Ikwenyesi Ike n’Ozizi Bụ Isi—Gịnị Ka Ọ Bụ?
EBEE ka ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi si malite? Ná ngwụsị nke narị afọ gara aga, ndị ọkà mmụta okpukpe na-adịghị esiri ozizi ọnwụ nọ na-agbanwe nkwenkwe ha iji nabata oké nkatọ Bible na nchepụta nkà mmụta sayensị, dị ka evolushọn. N’ihi nke ahụ, e mere ka obi ike ndị mmadụ nwere na Bible daa mbà. Ndị ndú okpukpe na-adịghị anabata echiche dị iche na United States meghachiri omume site n’iguzobe ihe ha kpọrọ nkweta ndị bụ isi.a Ná mmalite narị afọ nke 20, ha bipụtara ntụle nke ihe ndị a bụ isi n’ọtụtụ mpịakọta a kpọrọ The Fundamentals: A Testimony to the Truth. Ọ bụ n’isiokwu a ka e si nweta okwu bụ́ “ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi.”
N’ọkara mbụ nke narị afọ nke 20, ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi ghọrọ isiokwu akụkọ site n’oge ruo n’oge. Dị ka ihe atụ, na 1925, ndị na-ekwenyesi ike n’ozizi bụ isi nke okpukpe gbara onye nkụzi ụlọ akwụkwọ aha ya bụ John Scopes, nke Tennessee, U.S.A., akwụkwọ n’ụlọikpe n’ihe e mesịrị mara dị ka ikpe Scopes. Gịnị bụ mpụ ya? Ọ na-akụzi evolushọn, nke ahụ megidekwara iwu ọchịchị. N’oge ahụ, ụfọdụ kweere na ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi ga-adịru nwa oge. Na 1926, Christian Century, bụ́ magazin Protestant, kwuru na ọ bụ ihe “na-abaghị ezi uru na aka mere,” bụrụkwa “ihe na-enwetụghị ọdịdị nke ịrụzu ezi ihe ma ọ bụ nke nlanarị.” Lee ka echiche ahụ si hie ụzọ!
Kemgbe afọ ndị 1970, ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi abụrụwo isiokwu a na-akọ mgbe nile n’akụkọ. Prọfesọ Miroslav Volf, nke Seminarị Nkà Mmụta Okpukpe nke Fuller, California, U.S.A., na-asị: “Ọ bụghị nanị na ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi adịgidewo, kama o towokwa eto.” Taa, okwu bụ́ “ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi” adịghị emetụta nanị òtù ndị dị na Protestant kama ọ na-emetụtakwa ndị nọ n’okpukpe ndị ọzọ, dị ka okpukpe Katọlik, Alakụba, okpukpe ndị Juu, na okpukpe Hindu.
Ọ Bụ Mmeghachi Omume nke Oge Anyị
N’ihi gịnị ka ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi ji agbasa? Ndị na-amụ ya na-ekwu na, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ, ọ bụ mgbagwoju anya n’omume na okpukpe nke oge anyị kpatara ya. N’afọ ndị gara aga ihe ka ọtụtụ n’ọha mmadụ biri n’ọnọdụ omume doro anya, nke dabeere na nkwenkwe ọdịnala. Ugbu a, a na-ama nkwenkwe ndị ahụ aka ma ọ bụ na-ajụ ha. Ọtụtụ ndị ọkà amamihe na-ekwu na Chineke adịghị nakwa na mmadụ nọ nanị ya n’eluigwe na ala nọọrọ onwe ya. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na-akụzi na ihe a kpọrọ mmadụ sitere n’evolushọn ndapụta, n’abụghị site n’ihe Onye Okike na-ahụ n’anya mere. Echiche ime ihe masịrị onye zuru ebe nile. Enweghị ụkpụrụ omume ọma na-eti ụwa ihe otiti n’ọkwá nile nke ọha mmadụ.—2 Timoti 3:4, 5, 13.
Ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi na-achụso ihe ochie ndị ahụ doro anya, ụfọdụ n’ime ha na-agbalịkwa iweghachi ógbè na mba ha n’ihe ha chere na ha bụ ntọala omume na nkwenkwe ndị kwesịrị ekwesị. Ha na-eme ihe nile dị n’ike ha iji manye ndị ọzọ ịdị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume na usoro nkwenkwe “ziri ezi.” Onye kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi nwere obi ike na ya ziri ezi ebe ndị ọzọ hiere ụzọ. Prọfesọ James Barr, n’akwụkwọ ya bụ́ Fundamentalism, na-ekwu na ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi “ka a na-ewerekarị dị ka okwu ibu iro na nke e ji eme ihe ọchị, na-atụ aro ajọ mbunobi, nkwesi olu ike, nzochi ihe ọmụma na ịrọ òtù.”
Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye chọrọ ka a kpọọ ya onye nwere ajọ mbunobi, na-ekwesi olu ike, ma ọ bụ onye na-arọ òtù, ọ bụghị mmadụ nile kwekọrịtara banyere onye bụ onye kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi na onye na-abụghị. Otú ọ dị, e nwere akụkụ ụfọdụ e ji amata ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi nke okpukpe.
Ịmata Onye Kwenyesiri Ike n’Ozizi Bụ Isi
Ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi nke okpukpe na-abụkarị mgbalị a na-eme iji chekwaa ihe ndị e kwere na ha bụ ọdịnala ndị mbụ ma ọ bụ nkwenkwe okpukpe nke otu ọdịbendị na iji megide ihe e chere na ọ bụ omume achọghị ihe ime mmụọ nke ụwa. Nke a apụtaghị na ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi na-emegide ihe ọgbara ọhụrụ nile. Ụfọdụ na-eji usoro nzirịta ozi ọgbara ọhụrụ n’ụzọ dị irè akwalite ụzọ ha si ele ihe anya. Ma ha na-alụ ọgụ megide ime ka ọha mmadụ na-agbaso echiche ụwa.b
Ụfọdụ ndị na-ekwenyesi ike n’ozizi bụ isi na-ekpebisi ike, ọ bụghị nanị ichekwara onwe ha ọdịdị ọdịnala nke nkwenkwe ma ọ bụ ụzọ ndụ, kama ibokwasị ndị ọzọ ndị a, ịgbanwe ọdịdị ọha mmadụ ka ha wee kwekọọ n’ihe ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi kweere. N’ihi ya, onye Katọlik kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi agaghị akwụsị nanị n’ịjụ nsikwopụ afọ ime. O yiri ka ọ ga-arụgide òtù ndị ome iwu nke mba ya ka ha mapụ nsikwopụ afọ ime n’iwu. Na Poland, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ La Repubblica si kọọ, iji mee ka a kwadoo iwu na-emegide nsikwopụ afọ ime, Chọọchị Katọlik duziri “‘ọgụ’ nke ha nọ ya tinye ike na mmetụta ya nile n’ọrụ.” N’ime otú ahụ, ndị isi chọọchị na-eme ihe dị nnọọ ka ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi. Òtù Njikọ Ndị Kraịst Protestant dị na United States na-alụ “ọgụ” ndị yiri ya.
Karịsịa ihe nile, e ji nkweta okpukpe gbanyemiri mkpọrọgwụ mara ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi. N’ihi ya, onye Protestant kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi ga-abụ onye nkwado kwenyesiri ike nke nkọwa nkịtị nke Bible, eleghị anya na-agụnye nkwenkwe bụ na e kere ụwa n’ụbọchị isii efu. Onye Katọlik kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi enweghị obi abụọ banyere emehieghị emehie nke popu.
Mgbe ahụ, o kwere nghọta ihe mere okwu ahụ bụ́ “ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi” ji akpali echiche nke iji nzuzu anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè na ihe mere na ahụ adịghị eru ndị na-adịghị ekwenyesi ike n’ozizi bụ isi ala mgbe ha hụrụ ka ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi na-agbasa. Dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, ọ pụrụ ịbụ na anyị adịghị ekwenyere ndị na-ekwenyesi ike n’ozizi bụ isi ma bụrụ ndị ụzọ aghụghọ ha ji eme ihe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na omume ime ihe ike ha mgbe ụfọdụ juru anya. N’ezie, omume ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi nke otu okpukpe pụrụ ịdị na-awụ ndị nke okpukpe ọzọ akpata oyi! Ma, ọtụtụ ndị mmadụ nwere ọgụgụ isi na-echegbu onwe ha banyere ihe ndị na-akpata mgbasa nke ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi—ejighị omume ọma kpọrọ ihe nke na-arị elu, enwekwaghị okwukwe, na ịjụ ihe ime mmụọ nke dị n’ọha mmadụ oge a.
Ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi ọ̀ bụ nanị mmeghachi omume dịnụ nye ọnọdụ ndị a? Ma ọ́ bụghị ya, gịnị pụrụ ịnọchi anya ya?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe ahụ a na-akpọkarị Isi Ihe Ise nke Ikwenyesi Ike n’Ozizi Bụ Isi, nke a kọwara na 1895, bụ “(1) isite n’ike mmụọ nsọ na ehieghị ụzọ nke Akwụkwọ Nsọ; (2) ịbụ chi nke Jisọs Kraịst; (3) ọmụmụ Kraịst site n’aka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke; (4) mkpuchi mmehie n’ụzọ idochi anya ihe nke Kraịst n’elu obe; (5) mbilite n’ọnwụ n’anụ ahụ na ọbịbịa onwe onye nke abụọ nke Kraịst n’ụwa n’anụ ahụ.”—Studi di teologia (Ihe Ọmụmụ Nkà Mmụta Okpukpe).
b “Ime ka a gbasoo echiche ụwa” pụtara ịkwadosi ihe nke ụwa ike, dị ka nke na-emegide ihe ime mmụọ ma ọ bụ nke dị nsọ. Onye nwere echiche ụwa adịghị echegbu onwe ya banyere okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe okpukpe.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Na 1926, otu magazin ndị Protestant kọwara ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi dị ka ihe “na-abaghị ezi uru na aka mere,” bụrụkwa “ihe na-enwetụghị ọdịdị nke ịrụzu ezi ihe ma ọ bụ nke nlanarị”