Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Na-enwu Dị Ka Ihe Ndị Na-enye Ìhè
1. Olee otú Bible si egosi na Ndị Kraịst ga-abụ ndị a ga na-ahụ, oleekwa otú nke ahụ si metụta Ndị Kraịst na-eto eto taa?
1 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bụ ìhè nke ụwa.” (Mat. 5:14, 16) A ga na-ahụ ha nke ọma dị ka a na-ahụ obodo dị n’elu ugwu, nke na-egbuke egbuke ma anwụ na-acha. Taa, ọtụtụ Ndị Kraịst ka na-eto eto “na-enwu . . . dị ka ihe ndị na-enye ìhè n’ụwa” site n’omume ọma ha nakwa site n’ọrụ ịgba àmà ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ.—Fil. 2:15; Mal. 3:18.
2. Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi gbaara ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe gị àmà?
2 N’ụlọ Akwụkwọ: Olee otú ị pụrụ isi gbaa àmà n’ụlọ akwụkwọ? Ụfọdụ ndị ntorobịa ejirila oge ha na-amụ ihe ụfọdụ na klas gbaa àmà, oge ha na-amụ banyere ihe ndị dị ka ọgwụ ọjọọ, evolushọn, na otú ndị Nazi si gbukpọọ ndị mmadụ—ihe ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ha. Otu nwanna nwanyị ji otu edemede a sị ha dee banyere iyi ọha egwu gbaa àmà banyere Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya ụmụ mmadụ nwere. Edemede ahụ e chere echiche dee masịrị nnọọ onye nkụzi ya, nke a nyekwara nwanna nwanyị a ohere ịgbakwu àmà.
3. Olee otú ị pụrụ isi jiri àgwà gị mee ka ìhè gị na-enwu n’ụlọ akwụkwọ?
3 Ụzọ ọzọ ị pụrụ isi nwuo dị ka ihe na-enye ìhè bụ site n’àgwà gị nakwa site n’uwe dị mma ị na-eyi na ejiji dị mma ị na-eji. (1 Kọr. 4:9; 1 Tim. 2:9) Mgbe ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi hụrụ na àgwà gị dị iche, ụfọdụ pụrụ inwe mmasị n’eziokwu ahụ n’ihi àgwà ọma gị ma kwere ka ị gwa ha eziokwu Bible. (1 Pita 2:12; 3:1, 2) O nwere ike isiri gị ike ịkpa àgwà na-ewetara Chineke nsọpụrụ, ma Jehova ga-agọzi gị n’ụba ma i mee otú ahụ. (1 Pita 3:16, 17; 4:14) Iji mee ka ndị mmadụ nwee mmasị ige ntị n’ozi ọma ahụ, ị pụrụ ịdị na-agụ akwụkwọ dabeere na Bible n’oge unu na-anaghị amụ ihe ma ọ bụ debe ya n’ebe ndị ọzọ nwere ike ịhụ ya.
4. Olee ụfọdụ n’ime uru ndị a na-erite site n’ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ?
4 Ikwe ka ìhè gị na-enwu n’ụlọ akwụkwọ ga-eme ka okwukwe gị sie ike ma nyere gị aka iji ofufe ị na-efe Jehova eme ọnụ. (Jer. 9:24) Ime otú ahụ ga-echebekwa gị. Otu nwanna nwanyị kwuru, sị, “Otu n’ime uru ndị m na-erite n’ikwupụta ihe ndị m kweere bụ na ụmụ akwụkwọ adịghị anwa ịmanye m ime ihe ndị na-ekwekọghị n’ihe Bible na-ekwu.”
5. (a) Olee otú ụfọdụ ndị na-eto eto si agbasawanye ozi ha? (b) Olee ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị i setịpụụrụ onwe gị?
5 Ịgbasawanye Ozi Ha: Ụzọ ọzọ ọtụtụ ndị na-eto eto si enwu dị ka ihe ndị na-enye ìhè bụ site n’ịgbasawanye ozi ha. Mgbe otu nwanna nwoke gụsịrị ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ kwagara ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ọ nọ n’otu obere ọgbakọ e nwere nanị otu okenye. O degaara otu enyi ya akwụkwọ, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ ebe a. Ozi ọma na-enye m nnọọ ume ọhụrụ! Anyị na-anọru ihe dị ka minit 20 n’ụlọ ọ bụla, n’ihi na ndị mmadụ chọrọ ịnụ ihe nile anyị chọrọ ịgwa ha.” O kwukwara, sị: “Ọ dị m nnọọ ka onye ọ bụla na-eto eto jee ozi yiri nke a ma nwee ụdị afọ ojuju m na-enwe. O nweghị ihe dị mma karịa iji ihe nile anyị nwere jeere Jehova ozi.”
6. Olee ihe na-amasị gị n’ebe ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ unu nọ?
6 Anyị ji unu ndị na-eto eto, bụ́ ndị na-enwu dị ka ihe ndị na-enye ìhè n’ụwa, eme nnọọ ọnụ! (1 Tesa. 2:20) Ka unu ji obi unu dum, mkpụrụ obi unu dum, uche unu dum, na ike unu dum ejere Jehova ozi, unu ga-enweta ụgwọ ọrụ ya “okpukpu otu narị ugbu a n’ime oge a . . . nakwa ndụ ebighị ebi n’usoro ihe na-abịanụ.”—Mak 10:29, 30; 12:30.