Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 1997
1 “Otu ụbọchị n’ogige Gị nile dị mma karịa [otu puku ụbọchị] n’ebe ọzọ.” (Abụ Ọma 84:10) Mgbe ọbụ abụ ahụ fere ofufe n’ụlọ ukwu Jehova, ọ pụrụ inwe mmetụta nke ọnụnọ nke Chineke pụrụ ime ihe nile. Mgbe mba ahụ zukọtara maka ememe ndị ha na-eme kwa afọ, ndị na-efe ezi ofufe ejupụtakwa Jerusalem, ụmụ Israel ga-enweta mkpakọrịta dị ụtọ ka ha gbakọtara n’ogige ụlọ ukwu ahụ. E chetaara ha banyere ịdị n’otu mba ha dị ka nanị ndị nọ n’ụwa Jehova wụkwasịworo ngọzi na ihu ọma ya. Kwa afọ, anyị na-enwe ohere isoro ọtụtụ puku ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị kerịta mmetụta nke ịdị n’otu na ọṅụ yiri nke ahụ. N’oge anyị mgbakọ distrikti ndị a na-enwe kwa afọ bụ otu n’ime ụzọ ndị Jehova si na-akpọkọta ndị ya ọnụ maka ntụziaka na mkpakọrịta.
2 Ilekọta ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị Jehova bụ́ ndị biri n’ime na gburugburu Jerusalem n’oge ememe chọrọ nhazi. Ịnọgide na-enwe ịdị n’usoro na udo ma eleghị anya chọrọ inye ntụziaka gbasara ebe obibi, oge nzukọ, na ndokwa ndị ọzọ. Ebe okwu ndị a metụtara ezi ofufe ha, ụmụ Israel ga-eji ọṅụ gbasoo ntụziaka ndị a.—Abụ Ọma 42:4; 122:1.
3 Ọtụtụ narị ụmụnna etinyeworị ọtụtụ iri puku hour n’ịhazi ngalaba mgbakọ dị iche iche na idokwa ebe obibi n’obodo 23 a ga-eme mgbakọ. Ụmụnna ndị a so Ngalaba Mgbakọ Society na-arụ ọrụ n’ụzọ chiri anya iji hazie ọtụtụ ihe ndị metụtara inwe mgbakọ. Ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị ahụ n’onwe anyị oge, mgbalị, na mmefu dị ukwuu na-abanye ná mgbakọ distrikti anyị ndị a na-enwe kwa afọ, ma anyị nile nwere obi ekele n’ezie maka mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke onye ọ bụla n’ime ụmụnna ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, ọ̀ bụ na anyị enweghị?
4 Ka nkwadebe na-aga n’ihu maka Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” nke 1997 anyị, anyị nwere isi ihe ụfọdụ chọrọ nlebara anya obiọma na ntụle siri ike gị. Nkwado gị ga-egosi obi ekele onwe onye gị maka ndokwa nile e mere n’ihi gị. Ọ bụ ezie na a tụlewo ụfọdụ n’ime okwu ndị a na mbụ, ọ dị mkpa onye ọ bụla n’ime anyị ịhụ nke ọma ibu ọrụ anyị n’ihu Jehova n’ịkwado ndokwa dị iche iche nke mgbakọ anyị.
5 Ntụziaka Maka Inweta Ebe Obibi: Anyị ga-agba mbọ inye ọgbakọ ọ bụla ọnụ ọgụgụ fọm Room Request zuru ezu. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request nke ọ bụla e tinyere nke ọma. EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “ndị nkwusa 50,” n’ohere e kwesịrị ide aha ndị a. A ghaghị idepụta ihe ọmụma nile n’ụzọ dị ọcha na n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ. Biko jide n’aka na i nyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, na ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ onye ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Tinye aha ụmụaka ná ndepụta ahụ. N’oge ndị gara aga, ọgbakọ ụfọdụ edepụtawo nanị aha ndị toworo eto. Nke a na-eme ka ndokwa ebe obibi sie ike nke ukwuu. Ọ bụrụ na ohere dị na fọm ahụ ezughịrị unu, jiri ibe akwụkwọ ọzọ mee ihe. Ọ bụrụ na e dere ihe karịrị aha otu onye na fọm ahụ, biko gosipụta ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu ọ na-ezipụrụ ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke Mgbakọ.
6 Kwa afọ, anyị na-arịọ ụmụnna inye Ngalaba Ụlọ Obibi nke Mgbakọ nkwado. Ọ dịkarịa ala a na-arụzu ihe abụọ site n’ige ntị ná ntụzi a:
7 Ọ na-echekwara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ego, ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha nwere ntakịrị ihe: Mgbe anyị kwadoro ndokwa Society, ọnụ ahịa ụlọ na-adịrị ụmụnna anyị ala karị. Kama itinyekwu ego anyị n’ịgawa na họtel na n’ebe ndị nwe ụlọ, a pụrụ iji ya mee ihe ndị ka mma n’ịkwado ezinụlọ anyị na ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụgodị na anyị onwe anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ebe obibi ndị dị oké ọnụ karị, anyị kwesịrị ịkwado mgbalị nke Ngalaba Ụlọ Obibi. Nke a bụ mmụọ nchebara echiche maka ndị ọzọ nke a kọwara na 1 Jọn 3:17 na ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:24.
8 Ọ na-egosipụta nrubeisi nye ntụzi Society: Isi ihe a kwesịrị ịbụ otu n’ime isi nchegbu anyị. Ndị Hibru 13:17 na-asị: “Na-ekwenyerenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaraghị unu uru.” Ka ụmụnna anyị na-eme ọtụtụ ndokwa maka mgbakọ distrikti anyị, anyị chọrọ ka ha nwee mmetụta na ha nwere nkwado anyị zuru ezu. Ebe ọ bụ na a na-achọ nkwado anyị n’okwu a nanị ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ kwa afọ, nke a bụ ụzọ dị mma isi kwadoo mgbalị ha. Ọ bụrụgodị na ihe ga-amasị anyị dị iche, ezi ihe nlereanya anyị, dị ka ụmụnna anyị na ụwa na-ahụ, na-akwalite mmụọ ịhụnanya, nke ịdị n’otu, na nke inye nkwado.—Fil. 2:1-4.
9 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa nke a bụ nanị maka ndị chọrọ enyemaka pụrụ iche site n’aka ndị ọzọ n’ime ndokwa ha ndị metụtara mgbakọ, karịsịa ndokwa ebe obibi, n’oge mgbakọ ahụ. Ha pụkwara ịchọ enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ, na-adabere n’ọnọdụ ha ndị pụrụ iche. Ọ bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ na-egosi ezi ihe nlereanya, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, bụ́ ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ nwapụtara ruru eru inweta enyemaka n’okpuru ndokwa Mkpa Ndị Pụrụ Iche. Ndokwa ndị ọzọ iji lekọta ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche kwesịrị ka ọgbakọ ha na-eso na-eje nzukọ mee ya, kama ịtụkwasị ibu ọrụ a n’isi nhazi mgbakọ. Ndị okenye na ndị ọzọ ndị maara banyere ọnọdụ onye ahụ pụrụ iji ịhụnanya nye aka. Nke a na-achọkarị ka ndị nkwusa tụlee mkpa nke ndị nọ n’ozi oge nile, ndị agadi, ndị ahụ na-adịkwaghị ike, na ma eleghị anya ndị ọzọ. Ndị nkwusa pụrụ inye aka site n’ịkpọrọ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ site n’ilekọta mkpa ha n’ụzọ ndị ọzọ dị irè.—Jes. 2:15-17; 1 Jọn 3:17, 18.
10 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa ndị pụrụ iche ụlọ obibi ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ isoro odeakwụkwọ ọgbakọ kwurịta ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta okwu iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe ọgbakọ mee inyere ndị a aka ịhụ maka ụlọ obibi nke ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ike inye enyemaka dị mkpa, odeakwụkwọ pụrụ inye ndị dị otú ahụ otu fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịworo n’ụzọ doro anya, n’elu peji nke mbụ, okwu ndị bụ “MKPA NDỊ PỤRỤ ICHE.” Nanị ndị nwere mkpa pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm a e nyere akara pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya maka izu ezu, izi ezi, na ịnwapụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eru maka nchebara echiche dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ahụ n’ohere e nyere n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezigbo oge tupu mgbakọ eruo. Odeakwụkwọ ga-ezipụziri Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-eme kpọmkwem ka onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ mara banyere ụlọ ahụ.
11 Ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma tinye akwụkwọ maka ụlọ mgbe ha bịarutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nnwapụta nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
12 Ije Mgbakọ Ọzọ: A na-ekenye ọgbakọ ọ bụla mgbakọ kasị ya nso. Dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e kenyere ịga mgbakọ nke ọ bụla, Society na-eme atụmatụ ndị ga-aga iji dokwaa maka oche, ụlọ, na akwụkwọ zuru ezu, na ihe ndị ọzọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere ị ga-eji jee mgbakọ na-abụghị nke e kenyere gị ma chọọ ka e nye gị ụlọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị otu fọm Room Request. Ị pụrụ idejupụta ya ma nye ya odeakwụkwọ ka ọ bịanye aka tupu i ziga ya ná mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
13 Mmechi: O doro anyị nile anya na Jehova na-akwado ndokwa nke mgbakọ ndị a na-eme kwa afọ. Ebe ọtụtụ n’ime ụmụnna na-eje mgbakọ distrikti chọrọ ụlọ, a pụrụ imesi anyị obi ike na Jehova ga-emezu mkpa ndị a n’ụzọ zuru ezu. Ebe okwu ndị a metụtara ezi ofufe anyị, anyị kwesịrị iji ọṅụ gbasoo ntụziaka ndị e nyere. Igosi na anyị ‘kwesịrị ka a tụkwasị anyị obi n’ihe dịkarịsịrị nta’ na-eme ka anyị nọrọ n’ọnọdụ maka inweta ngọzi ukwuu ndị na-echere ndị Jehova hụrụ n’anya.—Luk 16:10.
14 Aịsaịa 33:20 na-asị: “Lekwasị Zaịọn anya, bụ́ obodo nke mgbe nile anyị a kara aka.” Anyị pụrụ nanị iche n’echiche ìgwè ndị nwere obi ụtọ na-ejupụta Jerusalem bụ́ ndị jikwa ọchịchọ obi meghachi omume nye iwu Jehova nke ‘ịṅụrị nanị ọṅụ.’ (Deut. 16:15) Mgbakọ distrikti anyị ndị a na-enwe kwa afọ na-enye anyị ohere dị ebube ma nke iji nara ntụziaka Chineke ma nke ịnụ ụtọ mkpakọrịta na-ekpo ọkụ nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị. Ka Jehova gọzie mgbalị gị ka ị na-akwado ịga usoro Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” nke 1997!
[Okwu Dịịrị Òtù Ndị Okenye: Mgbe unu natara ihe ntinye a, biko maanụ n’ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi nke so ya, tinyekwara n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-esochi ebe na ụbọchị ndị Society kenyere ọgbakọ unu. Ọ ga-adị mma ịka akara n’okpuru ebe na ụbọchị ndị e kenyere ọgbakọ unu ma mapawa akụkụ ihe ntinye ahụ na bọọdụ ịma ọkwa.
Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime akụkụ ihe omume na ịma ọkwa ndị metụtara mgbakọ ná nzukọ ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Ndị okenye nile ga-achọ inye nkwado zuru ezu, iji hụ na e mere ihe ọsọ ọsọ, n’ịnụ ọkụ n’obi, na n’ụzọ dịkwa irè banyere ihe ndị metụtara mgbakọ.]
Igbe dị na peeji nke 4]
Oge Usoro Ihe Omume
Friday
9:20 ụtụtụ -4:40 ehihie
Saturday
9:00 ụtụtụ -4:20 ehihie
Sunday
9:00 ụtụtụ -3:20 ehihie