Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 12/15 p. 3-4
  • Oziọma ahụ Dị Ka Ndị Ọkà Mmụta Si Hụ Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oziọma ahụ Dị Ka Ndị Ọkà Mmụta Si Hụ Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ile Jisọs Anya “n’Ụzọ Nkà Mmụta”
  • Ihe Karịrị Nkà Mmụta
  • Oziọma Ndị Ahụ—Arụmụka ahụ Ka Na-aga n’Ihu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jisọs nke Bụ́ Ezigbo Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • È Kwesịrị Ịtụkwasị Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Eziokwu Banyere Jisọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 12/15 p. 3-4

Oziọma ahụ Dị Ka Ndị Ọkà Mmụta Si Hụ Ya

“ÒNYE ka ọha mmadụ na-asị na Mụ onwe m bụ?” (Luk 9:18) Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya nke a ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ iri abụọ gara aga. Ajụjụ ahụ kpaliri arụmụka mgbe ahụ. O yiri ka ọ dị otú ahụ ugbu a ọbụna karị, karịsịa n’oge Krismas, nke a sịrị na o hiwere isi na Jisọs. Ọtụtụ kwere na e si n’eluigwe zite Jisọs ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ̀ bụ ihe i chere?

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-echepụta echiche ọzọ. “Onyinyo Jisọs dị ka onye kụziri na ya bụ Ọkpara Chineke bụ́ onye ga-anwụ maka mmehie nke ụwa abụghị eziokwu dị ka akụkọ ihe mere eme si gosi,” ka Marcus J. Borg, bụ́ prọfesọ nke okpukpe na ọdịbendị na-ekwu.

Ndị ọkà mmụta ọzọ na-ekwu na onye bụ Jisọs n’ezie dị iche n’onye anyị na-agụ banyere ya n’ime Bible. Ụfọdụ kwere na e dere Oziọma ahụ nile n’afọ iri anọ ma ọ bụ karị mgbe Jisọs nwụsịrị nakwa na ka ọ na-erule oge ahụ a gbakwụnyewo ihe n’onye Jisọs bụ n’ezie. Ndị ọkà mmụta ahụ na-ekwusi ike na ebe nsogbu dị abụghị n’ebe ikike ncheta ihe nke ndị dere Oziọma ahụ dị, kama ná nkọwa ha. Mgbe Jisọs nwụsịrị ndị na-eso ụzọ ya bịara hụ ya n’ụzọ dị iche—dị ka Ọkpara Chineke, Onye Nzọpụta, na Mesaịa. Ụfọdụ ji nkwuwa okwu na-azọrọ na Jisọs bụ nanị onye amamihe na-awagharị awagharị, onye na-eweta mgbanwe n’ọha mmadụ. Ndị ọkà mmụta ahụ na-ekwu na nke ahụ bụ eziokwu gbara ọkpụrụkpụ.

Ile Jisọs Anya “n’Ụzọ Nkà Mmụta”

Iji kwadoo echiche ha “n’ụzọ nkà mmụta,” o yiri ka ọ dị ndị nkatọ ọkụ n’obi iwezụga ihe ọ bụla banyere Jisọs nke yiri ihe karịrị ike mmadụ n’ụsọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-asị na ọmụmụ nwa nke nwanyị ahụ na-amaghị nwoke bụ iji kpuchie na Jisọs bụ nwa mkpuke. Ndị ọzọ na-ajụ amụma Jisọs banyere mbibi Jerusalem, na-esi ọnwụ na e tibara ndị a n’Oziọma ahụ mgbe “mmezu” ha gasịrị. Ọbụna ụfọdụ na-ekwu na ọgwụgwọ ndị Jisọs gwọrọ bụ nnọọ site ná mmetụta uche—itinye uche n’ihe. Ị̀ na-ahụ ụdị nguzo ahụ dị ka eziokwu ka ọ̀ bụ nke ezi uche na-adịghị na ya?

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta ọbụna na-azọrọ na ndị na-eso ụzọ Jisọs chepụtara mbilite n’ọnwụ ahụ echepụta iji mee ka òtù ha ghara ịdakpọ. E kwuwerị, ka ndị ọkà mmụta ahụ na-eche, ụmụazụ Jisọs adịghị ike ma e wepụ ya, ya mere ha debaghachiri Onyenwe ha n’akụkọ ahụ. Ya bụ, ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst, ọ bụghị Kraịst, ka a kpọlitere n’ọnwụ. Ọ bụrụ na nke ahụ yiri ndahie nkà mmụta, gịnị banyere echiche nke ọkà mmụta okpukpe bụ́ Barbara Thiering na e gbughị Jisọs ma ọlị? O kwenyere na Jisọs lanarịrị mkpọgbu ya ma gaa n’ihu ịlụ nwunye ugboro abụọ ma mụta ụmụ atọ.

Nzọrọ ndị a nile na-ewetu Jisọs ala nanị n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọtụtụ ndị ọkà mmụta ga-anakwere ya: nke ịbụ nwoke amamihe, onye bụtụ onye Juu, onye mgbazi uche ọha—ihe ọ bụla ma e wezụga Ọkpara Chineke, onye bịara “werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—Matiu 20:28.

Ikekwe n’ihe dị ka n’oge a n’afọ, ị gụwo akụkụ dị iche iche nke Oziọma ahụ, dị ka akụkụ banyere ọmụmụ a mụrụ Jisọs n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ị nụwo ya na chọọchị. Ị̀ nakweere ihe ndekọ Oziọma ahụ dị ka ndị bara uru na ndị a pụrụ ikwere na ha? Mgbe ahụ rịba ama ọnọdụ a na-ama ahụ jijiji. N’ihe a kpọrọ Nzukọ Banyere Jisọs, otu ìgwè nke ndị ọkà mmụta ezukọwo ugboro abụọ kwa afọ kemgbe 1985 iji kpebie ịbụ eziokwu nke okwu Jisọs. Jisọs ò kwuru n’ezie ihe Bible sịrị na o kwuru? Ndị bịara nzukọ ahụ ji ákà tụrụ àgwà mee ntụliaka elu n’okwu nke ọ bụla. Ákà na-acha ọbara ọbara pụtara na otu okwu bụ n’ezie ihe Jisọs kwuru; ákà na-acha pinki pinki pụtara na ma eleghị anya Jisọs kwuru ya; ákà na-acha ntụ ntụ gosiri obi abụọ; ákà ojii pụtara ngwagbu.

Ọ pụrụ inye gị nsogbu n’obi ịmara na Nzukọ Banyere Jisọs ahụ kwuru na 82 pasent nke ihe ndị a sịrị na Jisọs kwuru bụ ndị ọ na-ekwughị ma eleghị anya. Nanị otu nhota sitere n’Oziọma Mak ka e weere dị ka ihe kwesịrị ntụkwasị obi. A sịrị na Oziọma Luk jupụtara ná mkpọsa ụgha nke na “a pụghị inwetaghachi” ha. Ha nile ma e wezụga ahịrịokwu atọ nke Oziọma Jọn nwetara ntụliaka ákà ojii, na-egosipụta ịbụ ụgha, ntakịrị nke fọdụkwaranụ ka a tụnyeere ákà na-acha ntụ ntụ nke pụtara obi abụọ.

Ihe Karịrị Nkà Mmụta

Ì kwenyeere ndị ọkà mmụta ahụ? Hà na-enyekwu anyị ihe ngosipụta ziri ezi banyere Jisọs karịa nke ahụ a na-achọta na Bible? Ajụjụ ndị a karịrị ihe a ga-arụrụ ụka n’ụzọ nkà mmụta. N’oge a n’afọ, a pụrụ ichetara gị na, dị ka Bible si kwuo, Chineke zitere Jisọs “ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Ọ bụrụ na Jisọs bụ nanị onye amamihe na-awagharị awagharị onye anyị pụrụ ịma ihe dị nta banyere ya, ọ ga-abụ ihe nzuzu ‘ikwe’ na ya. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ihe Bible kwuru banyere Jisọs bụ eziokwu, o metụtara nzọpụta ebighị ebi anyị. Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịmara—Bible ò nwere eziokwu banyere Jisọs?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya