Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 1999
1 Mgbe ụmụ Israel nọ n’ọzara, Jehova nyere Mosis ntụziaka ka o mee opi ọlaọcha abụọ. Ọ bụrụ na e gbuo nanị otu opi, ndị isi nke ebo dị iche iche ga-ezukọta n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ụda nke opi abụọ ahụ ga-abụ ihe àmà ka mkpọkọta nile nke Israel zukọta ọnụ. (Ọnụ Ọgụ. 10:1-4) Taa, ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe oké obi ụtọ mgbe anyị nụrụ ịma ọkwa ndị, dị ka ụda opi, na-eme ka anyị zukọta ọnụ ná mgbakọ distrikti ndị anyị na-enwe kwa afọ? Ná mgbakọ anyị, anyị na-enweta ntụziaka na nduzi Jehova site n’Okwu ya na site n’aka ndị nnọchiteanya ya ọ họpụtara. Nke a na-enyere anyị aka ịnọgidesi ike n’ijere Chineke ozi. Ọ̀ bụ anyị adịghị aṅụrị ọṅụ mgbe anyị hụrụ ọtụtụ puku—ikekwe ọtụtụ iri puku—ndị kwesịrị ntụkwasị obi anyị na ha na-efekọ ofufe ka ha zukọtara ọnụ n’ịhụnanya na n’udo? N’ezie anyị na-aṅụrị!—Abụ Ọma 122:1, 7, 8.
2 Malite n’October 1998 ruo January 1999, e nwere ngụkọta nke Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” 106 n’obodo 22 n’ime Nigeria. Anyị nile nwetara agbamume ma bụrụ ndị e wuliri elu site ná mkpakọrịta dị mma anyị na ụmụnna anyị nwere na site n’akụkụ dị iche iche nke usoro ihe omume mgbakọ ahụ, karịsịa ahụmahụ ozi ubi na akụkọ banyere ọganihu nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’ala ndị ọzọ. Ka anyị na-ezukọta maka mgbakọ distrikti anyị nke afọ 1999, anyị ga-enwe ohere ndị ọhụrụ iji hụ òtù ụmụnna anyị dị oké ọnụ ahịa na iji kelee Jehova maka ịdị n’otu o nyeworo anyị.
3 Ka a na-aga n’ihu n’ime nkwadebe maka Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999, anyị ga-achọ ịtụle ihe ọmụma ụfọdụ ga-adị unu mkpa iji nweta ebe obibi ná mgbakọ ahụ. Nkwado zuru ezu ị ga-enye ga-egosi ekele i nwere maka ndokwa nile e mere n’ihi gị.
4 Ntụziaka Maka Inweta Ebe Obibi: Anyị ga-agba mbọ inye ọgbakọ ọ bụla ọnụ ọgụgụ fọm Room Request ga-ezuru ha. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request nke ọ bụla e zigara nke ọma. EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “ndị nkwusa 50,” n’ohere ebe e kwesịrị ide aha ndị a. A ghaghị idepụta ihe ọmụma nile nke ọma na n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ. Biko jidenụ n’aka na unu nyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, na ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ onye ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Denye ụmụaka ná ndepụta ahụ. N’oge ndị gara aga, ọgbakọ ụfọdụ edepụtawo nanị aha ndị toworo eto. Nke a na-eme ka o sie ike ime ndokwa maka ebe obibi zuru ezu. Ọ bụrụ na unu chọrọ ohere karịa nke e nyere na fọm ahụ, jiri ibe akwụkwọ ọzọ mee ihe. Ọ bụrụ na e dere ihe karịrị aha otu onye na fọm ahụ, biko gosipụta ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu ọ na-ezipụrụ ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ.
5 Kwa afọ, anyị na-arịọ ụmụnna ka ha nye Ngalaba Ụlọ Obibi nke mgbakọ nkwado. Ma ọ dịghị ihe ọzọ a na-emezu ihe abụọ site n’ịṅa ntị ná ntụziaka a:
6 Anyị na-echekwara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ego: Mgbe anyị kwadoro ndokwa Society, ọnụ ahịa ụlọ na-adịrị ụmụnna anyị ala karị. Kama ego anyị ịga n’aka ndị nwe ụlọ, a pụrụ iji ya mee ihe ndị ka mma n’ịkwado ezinụlọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụgodị na anyị onwe anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ebe obibi ndị dị oké ọnụ karị, anyị kwesịrị ịkwado mgbalị nke Ngalaba Ụlọ Obibi na-eme. A kọwara mmụọ a nke ichebara ndị ọzọ echiche na 1 Jọn 3:17, ọ bụkwa ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:24.
7 Anyị na-egosipụta nrubeisi nye ntụzi Society: Nke a kwesịrị ịbụ otu n’ime isi nchegbu anyị. Ndị Hibru 13:17 na-asị: “[Na-ekwenyerenụ] ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghịrị unu uru.” Ka ụmụnna anyị na-eme ọtụtụ ndokwa maka mgbakọ distrikti anyị, anyị chọrọ ka ha nwee mmetụta na anyị na-akwado ha n’ụzọ zuru ezu. Ebe a na-achọ nkwado anyị n’okwu a nanị maka ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ kwa afọ, nke a bụ ụzọ dị mma isi kwadoo mgbalị ha. Ọ bụrụgodị na ihe ga-amasị anyị dị iche, ezi ihe nlereanya anyị, dị ka ụmụnna anyị na ụwa si na-ahụ ya, na-akwalite mmụọ ịhụnanya, ịdị n’otu, na nke inye nkwado.—Fil. 2:1-4.
8 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa a bụ nanị maka ndị chọrọ enyemaka pụrụ iche site n’aka ndị ọzọ n’ime ndokwa ha banyere mgbakọ, karịsịa ndokwa ebe obibi. Ha pụkwara ịchọ enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ, na-adabere n’ọnọdụ ha ndị pụrụ iche. Ọ bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ na-egosi ezi ihe nlereanya, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, bụ́ ndị nwere mkpa pụrụ iche, ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadokwara, ruru eru inweta enyemaka ná ndokwa nke Mkpa Ndị Pụrụ Iche. Ndokwa ndị ọzọ iji lekọta ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche kwesịrị ka ọgbakọ ebe ha na-eje nzukọ mee ya, kama ịtụkwasị ibu ọrụ a n’isi ndị nhazi mgbakọ. Ndị okenye na ndị ọzọ ndị maara banyere ọnọdụ onye ahụ pụrụ iji ịhụnanya nye aka. Nke a na-achọkarị ka ndị nkwusa tụlee mkpa nke ndị nọ n’ozi oge nile, ndị agadi, ndị ahụ na-esichaghị ike, na ma eleghị anya ndị ọzọ. Ndị nkwusa pụrụ inye aka site n’ịkpọrọ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ site n’ilekọta mkpa ha n’ụzọ ndị ọzọ dị irè.—Jes. 2:15-17; 1 Jọn 3:17, 18.
9 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa ndị pụrụ iche ụlọ obibi ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ isoro odeakwụkwọ ọgbakọ kwurịta ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta okwu iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe ọgbakọ mee inyere ndị a aka ịhụ maka ụlọ obibi nke ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ike inye aka a dị mkpa, odeakwụkwọ pụrụ inye ndị dị otú ahụ otu fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịworo n’ụzọ doro anya, n’elu peji nke mbụ, okwu ndị bụ́ “MKPA NDỊ PỤRỤ ICHE.” Nanị ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm a e dekwasịrị ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya iji hụ na e denyezuru ihe nile a chọrọ, na o ziri ezi, ma nwapụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eruo maka nchebara echiche dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ndị ahụ n’ohere e nyere n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezi oge tupu mgbakọ eruo. Odeakwụkwọ ga-ezipụziri Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-eme ka onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ kpọmkwem mara banyere ụlọ ahụ.
10 Ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma rịọ ka e nye ha ụlọ mgbe ha rutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nnwapụta nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
11 Ọtụtụ ndị egosipụtawo ekele maka ndokwa ndị a na-eme maka ụlọ obibi n’oge mgbakọ. Gị onwe gị kwa ì nwere ekele maka ọtụtụ ndokwa ndị e mere maka gị? Obi dị Society ụtọ inye ebe obibi dị ntụsara ahụ, nke aka pụrụ iru n’oge mgbakọ, na-enye anyị nile ohere itinye uche n’uru ime mmụọ nke mgbakọ ahụ na n’usoro ihe omume ya.
12 Ije Mgbakọ Ọzọ: A na-ekenye ọgbakọ ọ bụla mgbakọ kasị ya nso. Dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e kenyere ịga mgbakọ nke ọ bụla, Society na-eme atụmatụ ọnụ ọgụgụ ndị ga-abịa iji dokwaa maka oche, ụlọ, akwụkwọ na ihe ndị ọzọ ga-ezunụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere ị ga-eji gaa mgbakọ na-abụghị nke e kenyere gị ma chọọ ka e nye gị ụlọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị otu fọm Room Request. Ị pụrụ idejupụta ya ma nye ya odeakwụkwọ ka ọ bịanye aka tupu i ziga ya ná mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
13 Asụsụ Ogbi: A ga-eme ndokwa ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ruru eru sụgharịa usoro ihe omume ahụ nile n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke America ná mgbakọ ndị na-esonụ: Ota 2, November 5-7; Kaduna 3, November 19-21; Uli 7, December 10-12; na Ubogo 9, December 17-19, 1999. A na-agba ndị ntị chiri nọ n’ọgbakọ nile na Nigeria ume ịmalite mewe atụmatụ ịga ma ọ dịkarịa ala otu n’ime mgbakọ ndị a. Ndị okenye kwesịrị iji ịdị uchu jụọ onye ọ bụla ntị chiri nọ n’ọgbakọ ha onye na-aghọta Ụdị Asụsụ Ogbi nke America iji jide n’aka na ha maara banyere ndokwa a na iji chọpụta ma ha ga-achọ enyemaka ọ bụla ka ha wee nwee ike ịga.
14 Ọ bụ nanị mgbakọ ndị a ga-enwe akụkụ dị iche e dowere oche maka ndị ntị chiri bụ́ ndị a ga-atụgharịrị usoro ihe omume ahụ n’asụsụ ogbi. A gaghị eme ndokwa ka a tụgharịa okwu n’asụsụ ogbi ná mgbakọ ọ bụla ọzọ. Ọ bụrụ na onye ntị chiri esoro onye ma asụ asụsụ ogbi bịa mgbakọ ọ bụla ọzọ, a ga-ekwe ka a na-atụgharịrị nanị onye ahụ, mmadụ abụọ ahụ anọdewe onwe ha, ọ bụghị iguzo n’ihu otu onye ma ọ bụ karị.
15 Dokọọ Ego Maka Mgbakọ Ahụ: Tinyere ndokwa ndị ọzọ, UGBU A bụ oge iji malite idokọ ego maka mgbakọ distrikti ahụ. Ụfọdụ bi n’ebe dịtụ anya site n’ebe a ga-enwe mgbakọ. Ọzọ, ụfọdụ nwere ezinụlọ buru ibu. Ego dị ndị a, nakwa anyị nile mkpa maka inye onyinye, ịgba ụgbọ, iri ihe ná mgbakọ ahụ, akwụkwọ, tinyere ihe ọhụrụ ọ bụla e wepụtara, na ihe ndị ọzọ pụrụ ịdapụta. Ọ dị ndị nwere ezinụlọ buru ibu mkpa ime atụmatụ tupu oge eruo na idokọ ego ga-ezunụ ka ezinụlọ ahụ nile nwee ike ịga mgbakọ ahụ. Ụzọ dị irè pụrụ ịbụ ime atụmatụ maka ego nile a ga-achọ. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya imenye atụmatụ maka ịrị elu nke ọnụ ahịa ihe mgbe ị na-eme atụmatụ gị. Kerie ego ole e mere atụmatụ ya ụzọ ọnwa ole fọrọ si ugbu a ruo oge mgbakọ distrikti unu. Nke a bụ ego ole ọ dị gị mkpa idokọ kwa ọnwa. Kwa ọnwa, mee ka ọ bụrụ iwu na ị ga-ebu ụzọ wepụ ego a iche dị ka ego mgbakọ. A pụrụ ịdị na-etinye nke a n’obere igbe ma ọ bụ envelopu. Otú ọ dị, a pụrụ ike ego ahụ a na-edokọ kwa ọnwa ụzọ anọ ma na-ewepụ ya iche kwa izu. Ihe dị mkpa bụ na i kwesịghị ichere ruo mgbe ọ fọrọ otu ọnwa ma ọ bụ abụọ ka mgbakọ malite tupu ị malite idokọ ego maka njem a a na-eme kwa afọ.—Ilu 21:5.
16 Mee Ihe Nile Iji Nye Chineke Otuto: Ọ bụ ihe na-agba ume ịnụ otuto a na-enye aha Jehova n’ihi ezi àgwà nke ụmụnna anyị nwoke na ụmụnna anyị nwanyị ná mgbakọ dị iche iche. Banyere ezi àgwà nke ndị bịara otu mgbakọ, otu onye hụrụ ihe merenụ dere, sị: “Nnọkọ ahụ tọrọ m ụtọ. Ahụtụbeghị m okpukpe dị otú a. N’agbanyeghị otú nnọkọ ahụ bururu n’ibu, e nweghị onye uwe ojii ọ bụla, a lụghị ọgụ, e nwere ọbụna ngalaba ebe ndebe ihe furu efu.” Otu onye na-arụ ọrụ n’ime otu ihe owuwu ebe e nyere ụmụnna anyị ụlọ n’oge mgbakọ kwuru, sị: “Ndị bịara mgbakọ unu bụ ndị kasị mma anyị nwere n’ebe a.” Onye ọzọ sịrị: ‘Anyị na-enwe mmasị inye ndị òtù unu ụlọ. Ha nile nwere àgwà ọma.’ Okwu ndị a bụ àmà dị mma sitere n’ọnụ ndị nọ n’èzí. Aha ọma anyị nwetaworo na-ewetara Jehova otuto ma na-eme ka o nwee obi ụtọ banyere anyị.—1 Tesa. 4:12; 1 Pita 2:12.
17 Otú ọ dị, anyị nwetakwara akụkọ ụfọdụ ndị na-adịghị mma site ná mgbakọ dị iche iche banyere ma ụmụaka ma ndị okenye ịdị na-agagharị mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ụfọdụ nọdụrụ n’ime ụgbọala ige egwú. A hụrụ ole na ole ka ha si n’Ụlọ Mgbakọ na-aga na họtel na ụlọ mmanya n’oge ihe omume na-aga n’ihu. Ndị ọzọ na-aga n’akụkụ dịpụrụ adịpụ ije kpaa nkata na ịkọ akụkọ. Ụfọdụ lawara mgbe ihe omume ụtụtụ gasịrị na Sunday. Anyị achọghị ka ihe ndị ahụ mee ọzọ ná mgbakọ dị iche iche n’afọ a. Biko anyị na-agba mmadụ nile ume ka ha nwee njide onwe onye. A na-echetakwara ndị mụrụ ụmụ ka ha lekọta ụmụ ha. Ọ bụrụ na ị lụghị di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ nwee ike inyere ndị mụrụ ọtụtụ ụmụ aka, biko mee otú ahụ.—Gal. 6:2.
18 Onye ọ bụla na-abịa mgbakọ anyị dị iche iche kwesịrị ịma na ya nọ n’ebe a na-efe ofufe. Ọ dịghị onye kwesịrị iji oge ahụ chụọ nta ego. Akwụkwọ Ozi Anyị na-ekwu, na peji nke 134, paragraf nke 3, sị: “Idobe ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke ga-egbochi anyị iji mkpakọrịta ọchịchị Chineke anyị mere ihe maka ịkwalite ọdịmma dị iche iche nke onwe onye ma ọ bụ nke ịchụ nta ego ndị ọzọ. Nzube nke mkpakọrịta anyị na ndị Kraịst ndị ọzọ ná nzukọ ndị Kraịst . . . na mgbe a na-eje mgbakọ sekit na mgbakọ ndị ka ukwuu bụ kpam kpam maka ife Jehova, iri na table ime mmụọ ya na inwe mgbarịta ume. (Rom 1:11, 12; Hib. 10:24, 25)” Ya mere o zighị ezi iji mkpakọrịta bụ́ maka ọchịchị Chineke mee ihe iji nweta ego site n’ire ngwá ahịa ma ọ bụ ịrụ ọrụ ná mgbakọ. Nke a na-agụnyekwa ise foto. Ọ dịghị onye kwesịrị ịkpọsa achụmnta ego ise foto ya ná mgbakọ (dị ka site n’iyi baaji na-akpọsa achụmnta ego ise foto ya) ma ọ bụkwanụ na-akpọ ndị ahịa.
19 Anyị na-agba gị ume ime ndokwa ugbu a iji gazuo ụbọchị atọ ahụ nke Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999. Anyị so unu na-atụ anya ịnụ “iti mkpu ọṅụ na nke ekele” ime mmụọ nke ndị na-efe Chineke dị ka ìgwè dị n’otu. (Abụ Ọma 42:4) Ka Jehova gọzie ndokwa nile a na-eme maka ịnọgide na-azụ anyị n’ụzọ ime mmụọ!
[Okwu Dịịrị Òtù Ndị Okenye: Ozugbo unu natara ihe ntinye a, biko maanụ n’ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na-esonụ, nakwa n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-esochinụ, ebe na ụbọchị Society kenyere ọgbakọ unu. Ọ ga-adị mma ịka akara n’okpuru ebe na ụbọchị ndị e kenyere ọgbakọ unu ịga mgbakọ ma mapawa akụkụ ihe ntinye ahụ na bọọdụ ịma ọkwa.
Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime akụkụ ihe omume na ịma ọkwa ndị metụtara mgbakọ ná nzukọ ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Ndị okenye nile kwesịrị inye nkwado zuru ezu iji hụ na e mere ihe ọsọ ọsọ, n’ịnụ n’ọkụ n’obi, na n’ụzọ dị irè banyere ihe ndị metụtara mgbakọ.]
Igbe dị na peeji nke 3]
Oge Ihe Omume
Friday: 9:20 ụtụtụ - 4:50 uhuruchi
Saturday: 9:00 ụtụtụ - 4:30 uhuruchi
Sunday: 9:00 ụtụtụ - 3:20 ehihie