Mgbakọ Distrikti nke Ndịàmà Jehova nke Afọ 2008
1. (a) Olee ihe mere ndụmọdụ Pọl nyere Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ji metụta anyị n’ụzọ pụrụ iche taa? (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) (b) Olee ohere anyị ga-enwe itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ?
1 Pọl onyeozi gbara ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ume ka ha na-ezukọta ọnụ iji gbaa onwe ha ume, “na-emekwa otú ahụ karị” ka ha na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso. (Hib. 10:24, 25) Ihe ndị na-egosi na “ụbọchị ahụ” Pọl kwuru maka ya eruola nso na-amụba amụba! N’ihi ya, ọ na-agụ anyị agụụ inwe ohere anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ga-eji gekọọ okwu Chineke ọnụ bụ́ nke nwere ike ichebe anyị “n’oge ikpeazụ” a na-ajọwanye njọ. (2 Tim. 3:1) Anyị ga-enwe ohere dị otú ahụ ná mgbakọ distrikti nke afọ 2008 na-abịanụ.
2. (a) Olee ihe mere o ji dị mkpa ịgazu ụbọchị atọ nke mgbakọ ahụ? (b) Olee ihe ndị mbụ anyị kwesịrị ime iji kwadebe ịga mgbakọ ahụ?
2 Gazuo Ụbọchị Atọ Ahụ: Anyị na-agba gị ume ka ị gazuo ụbọchị atọ nke mgbakọ ahụ. Ọ bụrụ na anyị aghara “ịhapụ nzukọ anyị,” nri ime mmụọ dị anyị oké mkpa agaghị akwa anyị. (Hib. 10:25) Malite ime ndokwa maka ya ozugbo o kwere gị mee. I kwesịrị ịgwa onye ị na-arụrụ ọrụ n’oge ka o wee nwee ike ime ndokwa ọ bụla dị mkpa. Ọ bụrụ na ụmụ gị ga-anọ n’ụlọ akwụkwọ n’oge mgbakọ ahụ, gwa ndị nkụzi ha ndokwa ị na-eme. Mee ka ha mara na mgbakọ ahụ so n’ihe ndị metụtara ofufe unu unu na-eme mgbe niile. Ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi mgbalị ndị ị na-eme ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ.—Mat. 6:33.
3. Olee otú anyị nwere ike isi chebara ndị ọzọ echiche?
3 Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịga: Pọl rịọkwara ụmụnna ya ka ha ‘na-echebara ibe ha echiche.’ (Hib. 10:24) È nwere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị nọ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị ọ dị mkpa ka e nyere aka ịga mgbakọ ahụ? Ì nwere ike inyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl aka iso gị gaa, ma ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị otu ụbọchị ka ha ga-abịali? Mgbe ị na-agwa ndị ikwu gị na-ekweghị ekwe atụmatụ ndị ị na-eme banyere mgbakọ ahụ, gwa ha ka ha soro gị gaa. Chineke nwere ike ịgọzi mgbalị ahụ i ji ịhụnanya na-eme n’ụzọ ị na-atụghị anya ya.
4. Olee otú anyị nwere ike isi mata mgbe a ga-enwe mgbakọ distrikti na ebe ndị a ga-enwe ya?
4 Ịjụ Ajụjụ: Ọtụtụ nde mmadụ na-akpọ alaka ụlọ ọrụ anyị na telefon kwa afọ na-ajụ ha ebe a ga-enwe mgbakọ distrikti na mgbe a ga-enwe ya. Ọ na-afọ obere ka ọ bụrụ na ndị a niile na-akpọ fon bụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị nwetara Ozi Alaeze Anyị zara ajụjụ ndị ahụ. Tupu ị kpọọ alaka ụlọ ọrụ, anyị na-atụ aro ka i lee peeji nke 5 na nke 6 nke Ozi Alaeze Anyị a.
5. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata otú anyị ga-esi nweta ụlọ ná mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ anyị?
5 Ọ bụrụ na ị ga-aga mgbakọ ọzọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ gị, i nwere ike ịmata otú ị ga-esi nweta ụlọ site n’iji adres dị n’azụ fọm Room Request kasị ọhụrụ e nwere degara isi ụlọ ọrụ nke ebe a ga-enwe mgbakọ ahụ akwụkwọ. E zigarala ndị odeakwụkwọ ọgbakọ fọm ndị a. Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta azịza nke akwụkwọ ozi gị, hụ na i tinyere envelopu e suru stampụ n’ime akwụkwọ ozi ahụ.
6. Olee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị icheta banyere Room Request Form?
6 Mkpa Pụrụ Iche: Ọ bụrụ na onye nkwusa rịọrọ ka e nyere ya aka ịchọta ụlọ, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị ikpebi ma onye nkwusa ahụ ò ruru eru idejupụta akụkụ e dere Special Needs nke dị na Room Request Form. E kwesịrị ịtụle ntụziaka ndị dị na fọm ahụ tupu odeakwụkwọ ọgbakọ ana-ezigara ya Ngalaba Na-enye Ụlọ ná mgbakọ.
7. Olee otú anyị nwere ike isi kwado ndokwa ndị e mere maka ụlọ obibi? (Lee igbe bụ́ “Otú E Si Enweta Ụlọ.”)
7 Ụlọ Obibi: Iji mee ka ị tụsara ahụ́, a ga-eme ndokwa maka ụlọ obibi n’obodo ọ bụla a ga-enwe mgbakọ. N’ọtụtụ ala mgbakọ, a na-enye ndị mmadụ ụlọ n’ala mgbakọ, n’ụlọ obibi ndị na-adịru nwa oge, ma ọ bụ n’ezigbo ụlọ a rụrụ maka obibi. Biko, burunụ n’uche na nzukọ a agaghị enwe ike ịrụ ụlọ obibi ga-ezuru ndị niile bịara mgbakọ. Ọ bụ naanị ndị Ngalaba Na-enye Ụlọ nyere ụlọ n’ala mgbakọ kwesịrị ibi na ya. Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ n’ebe ọzọ, i kwesịrị ikwenyere Ngalaba Na-enye Ụlọ ma biri n’ụlọ e nyere gị. Chetakwa na ọ pụrụ ifutụ gị ego iji na-abịa n’ala mgbakọ ma na-ala kwa ụbọchị. Ọ dịkwa mkpa na ị ga-enye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ n’ala mgbakọ ahụ, ọ ga-adị mkpa ka i nye onyinye maka ụlọ ahụ e nyere gị. N’ihi ya, ọ dị mkpa ịgụnye ihe ndị a mgbe ị na-akpakọ ego ị ga-eji aga mgbakọ. (1 Kọr. 16:1-4; 2 Kọr. 9:7) Tupu i dejupụta Room Request Form, tụleghachi isi ihe ndị dị n’igbe bụ́ “Otú E Si Enweta Ụlọ.”
8. (a) Olee otú anyị nwere ike isi too Jehova mgbe anyị gara mgbakọ distrikti? (b) Olee ihe ndị na-arụ na họtel kwuru n’ihi ezi àgwà ụmụnna anyị?
8 Ọrụ Ọma: Irube isi n’iwu Jehova nyere anyị ịgbakọta ọnụ iji fee ya na-enyere anyị aka ‘ịbara onwe anyị uru.’ Nke ka mkpa bụ na ọ na-enye anyị ohere ito aha Jehova. (Aịza. 48:17) “Ọrụ ọma [anyị] na-apụta ìhè” nye ọtụtụ ndị ná mgbakọ distrikti, nke a akpaliekwala ụfọdụ ikwupụta otú obi dị ha. (1 Tim. 5:25) N’otu obodo anyị nọrọla nwee mgbakọ ruo ọtụtụ afọ, onyeisi otu họtel kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị n’obodo a na-ekwu banyere Ndịàmà Jehova na otú mgbakọ unu si abara anyị uru. Anyị maara otú unu na-esi azachasị ámá egwuregwu anyị, anyị na-ahụkwa ka unu na-azacha ebe anyị rụrụ maka ịdọwa ụgbọala. Otú ahụ unu na-esi anọnyere anyị n’oge okpomọkụ na-atọ anyị ụtọ. Anyị nwere olileanya na anyị na unu ga-anọgide na-emekọ ihe n’afọ ndị na-abịa abịa.” Mgbe onyeisi otu họtel kwusịrị banyere nsogbu ha na ndị na-abịa eme egwuregwu na họtel ha na-enwe, o kwuru otú ụmụnna anyị si ekwenyere ha ma na-egosi ndidi mgbe ha nọrọ na họtel ha. O kwuru, sị, “Ọ dị anyị ka ya bụrụ na ndị ọbịa niile anyị na-enwe bụ Ndịàmà Jehova!” Ọ ga-abụrịrị na àgwà ọma ụmụnna anyị kpara mere e ji kwuo ihe ndị a, na okwu ọma ndị ọzọ, na-eme Chineke anyị, bụ́ Jehova, obi ụtọ! Ebe ọ bụla e nyere gị ụlọ, ma ọ bụ na họtel, n’ụlọ mmadụ, ma ọ bụ n’ebe obibi dị n’ala mgbakọ ahụ, biko kpaa ezi àgwà ma hụ na i debere gburugburu ebe i bi ọcha.
9. Olee otú Matiu 4:4 si gosi mkpa ọ dị ige ntị n’ihe omume niile a ga-eme ná mgbakọ distrikti?
9 Jizọs kwuru na ndụ anyị dabeere nnọọ n’ige ntị ‘n’okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.’ (Mat. 4:4) Ná mgbakọ anyị na-enwe kwa afọ, Jehova na-enye anyị ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị,’ bụ́ nke “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” kwadebere. (Mat. 24:45) Ọrụ a na-arụ iji kwadoro anyị oriri ime mmụọ a abụghị obere ihe. Ka anyị gosi Jehova na anyị ji nlekọta o ji ịhụnanya elekọta anyị kpọrọ ihe site n’ịbịa n’ụbọchị nke ọ bụla na ige ntị n’ihe omume niile a ga-eme.
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday na Saturday
9:20 ụtụtụ - 4:55 uhuruchi
Sunday
9:20 ụtụtụ - 4:00 uhuruchi
Igbe dị na peeji nke 4]
Otú E Si Enweta Ụlọ:
1. Nata odeakwụkwọ ọgbakọ unu Room Request Form.
2. Dejupụta Room Request Form ahụ n’ezi oge. Biko hụ na i dere ihe zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwaanyị, nakwa ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ụlọ obibi ọ̀ bụ ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Ihe e dere na Room Request Form kwesịrị ịdị mfe ọgụgụ.
3. Odeakwụkwọ kwesịrị inyocha Room Request Form ahụ iji mara ma è dejupụtara ya nke ọma ma zigazie ya n’obodo ahụ a ga-enwe mgbakọ Ọ BỤGHỊ IZITERE YA ALAKA ỤLỌ ỌRỤ. Nke a bụ n’ihi na e nwere ike fọm ahụ agaghị eru n’oge ma e si n’alaka ụlọ ọrụ ziga ya.
4. E kwesịrị izigara Ngalaba Na-enye Ụlọ Room Request Form n’ezi oge. Nke a ga-eme ka Ngalaba Na-enye Ụlọ nwee oge zuru ezu iji chọtara unu ụlọ obibi ndị dị mma.
5. Ngalaba Na-enye Ụlọ ga-agwa gị ebe e nyere gị ụlọ n’ezi oge tupu mgbakọ ahụ, e nwekwara ike ịchọ ka i buru ụzọ kwụọ ụgwọ iji hụ na e debeere gị ụlọ ahụ.
Biko
◼ Were ụlọ Ngalaba Na-enye Ụlọ nyere gị. Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ebe Ngalaba Na-enye Ụlọ nyere gị. Ekwela ka ọnụ ọgụgụ ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru.
◼ Agala n’ebe ndị nwe ụlọ e nyere gị na-achọghị ka ndị mmadụ na-aga. Sie nri naanị ma ọ bụrụ na e nyere gị ikike ime otú ahụ, siekwa ya naanị n’ebe a gwara gị ka ị nọrọ sie ya.
◼ Agwala onye nwe ụlọ na ị ga-etinyere ya ego n’ihe ya na Ngalaba Na-enye Ụlọ kwekọrịtara ka o wee nye gị ụlọ ahụ.
◼ Mgbe ị na-achọ ụlọ nke gị, jụọ Ngalaba Na-enye Ụlọ iji zere ịga n’ụlọ ha naarala.