Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” nke Ndịàmà Jehova nke 2007
1, 2. (a) Olee otú Mozis si gbaa ụmụ Izrel ume irite uru site n’izukọta ọnụ n’ìgwè? (b) Olee nkwadebe ọ dị mkpa ka anyị malite ugbu a mewe?
1 Mozis gwara ndị Izrel nile na ndị ọbịa ha nile ka ha na-ezukọ otu ugboro n’afọ asaa ọ bụla ka e wee gụọrọ ha Iwu Chineke. Ọ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ “ka ha wee nụ, ka ha wee mụtakwa” ihe. (Deut. 31:10-12) Jehova hụrụ na ọ dị mkpa ịkpọkọta ndị ya n’ìgwè. N’oge na-adịghị anya, ndị Jehova ga-ezukọtakwa ọzọ maka Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” nke ga-ewe ụbọchị atọ.
2 Ị̀ malitela ịkwadebe maka ya? Ọ̀ ga-adị gị mkpa ịrịọ onye were gị n’ọrụ ka o nye gị oge iji gaa? Ị̀ malitela ichekwa ego maka ya ka gị na ndị nile nọ n’ezinụlọ gị wee nwee ike ịgazu ụbọchị atọ ahụ? Ì nwere ike inyere onye ị na-amụrụ Bible ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà aka ka ha soro gị gaa mgbakọ ahụ? È nwere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu ga-achọ enyemaka iji gaa? Ị̀ na-eme atụmatụ ịga mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ unu ịga? Ị̀ ga-achọ ibi ebi? Ihe ndị na-esonụ ga-enyere gị aka ịkwadebe.
3. (a) Olee amụma e buru n’Aịsaịa 25:6 nke na-emezu taa? (b) Olee ihe a chọpụtara banyere otú ndị mmadụ si abịa mgbakọ n’ụbọchị Friday, gịnịkwa ka anyị nile n’otu n’otu kwesịrị ime?
3 Gazuo Ụbọchị Atọ Ahụ: Jehova na-enye ndị ya nri ime mmụọ n’ụba. (Aịsa. 25:6) Nke a na-agụnye nri ime mmụọ anyị na-eri ná mgbakọ anyị na-enwe kwa afọ. A chọpụtala na ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa n’ụbọchị Friday na-adị nnọọ ala karịa ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa n’ụbọchị ndị ọzọ. Gbalịa ịhụ na ị gazuru ụbọchị atọ nke mgbakọ ahụ nzukọ Jehova kwadebeere anyị, bụ́ ebe anyị ga-anọ nweta ume ọhụrụ! Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ịrịọ onye were gị n’ọrụ ka o nye gị oge iji gaa, tinye ya n’ekpere. I mesịa nke ahụ, jiri obi ike gaa gwa ya banyere ya ozugbo a mara ọkwa ụbọchị unu ga-aga mgbakọ nke unu. (1 Tesa. 2:2; Neh. 2:4, 5) Ọ bụrụ na ị kọwaara ya na mgbakọ ị na-aga kwa afọ bụ otu ụzọ i si efe Chineke, nke ahụ pụrụ inye aka. Ọ bụrụ na i mee nke a n’ezi oge, ọ pụrụ ịdịrị onye ahụ were gị n’ọrụ mfe ịhazigharị ihe ụfọdụ iji nwee ike ikwe ka ị gaa.
4. Olee otú anyị pụrụ isi kwadebe ndị anyị na-amụrụ Bible na ndị òtù ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà maka mgbakọ ahụ?
4 Ịkwadebe Ndị Ị Na-amụrụ Bible na Ndị Ezinụlọ Gị: Ọ ga-abụ nnọọ ihe na-enye ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ị na-amụrụ Bible esoro gị gaa mgbakọ ahụ, ma jiri anya ha hụ ebe ụmụnna anyị ji obi ụtọ na-emekọ ihe ọnụ dị ka Ndị Kraịst ‘n’ime mkpọkọta bara ụba’! (Ọma 22:25) Gwa ha n’oge ka ha wee nwee ike ịhazi oge ha iji gaa. Kọọrọ ha ihe mere mgbakọ ukwu anyị ji atọ gị ụtọ. I nwere ike ime ka ha mara ihe ndị ha ga-atụ anya ha site n’ime ndokwa ka ha kirie vidio ndị e gosiri mgbakọ ukwu ndị e mere n’oge ndị gara aga, karịsịa vidio bụ́ United by Divine Teaching. Meekwa ka ndị òtù ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà mara banyere atụmatụ gị. Ikekwe, ha nwere ike ịhazi oge ha iji bịa kirie ihe nkiri a ga-eme ná mgbakọ ahụ ma ọ bụkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, soro gị gaa otu n’ime ụbọchị ndị ahụ a ga-enwe mgbakọ ahụ.
5, 6. (a) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere mmụọ mmesapụ aka ahụ e kwuru okwu ya na 1 Timoti 6:18? (b) Olee ndokwa e mere iji nyere ụfọdụ ndị enyemaka dị mkpa aka inweta ụlọ?
5 Inyere Ụmụnna Anyị Aka: Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst bara ọgaranya ume “ka ha na-arụ ọrụ ọma, ka ha baa ọgaranya n’ezi ọrụ, ka ha na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe.” (1 Tim. 6:17, 18) Otú anyị nwere ike isi gosi na anyị nwere ụdị mmụọ mmesapụ aka ahụ Pọl kwuru okwu ya bụ site n’ilebara ndị nọ n’ọnọdụ ụfọdụ anya, dị ka ihe atụ, ndị merela agadi na ndị na-adịkwaghị ike, ndị nọ n’ozi oge nile, ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna, na ikekwe ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị ọ dị mkpa ka e nyere aka ka ha wee gaa mgbakọ ahụ. Ọ bụ ndị ezinụlọ ha nọ n’ọgbakọ ka ọ kasị dịrị n’ubu igbo mkpa ha. Ma, ndị okenye na ndị ọzọ nwere ike igosi na ha ghọtara ọnọdụ ha ma nyere ha aka dị ka o si dị mkpa.—Gal. 6:10; 1 Tim. 5:4.
6 Ọ bụrụ na onye nkwusa nọ n’ọgbakọ unu chọrọ enyemaka iji nweta ụlọ, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị ikpebi ma ò ruru eru idejupụta akụkụ e mere maka ndị nwere mkpa pụrụ iche na fọm Room Request.
7. Olee ihe ndị anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịga mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ anyị?
7 Ịga Mgbakọ Na-abụghị nke E Kenyere Ọgbakọ Unu Ịga: N’ihi ọnọdụ gị, ọ pụrụ ịdị mkpa na ị ga-aga mgbakọ na-abụghị nke e kenyere ọgbakọ unu ịga. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka a chọtara gị ụlọ obibi, biko gakwuru odeakwụkwọ ọgbakọ unu ka o nye gị fọm Room Request. Ziga fọm Room Request gị n’ala mgbakọ ahụ ị chọrọ ịga. Ọ bụrụ na a ga-enwe mgbakọ abụọ ma ọ bụ karịa n’obodo ahụ, jide n’aka na i dere ụbọchị a ga-enwe mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
8. Olee ihe ndị dị mkpa anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-arịọ maka ụlọ obibi, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (Gụnye ihe e dere n’igbe dị na peeji nke 4)
8 Ụlọ Obibi: Iji mee ka ị tụsara ahụ́, a ga-eme ndokwa maka ụlọ obibi n’obodo nke ọ bụla a ga-enwe mgbakọ na ya. N’ụfọdụ ala mgbakọ, a na-enye ndị mmadụ ụlọ n’ala mgbakọ, ma ọ́ bụghị n’ụlọ a rụrụ iji mee ihe ruo nwa oge, ya abụrụ n’ezigbo ụlọ a rụrụ maka obibi. Biko burunụ n’uche na nzukọ a agaghị enwe ike ịrụ ụlọ obibi ga-ezuru ndị nile bịara mgbakọ. Ọ bụ nanị ndị Ngalaba Ụlọ Obibi nyere ụlọ n’ala mgbakọ kwesịrị ibi na ya. Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ n’ebe ọzọ, i kwesịrị ikwenyere Ngalaba Ụlọ Obibi ma biri n’ụlọ e nyere gị. Chetakwa na ọ pụrụ ifutụ gị ego iji na-abịa n’ala mgbakọ ma na-ala kwa ụbọchị. Ọ dịkwa mkpa na ị ga-enye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. N’ihi ya, ọ dị mkpa iburu ihe ndị a n’uche mgbe ị na-akpakọ ego ị ga-eji aga mgbakọ distrikti a. (1 Kọr. 16:1-4; 2 Kọr. 9:7) Tupu i dejupụta fọm Room Request, tụleghachi isi ihe ndị dị n’igbe bụ́ “Otú E Si Enweta Ụlọ Obibi.”
9, 10. (a) Olee ihe ndị a na-emere anyị tupu anyị abịarute n’ala mgbakọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na obi dị anyị mma, nakwa na anyị nwere ekele maka ọrụ nile a rụụrụ anyị? (Gụọ Ndị Hibru 13:17.)
9 Kwadoo Ndokwa Ndị E Mere: Mgbe anyị rutere n’ala mgbakọ ahụ, anyị ga-ahụ na a rụọla nnukwu ọrụ iji kwadebe maka ọbịbịa anyị. Ụmụnna ndị ji ịhụnanya na-arụ ọrụ atendantị na-abịa kelee anyị, nye anyị akwụkwọ usoro ihe omume, ma nyere anyị aka inweta oche. Ụmụnna edebela ebe ahụ ọcha ma mee ka ọ dị mma n’anya. A rụọkwala ọrụ ndị dị oké mkpa iji kwadebe okwu ndị a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ, iji chọtara anyị ụlọ, na iji hụ maka ọtụtụ mkpa ndị ọzọ.
10 Ná mgbakọ ọ bụla a ga-enwe, ọtụtụ ụmụnna na-arụ ọrụ ruo ọtụtụ ọnwa iji hazie ihe ndị dị mkpa, ndị ezinụlọ ha na-enyekwa aka site n’ikwe ka ha bịa hụ maka ihe ndị a dị mkpa. Ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele maka ihe ndị a ha chụrụ n’àjà maka anyị? Anyị pụrụ igosi na anyị nwere ekele site n’ịgbaso ntụziaka dị n’isiokwu a nakwa ntụziaka ndị ọzọ anyị nwere ike inweta tupu mgbakọ anyị eruo. (Hib. 13:17) Ọ bụrụ na mmadụ nile agbasoo ntụziaka ndị a, ọ ga-eme ka ihe nile “were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.”—1 Kọr. 14:40.
11. (a) Gịnị mere o ji dị nnọọ mkpa ka ndị Jehova na-agbakọta ọnụ n’oge anyị a? (b) Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ime ugbu a?
11 Ka anyị “na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso,” ọ dị mkpa ka ndị Chineke na-agbakọta ọnụ ọbụna karị. (Hib. 10:25) Ná mgbakọ ukwu ndị anyị na-enwe, ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke nwekwara uche na-agwa anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ‘ilezi anya ime okwu nile’ Jehova chọrọ ka anyị mee. (Deut. 31:12) Malite ugbu a mewe ndokwa iji gazuo ụbọchị atọ ahụ Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” ga-ewe, ma si otú a rite uru site ná ntụziaka ime mmụọ nile a ga-enye, nakwa ná mkpakọrịta na-enye obi ụtọ a ga-enwe n’ebe ahụ!
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday 9:00 nke ụtụtụ - 4:35 nke uhuruchi
Saturday 9:00 nke ụtụtụ - 4:35 nke uhuruchi
Sunday 9:00 nke ụtụtụ - 3:40 nke uhuruchi
Igbe dị na peeji nke 4]
Otú E Si Enweta Ụlọ Obibi
1. Nata odeakwụkwọ ọgbakọ unu fọm Room Request.
2. Dejupụta fọm Room Request ahụ n’ezi oge. Biko hụ na i dere aha gị, afọ ndụ gị, ma ị̀ bụ nwoke ka ị̀ bụ nwanyị, nakwa ma ị̀ bụ ọsụ ụzọ ka ị̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. I kwesịrị iji aka akwụkwọ dị mma dejupụta fọm Room Request gị otú a ga-agụta ihe i dere.
3. Odeakwụkwọ kwesịrị inyocha fọm Room Request ahụ iji mara ma ì dejupụtara ya nke ọma. Ọ bụrụ na i dejupụtara ya nke ọma, o kwesịrị ịbịanye aka na ya ma ziga ya n’obodo a ga-enwe mgbakọ ahụ, Ọ BỤGHỊ N’ALAKA ỤLỌ ỌRỤ. Nke a bụ n’ihi na e nwere ike fọm ahụ agaghị eru n’oge ma e si n’alaka ụlọ ọrụ ziga ya.
4. I kwesịrị izigara Ngalaba Ụlọ Obibi fọm Room Request n’ezi oge. Nke a ga-eme ka ha nwee nnọọ oge ha ga-eji chọtara gị ezigbo ụlọ.
5. Ngalaba Ụlọ Obibi ga-eme ka ị mara banyere ụlọ a chọtaara gị tupu ụbọchị mgbakọ ahụ eruo, ha pụkwara ịgwa gị ka i weta ego maka ya ka ha wee kwụọrọ gị ụgwọ ya tupu ụbọchị mgbakọ unu eruo.
Biko
◼ Were ụlọ Ngalaba Ụlọ Obibi nyere gị. Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ebe Ngalaba Ụlọ Obibi nyere gị. Ekwela ka ọnụ ọgụgụ ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru.
◼ Agala n’ebe ndị nwe ụlọ e nyere gị na-achọghị ka ndị mmadụ na-aga. Sie nri nanị ma ọ bụrụ na e nyere gị ikike ime otú ahụ, siekwa ya nanị n’ebe a kwadoro ka ị nọrọ sie ya.
◼ Agwala onye nwe ụlọ ka ị kwụọ ya ego karịrị nke ya na Ngalaba Ụlọ Obibi kwekọrịtara ka i wee nweta ụlọ ahụ.
◼ Mgbe i ji aka gị na-achọ ụlọ obibi, biko chọpụta ma Ngalaba Ụlọ Obibi ò kwuola okwu ụlọ ahụ iji zere inweta ụlọ ha kwurula okwu ya