Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 9/1 p. 18
  • “Chineke nke Nkasi Obi Niile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Chineke nke Nkasi Obi Niile”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwu Mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ngụgụ Obi Site n’Aka “Chineke nke Nkasi Obi Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Otú Chineke Si Akasi Mmadụ Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • “Ịkasi Ndị Niile Na-eru Uju Obi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 9/1 p. 18

Bịaruo Chineke Nso

“Chineke nke Nkasi Obi Niile”

2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4

E NWERE ọtụtụ ihe na-eme ka obi jọọ mmadụ njọ, ọbụna na-eme ka obi daa mmadụ mbà, dị ka ahụhụ, ihe ịga otú mmadụ na-atụghị anya ya, na owu ọmụma. Mgbe ihe dị otú a mere, i nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee ebe m ga-esi nweta enyemaka?’ Ihe Pọl onyeozi kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4 na-egosi anyị onye na-akasi anyị obi n’ụzọ na-enweghị atụ, ya bụ, Jehova bụ́ Chineke.

N’amaokwu nke atọ, ọ kpọrọ Chineke “Nna nke obi ebere.” Olee ihe ọ pụtara? Okwu Grik a sụgharịrị “obi ebere” nwere ike ịpụta imechitere ndị na-ata ahụhụ ebere.a Otu akwụkwọ ndị nsụgharị Baịbụl ji eme nnyocha kwuru na e nwere ike ịsụgharị okwu ahụ “inwe ọmịiko” ma ọ bụ “ichebara mmadụ echiche nke ukwuu.” “Obi ebere” Chineke na-eme ka o mee ihe. Anyị ịmara banyere àgwà a Chineke nwere na-eme ka anyị bịaruo ya nso, ọ́ bụghị eziokwu?

Pọl kwukwara na Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi niile.” A sịrị na okwu Pọl dere n’ebe a pụtara “mmadụ ịkasi onye nọ ná nsogbu ma ọ bụ onye na-eru uju obi nakwa inyere mmadụ aka ma ọ bụ ịgba ya ume.” Akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible kwuru, sị: “Anyị ga-asị na anyị kasiri onye na-ata ahụhụ obi ma ọ bụrụ na ume anyị gbara ya ga-enyere ya aka idi ihe na-enye ya nsogbu.”

I nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee otú Chineke si akasi anyị obi ma na-agba anyị ume iji die ihe na-enye anyị nsogbu?’ Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na ohere o nyere anyị ikpeku ya ekpere bụ ụzọ bụ́ isi o si eme ya. Pọl gwara anyị na Chineke hụrụ anyị n’anya wee nye anyị Okwu Ya ka anyị wee site ná “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” Ekpere si anyị n’ala ala obi ga-emekwa ka anyị nwee “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.”—Ndị Rom 15:4; Ndị Filipaị 4:7.

Olee otú Jehova na-akasiru ndị ya obi? Pọl kwuru na Chineke “na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Ndị Kọrịnt 1:4) N’agbanyeghị nsogbu, nhụjuanya, ma ọ bụ ahụhụ nwere ike ịbịara anyị, Chineke ga-agba anyị ume, nyekwa anyị ike anyị ga-eji die ya. Nke a ọ́ naghị eme ka obi sie anyị ike?

Ọ bụghị naanị onye Chineke kasiri obi na-erite uru ná nkasi obi ahụ. Pọl kwukwara na Chineke na-akasi anyị obi ka “anyị wee nwee ike ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi site ná nkasi obi nke Chineke na-akasi anyị onwe anyị.” Ọ bụrụ na Chineke akasie anyị obi mgbe anyị nọ ná mkpagbu, ọ na-eme ka anyị nwee ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ, meekwa ka anyị na-enyere ndị nọ ná mkpa aka.

Ọ bụ ezie na Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi niile,” nke a apụtaghị na ọ ga-ewepụrụ anyị nsogbu ma ọ bụ ihe mwute niile na-abịara anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị agakwuru ya ka ọ kasie anyị obi, ọ ga-enye anyị ume anyị ga-eji die ihe mwute ma ọ bụ nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị ná ndụ. Anyị kwesịrị ife Chineke ọmịiko, na-enyekwa ya otuto.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A kpọrọ Chineke “Nna nke obi ebere [ma ọ bụ, onye obi ebere malitere n’ebe ọ nọ]” n’ihi na ọmịiko sitere n’ebe ọ nọ, o sokwa n’àgwà ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya