‘Inwu Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè’
1 N’ime ajọ ọnọdụ ime mmụọ na nke omume e nwere n’usoro ihe a, ihe dị ka nde mmadụ isii bụ́ ndị na-efe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova ofufe, “na-enwu dị ka ndị na-enye ìhè” n’ala 234 gburugburu ụwa. (Fil. 2:15) Nke a na-eme ka anyị bụrụ ndị dị nnọọ iche. Olee otú anyị si egosipụta ìhè dị oké ọnụ ahịa nke eziokwu ahụ bụ́ nke na-abịa site n’aka Jehova?—2 Kọr. 3:18.
2 Omume Anyị: Ndị mmadụ na-achọpụta omume anyị ọsọ ọsọ. (1 Pita 2:12) Otu nwanyị chọpụtara na otu Onyeàmà ya na ya na-arụkọ ọrụ nwere obiọma, na-enyekwara ndị ọzọ aka, ọ dịghịkwa ekwu okwu rere ure ma ọ bụ na-achị ọchị mgbe a mara njakịrị ndị rụrụ arụ. Mgbe ndị ọzọ gbalịrị ịkpasu Onyeàmà ahụ iwe site n’ikwu okwu rere ure n’ebe ọ nọ, ọ naghị ewe iwe ma ọ dịghị esonyere ha. Olee mmetụta nke a nwere n’ahụ́ nwanyị ahụ? Ọ na-echeta, sị: “Àgwà ya masịrị m nke ukwuu nke na m malitere ịjụ ajụjụ banyere Bible. Amalitere m ịmụ Okwu Chineke, ka oge na-agakwa e mere m baptizim.” O kwukwara, sị: “Ọ bụ àgwà ya mere ka m kweta inyocha ihe Ndịàmà Jehova kwere na ha.”
3 Omume anyị n’ebe ndị ọchịchị nọ, otú anyị si ele omume ndị ụwa anya, na okwu dị ọcha anyị na-ekwu, na-eme ka Ndịàmà Jehova dị iche dị ka ndị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ dị elu nke Bible. Ọrụ ọma ndị dị otú ahụ pụrụ iwetara Jehova otuto ma dọta ndị ọzọ ife ya ofufe.
4 Ihe Anyị Na-ekwu: N’ezie, ndị na-ahụ àgwà ọma anyị nwere ike ha agaghị ama ihe mere anyị ji dị iche ọ gwụla ma anyị kọọrọ ha ihe ndị anyị kwere na ha. Ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị, hà maara na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova? Ị̀ na-achọ ohere iji gbanwee nkwurịta okwu nkịtị ka ọ ghọọ ịgba àmà? Ì kpebiwo “ikwe ka ìhè gị na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ” n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị?—Mat. 5:14-16.
5 Ịrụzu ọrụ anyị dị ka ndị na-enye ìhè na-achọ mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Àgwà nke iji mkpụrụ obi dum na-eje ozi ga-akwali anyị ịhapụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa iji kere òkè dị ukwuu dị ka anyị nwere ike n’ọrụ ahụ na-azọpụta ndụ nke ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ.—2 Kọr. 12:15.
6 Site n’okwu anyị na omume anyị, ka anyị nọgide na-enwu dị ka ndị na-enye ìhè. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, a pụrụ ịkpali ndị ọzọ isonyere anyị n’inye Jehova otuto.