Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke 1998
1 Site n’afọ ruo n’afọ ndị na-efe Jehova n’oge a n’ụwa nile na-atụsi anya ike ịgbakọ n’ọnụ ọgụgụ bara ụba ná mgbakọ distrikti. N’ime nke a, ha na-egosipụta mmụọ yiri nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’Israel oge ochie nwere bụ́ ndị jiri ọṅụ bụọ okwu ndị dị n’Abụ Ọma 122 n’abụ ka ha nọ n’ụzọ ije fee Jehova ofufe na Jerusalem. Amaokwu nke 1 nke abụ ọma ahụ na-agụ, sị: “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, Ka anyị jee n’ụlọ Jehova.” N’oge ndị dị otú ahụ anyị na-ahụkwa ihe àmà na-arị elu na okwu Aịsaịa 2:2, 3 e dere n’ike nke mmụọ nsọ na-emezu.
2 N’afọ a anyị nwere ihe pụrụ iche mere anyị ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ihi njimara mba dị iche iche nke ndị ga-esite ná mba ndị dị gburugburu ụwa gaa ụfọdụ n’ime mgbakọ ndị ahụ ga-atụkwasị. Usoro ihe omume mgbakọ n’ebe ọ bụla ga-enwe ahụmahụ sitere n’ubi na akụkọ ọganihu nke ọrụ ime nkwusa Alaeze n’ala ndị ọzọ.
3 Otú ọ dị, nanị ọgbakọ ndị a kpọrọ òkù na gburugburu ebe mgbakọ mba nile ndị ahụ ga-enwe ike ịga mgbakọta ndị ahụ. Ọ dị mkpa ka mmadụ nile kwanyere ókè a a kpara ùgwù ka e wee nwee mgbakọ nile n’ụzọ dị n’usoro. Njimara mba dị iche iche ga-apụta ìhè ná mgbakọ distrikti nile n’akụkụ ihe omume na akụkọ ụfọdụ, tinyere ọnụnọ nke ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị pụrụ ịga.
4 Ka nkwadebe maka Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998 anyị na-aga n’ihu, anyị ga-achọ ịtụle ihe ọmụma ụfọdụ ga-adị unu mkpa maka inweta ebe obibi ná mgbakọ ahụ. Nkwado zuru ezu unu ga-egosi obi ekele nke aka unu maka ndokwa nile e mere n’ihi unu.
5 Ntụziaka Maka Inweta Ebe Obibi: Anyị ga-agba mbọ inye ọgbakọ ọ bụla ọnụ ọgụgụ fọm Room Request ga-ezuru ha. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request nke ọ bụla e zigara nke ọma. EDELA nanị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa chọrọ ebe obibi, dị ka “ndị nkwusa 50,” n’ohere ebe e kwesịrị ide aha ndị a. A ghaghị idepụta ihe ọmụma nile nke ọma na n’ụzọ ga-ekwe ọgụgụ. Biko jidenụ n’aka na unu nyere ihe ọmụma zuru ezu banyere aha, afọ ndụ, nwoke ka ọ̀ bụ nwanyị, na ma onye ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi ọ̀ bụ onye ọsụ ụzọ ka ọ̀ bụ onye nkwusa ọgbakọ. Denye ụmụaka ná ndepụta ahụ. N’oge ndị gara aga, ọgbakọ ụfọdụ edepụtawo nanị aha ndị toworo eto. Nke a na-eme ka ndokwa ebe obibi sie ike nke ukwuu. Ọ bụrụ na unu achọọ ohere karị nke e nyere na fọm ahụ, jiri ibe akwụkwọ ọzọ mee ihe. Ọ bụrụ na e dere ihe karịrị aha otu onye na fọm ahụ, biko gosipụta ihe jikọrọ ndị ahụ na-etinye akwụkwọ maka ebe obibi n’ohere kwesịrị ekwesị. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara fọm Room Request ahụ n’ụzọ ziri ezi tupu ọ na-ezipụrụ ya Ngalaba Ụlọ Obibi nke Mgbakọ.
6 Kwa afọ, anyị na-arịọ ụmụnna ka ha nye Ngalaba Ụlọ Obibi nke Mgbakọ nkwado. Ọ dịkarịa ala a na-arụzu ihe abụọ site n’ige ntị ná ntụzi a:
7 Ọ na-echekwara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ego: Mgbe anyị kwadoro ndokwa Society, ọnụ ahịa ụlọ na-adịrị ụmụnna anyị ala karị. Kama ego anyị ịga n’aka ndị nwe ụlọ, a pụrụ iji ya mee ihe ndị ka mma n’ịkwado ezinụlọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na n’ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụgodị na anyị onwe anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ maka ebe obibi ndị dị oké ọnụ karị, anyị kwesịrị ịkwado mgbalị nke Ngalaba Ụlọ Obibi. A kọwara mmụọ nke nchegbu banyere ndị ọzọ dị otú a na 1 Jọn 3:17, ọ bụkwa ụkpụrụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:24.
8 Ọ na-egosipụta nrubeisi nye ntụzi Society: Isi ihe a kwesịrị ịbụ otu n’ime isi nchegbu anyị. Ndị Hibru 13:17 na-asị: “Na-ekwenyerenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghịrị unu uru.” Ka ụmụnna anyị na-eme ọtụtụ ndokwa maka mgbakọ distrikti anyị, anyị chọrọ ka ha nwee mmetụta na ha nwere nkwado zuru ezu anyị. Ebe ọ bụ na a na-achọ nkwado anyị n’okwu a nanị ụbọchi abụọ ma ọ bụ atọ kwa afọ, nke a bụ ụzọ dị mma iji kwadoo mgbalị ha. Ọbụna ọ bụrụ na nhọrọ onwe onye anyị dị iche, ezi ihe nlereanya anyị, dị ka ụmụnna anyị na ụwa na-ahụ, na-akwalite mmụọ ihụnanya, nke ịdị n’otu, na nke inye nkwado.—Fil. 2:1-4.
9 Mkpa Ndị Pụrụ Iche: Ndokwa a bụ nanị maka ndị chọrọ enyemaka pụrụ iche site n’aka ndị ọzọ n’ime ndokwa ha ndị metụtara mgbakọ, karịsịa ndokwa ebe obibi, n’oge mgbakọ ahụ. Ndị a pụkwara ịchọ enyemaka n’ụzọ ndị ọzọ na-adabere n’ọnọdụ ha ndị pụrụ iche. Ọ bụ nanị ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ na-egosi ezi ihe nlereanya, tinyere ụmụ ha na-akpa ezi àgwà, bụ́ ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche, ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwadoro ruru eru inweta enyemaka n’okpuru ndokwa Mkpa Ndị Pụrụ Iche. Ndokwa ndị ọzọ iji lekọta ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche kwesịrị ka ọgbakọ ebe ha na-eje nzukọ mee ya, kama ịtụkwasị ibu ọrụ a n’isi ndị nhazi mgbakọ. Ndị okenye na ndị ọzọ ndị maara banyere ọnọdụ onye ahụ pụrụ iji ịhụnanya nye aka. Nke a na-achọkarị ka ndị nkwusa tụlee mkpa nke ndị nọ n’ozi oge nile, ndị agadi, ndị ahụ na-esichaghị ike, na ma e leghị anya ndị ọzọ. Ndị nkwusa pụrụ inye aka site n’ịkpọrọ ndị dị otú ahụ ma ọ bụ site n’ilekọta mkpa ha n’ụzọ ndị ọzọ dị irè.—Jes. 2:15-17; 1 Jọn 3:17, 18.
10 N’ezie, Ngalaba Ụlọ Obibi ga-agba mbọ inye ndị nkwusa nwere mkpa ndị pụrụ iche ụlọ obibi ndị kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ apụghị inyere ha aka. Ndị nkwusa a pụrụ isoro odeakwụkwọ ọgbakọ kwurịta ọnọdụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị isoro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta okwu iji hụ ma ọ̀ ga-ekwe ọgbakọ mee inyere ndị a aka ịhụ maka ụlọ obibi nke ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ike inye enyemaka dị mkpa, odeakwụkwọ pụrụ inye ndị dị otú ahụ otu fọm Room Request bụ́ nke o dekwasịworo n’ụzọ doro anya, n’elu peji nke mbụ, okwu ndị bụ “MKPA NDỊ PỤRỤ ICHE.” Nanị ndị nwere mkpa pụrụ iche kwesịrị idejupụta fọm a e nyere akara pụrụ iche. Ọ bụ onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ ga-edejupụta ya. E kwesịrị iweghachiri ya odeakwụkwọ, bụ́ onye ga-eleru ya anya maka izu ezu, izi ezi, na ịnwapụta ọnọdụ ndị mere ka onye ahụ ruo eruo maka nchebara echiche dị otú ahụ. Odeakwụkwọ GA-AKỌWA N’ỤZỌ ZURU EZU ọnọdụ ndị ahụ n’ohere e nyere n’azụ fọm ahụ. E kwesịrị ime ihe a nile n’ezi oge tupu mgbakọ eruo. Mgbe ahụ odeakwụkwọ ga-ezipụrụ Ngalaba Ụlọ Obibi fọm ahụ. A ga-eme ka onye ahụ na-achọ ka e nye ya ụlọ kpọmkwem mara banyere ụlọ ahụ.
11 Ndị nwere mkpa ndị pụrụ iche EKWESỊGHỊ ịga ná mgbakọ ma tinye akwụkwọ maka ụlọ mgbe ha bịarutere, n’ihi na Ngalaba Ụlọ Obibi aghaghị inweta nnwapụta nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
12 Ije Mgbakọ Ọzọ: A na-ekenye ọgbakọ ọ bụla mgbakọ kasị ya nso. Dabere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e kenyere ịga mgbakọ nke ọ bụla, Society na-eme atụmatụ ndị ga-abịa iji dokwaa maka oche, ụlọ, akwụkwọ na ihe ndị ọzọ ga-ezunụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere ị ga-eji gaa mgbakọ na-abụghị nke e kenyere gị ma chọọ ka e nye gị ụlọ, odeakwụkwọ ọgbakọ pụrụ inye gị otu fọm Room Request. Ị pụrụ idejupụta ya ma nye ya odeakwụkwọ ka ọ bịanye aka tupu i ziga ya ná mgbakọ nke ị chọrọ ịga.
13 Chekwaa Ego Maka Mgbakọ Ahụ: Tinyere ndokwa ndị ọzọ, UGBU A bụ oge a ga-amalite ichekwawa ego maka mgbakọ distrikti ahụ. Ụfọdụ bi n’ebe dịtụ anya site n’ebe a ga-enwe mgbakọ. Ọzọ, ụfọdụ nwere ezinụlọ ndị buru ibu. Nye ndị a, nakwa anyị nile, ego dị mkpa maka onyinye, ime njem, iri ihe n’oge mgbakọ ahụ, akwụkwọ, tinyere akwụkwọ ọhụrụ ọ bụla ndi a ga-ewepụta, na ihe mberede ndị ọzọ. Ọ dị ndị nwere ezinụlọ buru ibu mkpa ime atụmatụ tupu oge eruo ma chekwaa ego ga-ezuru ha ka ezinụlọ ahụ nile nwee ike ịga mgbakọ ahụ. Ụzọ dị irè pụrụ ịbụ ime atụmatụ maka ego nile dị mkpa. Ọ bụ ihe amamihe inye ohere maka ịrị elu nke ọnụ ahịa mgbe ị na-eme atụmatụ gị. Jiri ọnụ ọgụgụ ọnwa ndị dị site n’ugbu a ruo mgbe unu ga-enwe mgbakọ distrikti kee ego ole e mere atụmatụ ya. Nke a bụ ọnụ ego dị gị mkpa ichekwa kwa ọnwa. Kwa ọnwa, mee ka ọ bụrụ iwu na ị ga ebu ụzọ wepụ ọnu ego a iche dị ka ego mgbakọ. A pụrụ idebe nke a n’obere igbe ma ọ bụ envelopu. Otú ọ dị, a pụrụ ike ego a na-echekwa kwa ọnwa ụzọ anọ ma na-ewepụ ya iche kwa izu. Ihe dị mkpa bụ na i kwesịghị ichere ruo mgbe mgbakọ fọrọ otu ọnwa ma ọ bụ abụọ tupu ị gbalịwa ichekwa ego maka njem a a na-eme mgbe nile kwa afọ.—Ilu 21:5.
14 Mmechi: Okwu ndị sitere ná mgbakọ dị iche iche na-egosi na e kwesịrị ịja unu bụ́ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị mma n’ihi igosipụta àgwà Chineke. Otu akụkọ sịrị: “Mgbakọ ahụ gara n’usoro na n’udo, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị tụkwasịkwara uche n’ihe ime mmụọ karịa nke anụ ahụ. . . . N’oge nnọkọ, ndị na-ege ntị ṅara ntị nke ọma n’ihe omume ahụ.” Nwanyị nwe ụlọ akwụkwọ ebe ndị bịara mgbakọ biri kwuru, sị: “Ana m adị na-anụ na Ndịàmà Jehova bụ ndị na-adị ọcha, ma ejighị m ya kpọrọ ihe. Ma ugbu a ahụwo m ya n’onwe m. Obi dị m ụtọ nke ukwuu ịhụ na ha debere nnọọ ogige ụlọ akwụkwọ m ọcha, na-anyụghị nsị aghara aghara. Unu nweere onwe unu iji ogige a mee ihe mgbe ọ bụla unu nwere mgbakọ unu.” Okwu ndị dị otú a dị mma ịnụ, ọ̀ bụ na ha adịghị? Àgwà ụmụnna nwoke na nwanyị kpaliri okwu ndị a na-eme n’ezie ka obi Jehova ṅụrịa.
15 Society natara ọtụtụ akwụkwọ ozi site n’aka ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-egosi obi ekele ha maka ndokwa ndị e meere ha. Otu nwanna nwoke dere, sị: “Unu emeela nke ukwuu . . . Nke a bụ banyere Mgbakọ Distrikti ‘Okwukwe n’Okwu Chineke’ were ụbọchị atọ nke tọworo m ụtọ nke ukwuu. . . . Unu emeela nke ukwuu maka ụzọ e si hazie mgbakọ ahụ n’ụzọ dị mma.” Otu nwanna nwanyị dere, sị: “Achọrọ m ikele ụmụnna m nile aka ha dị n’idokwa maka ebe obibi site n’ala ala obi m. Mụ na di m nwere obi ekele maka ọnụ ego ahụ dị ala, ebe anyị ji ego otu onye na-akpata na-akwado onwe anyị ka m wee nwee ike ịnọgide n’ịsụ ụzọ. Ndokwa ndị a na-enyere anyị aka irite uru dị ukwuu karị site ná mgbakọ.”
16 O doro anyị nile anya na Jehova na-akwado nhazi a na-eme maka mgbakọ kwa afọ. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ụmụnna na-aga mgbakọ distrikti na-achọ ọnụ ụlọ, a pụrụ imesi anyị obi ike na Jehova ga-egbo mkpa ndị a n’otu aka ahụ. Igosi na anyị ‘kwesịrị ka a tụkwasị anyị obi n’ihe dịkarịsịrị nta’ na-etinye anyị n’ọnọdụ ịnata ngọzi kasịnụ nke na-echere ndị Jehova hụrụ n’anya.—Luk 16:10.
[Okwu Dịịrị Òtù Ndị Okenye: Ozugbo unu natara ihe ntinye a, biko maanụ n’ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi nke so ya, tinyekwara n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-esochi ebe na ụbọchị Society kenyere ọgbakọ unu. Ọ ga-adị mma ịka akara n’okpuru ebe na ụbọchị ndị e kenyere ọgbakọ unu ma mapawa akụkụ ihe ntinye ahụ na bọọdụ ịma ọkwa.
Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime akụkụ ihe omume na ịma ọkwa ndị metụtara mgbakọ ná nzukọ ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Ndị okenye nile ga-achọ inye nkwado zuru ezu iji hụ na e mere ihe ọsọ ọsọ, n’ịnụ ọkụ n’obi, na n’ụzọ dịkwa irè banyere ihe ndị metụtara mgbakọ.]
Igbe dị na peeji nke 4]
Oge Usoro Ihe Omume
Friday
9:20 ụtụtụ–4:50 ehihie
Saturday
9:00 ụtụtụ–4:30 ehihie
Sunday
9:00 ụtụtụ–3:30 ehihie