Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
“Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu n’Ihu Mmadụ”
N’OZIZI Elu Ugwu ya, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa.” Ọ gara n’ihu ịgba ha ume, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.”—Matiu 5:14-16.
N’Itali a hụtawo ọrụ ọma nke Ndịàmà Jehova. Dị ka ihe atụ, ezi àgwà ha mgbe ha na-aga mgbakọ kwa afọ ha na-ewetara Chineke otuto, dị ka akụkọ na-esonụ na-akwado:
▪ Ruo ọtụtụ afọ otu nwanyị bi na Terni, Itali, nyeere nwa ya nwanyị aka ilekọta otu ụlọ kọfị nke dị nso n’ámá egwuregwu dị n’obodo ukwu ahụ. Ọ na-akọ, sị: “Ahụtara m ọdịiche dị ukwuu n’etiti ndị bịara maka egwuregwu bọl ụkwụ na ndị bịara mgbakọ nke Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ. Ndịàmà na-emeru ihe n’ókè karị n’uwe ha, ha na-akwụwakwa aka ọtọ ma na-akwanye ùgwù. M na-ajụbu onwe m mgbe mgbe otú ndị sitere agbụrụ dị iche iche pụrụ isi na-emekọ ihe ọnụ otú a.
“Otu ụbọchị otu Onyeàmà kwụsịrị m n’okporo ámá wee jụọ ma m maara aha Chineke. Amaghị m, ebe m makwaara na Ndịàmà Jehova bụ ndị ezi mmadụ, ekwere m ka ọ bịa leta m. Enwere m ajụjụ banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ọ zara site na Bible. N’egbughị oge, anakweere m ọmụmụ Bible. izu abụọ kwa n’ihu amalitere m ịga nzukọ.
“Na mbụ nwa m nwanyị megidere m, ma àgwà m na mkpebisi ike m gbanwere omume ya. Amalitere m ịmụ ihe ọnwa itoolu gara aga. Taa nwa m nwanyị na di ya na-agwa Ndịàmà na-aṅụ kọfị n’ụlọ kọfị ha okwu ịja mma. Nye m, e mere m baptism n’otu mgbakọ n’ámá egwuregwu a.”
▪ Mgbe e nwesịrị mgbakọ na Roseto degli Abruzzi, manija otu ogige ụlọ ntu kwuru, sị: “Achọpụtawo m na Ndịàmà Jehova na-akwụwa nnọọ aka ha ọtọ n’ihe nile ha na-eme. N’izu gara aga, 40 n’ime ha nọ n’ogige ụlọ ntu m, ha akpataghịkwa nsogbu ọ bụla. N’ụzọ megidere nke ahụ, ha bụ nanị ndị na-abịa agwa gị na ha nwere onye ọzọ so ha na-anọ n’ụlọ ụgbọala na-adọkpụ ma ọ bụ ụlọ ntu. Nye m, ha bụ ndị ahịa kasị mma ị pụrụ inwe.”
▪ Mgbe otu mgbakọ ahụ gasịrị, otu manija họtel kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova nile bụ ndị udo. Ha adịghị aghara, ha na-alakpukwa ụra ngwa ngwa. N’ezie ha dị obiọma, na-akwụwa aka ọtọ, na-akpakwa àgwà ọma. Ọ ga-amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na mmadụ nile dị ka ha. Ndị ọzọ na-ezu ihe nile—iko okooko osisi, ihe e ji etinye ntụ siga, ọbụna akwụkwọ mposi na shuga! Ihe yiri nke ahụ emebeghị n’ebe unu nọ. Mgbe ụmụ unu na-ewere ice cream na friji n’uhuruchi, adịghị m enye onwe m nsogbu ịga lee ma e nwere ihe ha weere. Ha na-agbakọ ụgwọ ha ji m wee bịa kwụọ ya ozugbo. Atụkwasịrị m ha nnọọ obi. Lee ihe magburu onwe ya ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ dị otú ahụ! Ọ dị m ka ya bụrụ na ndị ọbịa m nile bụ Ndịàmà Jehova.”
A maara Ndịàmà Jehova nke ọma n’Itali, dị ka n’ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. Ha ‘na-ebi obi ha nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ’ wee si otú a na-ewetara ezi Chineke ahụ, onye ha na-aza aha ya, otuto.—1 Pita 2:12.