Ndị A Haziri “n’Ụzọ Dị Mma n’Anya, na n’Usoro”
1 Ka mgbakọ distrikti wee gaa nke ọma, a ghaghị imekọ mgbalị ọnụ. Ngalaba na-elekọta mgbakọ na-eme ndokwa maka ebe kwesịrị ekwesị a ga-ezukọta nakwa maka ụlọ obibi. Ndị mmadụ n’otu n’otu na ìgwè ezinụlọ dị iche iche na-emere onwe ha ndokwa maka ime njem. Ọgbakọ dị iche iche na-ahazi ndị ọrụ afọ ofufo ha iji mee ka e nwee ndị ga-arụ ọrụ n’ọtụtụ ngalaba ndị dị mkpa iji nwee mgbakọ ahụ. Nzube e ji eme ha bụ “ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.”—1 Kọr. 14:40.
2 Ka ị na-eme ka mgbalị gị daba na nke ndị na-elekọta mgbakọ, buru n’uche na a chọrọ nkwadebe nke ga-ewe ọtụtụ ọnwa—mgbe ụfọdụ ọtụtụ afọ. Ọtụtụ narị ụmụnna na-etinye oge dị ukwuu n’ịkwadebe ihe dị iche iche. Nke a na-agụnye iwekọta ngwá ọrụ na inweta ndị ọrụ afọ ofufo. Nkwadebe a a na-eme tupu oge eruo na-eme ka mmadụ nile nweta ngọzi ime mmụọ. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nye aka?
3 Kwadoo Ndokwa Maka Ụlọ Obibi: Ọ dị oké mkpa ka anyị nile kwadoo ndokwa ndị e mere maka mgbakọ. Nke a dị mkpa karịsịa mgbe anyị na-eme ndokwa nke anyị maka ụlọ obibi. A chọrọ n’ezie ọtụtụ narị ọnụ ụlọ maka mgbakọ nke ọ bụla. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụnna anyị abaghị ọgaranya, ha aghaghịkwa ịdabere n’ọnụ ego dị ala maka ọnụ ụlọ. E mewo mgbalị dị ukwuu iji nweta ọnụ ego kasị dị ala ruo n’ókè o kwere mee maka ọnụ ụlọ dị iche iche. Anyị aghaghị iji ịhụnanya chebara mkpa nke ndị ọzọ echiche ma ‘ghara ile ihe nke aka anyị anya, kama ka anyị leekwa ihe nke mmadụ ibe anyị anya.’—Fil. 2:4.
4 Anyị ịgbasosi ụkpụrụ nduzi mgbakọ banyere inweta ụlọ obibi ike na-abara ndị nile o metụtara uru. Ileghara ụkpụrụ nduzi ndị a anya na-akpata nsogbu ndị na-enweghị isi. N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe anyị gbasoro aro ndị a, ndị nwe ụlọ na-amata tupu oge eruo ụlọ ole ha meworo ndokwa inyepụ. Nke a na-enyere ha aka n’ime atụmatụ ha, ọ pụkwara ime ka a nọgide na-ewetulata ọnụ ego ha n’afọ ndị na-abịa. Ọ bụrụ na ọtụtụ n’ime anyị akagbuo akwụkwọ anyị tinyere maka inweta ụlọ obibi ma ọ bụ mee ndokwa dị iche, nke a na-akpaghasịrị ndị nwe ụlọ nakwa ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ihe bụ́ ndị pụrụ ịchọworị inweta ebe obibi n’otu ụlọ ahụ. Ndị nwe ụlọ pụrụ iwepụta ọnụ ụlọ na-erughị ole ha na-ewepụtabu maka mgbakọ ndị anyị ga-enwe n’ọdịnihu, na-eche na anyị agaghị emezu nkwa anyị. Lee ka ọ ga-esi ka mma mgbe anyị na-emezu ihe anyị kwuru, na-ekwe ka ‘Ee anyị bụrụ Ee’!—Mat. 5:37.
5 Tụlee Ihe Ọma Ndị A Ọ Rụpụtara: Mgbe e mesịrị otu mgbakọ, manịja nke otu ogige kwuru, sị: “Achọpụtawo m na Ndịàmà Jehova na-akwụwa nnọọ aka ọtọ n’ihe nile ha na-eme. N’izu gara aga, mmadụ 40 n’ime ha nọrọ n’ogige m, ha akpataghịkwa nsogbu ọ bụla. Kama nke ahụ, ọ gwụla ha bụ ndị ga-abịa gwa gị ma ọ bụrụ na ha enwee onye ọzọ ha na-ekwubughị so ha nọrọ [n’ebe obibi] ha. Nye m, ha bụ ndị ahịa kasị mma mmadụ pụrụ inwe.” Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya ma ọ bụrụ na ndị nile na-agbazinye anyị ụlọ pụrụ inwe ahụmahụ ọma dị otú a! Lee àmà nke ahụ ga-agba!
6 Manịja ógbè nke otu họtel kwuru n’otu oge, sị: “Agaghị m echetali mgbe m nwetụworo ìgwè mmadụ buru ibu otú a, ndị gosipụtara n’ụzọ dị ukwuu ihe ha kwere n’omume ha, dị ka Ndịàmà Jehova. Anyị na-enwe olileanya na unu ga-abịa ọzọ.” Okwu a na-egosi na ezi àgwà na-enye ume ọhụrụ ọ bụghị nanị nye anyị, kama nyekwa ọtụtụ ndị nọ n’ụwa na-ahụ anyị.
7 Ụzọ Ndị Bụ́ Isi Anyị Pụrụ Isi Kwadoo Ha: E nwere ihe ndị dị mfe anyị pụrụ ime iji kwadoo ndokwa mgbakọ maka itinye akwụkwọ inweta ụlọ. (1) Emela ndokwa ndị dị iche ma ọ bụrụ na i tinyewo fọm Room Request. (2) Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịdị na-elekọta ụmụ ha ka ha ghara ịkpa aghara. (3) Ọ gwụla ma e nyere ikike kpọmkwem ka a na-esi nri n’ọnụ ụlọ ahụ, a gaghị eme ya eme. (4) Cheta na ndị nwe ụlọ na ndị nwe họtel na-atụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ka anyị rube isi n’iwu ha.
8 Dị ka ndị ohu Jehova Chineke, anyị nwere ohere nke igosipụta àgwà ya n’ihe nile anyị na-eme. Nke a na-agụnye ime ndokwa maka nakwa ịga mgbakọ bụ́ ebe ihe a na-eme na-emetụta aha Chineke. Cheta, ọ ‘bụghị Chineke nke aghara, kama Ọ bụ Chineke nke udo.’ (1 Kọr. 14:33) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ime ka ndị nile na-ele anyị chọpụta àgwà Jehova a site n’ihe ha na-ahụ n’ahụ anyị—àgwà na omume anyị ka anyị na-eme atụmatụ maka nakwa na-aga Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke.” Ka ndị na-ahụ anyị, bụ́ ndị nwere obi eziokwu bịa ghọta na a haziri mkpọkọta Jehova ahazi “n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.”—Ọma 68:26.