Mgbasa nke Ikwenyesi Ike n’Ozizi Bụ Isi
IKWENYESI ike n’ozizi bụ isi—n’iri afọ ole na ole ji ọsọ ọsọ gafere, nke a bụ nanị òtù dị nta n’ime okpukpe Protestant. Lee ka ihe siworo gbanwee! Bruce B. Lawrence, onye na-enye nkọwa n’ihe metụtara okpukpe, dere na n’afọ 30 gara aga, mmadụ ole na ole gaara ebuwo ụzọ hụ na ná ngwụsị nke narị afọ nke 20, ikwenyesi ike n’ozizi bụ isia gaabụworị isiokwu dị mkpa otú a na ọbụna nke usoro mgbasa ozi na mahadum na-enyochabiga ókè.
Otú ọ dị, nke ahụ bụ ihe meworonụ. Akụkọ akwụkwọ akụkọ banyere njegharị iwe nke ime ihe ike n’okporo ámá, igbu ọchụ, òtù na-emegide nsikwopụ afọ ime, òtù okpukpe na-enye nrụgide iji ọchịchị eme ihe masịrị ha, na isu akwụkwọ ndị e weere na ha na-ekwulu ekwulu ọkụ n’ihu ọha bụcha ihe ncheta dị mgbe nile banyere ihe ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi na-eme. Akwụkwọ okwu ego a na-ebipụta kwa izu n’Itali bụ́ Mondo Economico kwuru na n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nnọọ n’ebe nile, ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi “ji aha Chineke na-eme mwakpo.”
A na-egosikarị ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi dị ka ndị na-emebiga ihe ókè na ndị na-anụbiga ọkụ n’obi ókè, na-akpata mgba okpuru na izu mmegide ma na-eji iyi egwu eme mwakpo. Uto nke ìgwè ndị dị ka Comunione e Liberazione n’okpukpe Roman Katọlik, Gush Emunim n’okpukpe ndị Juu, na Òtù Njikọ Ndị Kraịst n’okpukpe Protestant nke Ebe Ugwu America na-echegbu ndị mmadụ. N’ihi gịnị ka ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi ji agbasa? Gịnị na-akwalite ya? Ọ̀ bụ ma eleghị anya “ịbọ ọ́bọ̀ nke Chineke,” dị ka onye France bụ́ ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Gilles Kepel na-atụ aro ya?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Onye kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi bụ onye na-arapagidesi ike n’ụkpụrụ okpukpe ọdịnala ndị bụ isi. A ga-atụlekwu n’ụzọ zuru ezu ihe “ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi” pụtara n’isiokwu na-esonụ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Nina Berman/Sipa Press