Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Àgwà nke Na-achọ Ije Ozi Ndị Kraịst Anyị Mma
PITA onyeozi nyere ndị Kraịst ndụmọdụ, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ.” (1 Pita 2:12) Pọl onyeozi gosiri na site n’ezi àgwà anyị, anyị ‘na-achọ ozizi nke Onye Nzọpụta anyị Chineke mma n’ihe nile.’ (Taịtọs 2:10) Ndịàmà Jehova bi gburugburu ụwa bụ ndị a ma ama n’ihi ezi akparamagwa ha. Rịba ụfọdụ ihe atụ ama.
A Kpaliri Onye Nkụzi n’Ihi Ezi Àgwà
◻ Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Costa Rica kọrọ na ìgwè buru ibu nke ndị na-eto eto ná mba ahụ setịpụrụ ezi ihe nlereanya. Otu nwanna nwoke kọrọ ihe dọtara ya n’ebe eziokwu ahụ dị. Ọ kọrọ, sị: “Ihe dọtara mmasị m karịsịa bụ ezi àgwà nke ma ndị ntorobịa ma ndị okenye, ma karịsịa, nke ndị ntorobịa. Mgbe m na-arụ ọrụ dị ka onye nkụzi, enwere m ohere nke ileru Ndịàmà nọ n’ụlọ akwụkwọ m anya nke ọma. Ebe ọ bụkwa na mụ na otu ezinụlọ Ndịàmà Jehova bi, ahụtakwara m akparamagwa nke ụmụntakịrị nọ n’ebe ahụ.
“Apụghị m nnọọ izere ịhụta ọdịiche dị n’etiti ụmụ akwụkwọ bụ Ndịàmà na ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ nọ n’ụlọ akwụkwọ m. Ndịàmà ahụ na-abịa n’oge mgbe nile, na-akpa ezi àgwà, ha adịghị ekwu okwu ụgha, ha na-arụzukwa ọrụ e nyere ha mgbe nile. Ahụtakwara m na ha na-eme ihe n’eziokwu mgbe ha na-ele ule, ọ bụ ezie na ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ na-egwukarị wayo. Ọzọkwa, ha nwere ezi àgwà nke ukwuu, na-akwanyekwara m ùgwù dị ka onye nkụzi ha. N’ịbụ onye a kpaliri mmasị ya n’ihi Ndịàmà ahụ bụ ụmụntakịrị nọ n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ụlọ ebe m bi, amalitere m inyocha ihe banyere okpukpe nke a, ma mesịa nakwere eziokwu ahụ.”
A Rụpụtara Ezi Ihe Site n’Àgwà Ndị Kraịst n’Otu Mgbakọ
◻ Otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ n’otu ọgbakọ dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke El Salvador nwere ọchịchọ iso ụmụnne ya abụọ ndị nwoke kerịta ozi ọma Alaeze ahụ. Otu n’ime ha gere ntị ma malite iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Nwanne ya nwoke nke ọzọ nọ na chọọchị Evangelical nke a na-akpọ Onye Isi Udo, ọ gwakwara nwanne ya nwoke, sị: “Agwala m okwu ọ bụla; ị na-ejere ọdịmma Ekwensu ozi.” Mgbe oge ruru maka mgbakọ distrikt, onye nke ahụ na-amụ ihe kpọrọ nwanne ya nwoke òkù ka o soro ya jee mgbakọ ahụ. Nwanne ya nwoke sịrị: “Ọ dị mma, m ga-eso gị jee; m na-eje nanị ka m hụ ihe m ga-eji jide Ndịàmà.” Ụmụnne abụọ ahụ jekọrọ mgbakọ ahụ. Ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu ndị bịaranụ na ezi ime ihe n’usoro e nwere ná mgbakọ ahụ kpaliri mmasị nke onye Evangelical ahụ, onye kwuru na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ya hụtụrụla ihe yiri nke a. Mgbe ọ laghachiri, ọ gwara nwanne ya nwoke, sị: “Kwee m n’aka.” Nwanne ya nwoke jụrụ, sị, “Nke a ọ̀ bụ maka gịnị?” Nzaghachi e nyere ya bụ “Nanị kwee m n’aka.” Ha kwere n’aka, nwanne ya nwoke ahụ nke nọbu na chọọchị Evangelical kwuru, sị: “Site ugbu a gaa n’ihu, m gaje iso Ndịàmà Jehova na-amụ ihe. N’eziokwu, amaghị m ihe na-efunarị m kemgbe.” Ugbu a, ya onwe ya bụkwa onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke.