekọ nkasi obi nke Chineke?
17 Na nso nso a ezi ụmụnna anyị nọ na Rwanda gabigara ahụmahụ yiri nke Pọl na ndị ibe ya. Ọtụtụ tụfuru ndụ ha, ma mgbalị Setan mere ibibi okwukwe ha kụrụ afọ n’ala. Kama nke ahụ, ụmụnna anyị nọ n’ala a enwetawo nkasi obi Chineke n’ọtụtụ ụzọ n’onwe ha. N’oge mgbukpọ ahụ nke ndị Tutsi na ndị Hutu bi na Rwanda, e nwere ndị Hutu tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ iji chebe ndị Tutsi na ndị Tutsi chebere ndị Hutu. Ndị na-emebiga ihe ókè gburu ụfọdụ n’ime ha maka ichebe ndị kwere ekwe ibe ha. Dị ka ihe atụ, e gburu otu Onyeàmà bụ́ onye Hutu aha ya bụ Gahizi mgbe o zobesịrị otu nwanna nwanyị onye Tutsi aha ya bụ Chantal. Otu nwanna nwanyị onye Hutu aha ya bụ Charlotte zobere di Chantal bụ́ onye Tutsi, bụ́ Jean, n’ebe ọzọ. Ruo ụbọchị 40 Jean na nwanna ọzọ bụ́ onye Tutsi zogidere n’ebe buru ibu anwụrụ ọkụ si apụ na kichin, na-apụta nwa mkpirikpi oge nanị n’abalị. N’oge ndị a nile, Charlotte nyere ha nri na nchebe, ọ bụ ezie na o bi nso n’ogige ndị agha Hutu. Na peji a, ị pụrụ ịhụ foto nke Jean na Chantal e jikọghachiri, bụ́ ndị nwere ekele na ndị ofufe ibe ha bụ́ ndị Hutu “tọgbọrọ olu nke aka ha,” dị nnọọ ka Priska na Akwịla meere Pọl onyeozi.—Ndị Rom 16:3, 4.
18 Onyeàmà ọzọ bụ́ onye Hutu, bụ́ Rwakabubu, bụ onye akwụkwọ akụkọ bụ́ Intaremara toro maka ichebe ndị kwere ekwe ibe ya bụ́ ndị Tutsi.a O kwuru, sị: “E nwekwara Rwakabubu, otu n’ime Ndịàmà Jehova, onye nọgidere na-ezo ndị mmadụ aghara aghara n’etiti ụmụnna ya (otú ahụ ka ndị kwere ekwe ibe ha na-akpọ onwe ha). Ọ na-ejibu ogologo ụbọchị nile na-ebugara ha nri na mmiri ọṅụṅụ ọ bụ ezie na ọ na-arịa ọrịa ụkwara asthma. Ma Chineke mere ka ọ dị ike n’ụzọ pụrụ iche.”
19 Tụleekwa di na nwunye nwere mmasị bụ́ ndị Hutu aha ha bụ Nicodeme na Athanasie. Tupu mgbukpọ ahụ etiwapụ, di na nwunye a anọwo na-eso Onyeàmà bụ́ onye Tutsi aha ya bụ Alphonse na-amụ Bible. N’itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ, ha zoro Alphonse n’ebe obibi ha. Ka oge na-aga ha chọpụtara na ụlọ ahụ abụghị ebe dị nchebe n’ihi na ndị agbata obi ha bụ́ ndị Hutu maara banyere enyi ha bụ́ onye Tutsi. Ya mere, Nicodeme na Athanasie zoro Alphonse n’otu olulu dị n’èzí ha. Nke a bụ ime ezi ihe n’ihi na ndị agbata obi ha malitere ịbịa na-achọgharị Alphonse ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị. Ka o dina n’olulu a ruo ụbọchị 28, Alphonse tụgharịrị uche n’ihe ndekọ Bible ndị dị ka nke ahụ bụ́ banyere Rehab, onye zoro ndị Israel abụọ n’uko ụlọ ya na Jeriko. (Joshua 6:17) Taa Alphonse na-aga n’ihu n’ozi ya na Rwanda dị ka onye na-ekwusa ozi ọma, na-enwe ekele na ndị ọ na-eduziri ọmụmụ Bible bụ́ ndị Hutu tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi ya. Gịnịkwa banyere Nicodeme na Athanasie? Ha bụ ugbu a Ndịàmà Jehova e mere baptism, na-eduzikwara ndị nwere mmasị ihe karịrị ọmụmụ Bible 20.
20. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova siworo kasie ụmụnna anyị nọ na Rwanda obi, ma mkpa dị aṅaa ka ọtụtụ n’ime ha nọgidere na-enwe?
20 N’oge mgbukpọ ahụ malitere na Rwanda, e nwere ndị nkwusa 2,500 nke ozi ọma ahụ ná mba ahụ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ narị tụfuru ndụ ha ma ọ bụ bụrụ ndị a manyere ịgbapụ ná mba ahụ, ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà amụbawo gaa n’ihe karịrị 3,000. Nke ahụ bụ ihe na-egosi na Chineke n’ezie kasiri ụmụnna anyị obi. Gịnị banyere ọtụtụ ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nọ n’etiti Ndịàmà Jehova? Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ndị a ka na-enweta mkpagbu ma nọgidekwa na-enwe mkpa nke nkasi obi. (Jemes 1:27) A ga-ehichapụ anya mmiri ha kpam kpam nanị mgbe mbilite n’ọnwụ weere ọnọdụ n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ka o sina dị, n’ihi nlekọta nke ụmụnna ha na n’ihi na ha bụ ndị na-efe “Chineke nke nkasi obi nile,” ha nwere ike ịnagide ihe ndụ na-enye.
21. (a) Olee ebe ọzọ ụmụnna anyị nweworo mkpa dị ukwuu maka nkasi obi Chineke, oleekwa otu ụzọ nke anyị nile pụrụ isi nye aka? (Lee igbe bụ́ “Nkasi Obi n’Ime Afọ Anọ nke Agha.”) (b) Olee mgbe a ga-egbo mkpa anyị maka nkasi obi n’ụzọ zuru ezu?
21 N’ọtụtụ ebe ndị ọzọ, dị ka Eritrea, Singapore, na ebe bụbu Yugoslavia, ụmụnna anyị anọgidewo na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị mkpagbu. Ka anyị nyere ụmụnna ndị dị otú ahụ aka site n’ikpechi ekpere anya ka ha nwee ike ịnata nkasi obi. (2 Ndị Kọrint 1:11) Ka anyị na-atachikwa obi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo oge mgbe Chineke site na Jisọs Kraịst “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya [anyị]” n’echiche kasị zuo ezu. Mgbe ahụ anyị ga-enweta n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ezu nkasi obi nke Jehova ga-enye n’ụwa ọhụrụ ya nke ezi omume.—Mkpughe 7:17; 21:4; 2 Pita 3:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ụlọ Nche, January 1, 1995, peji nke 26, kọrọ ahụmahụ nke ada Rwakabubu, bụ́ Deborah, onye ekpere ya metụrụ ìgwè ndị agha Hutu n’ahụ ma mee ka a ghara igbu ezinụlọ ahụ.
Ị̀ Maara?
◻ N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Jehova ‘Chineke nke nkasi obi nile’?
◻ Olee otú anyị kwesịrị isi lee mkpagbu anya?
◻ Ole ndị ka anyị pụrụ iso kerịta nkasi obi?
◻ Olee otú a pụrụ isi gboo mkpa anyị maka nkasi obi n’ụzọ zuru ezu?
[Foto dị na peeji nke 17]
Jean na Chantal, ọ bụ ezie na ha bụ Ndịàmà bụ́ ndị Tutsi, bụ ndị Ndịàmà bụ́ ndị Hutu zoro n’ebe dị iche iche n’oge mgbukpọ ahụ na Rwanda
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndịàmà Jehova anọgidewo na-esoro ndị agbata obi ha na Rwanda na-ekerịta ozi nkasi obi nke Chineke