Ịgba Àmà Site n’Àgwà Dị Mma
1 N’ọha mmadụ taa nke ime ihe masịrị onye, ọtụtụ ndị na-eto eto na-eji elezighị anya were ọgwụ ọjọọ, omume rụrụ arụ, nnupụisi, na ihe ike na-ebibi ndụ ha. N’ụzọ dị iche, ọ na-enye obi ụtọ ịhụ àgwà ọma nke ezi ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst, ọ bụkwa ihe mara mma n’ezie nye Jehova. Ọ bụ ihe àmà dị ike nke pụrụ ịdọta ndị ọzọ n’eziokwu.—1 Pita 2:12.
2 Ọtụtụ ahụmahụ na-egosi na àgwà ọma ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst enwewo mmetụta dị mma n’ahụ ndị na-ekiri ha. N’ikwu banyere otu Onyeàmà na-eto eto bụ́ nwa akwụkwọ ya, otu onye nkụzi gwara klas dum na Chineke nwatakịrị nwanyị a, bụ́ Jehova, bụ ezi Chineke ahụ. O kwuru nke a n’ihi na àgwà nwatakịrị nwanyị ahụ bụ nke nkwanye ùgwù mgbe nile. Onye nkụzi ọzọ detaara Society akwụkwọ, na-ekwu: “Eji m obi ụtọ na-aja unu mma maka ezi ụmụ okoro ndị unu nwere n’okpukpe unu. . . . Ụmụ okoro na agbọghọ unu bụ ezi ihe nlereanya n’ezie. Ha na-asọpụrụ ndị tọrọ ha, ha dị nwayọọ, na-ejikwa ejiji dị mma. Leekwa nnọọ ka ha si mara Bible ha! Nke ahụ bụ okpukpe n’ezie!”
3 Àgwà ọma Onyeàmà dị afọ asaa nọ na klas ya masịrị onye nkụzi ọzọ. Àgwà ịdị nwayọọ, nke na-enyekwa obi ụtọ nke nwa okoro ahụ, nke mere ka ọ pụọ nnọọ iche n’ebe ụmụ okoro ndị ọzọ nọ dọtara ya. O nwere mmasị n’àgwà ya nke iji ihe kpọrọ ihe n’ebe nkwenkwe okpukpe ya dị—ihere emeghị ya ịdị iche n’ihi ihe o kwenyere. Ọ pụrụ ịhụ na a zụwo akọ na uche ya nakwa na ọ pụrụ “ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Hib. 5:14) E mesịa, nne nwa okoro ahụ letara onye nkụzi ahụ, a malitekwara ọmụmụ Bible. Ka oge na-aga, e mere onye nkụzi ahụ baptism, mgbe e mesịkwara ọ ghọrọ ọsụ ụzọ oge nile!
4 Ezi àgwà nke otu Onyeàmà nọ n’ụlọ akwụkwọ ya nwere mmetụta n’ahụ otu nwa okorobịa. Ọ dị iche n’ezie—o nwere nnọọ àgwà nsọpụrụ, na-amụsi ihe ike, na-ejikwa ejiji kwesịrị ekwesị mgbe nile; ọzọkwa, n’adịghị ka ụmụ agbọghọ ndị ọzọ, ọ dịghị mgbe o so ụmụ nwoke mee mfegharị. Ọ pụrụ ịhụ na ọ na-adị ndụ dị ka ụkpụrụ Bible si dị. Nwa okorobịa ahụ jụrụ ya ajụjụ banyere nkwenkwe okpukpe ya, o nwekwara mmasị n’ihe ọ mụtara. Ọ malitere ịmụ ihe, n’oge na-adịghị anya e mere ya baptism, o mesịkwara kere òkè n’ozi ịsụ ụzọ na n’ozi Betel.
5 Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst na-eto eto chọrọ ịgbara ndị ọzọ àmà dị mma, leruo àgwà gị anya n’ụzọ ọ bụla. Adala mba mgbe ọ bụla site n’ịnakwere àgwà, echiche, ma ọ bụ ụzọ ndụ ime ihe masịrị onye nke ụwa. Setịpụ ihe nlereanya dị elu n’okwu ọnụ, uwe, na ejiji gị, ọ bụghị nanị mgbe ị na-ekere òkè n’ozi ubi na ná nzukọ ọgbakọ kamakwa mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ na mgbe ị na-enwe ntụrụndụ. (1 Tim. 4:12) Ị ga-enwe ezi ọṅụ mgbe mmadụ nwere mmasị n’eziokwu n’ihi na ị nọwo na-eme ‘ka ìhè gị na-enwu’ site n’àgwà gị dị mma.—Mat. 5:16.