Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 3/1 p. 6-7
  • Ụzọ Ka mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Ka mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụwa nke Nwere Ụkpụrụ Ndị Siri Ike
  • Ikwenyesi Ike n’Ozizi Bụ Isi—Gịnị Ka Ọ Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ọchịchị Nke Ga-akwado Ụkpụrụ Chineke
    Teta!—2003
  • Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
    Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
  • Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 3/1 p. 6-7

Ụzọ Ka mma

NDỊÀMÀ JEHOVA nwere nchegbu banyere nrichapụ nke ọnọdụ ime mmụọ dị n’ụwa na omume rụrụ arụ na mgbagwoju anya okpukpe nke jupụtara ọha mmadụ. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ a na-akpọ ha ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi. Ma hà bụ? Ee e. Ọ bụ ezie na ha nwere nkweta okpukpe ndị siri ike, ha abụghị ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi n’echiche nke e jizi okwu ahụ eme ihe. Ha adịghị arụgide ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị iji kwalite otu ụzọ e si ele ihe anya, ha adịghịkwa eme ngagharị iwe ma ọ bụ emeso ndị ha na ha na-enweghị nkwekọrịta ihe ike. Ha achọtawo ụzọ ka mma. Ha na-eṅomi Onye Ndú ha, bụ́ Jisọs Kraịst.

Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na eziokwu okpukpe dị, na a na-achọta ya n’ime Bible. (Jọn 8:32; 17:17) Ma Bible na-akụziri ndị Kraịst ịdị obiọma, ịdị mma, umeala n’obi, na inwe ezi uche—àgwà ndị na-adịghị enye ohere maka ịnụbigara ihe ọkụ n’obi ókè. (Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Filipaị 4:5) N’akwụkwọ Bible bụ́ Jemes, a na-agba ndị Kraịst ume ịzụlite “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” bụ nke a kọwara dị ka nke “buru ụzọ dị ọcha, e mesịa ọ dị udo, nwee obiọma, na-ekwenye okwu nke ọma, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ.” Jemes gbakwụnyere, sị: “Mkpụrụ nke ezi omume ka ndị na-eme udo na-agha n’udo.”—Jemes 3:17, 18.

Ndịàmà Jehova na-echeta na Jisọs nwere oké nchegbu banyere eziokwu. Ọ gwara Pọntiọs Paịlet, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Ọ bụ ezie na ọ bụ onye nkwado na-adịghị atụ egwu nke eziokwu, ọ chọghị ịmanye ndị ọzọ ikwere n’ihe ndị o kwere na ha. Kama nke ahụ, ọ kpaliri uche na obi ha. Ọ maara na Nna eluigwe ya, bụ́ Chineke “dị mma na onye ziri ezi,” ga-ekpebi ụzọ na mgbe ọ ga-ekpochapụ ụgha na ikpe na-ezighị ezi pụọ n’elu ala. (Abụ Ọma 25:8) Ya mere, ọ chọghị ịbịada ndị na-ekwenyereghị ya. N’ụzọ dị iche, ọ bụ ndị ndú okpukpe ọdịnala nke oge ya bụ ndị gbalịrị ịbịada Jisọs.—Jọn 19:5, 6.

Ndịàmà Jehova nwere nkwenye ndị siri ike banyere ozizi okpukpe, ha na-egosikwa ụkpụrụ ndị siri ike n’ihe metụtara omume. Dị ka Pọl onyeozi, ha kwenyere na nanị “otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe dị, otu baptism dị.” (Ndị Efesọs 4:5) Ha makwaara okwu Jisọs: “Warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:13, 14) Ma, ha adịghị agbalị ịmanye ndị ọzọ ịgbaso nkwenkwe ha. Kama nke ahụ, ha na-eṅomi Pọl ma “na-arịọ” ndị nile chọrọ ka ‘ha na Chineke dị n’otu.’ (2 Ndị Kọrint 5:20) Nke a bụ ụzọ ka mma. Ọ bụ ụzọ Chineke.

Ikwenyesi ike n’ozizi bụ isi nke okpukpe, dị ka e ji okwu ahụ eme ihe taa, dị nnọọ iche. Ndị na-ekwenyesi ike n’ozizi bụ isi ji ọtụtụ atụmatụ—tinyere ime ihe ike—amanye ọha mmadụ ikwekọ n’ụkpụrụ ha. N’ime otú ahụ, ha na-aghọ otu akụkụ bụ isi nke usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma, Jisọs sịrị na ụmụazụ ya kwesịrị ịbụ ndị ‘na-esiteghị n’ụwa.’ (Jọn 15:19; 17:16; Jemes 4:4) N’ikwekọ n’okwu ndị ahụ, Ndịàmà Jehova na-anọpụ iche kpam kpam n’esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Dịkwa ka akwụkwọ akụkọ ndị Itali bụ́ Fuoripagina kwenyere, ha “adịghị amanye ihe ọ bụla n’ahụ onye ọ bụla; onye ọ bụla nweere onwe ya ịnakwere ma ọ bụ ịjụ ihe ha na-ekwu.” Gịnị si na ya apụta? Ozi dị n’udo nke Bible nke Ndịàmà na-adọta ụdị ndị dị iche iche, ọbụna ndị bụbu ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi.—Aịsaịa 2:2, 3.

Ụwa nke Nwere Ụkpụrụ Ndị Siri Ike

Ndịàmà na-aghọta na ụmụ mmadụ apụghị ịgwọta nsogbu na-enye ndị kwenyesiri ike n’ozizi bụ isi nsogbu. Ị pụghị ịmanye mmadụ ikwere na Chineke ma ọ bụ ịnakwere ihe ndị i kwere na ha. Iche na ihe dị otú ahụ kwere omume dugara n’ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị na-awụ akpata oyi n’akụkọ ihe mere eme, dị ka Agha Ntụte, Njụta Okwukwe nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya, na “ntọghata” nke ndị American India. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị tụkwasịrị Chineke obi, ị ga-adị njikere ịhapụ okwu n’aka ya.

Dị ka Bible si kwuo, Chineke esetịpụwo oge a kara aka nke o nyeworo ụmụ mmadụ ohere imebi iwu ya wee si otú a kpata ahụhụ na ihe mgbu. Ọ fọrọ nke nta ka oge ahụ gwụsịa. Ka ọ dị ugbu a, Jisọs na-achị isi dị ka Eze n’Alaeze eluigwe nke Chineke, n’isi nso kwa, Alaeze ahụ ga-eme ihe iji wepụ gọọmenti ụmụ mmadụ ma weghara nchịkwa kwa ụbọchị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Matiu 24:3-14; Mkpughe 11:15, 18) Ihe ga-esi na ya pụta ga-abụ paradaịs zuru ụwa ọnụ ebe udo na ezi omume ga-aba ụba. N’oge ahụ a gaghị enwe mgbagwoju anya banyere ụzọ e kwesịrị isi fee ezi Chineke ahụ ofufe. “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ụkpụrụ ebighị ebi ndị dị ka ebere ịhụnanya, eziokwu, ikpe ziri ezi, na ịdị mma ga-enwe mmeri maka ọdịmma nke ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi.

N’ilepụ anya n’ihu maka oge ahụ, ọbụ abụ ahụ na-ekwu n’ụdị abụ uri, sị: “Ebere na eziokwu ezutewo; ezi omume na udo esutụwo ọnụ. Eziokwu na-epu epu n’ala; ezi omume esiwokwa n’eluigwe lepụ anya. Ọzọ, Jehova ga-enye ezi ihe; ala anyị ga-enyekwa ihe omume ya. Ezi omume ga-aga n’ihu Ya; ọ ga-emekwa ka nzọụkwụ Ya nile ghọọ ụzọ.”—Abụ Ọma 85:10-13.

Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịgbanwe ụwa, anyị n’otu n’otu pụrụ ịzụlite ụkpụrụ Chineke ọbụna taa. N’ihi ya, anyị pụrụ ịgbalị ịbụ ụdị mmadụ Chineke ga-achọ dị ka ndị na-efe ya ofufe n’ụwa ọhụrụ ahụ. Mgbe ahụ anyị ga-eso ná ndị ahụ dị umeala n’obi ọbụ abụ ahụ zoro aka na ha, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) Chineke na-akwado ma na-agọzi ndị na-eme uche ya, ọ na-ekwekwa nkwa ihe ndị magburu onwe ha maka ọdịnihu. Jọn onyeozi sịrị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị nile òkù ịmara banyere ozi ọma nke Alaeze Chineke

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 6]

Oriọna dị na peji nke 3, 4, 5, na 6: Printer’s Ornaments/site n’aka Carol Belanger Grafton/Dover Publications, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya